< 2 Samuel 20 >

1 Mgbe ahụ, otu onye okwu na ụka, aha ya bụ Sheba, nwa Bikri, onye Benjamin nọ nʼebe ahụ nʼoge a. Ọ fụrụ opi ike ya tie mkpu sị, “Anyị enweghị oke nʼime Devid, anyị enwekwaghị ihe nketa nʼime nwa Jesi. Ndị Izrel, onye ọbụla laa nʼụlọ ikwu ya!”
Now there happened to be a worthless man, whose name was Sheba, the son of Bikri, a Benjamite. And he blew the trumpet, and said, "We have no share in David, nor do we have any inheritance in the son of Jesse. Every man to his tents, Israel."
2 Ya mere, ndị ikom Izrel niile tụgharịrị hapụ Devid, soro Sheba nwa Bikri. Ma ndị ikom Juda nọgidere soro eze ha site na Jọdan ruo Jerusalem.
So all Israel deserted David and followed Sheba the son of Bikri, but the men of Judah stayed by their king, from the Jordan to Jerusalem.
3 Mgbe Devid lọghachitere nʼụlọ ya na Jerusalem. O nyere iwu ka ndị iko ya nwanyị iri ndị ahụ ọ hapụrụ ilekọta ụlọ, ndị ahụ ha na Absalọm dinara, nọrọ nʼụlọ dị iche, ebe a nọ na-eche ha nche. Eze abakwurughị ha ọzọ. Ha bụ ndị emechibidoro ụzọ, ha na-ebi ndụ dịka ndị di ha nwụrụ anwụ tutu ruo ụbọchị ọnwụ ha.
Then David came to his palace at Jerusalem, and the king took the ten women his secondary wives, whom he had left to keep the palace, and placed them under guard, and provided for them, but did not go in to them. So they were kept in confinement until the day of their death, living as widows.
4 Mgbe ahụ, eze gwara Amasa okwu sị, “Kpokọta ndị agha Juda ka ha bịakwute m nʼime abalị atọ. Gị onwe gị kwa ga-eso ha bịa nʼoge ahụ.”
Then the king said to Amasa, "Summon the men of Judah to me within three days, and be present here yourself."
5 Amasa pụrụ jee ịkpọkọta ndị Juda; ma o were ya ọtụtụ oge karịa abalị atọ.
So Amasa went to summon Judah together, but he delayed beyond the set time that had been allotted him.
6 Devid sịrị Abishai, “Lee nwoke a bụ Sheba nwa Bikri na-aga ime ihe ọjọọ ga-adị njọ karịa nke Absalọm mere. Chịrị ndị agha nna gị ukwu chụso ya, ma ọ bụghị ya, ọ ga-achọta obodo e wusiri ike gbaba, ebe anyị na-apụghị inweta ya.”
David said to Abishai, "Now Sheba the son of Bikri will do us more harm than Absalom did. Now then, take your lord's servants with you and pursue after him, otherwise he will get himself to fortified cities and escape from us."
7 Ya mere ndị agha Joab, na ndị Keret na Pelet, na ndị niile bụ dike na dimkpa nʼagha pụrụ nʼikike ọchịchị Abishai. Ha si Jerusalem pụọ ịchụso Sheba nwa Bikri.
So there went out after him Joab's men and the Cherethites and the Pelethites, and all the warriors. And they went out from Jerusalem to pursue Sheba son of Bikri.
8 Mgbe ha rutere nʼoke nkume ahụ dị na Gibiọn, Amasa pụtara izute ha. Joab yi uwe agha ya nʼoge a; ọ fanyekwara mma agha ya nʼọbọ nʼukwu ya. Mgbe ọ gara nʼihu, mma ahụ si nʼọbọ ya dapụta.
When they were at the great stone that is in Gibeon, Amasa came to meet them. And Joab was wearing his military attire, and over it was a belt with a dagger in its sheath fastened at his waist, and as he advanced it fell out.
9 Joab kelere Amasa sị ya, “Kedụ ka ị dị nwanna m.” Mgbe ahụ, Joab ji aka nri ya jide Amasa nʼahụọnụ isutu ya ọnụ,
And Joab said to Amasa, "Is it well with you, my brother?" Then Joab took Amasa by the beard with his right hand to kiss him.
10 Amasa elezighị anya hụ na mma agha nta dị nʼaka Joab. Joab mabanyere ya nʼime afọ Amasa, mee ka mgbịrị afọ ya sọsikwaa nʼala. Ọ maghị ya mma ahụ ugboro abụọ, nʼihi na otu ugboro ahụ mere ka Amasa nwụọ. Mgbe ahụ, Joab na nwanne ya Abishai chụsoro Sheba nwa Bikri nʼazụ.
But Amasa did not notice the sword that was in Joab's hand. And he stabbed him with it in the abdomen, so that his intestines spilled out on the ground, and he did not do it to him again. Thus he died. Then Joab and Abishai his brother pursued Sheba son of Bikri.
11 Mgbe ahụ, otu nʼime ndị agha Joab guzo nʼakụkụ Amasa sị, “Onye ọbụla dịnyeere Joab na Devid ya bịa soro Joab nʼazụ.”
And one of Joab's young men stood beside Amasa and said, "Whoever is the one that favors Joab and whoever belongs to David, follow Joab."
12 Ma Amasa tọgbọ nʼala nʼetiti ụzọ. Ọbara sikwa ya nʼahụ na-asọpụta. Mgbe nwoke ahụ hụrụ na ọtụtụ ndị agha na-agbakọ ile Amasa, o bupụrụ ozu ya nʼụzọ, were uwe kpuchie ya nʼọhịa.
But Amasa lay covered with his blood in the midst of the road, and anyone who came by, seeing him, stopped. So when the man saw that all the people stopped, he dragged Amasa from the road into a field and threw a garment over him.
13 Mgbe e bupụsịrị ozu Amasa nʼụzọ, ndị agha niile sooro Joab gaa ijide Sheba, nwa Bikri.
When he was removed from the road, all the people followed Joab in pursuit of Sheba son of Bikri.
14 Sheba gabigara ebo niile nke Izrel ruo Ebel-Bet-Maaka, gabigakwa oke ala ndị Bikri, bụ ndị zukọtara soro ya.
He went through all the tribes of Israel to Abel of Beth Maacah, and all the Bikrites assembled and followed him.
15 Ndị agha Joab bịara gbochie ya na Ebel-Bet-Maaka. Ha wuru ihe mgbochi ruo obodo ahụ, nọbichie mgbidi dị ya gburugburu. Ebe ha nọ na-akụ mgbidi ahụ ihe, ka ha kwatuo ya.
And all the people who were with Joab came and besieged him in Abel of Beth Maacah. And they built a siege ramp against the city, and it stood against the rampart, and they were battering the wall so that it would collapse.
16 Otu nwanyị maara ihe si nʼobodo ahụ kpọọ oku sị, “Geenụ m ntị, geenụ m ntị, gwanụ Joab ka ọ bịa nʼebe a. Achọrọ m ịgwa ya okwu.”
Then a wise woman called out from the wall, "Listen, listen. Please tell Joab to come here so that I may speak to him.
17 Joab pụtara gaa ya nso. Nwanyị ahụ jụrụ sị, “Ọ bụ gị bụ Joab?” Ọ zara sị, “E, ọ bụ m.” Mgbe ahụ, ọ gwara ya, “Gee ntị, ka i nụ ihe ohu gị nwere ikwu.” Joab sịrị ya, “Ana m ege ntị.”
So he approached her, and the woman said, "Are you Joab?" And he replied, "I am." Then she said, "Listen to the words of your servant." And he replied, "I'm listening."
18 Ọ gara nʼihu sị, “Nʼoge ochie a na-ekwu sị, ‘Gaa jụta ase nʼEbel,’ nʼụzọ dị otu a ka ha si ekwubi okwu.
Then she said, "In the past they used to say, 'Let them inquire in Abel and in Dan whether
19 Anyị bụ ndị udo na ndị kwesiri ntụkwasị obi nʼIzrel. I na-achọ ibibi obodo bụ nne nʼIzrel. Gịnị mere i ji chọọ iloda ihe nketa nke Onyenwe anyị?”
that which the faithful of Israel established has been carried out.' You seek to destroy a city that is a mother in Israel. Why do you want to swallow up the inheritance of the LORD?"
20 Joab zara sị, “Mba! Ọ bụghị uche m ịla obodo a nʼiyi.
Joab answered, "Far be it from me that I should swallow up or destroy.
21 Ọ bụghị otu a ka okwu ahụ dị. Otu nwoke a na-akpọ Sheba nwa Bikri, nke si nʼobodo ugwu Ifrem e weliela aka ya imegide eze, bụ Devid. Nyefee nwoke a ọsịịsọ nʼaka m, aga m esi nʼobodo a pụọ.” Nwanyị ahụ sịrị Joab, “A ga-atụpụtara gị isi ya site na mgbidi.”
That is not the case. But a man of the hill country of Ephraim, Sheba the son of Bikri, has rebelled against king David. Give up him alone and I will withdraw from the city." Then the woman said to Joab, "Look, his head will be thrown to you from the wall."
22 Nwanyị ahụ ji ndụmọdụ nke amamihe ya gakwuru ndị obodo. Ha bipụrụ Sheba nwa Bikri isi, tụpụtara ya Joab. Ya mere na ọ fụrụ opi ike ya, ndị ikom ya sitere nʼobodo ahụ lasaa, onye ọbụla lara nʼụlọ nke ya. Joab laghachikwuru eze na Jerusalem.
Then she spoke to all the city with her wise advice, and they cut off the head of Sheba son of Bikri and threw it out to Joab. So he blew the trumpet, and they were dispersed from him, each returning to his home. And Joab went back to Jerusalem to the king.
23 Ọ bụ Joab ka e mere onyeisi agha na-achị ndị agha niile nke Izrel. Benaya nwa Jehoiada bụ onye na-achịkọta ndị Keret na ndị Pelet na-eche eze nche.
Now Joab was in command of the entire army of Israel; and Benaiah the son of Jehoiada was in command of the Cherethites and in command of the Pelethites;
24 Adoniram na-ahụ maka ihe banyere ndị ọrụ mmanye. Jehoshafat nwa Ahilud bụ onye na-edekọta ihe niile na-eme nʼobodo.
and Adoniram was in command of the forced labor; and Jehoshaphat the son of Ahilud was recorder;
25 Sheva bụ ode akwụkwọ eze, Zadọk na Abịata bụ ndị nchụaja.
and Shisha was scribe; and Zadok and Abiathar were priests;
26 Ira, onye si nʼobodo Jaịa, bụ onye nchụaja eze Devid.
and also Ira the Jairite was David's priest.

< 2 Samuel 20 >