< 2 Samuel 6 >

1 Emesịa, Devid chịkọtara iri puku ndị agha Izrel atọ a zụziri azụzi,
ダビデ再びイスラエルの選抜の兵士三萬人を悉く集む
2 Ya na ndị ikom ya niile gara Baala nʼime Juda, isi nʼebe ahụ bugota igbe ọgbụgba ndụ Chineke, nke akpọkwasịrị Aha ya, bụ aha Onyenwe anyị. Onye pụrụ ime ihe niile, onye na-anọkwasị nʼetiti cherubim.
ダビデ起ておのれと共にをる民とともにバアレユダに往て神の櫃を其處より舁上らんとす其櫃はケルビムの上に坐したまふ萬軍のヱホバの名をもて呼る
3 Ha dọkwasịrị igbe Chineke ahụ nʼelu ụgbọala ọhụrụ ehi na-adọkpụ, buputa ya site nʼụlọ Abinadab nke dị nʼelu ugwu nta. Ọ bụ Ụza na Ahio, ụmụ Abinadab, na-edu ụgbọala ọhụrụ ahụ,
すなはち神の櫃を新しき車に載せて山にあるアビナダブの家より舁だせり
4 nke igbe ọgbụgba ndụ Chineke dị nʼelu ya, Ahio butere ụzọ na-aga nʼihu igbe ahụ.
アビナダブの子ウザとアヒオ神の櫃を載たる其新しき車を御しアヒオは櫃のまへにゆけり
5 Devid na ndị Izrel weere ike ha niile na-aṅụ ọṅụ nʼihu Onyenwe anyị. Ha ji abụ, ụbọ akwara, opi, une na ogene na ihe egwu dị iche iche, dịka ịgba na ekwe na-eti egwu.
ダビデおよびイスラエルの全家琴と瑟と鼗と鈴と鐃鈸をもちて力を極め謡を歌ひてヱホバのまへに躍踴れり
6 Mgbe ha rutere nʼebe ịzọcha ọka nke Nakọn, Ụza setịpụrụ aka ya, jide igbe ọgbụgba ndụ Chineke ahụ, nʼihi na ehi ahụ zọhiere ụkwụ.
彼等がナコンの禾場にいたれる時ウザ手を神の櫃に伸してこれを扶へたり其は牛振たればなり
7 Ma iwe Onyenwe anyị dị ọkụ megide Ụza, nʼihi omume enweghị nsọpụrụ o mere. Ya mere, Chineke tigburu ya. Ọ nwụọ nʼebe ahụ nʼakụkụ igbe Chineke.
ヱホバ、ウザにむかひて怒りを發し其誤謬のために彼を其處に撃ちたまひければ彼そこに神の櫃の傍に死ねり
8 Mgbe ahụ, iwe were Devid, nʼihi ọnụma Onyenwe anyị dakwasịrị Ụza. Ruo taa, a na-akpọ ebe ahụ Perez Ụza.
ヱホバ、ウザを撃ちたまひしによりてダビデ怒り其處をペレヅウザ(ウザ撃)と呼り其名今日にいたる
9 Devid tụrụ egwu Onyenwe anyị nʼụbọchị ahụ. O kwuru sị, “Igbe ọgbụgba ndụ Onyenwe anyị ọ ga-esi aṅaa bịakwute m?”
其日ダビデ、ヱホバを畏れていひけるはヱホバの櫃いかで我所にいたるべけんやと
10 O kweghị ebubata igbe ọgbụgba ndụ Onyenwe anyị ahụ nʼime obodo Devid, kama o bugara ya nʼụlọ Obed-Edọm, onye Git.
ダビデ、ヱホバの櫃を己に移してダビデの城邑にいらしむるを好まず之を轉してガテ人オベデエドムの家にいたらしむ
11 Igbe ọgbụgba ndụ Onyenwe anyị nọrọ nʼụlọ Obed-Edọm, onye Git ọnwa atọ. Onyenwe anyị gọzikwara ya na ezinaụlọ ya niile.
ヱホバの櫃ガテ人オベデエドムの家に在ること三月なりきヱホバ、オベデエドムと其全家を惠みたまふ
12 Mgbe a gwara eze bụ Devid si, “Onyenwe anyị agọziela ezinaụlọ Obed-Edọm na ihe niile o nwere, nʼihi igbe ọgbụgba ndụ Chineke.” Nʼihi nke a, Devid ji oke ọṅụ gaa nʼụlọ Obed-Edọm, nʼihi ibugote igbe ọgbụgba ndụ Chineke, buga nʼobodo Devid.
ヱホバ神の櫃のためにオベデエドムの家と其所有を皆惠みたまふといふ事ダビデ王に聞えけれぼダビデゆきて喜樂をもて神の櫃をオベデエドムの家よりダビデの城邑に舁上れり
13 Mgbe ndị bu igbe ọgbụgba ndụ Onyenwe anyị ahụ zọrọ nzọ ụkwụ isii; ọ na-eji oke ehi na nwa ehi gbara abụba chụọ aja.
ヱホバの櫃を舁者六歩行](ゆき)}たる時ダビデ牛と肥たる者を献げたり
14 Devid ji ike ya niile na-ete egwu nʼihu Onyenwe anyị. Ọ yi uwe efọọd e ji akwa ọcha dụọ nʼụbọchị ahụ,
ダビデ力を極めてヱホバの前に踊躍れり時にダビデ布のエポデを著け居たり
15 mgbe ya na ndị Izrel niile ji iti mkpu na ụda ịfụ opi ike na-ebubata igbe ọgbụgba ndụ Onyenwe anyị.
ダビデおよびイスラエルの全家歓呼と喇叭の聲をもてヱホバの櫃を舁のぼれり
16 Mgbe ha bu igbe ọgbụgba ndụ Onyenwe anyị na-abata nʼobodo Devid, Mikal, nwa Sọl lepụrụ anya site na oghereikuku ụlọ. Mgbe ọ hụrụ eze Devid ka ọ na-awụli elu na-etekwa egwu nʼihu Onyenwe anyị, o ledara ya anya nʼime obi ya.
神の櫃ダビデの城邑にいりし時サウルの女ミカル窻より窺ひてダビデ王のヱホバのまへに舞躍るを見其心にダビデを蔑視む
17 Ha bubatara igbe ọgbụgba ndụ Onyenwe anyị ahụ, guzobe ya nʼọnọdụ ya nʼime ụlọ ikwu nke Devid manyere maka ya. Devid chụrụ aja nsure ọkụ na aja udo nʼihu Onyenwe anyị.
人々ヱホバの櫃を舁入てこれをダビデが其爲に張たる天幕の中なる其所に置りしかしてダビデ燔祭と酬恩祭をヱホバのまへに献げたり
18 Mgbe ọ chụsịrị aja nsure ọkụ na aja udo ndị a, ọ gọziri ndị Izrel nʼaha Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile.
ダビデ燔祭と酬恩祭を献ぐることを終し時萬軍のヱホバの名を以て民を祝せり
19 O nyekwara onye ọbụla nʼetiti igwe ndị Izrel niile ahụ, ma nwoke ma nwanyị, otu ogbe achịcha, ọkpụrụkpụ anụ na achịcha mkpụrụ osisi a mịkpọrọ amịkpọ. Ndị a niile lara, onye ọbụla nʼụlọ nke ya.
また民の中即ちイスラエルの衆庶の中に男にも女にも倶にパン一箇 肉一斤 乾葡萄一塊を分ちあたへたり斯て民皆おのおの其家にかへりぬ
20 Mgbe Devid lọtara ka ọ gọzie ndị ụlọ ya, Mikal, ada Sọl pụtara izute ya, sị, “Lee ka eze Izrel si mee onwe ya onye dị ukwuu taa! Ọ gbara onwe ya ọtọ na mbara, nʼihu ndị ohu nwanyị nke ndị odibo ya dịka mmadụ efu.”
爰にダビデ其家族を祝せんとて歸りしかばサウルの女ミカル、ダビデをいでむかへていひけるはイスラエルの王今日如何に威光ありしや自ら遊蕩者の其身を露すがごとく今日其臣僕の婢女のまへに其身を露したまへりと
21 Ma Devid zara Mikal sị ya, “Ọ bụ nʼihu Onyenwe anyị onye họpụtara m karịa nna gị maọbụ onye ọbụla ọzọ sitere nʼụlọ ya ka m tere egwu. E, Onyenwe anyị ahụ họpụtara m ịbụ onyendu Izrel, ndị nke ya. Nʼezie, aga m aga nʼihu ịkpa agwa dịka onye nzuzu nʼihi ịsọpụrụ Onyenwe anyị.
ダビデ、ミカルにいふ我はヱホバのまへに即ち汝の父よりもまたその全家よりも我を選みて我をヱホバの民イスラエルの首長に命じたまへるヱホバのまへに躍れり
22 E, aga m aga nʼihu ịghọ onye na-enweghị uche, na onye e weturu ala nʼanya onwe m. Ma ụmụ agbọghọ ndị ahụ i kwuru okwu ha, ha ga-asọpụrụ m!”
我は此よりも尚鄙からんまたみづから賤しと思はん汝が語る婢女等とともにありて我は尊榮をえんと
23 Mikal, ada Sọl amụtaghị nwa ọbụla ruo nʼoge ọnwụ ya.
是故にサウルの女ミカルは死ぬる日まで子あらざりき

< 2 Samuel 6 >