< 2 Samuel 16 >
1 Mgbe Devid gafechara elu ugwu ahụ na-agbada nʼakụkụ nke ọzọ ya, Ziba, onye na-elekọta akụ Mefiboshet, guzo na-eche ya. Ọ chị ịnyịnya ibu bu narị ogbe achịcha abụọ, na otu narị ụyọkọ mkpụrụ vaịnị a mịkpọrọ amịkpọ na narị ụyọkọ mkpụrụ osisi ndị ọzọ, na karama akpụkpọ buru ibu mmanya juru nʼime ya.
After David had gone a little way past the top of the mountain, there was Ziba, Mephibosheth's servant, waiting to meet him. He had two donkeys already saddled with him carrying two hundred loaves of bread, a hundred raisin cakes, a hundred summer fruits, and a skin of wine.
2 Eze jụrụ Ziba sị, “Gịnị mere i ji bute ihe ndị a?” Ziba zara sị, “Ịnyịnya ibu ndị a bụ nke ndị ụlọeze ga-anọkwasị. Achịcha na mkpụrụ osisi ndị a bụ nke ndị ikom gị ga-eri. Mmanya a bụ nke ndị na-ada mba nʼọzara ga-aṅụ.”
“What did you bring these for?” David asked Ziba. Ziba replied, “The donkeys are for the king's family to ride on, the bread and summer fruit are for the men to eat, and the wine is for those to drink who get worn out in the wilderness.”
3 Eze jụrụ ya sị, “Ebeekwanụ ka nwa nna gị ukwu nọ?” Ziba zara ya sị, “Ọ nọ na Jerusalem nʼihi na ọ sịrị, ‘Taa ụlọ Izrel ga-enyeghachi m alaeze nna nna m.’”
“Where is your master's grandson?” the king asked. Ziba answered, “He decided to stay in Jerusalem. He's saying, ‘Today the people of Israel will give me back my grandfather's kingdom.’”
4 Eze gwara Ziba sị ya, “Nʼihi ya, enyela m gị ihe niile Mefiboshet nwere, ha ga-abụkwa nke gị.” Ziba sịrị, “Ka m hụta amara nʼihu eze, bụ onyenwe m.”
The king told Ziba, “I give you everything that belongs to Mephibosheth!” “I bow before you,” Ziba replied. “May you approve of me, Your Majesty.”
5 Dịka eze bụ Devid na-abịaru obodo Bahurim, lee, otu nwoke sitere nʼagbụrụ ụlọ Sọl sitere nʼebe ahụ pụta. Ọ bụ Shimei nwa Gera. Ọ na-akọcha mgbe ọ na-apụta ya.
As King David arrived at the town of Bahurim, a man from Saul's family was just leaving. His name was Shimei, son of Gera, and he was shouting out curses as he came.
6 Ọ chịịrị nkume na-atụ Devid na ndị ozi eze niile. Ọ bụ ezie na ndị agha Izrel na ndị na-eche Devid nche gbara ya gburugburu nʼaka nri na aka ekpe.
He threw stones at David and all the king's officers, even though the king's men and all his bodyguards surrounded David.
7 Ma dịka Shimei na-akọcha, ọ sịrị, “Si nʼebe a pụọ, si nʼebe a pụọ, gị ogbu mmadụ, gị onye ọjọọ!
“Get out of here, just get out, you murderer, you wicked man!” Shimei said as he cursed.
8 Onyenwe anyị akwụghachila gị ụgwọ ọbara niile ị wụsiri nʼezinaụlọ Sọl, onye ị nọchiri ọnọdụ ya dịka eze. Onyenwe anyị anapụla gị alaeze ahụ, were ya nye Absalọm nwa gị! Ugbu a, ihe i metara abịala gị ụgwọ, gị ogbu mmadụ.”
“The Lord has paid you back for all of Saul's family that you killed, and for stealing Saul's throne. The Lord has given the kingdom to your son Absalom. Look how you've ended up in disaster because you're a murderer!”
9 Abishai, nwa Zeruaya gwara eze okwu sị, “Nʼihi gịnị ka nkịta a nwụrụ anwụ ga-eji na-akọcha onyenwe m bụ eze? Biko, ka m gafee gaa bipụ ya isi.”
Abishai, son of Zeruiah, asked the king, “Why should this dead dog curse Your Majesty? Let me go and cut off his head!”
10 Ma eze zara sị, “Gịnị jikọrọ mụ na unu, unu ụmụ ndị ikom Zeruaya. Ọ bụrụ na ọ na-akọcha m nʼihi na Onyenwe anyị sị ya ‘Kọchaa Devid,’ onye pụrụ ịjụ ajụjụ sị, ‘Gịnị mere ị ji na-eme ihe dị otu a?’”
“What's that got to do with you, you sons of Zeruiah?” the king replied. “If he's cursing me because the Lord told him to, then who can question what he's doing?”
11 Mgbe ahụ, Devid gwara Abishai na ndị ozi ya okwu sị, “Nwa m nwoke, onye si nʼahụ m na-agbalị ịnapụ m ndụ m. Gịnị ga-eme ka onye Benjamin a ghara ime karịa? Hapụ ya, ya kọchaa, nʼihi na Onyenwe anyị agwala ya ka ọ kọchaa m.
David said to Abishai and to all his officers, “Look, if my very own son is trying to kill me, why shouldn't this Benjamite want to even more! Leave him alone; let him curse me, for the Lord told him to.
12 Ma eleghị anya, Onyenwe anyị ga-ahụ ọnọdụ ahụhụ m, nyeghachikwa m ngọzị nʼọnọdụ nkọcha ndị a.”
Perhaps the Lord will see how I'm suffering and will pay me back with good for his curses today.”
13 Ya mere, Devid na ndị ya gakwara nʼihu ije ha nʼụzọ ahụ ma Shimei sokwara ha na-aga nʼakụkụ ugwu ahụ na-akọcha ha. Ọ nọgidekwara na-atụ Devid nkume, na-ekpolikwa aja elu ka ọ na-awụsa ha nʼahụ.
David and his men continued down the road, with Shimei keeping up with them on the hillside opposite. He went on cursing as he went along, throwing stones and dirt at David.
14 Ya mere, eze na ndị niile so ya gagidere bịaruo nʼakụkụ Jọdan nʼọnọdụ ike ọgwụgwụ. Nʼihi ya, ha nọdụrụ nʼebe ahụ zuo ike.
The king and everyone with him were tired out when they arrived at the Jordan. David rested there.
15 Ma Absalọm na ndị Izrel abatalarị Jerusalem. Ahitofel sokwa ya.
In the meantime Absalom and all the Israelites with him arrived in Jerusalem, along with Ahithophel.
16 Mgbe Hushaị, enyi Devid, onye Akai bịaruru, ọ gara hụ Absalọm sị ya, “Ka eze dị ogologo ndụ, ka eze dị ndụ.”
Hushai the Arkite, David's friend, went to see Absalom and declared, “Long live the king! Long live the king!”
17 Absalọm sịrị Hushaị, “Ọ bụ otu a ka i si egosi ịhụnanya i nwere na-ebe enyi gị nọ? Gịnị mere i soghị ya?”
“Is this how you show loyalty to your friend?” Absalom asked. “Why didn't you leave with your friend?”
18 Hushaị zara Absalọm sị, “Mba! Onye ahụ Onyenwe anyị na ọha mmadụ na ndị Izrel niile họpụtara, nke onye ahụ ka m ga-abụ. Ọ bụkwa onye ahụ ka m ga-adịnyere.
“Certainly not!” Hushai replied. “I'm on the side of the one chosen by the Lord, by the army, and by all the people of Israel. I will remain loyal to him.
19 Ma onye kwanụ ka m kwesiri ijere ozi? Ọ bụghị nwa eze? Ejeere m nna gị ozi, ugbu a anọkwa m jikere ijere gị ozi!”
In any case, why shouldn't I serve his son? In the same way I served your father I will serve you.”
20 Absalọm tụgharịrị gwa Ahitofel okwu sị, “Gịnị ọzọ ka m ga-eme? Nye anyị ndụmọdụ gị. Gịnị ka anyị kwesiri ime?”
Then Absalom asked Ahithophel, “Give me your advice. What shall we do?”
21 Ahitofel zara, “Ga dinaa ndị iko nwanyị nna gị ndị ahụ ọ hapụrụ ka ha lekọtaa ụlọ. Mgbe ahụ, Izrel niile ga-anụ na ị meela onwe gị ihe na-asọ oyi nʼebe nna gị nọ, aka ndị niile nọnyere gị ga-akwụkwa chịm.”
Ahithophel told him, “Go and sleep with your father's concubines—the ones he left here to look after the palace. Then everyone in Israel will realize that you have so offended your father there's no turning back, which will encourage all your supporters.”
22 Ya mere, ha manyeere Absalọm ụlọ ikwu nʼelu ụlọ; ọ kpọkwaara ndị iko nwanyị nna ya dinaa ha nʼotu nʼotu, nʼihu ndị Izrel niile.
So they put up a tent on the palace roof and Absalom went in and had sex with his father's concubines in the full view of everyone.
23 Nʼoge ahụ, ndụmọdụ ọbụla Ahitofel dụrụ dị ka a ga-asị na ọ bụ ozi si nʼọnụ Chineke nʼonwe ya bịa. Ọ bụladị nʼebe Devid nọ, na nʼebe Absalọm nọkwa, otu a ka esi bulie ndụmọdụ ọbụla Ahitofel nyere elu.
At that time Ahithophel's advice was like receiving messages from God himself. This was how both David and Absalom viewed Ahithophel's advice.