< 2 Samuel 23 >

1 Ndị a bụ okwu ikpeazụ Devid kwuru: “Okwu pụrụ iche si nʼọnụ Devid, nwa Jesi, ihe si nʼọnụ nwoke ahụ Chineke Onye kachasị ihe niile elu buliri elu. Nwoke ahụ onye Chineke nke Jekọb tere mmanụ, onye bụ ọka nʼịbụ abụ nʼala Izrel.
Now these are the last words of David. David the son of Jesse says, the man whom God raised up, the anointed of the God of Jacob, the sweet psalmist of Israel:
2 “Mmụọ Onyenwe anyị kwuru okwu site nʼọnụ m, okwu ya dịkwa m nʼire.
"The Ruach of the LORD spoke by me. His word was on my tongue.
3 Chineke Izrel kwuru okwu, Oke nkume Izrel sịrị m, ‘Mgbe mmadụ na-achị ndị ọzọ site nʼezi omume, mgbe ọ na-achị site nʼegwu Chineke.
The God of Jacob said, the Rock of Israel spoke to me, 'One who rules over men righteously, who rules in the fear of God,
4 Ọ dị ka ìhè nke ụtụtụ, mgbe anyanwụ na-achawapụta nʼụtụtụ nke igwe ojii na-adịghị. Dịka ìhè na-acha mgbe mmiri zochara nke na-eme ka ahịhịa ndụ na-epupụta nʼala.’
shall be as the light of the morning, when the sun rises, a morning without clouds, when the tender grass springs out of the earth, through clear shining after rain.'
5 “Ọ bụrụ na ihe banyere ụlọ m ezighị ezi nʼebe Chineke nọ. Nʼezie, ọ garaghị ekwe ka ọgbụgba ndụ ebighị ebi dịrị nʼetiti mụ na ya, Ọgbụgba ndụ e doro nʼusoro nke e mere ka o guzosie ike nʼụzọ niile. Nʼezie, ọ garaghị eme ka nzọpụta m zuo oke. Ma mezukwaara m ọchịchọ obi m niile.
Most certainly my house is not so with God, yet he has made with me an everlasting covenant, ordered in all things, and sure, for it is all my salvation, and all my desire, although he doesn't make it grow.
6 Ma ndị ajọ mmadụ ka a ga-atụfu nʼakụkụ dịka ogwu, nke mmadụ anaghị eji aka ekpokọta.
But all of the ungodly shall be as thorns to be thrust away, because they can't be taken with the hand,
7 Onye ọbụla metụrụ ogwu aka, bụ onye nwere ngwa ọrụ igwe maọbụ osisi ùbe. A na-esure ha ọkụ nʼebe ha tọgbọrọ.”
But the man who touches them must be armed with iron and the staff of a spear. They shall be utterly burned with fire in their place."
8 Ndị a bụ aha ndị dike nʼagha Devid nwere: Josheb-Bashebet, onye Takemon, bụ onyeisi nke mmadụ atọ. O weliri ùbe ya megide narị ndị ikom asatọ, bụ ndị o gburu nʼotu mgbe ibu agha.
These are the names of the warriors whom David had: Jeshbaal the son of Hachmoni, leader of the Three. He wielded his spear against eight hundred whom he killed at one time.
9 Onye nke na-eso ya bụ Elieza, nwa Dodayi, onye Ahohi. Dịka otu nʼime ndị dike atọ ahụ, ya na Devid nọ mgbe ha na-akwa ndị Filistia emo, bụ ndị zukọrọ na Pas Damim ibu agha. Mgbe ahụ, ndị Izrel lara azụ,
After him was Eleazar the son of Dodo, the Ahohite, one of the Three warriors. He was with David in Pas Dammim when they defied the Philistines who were gathered there for battle, and the men of Israel had retreated.
10 ma Elieza guzoro na-alaghị azụ. O gbugidere ndị Filistia ruo mgbe ike gwuru aka ya. Aka ya rapakwaara na mma agha. Onyenwe anyị nyekwara ha mmeri dị ukwuu nʼụbọchị ahụ. Ndị agha ahụ laghachikwutere Elieza, maọbụ naanị ka ha yipụsịa ndị ahụ e gburu egbu ihe ha yi nʼahụ.
He arose, and struck the Philistines until his hand was weary, and his hand froze to the sword; and the LORD worked a great victory that day; and the people returned after him only to take spoil.
11 Onye nke atọ bụ Shama, nwa Agee, onye Hara. Mgbe ndị Filistia chịkọtara onwe ha nʼotu ebe, nke e nwere otu ubi jupụtara na lentil, ma ndị agha Izrel niile sitere nʼebe ha nọ gbapụ.
After him was Shamma the son of Agee the Hararite. The Philistines were gathered together at Lehi, where there was a plot of ground full of lentils; and the people fled from the Philistines.
12 Ma naanị Shama guzoro nʼetiti ubi lentil ahụ. Ọ napụtara ya, tigbuo ndị Filistia niile ahụ. Onyenwe anyị nyere mmeri dị ukwuu.
But he stood in the midst of the plot, and defended it, and killed the Philistines; and the LORD worked a great victory.
13 Nʼoge owuwe ihe ubi, mmadụ atọ nʼime iri ndị dike atọ ahụ, jekwuru Devid nʼọgba nkume Adulam, mgbe otù ndị Filistia mara ụlọ ikwu ha na Ndagwurugwu Refaim.
And three of the Thirty chief men went down, and came to David in the harvest time to the cave of Adullam; and the troop of the Philistines was camped in the Valley of Rephaim.
14 Ma Devid nọ nʼebe ahụ ewusiri ike nʼoge ahụ, ma ọnọdụ ndị agha Filistia dị na Betlehem.
David was then in the stronghold; and the garrison of the Philistines was then in Bethlehem.
15 Agụụ mmiri gụrụ Devid nke ukwuu. Ọ sị, “Ọ ga-amasị m ma ọ bụrụ na o nwere onye ga-ekunye m mmiri ọṅụṅụ, site nʼolulu mmiri dị nso nʼọnụ ụzọ ama Betlehem!”
And David had a craving and said, "Oh that one would give me water to drink of the well of Bethlehem, which is by the gate."
16 Ya mere, ndị dike nʼagha atọ ahụ wakpuru ọmụma ụlọ ikwu ndị Filistia, seta mmiri site nʼolulu mmiri ahụ dị nʼakụkụ ọnụ ụzọ ama Betlehem, bulatara ya Devid. Ma Devid jụrụ ịṅụ ya, kama ọ wufuru ya nʼala nʼihu Onyenwe anyị.
The Three warriors broke through the army of the Philistines, and drew water out of the well of Bethlehem, that was by the gate, and took it, and brought it to David: but he would not drink of it, but poured it out to the LORD.
17 Ọ sịrị, “Ya bụrụ m ihe arụ, Onyenwe anyị, na m ga-eme nke a. Nke a ọ bụghị ọbara ndị ikom a, ndị ji ndụ ha chụọ aja nʼihi ikute mmiri a?” Devid ekweghị aṅụ ya. Nke a bụ ụdị ike dike atọ ahụ kpara.
He said, "Far be it from me, LORD, that I should do this. Shall I drink the blood of the men who went in jeopardy of their lives?" Therefore he would not drink it. The Three warriors did these things.
18 Abishai, nwanne Joab, nwa Zeruaya, bụ onyeisi ndị ikom atọ ahụ. O weliri ùbe ya megide narị ndị ikom atọ, tigbukwaa ha niile. Nʼihi nke a ọ ghọrọ onye a ma ama dịka mmadụ atọ ndị a.
And Abishai, the brother of Joab, the son of Zeruiah, was leader of the Thirty. And he wielded his spear against three hundred and killed them, and had a name beside the Three.
19 Ma anaghị asọpụrụ ya nʼebe ọ dị ukwuu karịa iri ndị ikom atọ ahụ? Ọ ghọrọ onyeisi ha. Ọ bụ ezie a na-agụnyeghị ya dịka otu onye nʼime ha.
He was the most illustrious of the Thirty, and he became their leader. However he did not attain to the Three.
20 Benaya, nwa Jehoiada, onye si Kabzeel, bụ dike nʼagha nke kpara ike dị ukwuu. O tigburu dimkpa abụọ ndị Moab, ndị bụ ọkaka nʼagha. O rịdakwukwara ọdụm nʼime olulu na-amị amị nʼụbọchị mkpụrụ mmiri na-ezo, gbuo ya.
Benaiah the son of Jehoiada was a valiant man of Kabzeel, who performed great deeds. He killed the two sons of Ariel of Moab. He also went down and killed a lion in the midst of a pit in time of snow.
21 O tigburu otu nwoke onye Ijipt, gbara dimkpa. Ọ bụ ezie na onye Ijipt ahụ ji ùbe nʼaka ya, ma Benaya ji naanị mkpọ jekwuru ya. Pụnara onye Ijipt ahụ ùbe dị nʼaka ya. Jiri ya magbuo ya
He killed an Egyptian, a man of great stature. And the Egyptian had a spear in his hand; but he went down to him with a staff, and grabbed the spear out of the Egyptian's hand, and killed him with his own spear.
22 Nke a bụ ụdị ike Benaya nwa Jehoiada kpara. Ya onwe ya nwekwara aha dịka ndị dike atọ mbụ.
Benaiah the son of Jehoiada did these things, and had a name among the Three warriors.
23 A na-asọpụrụ ya nʼebe ọ dị ukwuu karịa onye ọbụla nʼetiti iri dike atọ ndị ahụ, ma o rughị ogugo ndị dike atọ mbụ ahụ. Devid mere ya onyeisi ndị na-eche ya nche.
He was more honored than the Thirty, but he did not attain to the Three. David set him over his guard.
24 Nʼetiti iri ndị ikom atọ ahụ bụ: Asahel, nwanne Joab, Elhanan nwa Dodo, onye Betlehem
Asahel the brother of Joab was one of the Thirty; Elhanan the son of Dodo from Bethlehem,
25 Shama, onye Harod, Elika, onye Harod,
Shammah the Harodite, Elika the Harodite,
26 Helez onye Palti, Ira, nwa Ikesh, onye Tekoa,
Helez the Paltite, Ira the son of Ikkesh the Tekoite,
27 Abieza, onye Anatot, Mebunai, onye Husha,
Abiezer the Anathothite, Sibbekai the Hushathite,
28 Zalmon, onye Ahohi, Maharai, onye Netofa,
Zalmon the Ahohite, Maharai the Netophathite,
29 Heled, nwa Baana, onye Netofa, Itai, nwa Ribai, nke Gibea ụmụ Benjamin,
Heled the son of Baanah the Netophathite, Ittai the son of Ribai of Gibeah of the people of Benjamin,
30 Benaya, onye Piraton, Hidaị, nke si nʼakụkụ iyi dị na Gaash,
Benaiah a Pirathonite, Hiddai of Nahale Gaash.
31 Abi-Albon, onye Arba, Azmavet, onye Bahurim
Abiel son of the Arbathite, Azmaveth the Bahurimite,
32 Eliaba, onye Shaalbon, Ụmụ Jashen, Jonatan
Eliahba the Shaalbinite, Jashen the Gizonite,
33 nwa Shama, onye Hara Ahiam, nwa Shara nke Hara,
Jonathan son of Shamma the Hararite, Ahiam the son of Sakar the Hararite,
34 Elifelet, nwa Ahasbaị, onye Maaka, Eliam, nwa Ahitofel, onye Gailo,
Eliphelet the son of Ahasbai the Maacathite, Eliam the son of Ahithophel the Gilonite,
35 Hezro, onye Kamel, Paraị, onye Aaba,
Hezrai the Carmelite, Paarai the Archite,
36 Igal nwa Netan, onye Zoba, nwa Hagri,
Igal the son of Nathan, from the army of the Hagrites,
37 Zelek, onye Amọn, Naharai, onye Beerọt, onye na-ebu ihe agha Joab nwa Zeruaya,
Zelek the Ammonite, Naharai the Beerothite, armor bearer to Joab the son of Zeruiah,
38 Ira, onye Itra, Gareb, onye Itra
Ira the Jattirite, Gareb the Jattirite,
39 na Ụraya, onye Het. Ha niile dị iri ndị ikom atọ na asaa.
Uriah the Hethite: thirty-seven in all.

< 2 Samuel 23 >