< 2 Samuel 9 >

1 Otu ụbọchị, Devid jụrụ ajụjụ sị, “O nwere onye fọdụrụ ndụ nʼezinaụlọ Sọl? Achọrọ m igosi onye ahụ obi ebere nʼihi Jonatan.”
And David said, Is there yet any one left in the house of Saul, that I may deal kindly with him for Jonathan's sake?
2 Ọ nụrụ ihe banyere otu nwoke aha ya bụ Ziba, onye bụ otu nʼime ndị ohu Sọl. O ziri ozi ka a kpọọ ya. Mgbe ọ bịara nʼihu Devid, eze jụrụ ya sị, “Ọ bụ gị bụ Ziba?” Ọ zara sị, “E, onyenwe m, ọ bụ m ohu gị.”
And there was a servant of the house of Saul, and his name was Siba: and they call him to David; and the king said to him, Are you Siba? and he said, I [am] your servant.
3 Eze jụrụ ya sị, “Ọ dị onye fọdụrụ ndụ nʼezinaụlọ Sọl? Ọ bụrụ na ọ dị onye fọdụrụ, achọrọ m igosi ya ụdị obiọma Chineke na-egosi.” Ziba zara ya sị, “Otu nwa nwoke Jonatan, nke dara ngwụrọ nọ ndụ.”
And the king said, Is there yet a man left of the house of Saul, that I may act towards him with the mercy of God? and Siba said to the king, There is yet a son of Jonathan, lame [of] his feet.
4 Eze jụrụ, “Ebee ka ọ nọ?” Ziba zaghachiri, “Ọ nọ na Lo Deba, nʼụlọ Makia, nwa Amiel.”
And the king said, Where [is] he? and Siba said to the king, Behold, [he is] in the house of Machir the son of Amiel of Lodabar.
5 Ya mere eze Devid ziri ka e site nʼobodo Lo Deba, nʼụlọ Makia nwa Amiel kpọta ya.
And king David went, and took him out of the house of Machir the son Amiel of Lodabar.
6 Mgbe Mefiboshet nwa Jonatan, nwa Sọl, bịara nʼebe Devid nọ, o hulatara isi, kpọọrọ ya isiala, nʼọnọdụ nsọpụrụ. Mgbe ahụ, Devid kpọrọ ya aha sị, “Mefiboshet,” Mefiboshet zara sị ya, “A bụ m ohu gị.”
And Memphibosthe the son of Jonathan the son of Saul comes to the king David, and he fell upon his face and did obeisance to him: and David said to him, Memphibosthe: and he said, Behold your servant.
7 Ma Devid sịrị ya, “Atụla egwu, nʼezie, aga m egosi gị obiọma nʼihi nna gị Jonatan. Aga m enyeghachi gị ala niile nna nna gị Sọl nwere. Ma ị ga-eso soro m na-eri nri na tebul m oge niile.”
And David said to him, Fear not, for I will surely deal mercifully with you for the sake of Jonathan your father, and I will restore to you all the land of Saul the father of your father; and you shall eat bread at my table continually.
8 Mefiboshet dara nʼala nʼihu eze sị, “Eze, onye ka m bụ i ji egosi nkịta nwụrụ anwụ dịka m obi ebere?”
And Memphibosthe did obeisance, and said, Who am I your servant, that you have looked upon a dead dog like me?
9 Eze kpọrọ Ziba ohu Sọl ahụ sị ya, “Enyeghachila m nwa nwa nna gị ukwu ihe niile Sọl na ụlọ ya nwere.
And the king called Siba the servant of Saul, and said to him, All that belonged to Saul and to all his house have I given to the son of your lord.
10 Gị na ụmụ gị ndị ikom na ndị ozi gị ga-arụ ọrụ nʼubi ya ịrụpụta nri. Ma Mefiboshet, nwa nwa nna gị ukwu ga na-eri ihe na tebul m.” Ziba, nwere ụmụ ndị ikom iri na ise, na iri ndị ozi abụọ.
And you, and your sons, and your servants, shall till the land for him; and you shall bring in bread to the son of your lord, and he shall eat bread: and Memphibosthe the son of your lord shall eat bread continually at my table. Now Siba had fifteen sons and twenty servants.
11 Ọ sịrị eze, “Onyenwe m, ohu gị ga-eme ihe niile eze nyere m nʼiwu.” Site nʼoge ahụ, Mefiboshet riri nri na tebul Devid dịka ọ bụ otu nʼime ụmụ ndị ikom eze.
And Siba said to the king, According to all that my lord the king has commanded his servant, so will your servant do. And Memphibosthe did eat at the table of David, as one of the sons of the king.
12 Mefiboshet nwekwara otu nwa nwoke aha ya bụ Mika. Ziba na ndị niile bi nʼụlọ ya niile ghọrọ ndị ohu Mefiboshet.
And Memphibosthe had a little son, and his name [was] Micha: and all the household of Siba [were] servants to Memphibosthe.
13 Ma Mefiboshet biri na Jerusalem nʼihi na ọ bụ na tebul eze ka ọ na-eri nri mgbe niile. Ọ bụ onye dara ngwụrọ nʼụkwụ ya abụọ.
And Memphibosthe lived in Jerusalem, for he continually ate at the table of the king; and he was lame in both his feet.

< 2 Samuel 9 >