< 2 Samuel 8 >

1 Mgbe ihe ndị a gasịrị, Devid meriri ndị Filistia. Mee ka ha nọdụ nʼokpuru ọchịchị ya. Ọ naara obodo Meteg-Amaa site nʼọchịchị ndị Filistia.
ikawa baada ya haya Daudi aliwashambulia Wafilisti na kuwashinda. Hivyo Daudi akaichukua Gathi na vijiji vyake kutoka katika mamlaka ya wafilisti.
2 Devid merikwara ndị Moab. O mere ka ha dinaa nʼala. O jikwa ụdọ ọtụtụ tụa ha. Ọtụtụ abụọ ọbụla nʼime ha ka egburu. Ọtụtụ nke atọ ka a hapụrụ ka ha dịrị ndụ. Ya mere, ndị Moab ghọrọ ndị ohu Devid, na-ebutakwara ya ụtụ kwa afọ ọbụla.
Kisha akaishinda Moabu na akawapima watu wake kwa mstari kwa kuwafanya walale chini juu ya ardhi. Alipima mistari miwili ya kuua, na mstari mmoja kamili kuwahifadhi hai. Hivyo Wamoabu wakawa watumishi wa Daudi na wakaanza kumlipa kodi.
3 Devid merikwara Hadadeza nwa Rehob, eze Zoba. Mgbe ọ gara inweghachita ogidi e jiri mara ya, nʼakụkụ osimiri Yufretis.
Kisha Daudi akamshinda Hadadezeri mwana wa Rehobu, mfalme wa Soba, Hadadezeri aliposafiri kuurudisha ufalme wake katika mto Frati.
4 Devid nwudere otu puku ịnyịnya ya na-adọkpụ ụgbọ agha, puku ndị agha asaa ndị na-agba ụgbọ agha, tinyere ndị agha ji ụkwụ eje dị iri puku abụọ. O bipụrụ akwara ụkwụ ịnyịnya ndị ahụ niile ọ dọtara nʼagha, ma hapụ naanị narị ịnyịnya.
Daudi aliteka magari 1, 700 ya farasi na askari ishirini elfu waendao kwa miguu. Daudi akawakata miguu farasi wa magari, lakini akahifadhi wakutosha magari mia moja.
5 Mgbe ndị Aram nke Damaskọs bịara inyere Hadadeza eze Zoba aka, Devid gburu iri puku ndị agha abụọ na abụọ nʼime ha.
Wakati Washami wa Dameski walipokuja kumsaidia Hadadeziri mfalme wa Soba, Daudi akaua katika Washami watu ishirini na mbili elfu.
6 O wuru ogige ndị agha nʼalaeze ndị Aram nke Damaskọs. Ndị Aram ghọrọ ndị ohu Devid, na-ewetakwa ụtụ ịnata ihuọma. Onyenwe anyị nyere Devid mmeri ebe ọbụla ọ gara.
Daudi akaweka ngome huko Shamu ya Dameski, na Washami wakawa watumishi wake na wakaleta kodi. Yahwe akampa Daudi ushindi kila alikokwenda.
7 Devid chịkọtara ọta ọlaedo ndịisi agha Hadadeza ji lụọ agha webata ha na Jerusalem.
Daudi akachukua ngao za dhahabu walizokuwa nazo watumishi wa Hadadezeri naye akazileta Yerusalemu.
8 Site na Teba nakwa Beirotai, bụ obodo Hadadeza na-achị. Eze Devid weere ọtụtụ bronz dị ukwuu.
Mfalme Daudi akachukua shaba nyingi kutoka Beta na Berosai, miji ya Hadadezeri.
9 Mgbe Tou, eze Hamat, nụrụ na Devid emeriela ndị agha Hadadeza niile,
Wakati Tou, mfalme wa Hamathi, aliposikia kwamba Daudi amelishinda jeshi lote la Hadadezeri,
10 o zipụrụ Joram, nwa ya nwoke, ka ọ gaa kelee Devid, nʼihi mmeri o meriri Hadadeza nʼagha, bụ onye ya na Tou nọ nʼagha. Joram ji ọtụtụ akụrụngwa nke ọlaọcha, nke ọlaedo na nke bronz bịa.
Tou akamtuma Hadoramu mwanawe kwa mfalme Daudi kumpa salamu na kumbariki, kwa kuwa Daudi alikuwa amepigana na Hadadezeri na kumshinda, maana Hadadezeri alikuwa amepiga vita dhidi ya Tou. Hadoramu akaja pamoja na vitu vya fedha, dhahabu, na shaba.
11 Eze Devid doro akụrụngwa ndị a niile nsọ nye Onyenwe anyị, dịka o si mee ọlaọcha na ọlaedo si na mba niile ndị ọ lụgburu.
Mfalme Daudi akaviweka wakfu vitu hivi kwa ajili ya Yahwe, pamoja na fedha na dhahabu kutoka katika mataifa yote aliyokuwa ameyashinda-
12 Mba ndị a bụ: Edọm, Moab, ndị Amọn, ndị Filistia na Amalek. O dokwara nsọ nye Onyenwe anyị ihe ọ kwatara nʼagha site nʼaka Hadadeza nwa Rehob, bụ eze Zoba.
kutoka Shamu, Moabu, Waamoni, Wafilist, Waamaleki, pamoja na nyara zote alizoziteka kutoka kwa Hadadezeri mwana wa Rehobu, mfalme wa Soba.
13 Devid meere onwe ya aha, mgbe o si nʼitigbu puku ndị ikom Edọm iri na asatọ na Ndagwurugwu Nnu lọghachite.
Jina la Daudi likajulikana sana alipowashinda washami katika bonde la Chumvi, pamoja na watu wao wapatao elfu kumi na nane.
14 O wuru ogige ndị agha nʼala Edọm niile, ndị Edọm niile ghọrọ ndị na-ejere Devid ozi. Onyenwe anyị nyere Devid mmeri ebe ọbụla ọ gara.
Akaweka ngome katika Edomu yote, na Waedomu wote wakawa watumishi wake. Yahwe akampa Daudi ushindi kila alipokwenda.
15 Devid chịrị ndị Izrel niile, na-emere ndị ya ihe dị mma na ihe ziri ezi. O mesokwaghị onye ọbụla mmeso ọjọọ.
Daudi akatawala juu ya Israeli yote, naye akatenda kwa haki na usawa kwa watu wote.
16 Onyeisi ndị agha ya bụ Joab nwa Zeruaya; ode akwụkwọ obodo bụ Jehoshafat, nwa Ahilud.
Yoabu mwana wa Seruya alikuwa mkuu wa jeshi, na Yehoshafati mwana wa Ahiludi alikuwa mwenye kuandika taarifa.
17 Zadọk nwa Ahitub, na Ahimelek nwa Abịata, bụ ndị nchụaja; Seraya bụ ode akwụkwọ eze.
Sadoki mwana wa Ahitubu na Ahimeleki mwana wa Abiathari walikuwa makuhani, na Seraya alikuwa mwandishi.
18 Benaya, nwa Jehoiada, bụ onyeisi ndị Keret na Pelet. Ụmụ ndị ikom Devid bụkwa ndị nchụaja.
Benaya mwana wa Yehoyada alikuwa juu ya Wakerethi na Wapelethi, na wana wa Daudi walikuwa washauri wa mfalme.

< 2 Samuel 8 >