< 2 Samuel 21 >

1 Ụnwụ dara afọ atọ nʼoge Devid na-achị, afọ kwa afọ. Devid chọrọ ihu Onyenwe anyị. Mgbe ahụ, Onyenwe anyị sịrị, “Ọ bụ maka Sọl na ọbara ụlọ ya kwafuru, nʼihi na o gburu ndị Gibiọn.”
И бысть глад на земли во дни Давидовы три лета, лето по лету. И вопроси Давид лица Господня и рече Господь: над Саулом и над домом его обида в смерти кровей его, понеже умертви Гаваониты.
2 Eze kpọrọ ndị Gibiọn, gwa ha okwu. (Ndị Gibiọn abụghị ndị Izrel, kama ha bụ ndị fọdụrụ nʼime ndị Amọrait, ndị bi nʼala Kenan mgbe ụmụ Izrel batara. Mgbe ahụ ha batara, ndị Izrel ṅụrụ iyi nye ndị Gibiọn na ha agaghị egbu ha, ma Sọl sitere nʼịnụ ọkụ nke obi nʼihi Izrel na Juda chọọ ikpochapụ ha.)
И призва царь Давид Гаваониты и рече к ним: и Гаваонитяне не суть сынове Израилевы, но токмо от остатков Аморрейских, и сынове Израилевы кляшася им: Саул же взыска поразити я, внегда поревновати ему по сынех Израилевых и Иудиных.
3 Devid jụrụ ndị Gibiọn ajụjụ sị, “Gịnị ka m ga-emere unu? Gịnị ka m ga-eji kpuchie mmehie a e mere megide unu, ime ka unu gọzie ihe nketa Onyenwe anyị?”
И рече Давид ко Гаваонитяном: что сотворю вам? И чим умолю, да благословите достояние Господне?
4 Ndị Gibiọn zara ya sị, “Nsogbu anyị na Sọl na ndị ụlọ ya abụghị ihe a ga-eji ọlaọcha maọbụ ọlaedo mezie. Anyị achọkwaghị ka onye ọbụla nʼIzrel nwụọ nʼihi anyị.” Devid sịrị ha, “Gịnị ka unu chọrọ ka m meere unu?”
И реша ему Гаваонитяне: несть нам сребра или злата со Саулом и с домом его, и несть нам мужа умертвити от всего Израиля. И рече: что вы глаголете, и сотворю вам?
5 Ha zara eze sị, “Kwere ka anyị wezuga nwoke ahụ wetaara anyị mbibi na ịla nʼiyi, onye ahụ mere ka anyị ghara inwe ebe obibi ọbụla nʼala Izrel.
И реша ко царю: мужа, иже соверши над нами и погна ны, иже умысли потребити ны, потребим его, да не будет во всех пределех Израилевых:
6 Ka akpọnye anyị ndị ikom asaa site nʼụmụ ya, ka anyị kwụgbuo ha nye Onyenwe anyị na Gibea Sọl, onye Onyenwe anyị họpụtara.” Eze zara sị, “Aga m akpọnye unu ha.”
дадите нам седмь мужей от сынов его, и повесим их на солнце Господеви в Гаваоне Саули избранных Господних. И рече царь: аз дам.
7 Ma eze nwere ọmịiko nʼahụ Mefiboshet nwa Jonatan, nwa Sọl, nʼihi ịgba ndụ dị nʼetiti ya na Jonatan nʼihu Onyenwe anyị.
И пощаде царь Мемфивосфеа, сына Ионафаня сына Сауля, клятвы ради Господни, яже посреде их и посреде Давида и посреде Ионафана сына Сауля.
8 Ma eze kpọọrọ Amoni na Mefiboshet, ụmụ ndị ikom abụọ nke Rizpa, nwa nwanyị Aịa, bụ ndị ọ mụtaara Sọl. Nakwa ụmụ ndị ikom ise nke Merab nwa Sọl mụtara mgbe ọ bụ nwunye Adriel, nwa Bazilai onye Mehola.
И взя царь два сына Ресфы дщере Аиа, подложницы Саули, ихже роди Саулу, Ермониа и Мемфивосфеа, и пять сынов Мелхолы дщере Саули ихже роди Есдриилу сыну Верзеллиа Моулафиева,
9 O nyefere ha niile nʼaka ndị Gibiọn; ndị Gibiọn kwụbakwara ha nʼugwu nʼihu Onyenwe anyị. Ha asaa nwụrụ nʼotu ụbọchị na mmalite owuwe ihe ubi nke ọka balị.
и даде их в руки Гаваонитом. И повесиша я на солнце на горе пред Господем, и падоша тамо сии седмь вкупе: тии же умроша во днех жатвы первых, в начале жатвы ячменя.
10 Ma Rizpa, nwa nwanyị Aịa were akwa mkpe gbasara onwe ya nʼelu nkume. O kweghịkwa ka anụ ufe bekwasị ha nʼehihie, maọbụ anụ ọhịa nʼabalị. Ọ nọgidere nʼebe ahụ site nʼoge mmalite owuwe ihe ubi tutu ruo mgbe mmiri bidoro izokwasị anụ ahụ ha.
И взя Ресфа дщи Аиина вретище, и потче е себе при камени, в начале жатвы ячменя дондеже снидоша на них воды Божия с небесе, и не даде птицам небесным днем почити на них, ниже зверем земным нощию.
11 Mgbe a gwara Devid ihe Rizpa, nwa nwanyị Aịa, iko nwanyị Sọl mere,
И поведаша Давиду вся елика сотвори Ресфа дщерь Аиа, подложница Сауля. И истлеша, и взя я Дан сын Иой, иже от исчадий исполиновых.
12 ọ gara chịkọtaa ọkpụkpụ Sọl na nke nwa ya Jonatan site nʼaka ndị nwe obodo Jebesh Gilead. Ha gara na nzuzo zuru ozu Sọl na Jonatan site nʼama dị na Bet-Shan, ebe ndị Filistia kwụbara ha, oge ha gburu Sọl na Gilboa.
И иде Давид, и взя кости Саули и кости Ионафана сына его от мужей сынов Иависа Галаадскаго, иже украдоша их от стогны Вефсани, зане повесиша их тамо иноплеменницы в день, в оньже поразиша иноплеменницы Саула в Гелвуи.
13 Devid sitere nʼebe ahụ chịkọtaa ọkpụkpụ Sọl na nke nwa ya nwoke Jonatan, chịkọtaakwa ọkpụkpụ ndị ahụ akwụgburu.
И вознесе Давид кости Саули оттуду и кости Ионафана сына его, и собра кости повешеных на солнце:
14 Ha liri ọkpụkpụ Sọl na nke nwa ya nwoke Jonatan nʼobodo Zela nʼala Benjamin, nʼime ili Kish nna Sọl, meekwa ihe ndị ọzọ niile eze nyere nʼiwu. Mgbe nke a gasịrị, Chineke zara ekpere nʼihi ala ahụ.
и погребоша кости Саули и кости Ионафана сына его, и кости повешеных на солнце, в земли Вениаминове, при Краи во гробе Киса отца его, и сотвориша вся елика заповеда царь. И послуша Бог земли по сих.
15 Emesịa, ndị Filistia busokwara Izrel agha ọzọ. Devid na ndị agha ya pụkwara ịlụso ha ọgụ. Nʼoge ha na-alụ ọgụ a, ike gwụrụ Devid nke ukwuu.
И бысть паки брань иноплеменником со Израилтяны. И сниде Давид и отроцы его с ним, и бишася со иноплеменники: и утрудися Давид.
16 Mgbe ahụ, Ishibi-Benob, otu onye agbụrụ Rafa, onye ịdị arọ nke bronz dị nʼọnụ ùbe ya ruru kilogram atọ na ọkara, onye jikwa mma agha ọhụrụ, bịaruru Devid nso chọọ igbu ya.
И Иесвий, иже бе от внук Рафаних, (у негоже) бе вес копия его триста сикль веса медяна, и той бе препоясан оружием, и хотяше поразити Давида.
17 Ma Abishai nwa Zeruaya bịara nyere Devid aka, tigbuo onye Filistia ahụ. Site nʼoge ahụ, ndị ikom Devid ṅụrụ iyi sị ya, “Ị gaghị esokwa anyị gaa ibu agha ọzọ! Ka a ghara imenyụ oriọna Izrel.”
И поможе ему Авесса сын Саруин, и избави Давида Авесса, и порази иноплеменника, и умертви его. Тогда кляшася мужие Давидовы, глаголюще: не изыдеши ктому с нами на брань, да не угасиши светилника Израилева.
18 Mgbe oge gaturu, ha na ndị Filistia lụrụ agha ọzọ na Gob. Nʼoge a, Sibekai, onye Husha, gburu Saf, otu nʼime ndị agbụrụ Rafa.
И бысть по сих еще брань в Гефе со иноплеменники: тогда порази Совохей иже от Асофы собранныя внуки Гигантовы.
19 Nʼagha ọzọ ha na ndị Filistia lụrụ na Gob, Elhanan nwa Jaịa onye Betlehem gburu nwanne Golaịat onye Gat, onye ùbe ya nwere osisi dị ogologo dịka nke onye na-ekwe akwa ji ekwe akwa.
И бысть паки брань в Роме со иноплеменники: и порази Елеанан сын Ариоргима Вифлеемлянин Голиафа иже от Геффеа, и древо копия его бысть аки навой ткущих.
20 Nʼagha ọzọkwa, bụ nke a lụrụ na Gat, e nwere otu nwoke gbara oke dimkpa, nke nwere mkpịsịaka isii nʼaka ya ọbụla, nweekwa mkpịsịụkwụ isii nʼụkwụ ya ọbụla, ya bụ, a gụkọtaa ha niile, iri mkpịsịaka na mkpịsịụkwụ abụọ na anọ. Ọ bụkwa onye amụrụ nʼagbụrụ Rafa.
И бысть паки брань в Гефе: и бе муж от мадона, и персты рук его и персты ног его по шести, числом двадесять четыри: и той родися от Рафы,
21 Mgbe ọ kọchara Izrel, Jonatan nwa Shimei, nwanne nwoke Devid, gburu ya.
и уничижи Израиля: и уби его Ионафан сын Сафая брата Давидова.
22 Mmadụ anọ ndị a bụ ndị agbụrụ Rafa dị na Gat. Devid na ndị agha ya gburu ha niile.
Четыри сии родишася внуцы Гигантовы рафе в Гефе, и падоша от руку Давидову и от руку рабов его.

< 2 Samuel 21 >