< 2 Samuel 22 >
1 Devid buuru Onyenwe anyị okwu niile nke abụ a mgbe Onyenwe anyị napụtara ya site nʼaka ndị iro ya niile, nakwa nʼaka Sọl.
And David spoke unto the LORD the words of this song in the day that the LORD delivered him out of the hand of all his enemies, and out of the hand of Saul;
2 Ọ sịrị: “Onyenwe anyị bụ oke nkume m. Ọ bụ ebe mgbaba m e wusiri ike, na onye nnapụta m.
and he said: The LORD is my rock, and my fortress, and my deliverer;
3 Chineke m bụ oke nkume m, onye m gbabara nʼime ya. Ọ bụ ọta m, na mpi nzọpụta m. Ya bụ oke nkume m nke onye ọbụla na-apụghị ịba nʼime ya, ebe mgbaba m, na onye nzọpụta m, site nʼaka ndị na-eme ihe ike.
The God who is my rock, in Him I take refuge; my shield, and my horn of salvation, my high tower, and my refuge; my saviour, Thou savest me from violence.
4 “Akpọkuru m Onyenwe anyị; onye e kwesiri inye otuto. Azọpụtara m site nʼaka ndị iro m.
Praised, I cry, is the LORD, and I am saved from mine enemies.
5 Ebili mmiri nke ọnwụ gbara m gburugburu; Ịchị ọkụ nke mbibi ọjọọ kpuchiri m.
For the waves of Death compassed me. The floods of Belial assailed me.
6 Ụdọ niile nke ili kere m agbụ, Ọnya nke ọnwụ guzogidere m. (Sheol )
The cords of Sheol surrounded me; the snares of Death confronted me. (Sheol )
7 “Nʼọnọdụ oke mkpagbu m, akpọkuru m Onyenwe anyị, akpọkuru m Chineke m. Akwa m ruru ya ntị. O sitekwara nʼụlọnsọ ukwu ya nụ olu m.
In my distress I called upon the LORD, yea, I called unto my God; and out of His temple He heard my voice, and my cry did enter into His ears.
8 Ụwa mere mkpọtụ maa jijiji, ntọala eluigwe makwara jijiji, ha mara jijiji nʼihi iwe nke na-ewe ya.
Then the earth did shake and quake, the foundations of heaven did tremble; they were shaken, because He was wroth.
9 Anwụrụ ọkụ sitere ya nʼimi pụta; Ọkụ na-erepịa erepịa sikwa nʼọnụ ya pụta. Icheku ọkụ na-ere ọkụ sitekwara nʼebe ahụ nwupụta.
Smoke arose up in His nostrils, and fire out of His mouth did devour; coals flamed forth from Him.
10 O kewara mbara eluigwe, rịdata; oke igwe ojii dịkwa nʼokpuru ụkwụ ya.
He bowed the heavens also, and came down; and thick darkness was under His feet.
11 Ọ nọkwasịrị nʼelu cherubim felie elu, O feliri elu nʼelu nku nke ifufe.
And He rode upon a cherub, and did fly; yea, He was seen upon the wings of the wind.
12 O mere ọchịchịrị ihe mkpuchi nke gbara ya gburugburu, bụ ọchịchịrị mmiri igwe ojii nke mbara eluigwe.
And He made darkness pavilions round about Him, gathering of waters, thick clouds of the skies.
13 Site nʼìhè nke na-enwupụta nʼahụ ya, amụma egbe eluigwe nwupụtara ire ọkụ.
At the brightness before Him coals of fire flamed forth.
14 Onyenwe anyị sitere nʼeluigwe bigbọọ. Olu Onye kachasị ihe niile elu dara ụda.
The LORD thundered from heaven, and the Most High gave forth His voice.
15 Ọ gbara àkụ ya, mee ka ndị iro gbasasịa. O jikwa oke amụma nke egbe eluigwe chụsaa ha.
And He sent out arrows, and scattered them; lightning, and discomfited them.
16 E kpughere ala ala nke oke osimiri. Gbakwa ntọala niile nke ụwa ọtọ, site nʼịba mba nke Onyenwe anyị, na nkuume si nʼimi ya pụta.
And the channels of the sea appeared, the foundations of the world were laid bare by the rebuke of the LORD, at the blast of the breath of His nostrils.
17 “O sitere nʼelu setịpụ aka ya, jidesie m aka ike, ọ dọpụtara m site nʼogbu mmiri niile.
He sent from on high, He took me; He drew me out of many waters;
18 Ọ napụtara m site nʼaka ndị iro m dị ike, bụ ndị kpọrọ m asị, ndị dịkwa ike karịa m.
He delivered me from mine enemy most strong, from them that hated me, for they were too mighty for me.
19 Ha guzogidere m nʼụbọchị ihe ndakwasị m. Ma Onyenwe anyị bụrụ m ihe ndabere.
They confronted me in the day of my calamity; but the LORD was a stay unto me.
20 Ọ kpọpụtara m gaa nʼebe sara mbara, Ọ napụtara m nʼihi na ihe m na-atọ ya ụtọ.
He brought me forth also into a large place; He delivered me, because He delighted in me.
21 “Onyenwe anyị mesoro m dịka ezi omume m si dị, Ọ kwụghachiri m dịka ịdị ọcha nke aka m si dị.
The LORD rewarded me according to my righteousness; according to the cleanness of my hands hath He recompensed me.
22 Nʼihi na edebezuola m ụzọ niile nke Onyenwe anyị; ikpe amaghị m nʼihi ịgbakụta Chineke azụ.
For I have kept the ways of the LORD, and have not wickedly departed from my God.
23 Iwu ya niile dị nʼihu m, esibekwaghị m nʼụkpụrụ ya wezuga onwe m.
For all His ordinances were before me; and as for His statutes, I did not depart from them.
24 Abụ m onye na-enweghị ịta ụta nʼihu ya, edebekwara m onwe m pụọ na mmehie.
And I was single-hearted toward Him, and I kept myself from mine iniquity.
25 Onyenwe anyị kwụghachiri m dịka ezi omume m si dị, dịka ịdị ọcha m si dị nʼanya ya.
Therefore hath the LORD recompensed me according to my righteousness, according to my cleanness in His eyes.
26 “Nʼebe onye kwesiri ntụkwasị obi nọ, i na-egosi onwe gị onye kwesiri ntụkwasị obi, nʼebe onye zuruoke nọ, ị na-egosi onwe gị onye zuruoke.
With the merciful Thou dost show Thyself merciful, with the upright man Thou dost show Thyself upright,
27 Nʼebe onye dị ọcha nọ, ị na-egosi onwe gị onye dị ọcha, ma nye ndị ụzọ ha na-ezighị ezi, Ị na-egosi onwe gị dịka onye dị aghụghọ.
With the pure Thou dost show myself pure; and with the crooked Thou dost show Thyself subtle.
28 Ị na-azọpụta ndị dị umeala nʼobi, ma anya gị dị nʼahụ ndị mpako, I mee ka ha dị ala.
And the afflicted people Thou dost save; but Thine eyes are upon the haughty, that Thou mayest humble them.
29 Ọ bụ gị, Onyenwe anyị, bụ oriọna m, Onyenwe anyị na-eme ka ọchịchịrị m ghọọ ìhè.
For Thou art my lamp, O LORD; and the LORD doth lighten my darkness.
30 Site nʼinyeaka gị, apụrụ m ịlụso igwe ndị agha ọgụ; sitekwa na Chineke m apụkwara m ịwụfe mgbidi ọbụla.
For by Thee I run upon a troop; by my God do I scale a wall.
31 “Ma banyere Chineke, ụzọ ya zuruoke; okwu ọnụ Onyenwe anyị bụ ihe a nụchara anụcha. Ọ bụ ọta nke onye ọbụla na-ezo onwe ya nʼokpuru ya.
As for God, His way is perfect; the word of the LORD is tried; He is a shield unto all them that take refuge in Him.
32 Nʼihi na onye bụ Chineke, ma ọ bụghị naanị Onyenwe anyị? Onye bụkwa Oke Nkume ahụ, ma ọ bụghị naanị Chineke?
For who is God, save the LORD? and who is a Rock, save our God?
33 Ọ bụ Chineke na-enye m ike, na-echebekwa ụzọ m nʼizuoke.
The God who is my strong fortress, and who letteth my way go forth straight;
34 Ọ na-eme ka ụkwụ m dị gara gara, dịka nke nne ele Ọ na-emekwa ka m kwụrụ chịm nʼebe niile dị elu.
Who maketh my feet like hinds', and setteth me upon my high places;
35 Ọ na-azụ aka m abụọ ibu agha, ogwe aka m abụọ pụrụ ịrọji ụta bronz.
Who traineth my hands for war, so that mine arms do bend a bow of brass.
36 Ị na-eme ka inyeaka nke nzọpụta gị bụrụ ọta m, inyeaka gị emeela m ka m dị ukwuu.
Thou hast also given me Thy shield of salvation; and Thy condescension hath made me great.
37 Ị na-edozi ụzọ sara mbara nye ụkwụ. Ka nkwonkwo ụkwụ m ghara ịgbụchapụ.
Thou hast enlarged my steps under me, and my feet have not slipped.
38 “Achụrụ m ndị iro m ọsọ, kpochapụ ha. Alaghachighị m azụ tutu ruo mgbe ha niile lara nʼiyi.
I have pursued mine enemies, and destroyed them; neither did I turn back till they were consumed.
39 Etidara m ha nʼala kpamkpam. Ha enwekwaghị ike ibilite. Ha dara nʼokpuru ụkwụ m abụọ.
And I have consumed them, and smitten them through, that they cannot arise; yea, they are fallen under my feet.
40 Ọ bụ gị nyere m ike ibu agha. I wedara ndị niile na-emegide m nʼala nʼihu m.
For Thou hast girded me with strength unto the battle; Thou hast subdued under me those that rose up against me.
41 I meela ka ndị iro m tụgharịa gbalaga. Ebibiekwala m ha niile.
Thou hast also made mine enemies turn their backs unto me; yea, them that hate me, that I might cut them off.
42 Ha bere akwa maka enyemaka, ma ọ dịghị onye na-azọpụta ha. Ha kpọkuru Onyenwe anyị, ma ọ zaghị ha.
They looked, but there was none to save; even unto the LORD, but He answered them not.
43 Egwepịara m ha nke ọma, mee ka ha dịrị ka ntụ nke ala. Asụrụ m ha akwụ, zọtọọ ha dịka apịtị nke okporoụzọ.
Then did I beat them small as the dust of the earth, I did stamp them as the mire of the streets, and did tread them down.
44 “Ị napụtala m site nʼaka ndị niile na-alụso m ọgụ. Ị chebere m dịka onyeisi nke ọtụtụ mba. Ndị m na-amaghị na mbụ na-ejekwara m ozi.
Thou also hast delivered me from the contentions of my people; Thou hast kept me to be the head of the nations; a people whom I have not known serve me.
45 Ndị ala ọzọ na-ehulata nʼihu m nʼihi egwu, ngwangwa ha nụrụ olu m, ha na-erube isi nye m.
The sons of the stranger dwindle away before me; as soon as they hear of me, they obey me.
46 Obi na-ada ha mba. Ha na-ama jijiji mgbe ha na-esite nʼebe niile ha e wusiri ike na-apụta.
The sons of the stranger fade away, and come halting out of their close places.
47 “Onyenwe anyị na-adị ndụ. Otuto dịrị oke nkume m. Mbuli elu dịrị Chineke m, bụ oke nkume ahụ, Onye nzọpụta m.
The LORD liveth, and blessed be my Rock; and exalted be the God, my Rock of salvation;
48 Ọ bụ Chineke ahụ, onye na-abọrọ m ọbọ. Onye na-emekwa ka mba dị iche iche nọrọ nʼokpuru m.
Even the God that executeth vengeance for me, and bringeth down peoples under me,
49 Onye na-anapụta m site nʼaka ndị iro m. I mere ka m dị elu karịa ndị iro m. Napụtakwa m site nʼaka nwoke na-eme ihe ike.
And that bringeth me forth from mine enemies; yea, Thou liftest me up above them that rise up against me; Thou deliverest me from the violent man.
50 Nʼihi nke a, Onyenwe anyị, aga m eto gị nʼetiti mba niile dị iche iche. Aga m abụku aha gị abụ otuto.
Therefore I will give thanks unto Thee, O LORD, among the nations, and will sing praises unto Thy name.
51 “Chineke na-enye eze ya mmeri dị ukwuu. Ọ na-egosikwa onye ya o tere mmanụ obi ebere. Ihe ndị a ka ọ na-emere Devid na ụmụ ụmụ ya, ruo mgbe niile ebighị ebi.”
A tower of salvation is He to His king; and showeth mercy to His anointed, to David and to his seed, for evermore.