< 2 Samuel 18 >

1 Devid gụkọtara ndị ya na ha so ma họpụta ndịisi agha. Doo ụfọdụ ka ha chịa ọtụtụ puku ndị agha, ụfọdụ ka ha chịa ọtụtụ narị ndị agha.
HELU aku la o Davida i na kanaka me ia, a hoonoho aku la i na lunatausani, a me na lunahaneri maluna o lakou.
2 Devid zipụrụ ndị agha ya, otu ụzọ nʼime ụzọ atọ nʼokpuru Joab, Ọ họpụtakwara Abishai, nwanne Joab, nwa Zeruaya, ka ọ chịa otu ụzọ. Ma otu ụzọ nke fọdụrụ ka o tinyere nʼaka Itai onye Gat. Eze gwara ndị agha ahụ sị, “Mụ onwe m ga-edu unu gaa agha.”
Hoouna aku la o Davida i ka hapakolu o na kanaka malalo o ka lima o Ioaba, a o kekahi hapakolu malalo o ka lima o Abisai ke keiki a Zeruia, o ko Ioaba kaikaina, a o kekahi hapakolu malalo o ka lima o Itai ke Giti. I aku la hoi ke alii i na kanaka, Owau io no kekahi e hele aku ana me oukou.
3 Ma ndị ikom ahụ sịrị, “Ị gaghị apụkwa ọzọ nʼihi na ọ bụrụ na anyị atụgharịa bido ịgba ọsọ, ọ bụrụkwa na otu ọkara nʼime anyị anwụọ, nke ahụ agaghị emetụ ha nʼobi. Naanị gị ka ha na-achọ. Ị dịkwa mkpa karịa puku ndị agha iri. Ọ ga-akara anyị mma ugbu a ka ị na-ezitere anyị inyeaka site nʼime obodo.”
Aka, i mai la na kanaka, Aole oe e hele aku; no ka mea, a i hee aku makou, aole lakou e manao mai ia makou; a i make hoi kekahi hapalua o makou, aole no hoi lakou e manao mai ia makou. Aka hoi, ua like oe me ka umi tausani o makou; nolaila, e aho nau e kokua mai ia makou mailoko mai o ke kulanakauhale.
4 Eze zara nʼikpeazụ sị, “Ihe ọbụla dị mma nʼanya unu ka m ga-eme.” Ya mere, eze guzoro nʼakụkụ ọnụ ụzọ ama dịka ndị ikom ya niile na-apụ nʼusu nke ọtụtụ narị, nakwa nʼusu nke ọtụtụ puku.
I aku la ke alii ia lakou, O ka oukou pono ka'u e hana'i. Ku ae la ke alii ma ka aoao o ka ipuka o ka pa, a haele mai la na kanaka a pau iwaho ma na haneri a ma na tausani.
5 Eze nyere ndịisi agha ya, bụ Joab, Abishai na Itai, iwu sị ha, “Bikonu, nʼihi m, werenụ nwayọọ nʼebe nwokorobịa ahụ bụ Absalọm nọ.” Ndị agha niile nụkwara mgbe eze nyere ndịisi niile iwu a banyere Absalọm.
Kauoha aku la ke alii ia Ioaba me Abisai a me Itai, i aku la, E ahonui aku oukou no'u i ke kanaka opiopio ia Abesaloma. A lohe ae la na kanaka a pau, i ka wa i kauoha aku ai ke alii i na lunakoa a pau no Abesaloma.
6 Ndị agha Devid si nʼobodo pụọ izute ndị Izrel nʼagha. Alụrụ agha a nʼọhịa Ifrem.
Alaila hele aku la na kanaka iwaho ma ke kula e ku e i ka Iseraela: aia ma ka ululaau o Eperaima ke kaua ana.
7 Ndị agha Devid tigbukwara ndị agha Izrel. Ha gburu iri puku ndị agha abụọ nʼụbọchị ahụ.
Ilaila ua pepehiia na kanaka o ka Iseraela imua o ka poe kauwa a Davida: a he luku nui no ia la ma ia wahi, o na kanaka he iwakalua tausani.
8 Agha ahụ gbasara nʼelu ala ahụ niile. Ndị nwụrụ nʼọhịa nʼetiti ụmụ Izrel karịrị ndị e gburu egbu.
No ka mea, kaua liilii lakou malaila maluna o ka aina a pau: a ua oi ka nui o ka poe i make i ka laau ia la, i ka poe i make i ka pahikaua.
9 Absalọm zutere ndị agha Devid. Ọ na-anọkwasị nʼelu ịnyịnya ya nʼoge a, dịka ịnyịnya ahụ sitere nʼokpuru osisi ook ukwu dị nʼọhịa ahụ na-agbafee, agịrị isi ya konyere nʼalaka osisi ahụ, tụhịkọtaakwa, nke mere na ọ kwụrụ nʼetiti eluigwe na ala. Ma ịnyịnya ya gbaara na-aga.
A halawai ae la o Abesaloma me na kauwa a Davida. A holo ae la o Abesaloma maluna o ka hoki, a hele aku la ka hoki malalo o na lala pilikia o kekahi laau oka nui, a hihia ae la kona poo i ka laau, a kaulia oia mawaena o ka lani a o ka honua, a hele aku la ka hoki mai lalo aku ona.
10 Otu nʼime ndị ikom ahụ hụrụ ya, kọọrọ Joab, “Lee, ahụrụ m Absalọm ebe ọ kwụ nʼelu osisi ook.”
Ike aku la kekahi kanaka ia mea, a hai aku la ia Ioaba, i aku la, Aia ua ike aku au ia Abesaloma e kau ana maloko o kekahi laau oka.
11 Joab sịrị nwoke ahụ onye gwara gị, “Gịnị, ị hụrụ ya? Gịnị mere i tigbughị ya ka o ruo nʼala nʼebe ahụ? Mgbe ahụ, agaara m enye gị shekel ọlaọcha iri, na belịt a na-enye onye bụ dike nʼagha.”
I mai la o Ioaba i ke kanaka nana i hai aku ia ia, Aia hoi, ua ike aku oe; heaha hoi kau i pepehi ole ai ia ia a haule ia i ka houna? alaila haawi aku no wau ia oe i na apana kala he umi a me kekahi kaei.
12 Ma nwoke ahụ zara sị, “A sịkwarị na e nyere m puku ọlaọcha nʼaka m a, agaraghị m egbu ya. Nʼihi na anyị niile nụrụ mgbe eze na-agwa gị na Abishai na Itai sị, ‘Lezienụ anya banyere nwokorobịa bụ Absalọm, nʼihi m.’
I aku la ua kanaka la ia Ioaba, Ina paha e kau ana ma kun lima na apana kala he tausani, aole au e o aku i kuu lima e pepehi i ke keiki a ke alii: no ka mea, i ko makou lohe ana, ua kauoha mai ke alii ia oe, me Abisai a me Itai, i mai la, E malama oukou a pau i ke kanaka opiopio ia Abesaloma.
13 A sị na m gburu ya, ọ ga-abụ imegide eze. Ọ ga-emesiekwa chọpụta onye mere ya. Ma gị onwe gị agaraghị apụta kwuchite ọnụ m.”
Ina ole pela, ina ua hana au ma ka wahahee e hihia ai ko'u ola: no ka mea, aohe mea i hunaia mai ke alii aku, a o oe no hoi kekahi e ku e ia'u.
14 Joab sịrị, “Ọ bụghị otu a ka m ga na-eche nʼihu gị.” Ya mere, ọ chịịrị ùbe atọ nʼaka ya, dubaa ha nʼobi Absalọm, mgbe Absalọm ka dị ndụ makwụrụ nʼelu osisi ook.
Alaila, i aku la o Ioaba, Aole au e pono ke kali wale penei imua ou. Lalau aku la ia i na ihe ekolu ma kona lima, a hou aku la ia mau mea maloko o ka puu o Abesaloma, oi ola kela mawaena o ka laau oka.
15 Ụmụ okorobịa iri ndị na-ebu ihe agha Joab gbara Absalọm gburugburu, tigbuo ya.
Hoopuni mai la ka poe umi nana i lawe i ka Ioaba mea kaua, pepehi aku la ia Abesaloma, a make iho la ia.
16 Emesịa, Joab fụrụ opi ike nke mere ka ndị agha Devid na-achụ ndị Izrel kwụsị ịchụ ha ọsọ, nʼihi na Joab kwụsịrị ha.
Puhi aku la o Ioaba i ka pu, a hoi mai la na kanaka mai ke alualu ana'ku i ka Iseraela: no ka mea, ua paa na kanaka ia Ioaba.
17 Ha buuru ozu Absalọm tụba ya nʼolulu ukwu dị nʼoke ọhịa ahụ, werekwa nkume tụọ ya nʼelu. Ndị agha Izrel niile gbalara nʼụlọ ha.
Lawe aku la lakou ia Abesaloma; a hoolei aku la ia ia maloko o ka lua nui ma ka ululaau, a kau aku la lakou i ahu pohaku nui maluna iho ona: a holo aku la ka Iseraela a pau, o kela mea keia mea i kona halelewa.
18 Nʼoge Absalọm dị ndụ, o wuuru onwe ya ogidi ncheta. O wuru ogidi a na Ndagwurugwu Eze, nʼihi na o chere nʼime onwe ya sị, “Enweghị m nwa nwoke ga-aza aha m.” Ya mere, ọ gụrụ ogidi ahụ aha nke ya onwe ya. Ọ bụkwa Ogidi Absalọm ka a na-akpọ ya ruo taa.
A o Abesaloma i kona wa e ola ana, lawe aku la ia a hooku ae la i kekahi kia pohaku ma ke awawa o ke alii: no ka mea, i aku la ia, Aole a'u keikikane nana e hoomau i kuu inoa; a kapa aku la ia i ua kia pohaku la ma kona inoa iho: a ua kapaia'ku ia ko Abesaloma wahi, a hiki i neia manawa.
19 Mgbe ahụ, Ahimaaz, nwa Zadọk, bịakwutere Joab sị ya, “Biko, ka m gbara ọsọ gaa zie eze oziọma a, na Onyenwe anyị azọpụtala ya site nʼaka ndị iro ya.”
Alaila i aku la o Ahimaaza ke keiki a Zadoka, E ae mai oe e holo aku au ano, e lawe aku i ka olelo i ke alii, ua hoopakele aku o Iehova ia ia mai na lima aku o kona poe enemi.
20 Ma Joab zara sị ya, “Ọ bụghị gị ga-ezi eze ozi taa. I nwere ike ime ya mgbe ọzọ, ma ọ bụghị taa, nʼihi na nwa eze nwụrụ.”
I mai la o Ioaba ia ia, Aole no oe e lawe aku i ka olelo i keia la; e lawe olelo oe i kekahi la ae: i keia la, aole oe e lawe olelo aku, no ka mea, ua make ke keikikane a ke alii.
21 Joab gwara otu nwoke onye Kush sị ya, “Gaa gwa eze ihe ị hụrụ.” Nwoke ahụ kpọrọ isiala, gbapụ ọsọ.
Alaila i aku la o Ioaba ia Kusi, O hele oe e hai i ke alii i ka mea au i ike iho nei. Kulou iho la o Kusi ia Ioaba, a holo aku la.
22 Ahimaaz nwa Zadọk rịọkwara Joab ọzọ sị ya, “Otu ọbụla o si dị, biko kwere ka m gbaso onye Kush a.” Ma Joab zara sị, “Nwa m nwoke, gịnị mere i ji chọọ ị ga? I nweghị ozi ọbụla ị ga-ezi nke ga-ewetara gị ụgwọ ọrụ.”
I hou aku la o Ahimaaza ke keiki a Zadoka ia Ioaba, Owau hoi kekahi, ke noi aku nei au ia oe, e holo aku au mahope o Kusi. I mai la o Ioaba, No ke aha hoi oe e holo aku ai, e kuu keiki, aohe olelo e pono nau?
23 Ọ rịọrọ sị, “Otu ọbụla o si dị, hapụ m ka m gaa.” Nʼikpeazụ Joab kwenyere sị ya, “Ọ dị mma, gbara ọsọ gaa.” Ahimaaz sitere nʼụzọ dị mkpụmkpụ nke gafere obosara ala Jọdan buru nwoke Kush ahụ ụzọ gbaruo.
E ae mai hoi oe e holo wau. I mai la kela ia ia, E holo. Alaila holo aku la o Ahimaaza ma ka aoao o ka papu, a oi aku la ia imua o Kusi.
24 Devid nọ nʼọnụ ụzọ ama nʼoge a. Mgbe onye nche rigoruru nʼelu mgbidi ebe ọ na-anọ, ọ hụrụ otu nwoke ka ọ na-agba ọsọ naanị ya.
Noho iho la o Davida mawaena o na puka elua o ka pa, a pii aku la ke kiai maluna o ka puka ma ka pa pohaku; alawa ae la kona mau maka, nana aku la, aia he kanaka e holo mai ana, oia wale no.
25 Onye nche ahụ kpọrọ Devid oku gwa ya na o nwere onye na-abịa. Ma eze zara ya sị, “Ọ bụrụ naanị ya, o nwere oziọma.” Mgbe onyeozi ahụ na-abịaru nso,
Hea mai la ke kiai, a hai mai la i ke alii. I aku la ke alii, Ina hookahi wale no oia, he olelo no ma kona waha. Neenee mai la no ia, a kokoke mai.
26 onye nche ahụ lepụkwara anya hụ otu nwoke ọzọ ka o ji ọsọ na-abịa naanị ya. Ọ kpọkwara oku ọzọ sị, “Onye ọzọ na-abịakwa.” Eze zara sị, “Onye ahụ ga-enwekwa oziọma.”
Ike aku la hoi ke kiai i kekahi kanaka e ae e holo mai ana: hea mai la ke kiai i ka malama puka, Aia hoi, he kanaka e holo hookahi mai ana. I aku la ke alii, Ke lawe mai nei hoi oia i ka olelo.
27 Onye nche ahụ zara sị, “Onye nke mbụ na-abịa dị ka Ahimaaz, nwa Zadọk,” Eze zara sị, “Ọ bụ ezi mmadụ, ọ bụkwa oziọma ka o ji na-abịa.”
I mai la ke kiai, Ua like ka mea holo mua i kuu manao me ka holo ana o Ahimaaza ke keiki a Zadoka. I aku la ke alii, He kanaka maikai ia, a ke hele mai nei ia me ka olelo maikai.
28 Mgbe ahụ, Ahimaaz kpọrọ eze oku sị, “Udo!” Ọ kpọrọ isiala nye eze. Kpuokwa ihu ya nʼala sị, “Ngọzị na-adịrị Onyenwe anyị Chineke gị. Onye nke mebiri nzube ndị ahụ niile weliri aka imegide onyenwe m bụ eze.”
Kahea mai la o Ahimaaza, i mai la i ke alii, Aloha oe. A haule iho la ia ilalo ke alo ma ka honua imua o ke alii, i mai la, E hoomaikaiia o Iehova o kou Akua, nana i hoolilo mai i ka poe kanaka i hookiekie ae i ko lakou lima e ku e i kuu haku i ke alii.
29 Eze jụrụ ya sị, “Oleekwanụ maka nwokorobịa ahụ bụ Absalọm? Ọ nọkwa nʼudo?” Ahimaaz zara sị, “Mgbe Joab zipụrụ ohu eze, na mụ onwe m, oke ụzụ dị, ma amaghị m ihe kpatara ya.”
I aku la ke alii, Ua malama ola ia ke kanaka opio, o Abesaloma? I mai la o Ahimaaza, A hoouna mai la o Ioaba i ke kauwa a ke alii, a ia'u hoi i kau kauwa, ua ike aku au i ka wawa nui, aole hoi au i ike i ke ano.
30 Eze gwara ya sị, “Chere nʼebe a.” Ahimaaz chigharịrị chere.
I aku la ke alii, E kipa ae oe a e ku maanei. Kipa ae la ia, a ku malie iho la.
31 Mgbe ahụ, onye Kush ahụ bịarutere sị, “Onyenwe m bụ eze, nụrụ oziọma a. Taa Onyenwe anyị ekpepụtala gị site nʼịnapụta gị nʼaka ndị niile biliri imegide gị.”
Aia hoi, hele mai la o Kusi: i mai la o Kusi, He olelo ka'u e kuu haku, e ke alii; ua hoapono mai o Iehova ia oe i keia la i ka poe a pau i hoea mai e ku e ia oe.
32 Eze jụrụ onye Kush ahụ, “Nwokorobịa ahụ bụ Absalọm, ọ nọkwa nʼudo?” Onye Kush ahụ zaghachiri, “Ka ndị iro onyenwe m bụ eze na ndị niile na-ebili imejọ gị dị ka nwokorobịa ahụ!”
I aku la ke alii ia Kusi, Ua malama ola ia anei ke kanaka opio o Abesaloma? I mai la o Kusi, O ka poe enemi o kuu haku o ke alii, a o ka poe a pau i ku e mai e hoino mai ia oe, e hoolikeia lakou me ua kanaka opio la.
33 Okwu a metụrụ eze nʼahụ nke ukwuu, o biliri rigoo nʼụlọ nke dị nʼọnụ ụzọ ama, nọdụ nʼebe ahụ kwaa akwa. Ọ nọ na-akwa akwa mgbe ọ na-aga, na-eti mkpu akwa na-asị, “O, nwa m, Absalọm! O nwa m, nwa m, Absalọm. A sịkwarị na m nwụrụ nʼọnọdụ gị! O, Absalọm nwa m, nwa m oo!”
Haaloulou nui iho la ke alii, a pii aku la i ke keena maluna o ka puka, a uwe iho la: a i kona hele ana, penei kana i olelo ai, Auwe! kuu keiki e Abesaloma e! e kuu keiki, kuu keiki e Abesaloma e! ina no wau i make nou, e Abesaloma kuu keiki, kuu keiki e!

< 2 Samuel 18 >