< 2 Samuel 5 >
1 Mgbe ahụ, ndị ebo Izrel niile bịakwutere Devid na Hebrọn, sị ya, “Lee, ọkpụkpụ gị na anụ ahụ gị ka anyị bụ.
Kisha kabila zote za Israeli wakamwendea mfalme huko Hebroni nao wakasema, “Tazama, sisi ni nyama na mifupa yako.
2 Nʼoge gara aga, mgbe Sọl bụ eze na-achị anyị, ọ bụ gị duuru ndị agha Izrel nʼọgụ niile, ma ọpụpụ ma mbata. Onyenwe anyị sịrị gị, ‘Ị ga-azụ ndị m, bụ Izrel, ị ga-abụkwa onye ga-achị ha.’”
Kipindi kilichopita, Sauli alipokuwa mfalme juu yetu, ni wewe uliyeliongoza jeshi la Waisraeli. Yahwe akakwambia, 'Utawachunga watu wangu Israeli, na utakuwa mtawala juu ya Israeli.”
3 Mgbe ndị okenye Izrel niile bịakwutere Devid na Hebrọn, ha na eze Devid gbara ndụ nʼihu Onyenwe anyị na Hebrọn. Ha tere Devid mmanụ ịbụ eze Izrel.
Hivyo wazee wote wa Israeli wakaja kwa mfalme huko Hebron na mfalme Daudi akafanya nao agano mbele ya Yahweh. Wakamtawaza Daudi kuwa mfalme wa Israeli.
4 Devid gbara iri afọ atọ mgbe ọ malitere ịbụ eze. Ọ chịkwara iri afọ anọ.
Daudi alikuwa na umri wa miaka thelathini alipoanza kutawala, naye akatawala miaka arobaini.
5 Ọ chịrị ndị Juda niile na Hebrọn afọ asaa na ọnwa isii. Chịakwa ndị Izrel na Juda niile mgbe ọ nọ na Hebrọn na mgbe ọ nọ na Jerusalem iri afọ atọ na atọ,
Alitawala juu ya Yuda miaka saba na miezi sit a huko Hebroni, na huko Yerusalemu akatawala miaka thelathini na mitatu juu ya Israeli yote na Yuda.
6 Eze na ndị ikom ya zọọrọ ije garuo Jerusalem ibuso ndị Jebus bi nʼebe ahụ agha. Ndị Jebus gwara Devid sị, “Ị gaghị abata nʼebe a, ọ bụladị ndị ìsì na ndị ngwụrọ nwere ike ịchụghachi gị azụ.” Ha na-eche sị, “Devid agaghị abata nʼebe a,”
Mfalme na watu wake wakaenda Yerusalemu kupigana na wayebusi, waliokuwa wenyeji wa nchi. Wakamwambia Daudi, “Hautaweza kuja hapa kwani hata wipofu na vilema waweza kukudhuia kuingia. Daudi haweze kuja hapa.”
7 nʼagbanyeghị okwu ndị a, Devid dọtara ebe ahụ e wusiri ike nke Zayọn nʼagha, ya bụ obodo Devid.
Lakini, Daudi akaiteka ngome ya Sayuni, ambayo sasa ni mji wa Daudi.
8 Nʼụbọchị ahụ, Devid kwuru sị, “Onye ọbụla ga-emeri ndị Jebus ga-esite nʼọnụ warawara ebe mmiri si abanye nʼobodo a banyekwuru ndị ngwụrọ na ndị ìsì a bụ ndị iro Devid.” Ọ bụ nke a mere ha ji ekwu okwu sị, “Ndị ìsì na ndị ngwụrọ agaghị abata nʼụlọeze ahụ.”
Wakati huo Daudi akasema, “Waliowashambulia wayebusi watapaswa kupita katika mfereji wa maji ili wawafikie virema na vipofu ambao ni adui wa Daudi.” Hii ndiyo maana watu husema, “Vipofu na virema wasingie katika kasri.”
9 Devid biiri nʼebe ahụ e wusiri ike, kpọọ ya obodo Devid. O wuru akụkụ ebe dị gburugburu ya, site na Milo baa ruo nʼime ya.
Hivyo Daudi akaishi ngemeni naye akaiita mji wa Daudi. Akaizungushia ukuta, kuanzia barazani kuelekea ndani.
10 Ma ọ gara nʼihu na-adị ukwuu karịa, nʼihi na Onyenwe anyị, Chineke, Onye pụrụ ime ihe niile nọnyeere ya.
Daudi akawa na nguvu sana kwa maana Yahwe, Mungu wa utukufu, alikuwa pamoja naye.
11 Hiram bụ Eze Taịa, zitere Devid osisi sida e ji ewu ụlọ, na ndị ǹka osisi, ndị na-ewu ụlọ. Ha wuuru Devid ụlọeze.
Kisha Hiramu mfalme wa Tiro akatuma wajumbe kwa Daudi, na miti ya mierezi, mafundi seremala na wajenzi. Wakamjengea Daudi nyumba.
12 Mgbe ahụ, Devid ghọtara na Onyenwe anyị emeela ka o guzosie ike dịka eze ndị Izrel. Bulikwa alaeze ya elu nʼihi ndị ya Izrel.
Daudi akatambua kuwa Yahwe alikuwa amemweka ili awe mfalme juu ya Israeli, na kwamba alikuwa ameutukuza ufalme wake kwa ajili ya Israeli watu wake.
13 Mgbe Devid sitere na Hebrọn kwabata na Jerusalem; ọ lụrụ ndị inyom ọzọ, nwetakwara onwe ya ọtụtụ ndị iko nwanyị. Ọ mụtakwara ọtụtụ ụmụ nwoke na ụmụ nwanyị.
Baada ya Daudi kuondoka Hebroni na kwenda Yerusalemu, akajitwalia wake na masuria wengi huko Yerusalemu, na wana na binti wengi walizaliwa kwake.
14 Ndị a bụ aha ụmụ a mụụrụ ya na Jerusalem: Shamua, Shobab, Netan, Solomọn,
Haya ndiyo majina ya wanawe waliozaliwa kwake huko Yerusalemu: Shamua, Shobabu, Nathani, Selemani,
15 Ibha, Elishua, Nefeg, Jafia,
Ibhari, Elishua, Nefegi, Yafia,
16 Elishama, Eliada na Elifelet.
Elishama, Eliada na Elifeleti.
17 Mgbe ndị Filistia nụrụ na eteela Devid mmanụ ị bụ eze ndị Izrel, ha pụrụ ka igwe ha niile ha ịchọ ya. Ma Devid nụrụ maka ya, gbadaa nʼime ebe ahụ e wusiri ike.
Basi wafilisti waliposikia kwamba Daudi ametiwa mafuta kuwa mfalme juu ya Israeli, wakaenda wote kumtafuta. Daudi aliposikia hilo akashuka ngomeni.
18 Ma ndị Filistia bịara, gbasaa onwe ha na Ndagwurugwu Refaim niile.
Basi Wafilisiti walikuwa wamekuja na kuenea katika bonde la Mrefai.
19 Mgbe ahụ, Devid jụrụOnyenwe anyị ase sị, “Ọ bụ m gaa buso ndị Filistia agha? Ị ga-enyefe ha nʼaka m?” Onyenwe anyị zara sị ya, “Gaa, nʼihi na aghaghị m inyefe ndị Filistia nʼaka gị.”
Kisha Daudi akaomba msaada kutoka kwa Yahwe. Akasema, “Je niwashambulie wafilisti? Je utanipa ushindi juu yao?” Yahwe akamwambia Daudi, “Washambulia, kwa hakika nitakupa ushindi juu ya wafilisti.”
20 Ya mere, Devid gara Baal-Perazim, meriekwa ha nʼebe ahụ. O kwuru sị, “Onyenwe anyị enupula megide ndị iro m nʼihu m, dịka idee mmiri si enupu.” Nʼihi ya, a kpọrọ ebe ahụ Baal-Perazim.
Hivyo Daudi akawashambulia huko Baali Perasimu, naye akawashinda. Akasema, Yahwe amewafurikia adui zangu mbele yangu kama mafuriko ya maji. Kwa hiyo jina la mahali pale likawa Baali Perasimu.
21 Ndị Filistia hapụrụ arụsị niile ha nʼebe ahụ. Devid na ndị ikom ya chịkọtara ha chịpụ.
Wafilisiti wakaacha vinyago vyao pale, na Daudi na watu wake wakaviondoa.
22 Ma ndị Filistia lọghachiri ọzọ, gbasaa onwe ha na Ndagwurugwu Refaim.
Kisha wafilisiti wakaja kwa mara nyingine tena na kujieneza zaidi katika bonde la Mrefai.
23 Nʼihi nke a, Devid jụrụ Onyenwe anyị ase, ọ zara sị, “Esitekwala nʼihu ha gaa, kama gaa gburugburu ruo nʼazụ ha, buso ha agha na ncherita ihu osisi balsam ndị ahụ.
Hivyo Daudi akatafuta msaada tena kutoka kwa Yahweh, naye Yahweh akamwambia, “Usiwashambulie kwa mbele, lakini uwazunguke kwa nyuma na uwaendee kupitia miti ya miforosadi.
24 Ngwangwa ị nụrụ ụda ikiri ụkwụ nʼelu osisi balsam ndị ahụ, mee ngwa malite ọgụ, nʼihi na nke a pụtara na Onyenwe anyị eburula unu ụzọ pụọ, itigbu ndị agha Filistia.”
Wakati utakaposikia sauti za mwendo katika upepo uvumao juu ya miti ya miforosadi, hapo ushambulie kwa nguvu. Fanya hivi kwa kuwa Yahwe atatangulia mbele yako kulishambulia jeshi la Wafilisiti.”
25 Devid mere dịka Onyenwe anyị nyere ya nʼiwu. O tigburu ndị Filistia, site na Geba ruo Gaza.
Hivyo Daudi akafanya kama Yahwe alivyomwamuru. Akawaua wafilisti njiani mwote toka Geba hadi Gezeri.