< 2 Samuel 4 >
1 Mgbe Ishboshet nwa Sọl nụrụ na Abna anwụọla na Hebrọn. Ọ tụrụ egwu. Ndị Izrel tụkwara egwu hie nne.
И услышал Иевосфей, сын Саулов, что умер Авенир в Хевроне, и опустились руки его, и весь Израиль смутился.
2 Nʼoge a, nwa Sọl nwere mmadụ abụọ ndị bụ ndịisi ndị na-aga apụnara ndị mmadụ ihe. Aha otu onye bụ Baana, aha onye nke ọzọ bụ Rekab. Ha abụọ bụ ụmụ Rimọn onye Beerọt, nke dị nʼebo Benjamin. A na-agụ ndị Beerọt dịka ndị Benjamin,
У Иевосфея, сына Саулова, два было предводителя войска; имя одного - Баана и имя другого - Рихав, сыновья Реммона Беерофянина, из потомков Вениаминовых, ибо и Беероф причислялся к Вениамину.
3 nʼihi na ndị Beerọt gbara ọsọ agha gbalaa Gitaim, obodo ndị Benjamin. Ha bikwa nʼebe ahụ ruo taa dịka ndị ọbịa.
И убежали Беерофяне в Гиффаим и остались там пришельцами до сего дня.
4 (Jonatan nwa Sọl nwere otu nwa nwoke dara ngwụrọ nʼụkwụ ya abụọ. Ọ gbara afọ ise mgbe akụkọ banyere Sọl na Jonatan si Jezril bịarute ha. Nwanyị na-eku ya kuuru ya bido ịgbapụ ọsọ, ma dịka ọ na-agba ọsọ, nwantakịrị nwoke ahụ dara nʼala ghọọ onye ngwụrọ. Aha ya bụ Mefiboshet.)
У Ионафана, сына Саулова, был сын хромой. Пять лет было ему, когда пришло известие о Сауле и Ионафане из Изрееля, и нянька, взяв его, побежала. И когда она бежала поспешно, то он упал, и сделался хромым. Имя его Мемфивосфей.
5 Nʼoge a, Rekab na Baana ụmụ Rimọn, onye Beerọt bịaruru nʼụlọ Ishboshet nʼoge ehihie, mgbe ọ nọ na-ezu ike.
И пошли сыны Реммона Беерофянина, Рихав и Баана, и пришли в самый жар дня к дому Иевосфея; а он спал на постели в полдень.
6 Ha banyere nʼime ime ụlọ, dịka a ga-asị na ha na-aga iburu ọka wiiti. Mgbe ha banyere nʼebe ahụ, ha mara Ishboshet mma nʼafọ. Emesịa, Rekab na nwanne ya Baana si nʼụlọ ahụ zopu onwe ha.
А привратник дома, очищавший пшеницу, задремал и уснул и Рихав и Баана, брат его, вошли внутрь дома, как бы для того, чтобы взять пшеницы; и поразили его в живот и убежали.
7 Ha abatala nʼụlọ mgbe Ishboshet dinara nʼelu ihe ndina ya, nʼime ụlọ ndina ya. Mgbe ha machara ya mma, gbuo ya, ha bipụrụ ya isi. Buru isi ya gbalaga. Jee ije abalị ahụ niile gafee ọzara.
Когда они вошли в дом, Иевосфей лежал на постели своей, в спальной комнате своей; и они поразили его, и умертвили его, и отрубили голову его, и взяли голову его с собою, и шли пустынною дорогою всю ночь;
8 Ha buuru isi Ishboshet butere Devid na Hebrọn, sị eze, “Taa ka Onyenwe anyị bọọrọ onyenwe m eze ọbọ megide Sọl na mkpụrụ ya. Nke a bụ isi Ishboshet, nwa onye iro gị Sọl, onye chọsịrị ike iwepụ ndụ gị.”
и принесли голову Иевосфея к Давиду в Хеврон и сказали царю: вот голова Иевосфея, сына Саула, врага твоего, который искал души твоей; ныне Господь отмстил за господина моего царя Саулу врагу твоему и потомству его.
9 Ma Devid zara Rekab na Baana ụmụ Rimọn onye Beerọt okwu sị ha, “Dịka Onyenwe anyị si adị ndụ, onye napụtara m site na nsogbu m niile,
И отвечал Давид Рихаву и Баане, брату его, сыновьям Реммона Беерофянина, и сказал им: жив Господь, избавивший душу мою от всякой скорби!
10 mgbe otu onye bịakwutere m gwa m na Sọl anwụọla, na-eche nʼobi ya na o wetaara m oziọma. Egburu m ya na Ziklag, si otu ahụ kwụọ ya ụgwọ oziọma ahụ o chere na ọ wetaara m.
если того, кто принес мне известие, сказав: “вот, умер Саул, и Ионафан”, и кто считал себя радостным вестником, я схватил и убил его в Секелаге, вместо того, чтобы дать ему награду,
11 Ọ bụladị karịa nke a, mgbe ndị ikom ajọ omume gburu nwoke onye aka ya dị ọcha nʼụlọ ya, nʼelu ihe ndina ya? M ga-ahapụ ịbọtara onye e gburu egbu ọbọ, si otu a kpochapụ unu nʼụwa!”
то теперь, когда негодные люди убили человека невинного в его доме на постели его, неужели я не взыщу крови его от руки вашей и не истреблю вас с земли?
12 Devid nyere ụmụ okorobịa ya iwu ka ha gbuo mmadụ abụọ ahụ. Ha gbukwara ha. Emesịa, ha bipụrụ aka ha na ụkwụ ha. Were ozu ha kwụba ya nʼakụkụ ọdọ mmiri Hebrọn. Ha wekwaara isi Ishboshet, lie ya nʼili Abna na Hebrọn.
И приказал Давид слугам, и убили их, и отрубили им руки и ноги, и повесили их над прудом в Хевроне. А голову Иевосфея взяли и погребли во гробе Авенира, в Хевроне.