< 2 Samuel 24 >

1 Ọzọkwa, Onyenwe anyị were iwe dị ọkụ megide Izrel. Ọ kpaliri Devid imegide ha, sị, “Gaa gụọ Izrel na Juda ọnụ.”
And again the anger of Jehovah was kindled against Israel, and he moved David against them saying, Go, number Israel and Judah.
2 Ya mere, eze gwara Joab na ndịisi ọchịagha ya ha so, “Jegharịa nʼebo niile nke Izrel, site na Dan ruo Bịasheba, gụkọtaa ndị tozuru ije agha nʼIzrel niile ka m nwee ike mata ole ọnụọgụgụ ha dị.”
And the king said to Joab the captain of the host, who was with him, Go, I pray thee, through all the tribes of Israel, from Dan even to Beer-sheba, and count the people, that I may know the number of the people.
3 Joab zaghachiri eze, “Ka Onyenwe anyị bụ Chineke gị, mee ka ndị agha mụbaa, otu onye narị ụzọ, otu onye narị ụzọ karịa. Ka anya onyenwe m, bụ eze, hụkwa ya. Ma nʼihi gịnị ka onyenwe m bụ eze ji chọọ ime ihe dị otu a?”
And Joab said to the king, May Jehovah thy God even add to the people, how many soever they be, a hundredfold, and that the eyes of my lord the king may see [it]; but why does my lord the king delight in this thing?
4 Ma okwu eze dị ike karịa nke Joab na nke ndị ọchịagha ahụ. Ya mere, ha hapụrụ ihu eze pụọ ịgụ ndị agha Izrel ọnụ.
But the king's word prevailed against Joab, and against the captains of the army. And Joab and the captains of the army went out from the presence of the king to count the people of Israel.
5 Mgbe ha gabigachara Jọdan, ha manyere ụlọ ikwu ha na nso Aroea, nʼaka nri obodo ahụ dị nʼetiti ndagwurugwu Gad na-eru Jeza,
And they passed over the Jordan, and encamped in Aroer, on the right side of the city that is in the midst of the ravine of Gad, and toward Jaazer.
6 ha gara Gilead ruokwa nʼala Taatim Hodshi, bịarukwaa Dan Jaan, jee gburugburu jeruo Saịdọn.
And they came to Gilead, and to the land of Tahtim-hodshi; and came to Dan-jaan, and to the environs of Sidon;
7 Ha jere ruokwa nʼebe e wusiri ike nke Taịa, na obodo niile nke ndị Hiv, na nke ndị Kenan. Nʼikpeazụ, ha gaara ruo Bịasheba nʼime ndịda Juda.
and they came to the fortified city of Tyre, and to all the cities of the Hivites and of the Canaanites; and went out to the south of Judah, to Beer-sheba.
8 Mgbe ha jegharịchara nʼala ahụ niile; ha lọghachitere na Jerusalem na ngwụcha ọnwa nke itoolu na iri abalị abụọ ya.
And they went through all the land, and came to Jerusalem at the end of nine months and twenty days.
9 Joab nyere eze ngụkọta ọnụọgụgụ nke ndị agha Izrel. NʼIzrel, ha dị narị puku asatọ, bụ ndị ikom ndị tozuru iji mma agha buo agha, na Juda ha dị narị puku ise.
And Joab gave the sum of the number of the people to the king; and there were of Israel eight hundred thousand valiant men that drew sword; and the men of Judah were five hundred thousand men.
10 Ma obi Devid bidoro ịta ya ụta mgbe ọ gụchara ndị ikom na-alụ agha ọnụ. Ọ sịrị Onyenwe anyị, “Emehiela m nke ukwuu nʼihi ihe m mere. Ma ugbu a, Onyenwe anyị biko, arịọ m gị, wezuga ikpe ọmụma nke dịịrị ohu gị; nʼihi na emeela m ihe nzuzu dị ukwuu.”
And David's heart smote him after he had numbered the people. And David said to Jehovah, I have sinned greatly in what I have done; and now, I beseech thee, Jehovah, put away the iniquity of thy servant; for I have done very foolishly.
11 Nʼụtụtụ echi ya, tupu Devid na-eteta nʼụra, okwu Onyenwe anyị eruola Gad onye amụma, bụ onye ọhụ ụzọ Devid, sị,
And when David arose in the morning, the word of Jehovah came to the prophet Gad, David's seer, saying,
12 “Gaa gwa Devid, ‘Otu a ka Onyenwe anyị na-ekwu: Ụzọ ihe atọ ka m na-eche gị nʼihu. Họrọ otu nʼime ha nke m ga-eme ka ọ bịakwasị gị.’”
Go and say to David, Thus saith Jehovah: I impose on thee three [things]; choose one of them that I may do it unto thee.
13 Ya mere, Gad jekwuuru Devid sị ya, “Ọ bụ ka oke ụnwụ ịda nʼala gị afọ atọ? Ka ọ bụ na ị ga-agbalaga site nʼihu ndị iro gị ọnwa atọ, ka ha na-achụ gị ọsọ? Ka ọ bụ ka ajọ ọrịa na-efe efe daa nʼala gị mkpụrụ ụbọchị atọ? Ugbu a, chee echiche, kpebie ọsịsa ị chọrọ ka m weghachiri onye ahụ zitere m.”
And Gad came to David, and told him, and said to him, Shall seven years of famine come to thee in thy land? or wilt thou flee three months before thine adversaries while they pursue thee? or shall there be three days' pestilence in thy land? Now be aware and consider what word I shall bring again to him that sent me.
14 Devid sịrị Gad, “Anọ m nʼoke nsogbu, ọ ka mma ka anyị daba nʼaka Onyenwe anyị karịa ịdaba nʼaka mmadụ, nʼihi na obi ebere ya bara ụba.”
And David said to Gad, I am in a great strait: let us fall, I pray thee, into the hand of Jehovah; for his mercies are great; but let me not fall into the hand of man.
15 Nʼihi ya, Onyenwe anyị zitere ajọ ọrịa na-efe efe nʼala Izrel, site nʼụtụtụ ahụ ruo oge akara aka. Ọ bụ iri puku mmadụ asaa nwụrụ site na Dan ruo Bịasheba.
And Jehovah sent a pestilence upon Israel from the morning even to the set time; and there died of the people from Dan even to Beer-sheba seventy thousand men.
16 Mgbe mmụọ ozi ahụ setịpụrụ aka ya ibibi Jerusalem, o wutere Onyenwe anyị nʼihi oke mbibi ahụ. Ọ sịrị mmụọ ozi ahụ nke na-eweta nhụju anya nye ndị mmadụ, “O zuola. Seghachi aka gị.” Mgbe ahụ, mmụọ ozi Onyenwe anyị nọ nʼebe ịzọcha ọka Arauna onye Jebus.
And the angel stretched out his hand upon Jerusalem to destroy it; but Jehovah repented him of the evil, and said to the angel that destroyed among the people, It is enough: withdraw now thine hand. And the angel of Jehovah was by the threshing-floor of Araunah the Jebusite.
17 Mgbe Devid hụrụ mmụọ ozi ahụ na-etida ndị mmadụ, ọ sịrị Onyenwe anyị, “Ọ bụ mụ onwe m mehiere; mụ bụ onye ọzụzụ atụrụ, mere ajọ omume. Ma ndị a bụ naanị ụmụ atụrụ, gịnị kwanụ ka ha mere? Ka aka gị dịgide naanị nʼahụ m, dịgidekwa nʼahụ ndị ụlọ m.”
And David spoke to Jehovah when he saw the angel that smote among the people, and said, Behold, it is I that have sinned, and it is I that have committed iniquity; but these sheep, what have they done? let thy hand, I pray thee, be on me, and on my father's house!
18 Nʼụbọchị ahụ, Gad bịara nʼụlọ Devid gwa ya sị, “Gaa, wuore Onyenwe anyị ebe ịchụ aja nʼebe ịzọcha ọka Arauna, onye Jebus.”
And Gad came that day to David, and said to him, Go up, rear an altar to Jehovah in the threshing-floor of Araunah the Jebusite.
19 Ya mere, Devid rubere isi gaa mee dịka iwu Onyenwe anyị nyere site nʼọnụ Gad.
And David, according to the saying of Gad, went up as Jehovah had commanded.
20 Mgbe Arauna weliri anya hụ eze na ndị ọrụ ya ka ha na-abịa nʼebe ọ nọ, ọ pụtara kpọọ isiala nye eze. Kpudokwa ihu ya nʼala.
And Araunah looked, and saw the king and his servants coming on towards him; and Araunah went out, and bowed himself before the king with his face to the ground.
21 Arauna sịrị, “Gịnị mere onyenwe m, bụ eze ji bịakwute ohu ya?” Devid zaghachiri, “Abịara m ịzụrụ ebe ịzọcha ọka gị, ka m nwee ike wuore Onyenwe anyị ebe ịchụ aja; ka akwụsị ọrịa a na-efe efe dakwasịrị ndị mmadụ.”
And Araunah said, Why is my lord the king come to his servant? And David said, To buy the threshing-floor of thee, to build an altar to Jehovah, that the plague may be stayed from the people.
22 Arauna sịrị Devid, “Ka onyenwe m, bụ eze were ihe ọbụla ọ chọrọ, werekwa chụọ aja. Lee ehi maka iji chụọ aja nsure ọkụ, leekwa ihe igwe ịzọcha ọka niile, na osisi ndị ahụ niile a na-anyanye ehi nʼolu, ka ha bụrụ nkụ.
And Araunah said to David, Let my lord the king take and offer up that which is good in his sight: see, [here are] oxen for the burnt-offering, and the threshing-sledges and implements of the oxen for wood.
23 Eze, ihe ndị a niile ka mụ bụ Arauna na-enye eze, ka Onyenwe anyị Chineke gị nabatakwa gị.”
All these things, O king, doth Araunah give to the king. And Araunah said to the king, Jehovah thy God accept thee.
24 Ma eze zaghachiri Arauna, “Ee, aghaghị m ịkwụzu gị ụgwụ ya, nʼihi na agaghị m achụrụ Onyenwe anyị, bụ Chineke m aja nsure ọkụ nke na-agaghị efu m ihe ọbụla.” Ya mere, Devid zụrụ ebe ịzọcha ọka ahụ na ehi ahụ niile, kwụọ Arauna iri shekel ọlaọcha ise, nʼihi ha.
And the king said to Araunah, No; but I will in any case buy [them] of thee at a price: neither will I offer up to Jehovah my God burnt-offerings without cost. And David bought the threshing-floor and the oxen for fifty shekels of silver.
25 Devid wuru ebe ịchụrụ Onyenwe anyị aja nʼebe ahụ. Chụọkwa aja nsure ọkụ na aja udo. Mgbe ahụ, Onyenwe anyị zara ekpere o kpere nʼihi ala ahụ. Nrịa nrịa ahụ na-efe efe nke dakwasịrị Izrel kwụsịkwara.
And David built there an altar to Jehovah, and offered up burnt-offerings and peace-offerings. And Jehovah was propitious to the land, and the plague was stayed from Israel.

< 2 Samuel 24 >