< 2 Samuel 8 >

1 Mgbe ihe ndị a gasịrị, Devid meriri ndị Filistia. Mee ka ha nọdụ nʼokpuru ọchịchị ya. Ọ naara obodo Meteg-Amaa site nʼọchịchị ndị Filistia.
پس از چندی، باز داوود به فلسطینی‌ها حمله کرده، آنها را شکست داد و مِتِگ‌اَمّاه را از دستشان گرفت.
2 Devid merikwara ndị Moab. O mere ka ha dinaa nʼala. O jikwa ụdọ ọtụtụ tụa ha. Ọtụtụ abụọ ọbụla nʼime ha ka egburu. Ọtụtụ nke atọ ka a hapụrụ ka ha dịrị ndụ. Ya mere, ndị Moab ghọrọ ndị ohu Devid, na-ebutakwara ya ụtụ kwa afọ ọbụla.
داوود همچنین موآبی‌ها را شکست داده، اسیران را به ردیف در کنار هم روی زمین خوابانید؛ سپس از هر سه نفر دو نفر را کشت و یک نفر را زنده نگه داشت. بازماندگان موآبی تابع داوود شده، به او باج و خراج می‌دادند.
3 Devid merikwara Hadadeza nwa Rehob, eze Zoba. Mgbe ọ gara inweghachita ogidi e jiri mara ya, nʼakụkụ osimiri Yufretis.
در ضمن داوود نیروهای هددعزر (پسر رحوب)، پادشاه صوبه را در هم شکست، زیرا هددعزر می‌کوشید بار دیگر نواحی کنار رود فرات را به چنگ آورد.
4 Devid nwudere otu puku ịnyịnya ya na-adọkpụ ụgbọ agha, puku ndị agha asaa ndị na-agba ụgbọ agha, tinyere ndị agha ji ụkwụ eje dị iri puku abụọ. O bipụrụ akwara ụkwụ ịnyịnya ndị ahụ niile ọ dọtara nʼagha, ma hapụ naanị narị ịnyịnya.
در این جنگ داوود هزار ارابه، هفت هزار سرباز سواره و بیست هزار سرباز پیاده را به اسیری گرفت، بعد صد اسب برای ارابه‌ها نگه داشته، رگ پای بقیهٔ اسبان را قطع کرد.
5 Mgbe ndị Aram nke Damaskọs bịara inyere Hadadeza eze Zoba aka, Devid gburu iri puku ndị agha abụọ na abụọ nʼime ha.
او همچنین با بیست و دو هزار سرباز سوری که از دمشق برای کمک به هَدَدعَزَر آمده بودند جنگید و همهٔ آنها را کشت.
6 O wuru ogige ndị agha nʼalaeze ndị Aram nke Damaskọs. Ndị Aram ghọrọ ndị ohu Devid, na-ewetakwa ụtụ ịnata ihuọma. Onyenwe anyị nyere Devid mmeri ebe ọbụla ọ gara.
داوود در دمشق چندین قرارگاه مستقر ساخت و مردم سوریه تابع داوود شده، به او باج و خراج می‌پرداختند. به این ترتیب داوود هر جا می‌رفت، خداوند او را پیروزی می‌بخشید.
7 Devid chịkọtara ọta ọlaedo ndịisi agha Hadadeza ji lụọ agha webata ha na Jerusalem.
داوود سپرهای طلای سرداران هددعزر را گرفته، به اورشلیم برد.
8 Site na Teba nakwa Beirotai, bụ obodo Hadadeza na-achị. Eze Devid weere ọtụtụ bronz dị ukwuu.
در ضمن، او از طبح و بیروتای، شهرهای هددعزر، مقدار زیادی مفرغ گرفته، آنها را هم به اورشلیم برد.
9 Mgbe Tou, eze Hamat, nụrụ na Devid emeriela ndị agha Hadadeza niile,
توعو، پادشاه حمات، وقتی شنید که داوود بر لشکر هددعزر پیروز شده است،
10 o zipụrụ Joram, nwa ya nwoke, ka ọ gaa kelee Devid, nʼihi mmeri o meriri Hadadeza nʼagha, bụ onye ya na Tou nọ nʼagha. Joram ji ọtụtụ akụrụngwa nke ọlaọcha, nke ọlaedo na nke bronz bịa.
پسرش هدورام را فرستاد تا سلام وی را به او برساند و این پیروزی را به او تبریک بگوید، چون هددعزر و توعو با هم دشمن بودند. هدورام هدایایی از طلا و نقره و مفرغ به داوود داد.
11 Eze Devid doro akụrụngwa ndị a niile nsọ nye Onyenwe anyị, dịka o si mee ọlaọcha na ọlaedo si na mba niile ndị ọ lụgburu.
داوود، همهٔ این هدایا را با طلا و نقره‌ای که خود از ادومی‌ها، موآبی‌ها، عمونی‌ها، فلسطینی‌ها، عمالیقی‌ها و نیز از هددعزر پادشاه به غنیمت گرفته بود، وقف خداوند کرد.
12 Mba ndị a bụ: Edọm, Moab, ndị Amọn, ndị Filistia na Amalek. O dokwara nsọ nye Onyenwe anyị ihe ọ kwatara nʼagha site nʼaka Hadadeza nwa Rehob, bụ eze Zoba.
13 Devid meere onwe ya aha, mgbe o si nʼitigbu puku ndị ikom Edọm iri na asatọ na Ndagwurugwu Nnu lọghachite.
داوود در درهٔ نمک با هجده هزار سرباز ادومی وارد جنگ شده، آنها را از بین برد. این پیروزی داوود به شهرت او افزود.
14 O wuru ogige ndị agha nʼala Edọm niile, ndị Edọm niile ghọrọ ndị na-ejere Devid ozi. Onyenwe anyị nyere Devid mmeri ebe ọbụla ọ gara.
سپس داوود در سراسر ادوم، قرارگاهها مستقر کرد و ادومی‌ها تابع او شدند. داوود به هر طرف می‌رفت، خداوند به او پیروزی می‌بخشید.
15 Devid chịrị ndị Izrel niile, na-emere ndị ya ihe dị mma na ihe ziri ezi. O mesokwaghị onye ọbụla mmeso ọjọọ.
داوود با عدل و انصاف بر اسرائیل حکومت می‌کرد.
16 Onyeisi ndị agha ya bụ Joab nwa Zeruaya; ode akwụkwọ obodo bụ Jehoshafat, nwa Ahilud.
فرماندهٔ سپاه او، یوآب (پسر صرویه) و وقایع‌نگار او یهوشافاط (پسر اخیلود) بود.
17 Zadọk nwa Ahitub, na Ahimelek nwa Abịata, bụ ndị nchụaja; Seraya bụ ode akwụkwọ eze.
صادوق (پسر اخیطوب) و اخیملک (پسر اَبیّاتار) هر دو کاهن بودند و سرایا کاتب بود.
18 Benaya, nwa Jehoiada, bụ onyeisi ndị Keret na Pelet. Ụmụ ndị ikom Devid bụkwa ndị nchụaja.
بنایا (پسر یهویاداع) فرماندهٔ محافظین دربار داوود بود. پسران داوود نیز در امور دربار به او کمک می‌کردند.

< 2 Samuel 8 >