< 2 Samuel 15 >

1 Mgbe nke a gasịrị, Absalọm zụtaara onwe ya ụgbọ agha na ịnyịnya na-adọkpụ ya. O nwetakwaara onwe ya iri ndị ikom ise ndị na-agba ọsọ nʼihu ya.
Ma dopo, Assalonne si procurò un carro, cavalli e cinquanta uomini che correvano davanti a lui.
2 Nʼisi ụtụtụ, ọ na-ebili gaa guzo nʼakụkụ ọnụ ụzọ e si abata Jerusalem. Ọ bụrụ na ọ hụ onye ọbụla nwere okwu ọ chọrọ ka eze mara ihe banyere ya, Absalọm na-akpọ onye ahụ jụọ ya sị, “Olee obodo i si bịa?” Onye ahụ na-aza sị, “Ohu gị si nʼotu nʼime ebo dị nʼIzrel.”
Assalonne si alzava la mattina presto e si metteva da un lato della strada di accesso alla porta della città; quando qualcuno aveva una lite e veniva dal re per il giudizio, Assalonne lo chiamava e gli diceva: «Di quale città sei?», l'altro gli rispondeva: «Il tuo servo è di tale e tale tribù d'Israele».
3 Absalọm na-agwa onye ahụ sị, “Ahụrụ m na okwu gị niile bụ eziokwu. Ma ọ na-ewute m na eze enweghị onye na-enyere ya aka ịnụ okwu ndị a niile.”
Allora Assalonne gli diceva: «Vedi, le tue ragioni sono buone e giuste, ma nessuno ti ascolta da parte del re».
4 Absalọm na-ekwukwa sị, “Asị na m bụ onye ikpe nʼala Izrel, onye ọbụla nwere okwu na ụka gaara abịakwute m ka m mee ka ikpe ziri ezi rute ya aka.”
Assalonne aggiungeva: «Se facessero me giudice del paese! Chiunque avesse una lite o un giudizio verrebbe da me e io gli farei giustizia».
5 Mgbe onye ọbụla bịara ịkpọ isiala nye ya nʼọnọdụ nsọpụrụ, ọ na-eseti aka ya, jide onye ahụ sutu ya ọnụ.
Quando uno gli si accostava per prostrarsi davanti a lui, gli porgeva la mano, l'abbracciava e lo baciava.
6 Otu a ka Absalọm sị na-akpaso ndị Izrel agwa, bụ ndị ahụ niile na-abịakwute eze na-arịọ maka ikpe ziri ezi. O si otu a zuru obi ndị Izrel niile nʼohi.
Assalonne faceva così con tutti gli Israeliti che venivano dal re per il giudizio; in questo modo Assalonne si cattivò l'affetto degli Israeliti.
7 Mgbe afọ anọ gasịrị, Absalọm bịakwutere eze rịọọ ya sị, “Biko kwere ka m jee Hebrọn mezuoro Onyenwe anyị nkwa m kwere ya.
Ora, dopo quattro anni, Assalonne disse al re: «Lasciami andare a Ebron a sciogliere un voto che ho fatto al Signore.
8 Mgbe ohu gị bi na Geshua nʼime Aram, ekweere m nkwa a, ‘Ọ bụrụ na Onyenwe anyị ga-eme ka m lọghachi ọzọ na Jerusalem, aga m efe ya ofufe na Hebrọn.’”
Perché durante la sua dimora a Ghesùr, in Aram, il tuo servo ha fatto questo voto: Se il Signore mi riconduce a Gerusalemme, io servirò il Signore a Ebron!».
9 Eze sịrị ya, “Gaa nʼudo.” Ya mere, ọ pụrụ gaa Hebrọn.
Il re gli disse: «Và in pace!». Egli si alzò e andò a Ebron.
10 Mgbe ahụ, Absalọm zigara ndị ozi na nzuzo, ka ha gaa nʼebo niile nke ala Izrel. Nke a bụ ihe o ziri ha, “Mgbe unu nụrụ ụda opi ike, tienụ mkpu sị, ‘Absalọm abụrụla eze na Hebrọn.’”
Allora Assalonne mandò emissari per tutte le tribù d'Israele a dire: «Quando sentirete il suono della tromba, allora direte: Assalonne è divenuto re a Ebron».
11 Narị mmadụ abụọ si Jerusalem soro Absalọm gaa dịka ndị ọ kpọrọ oku oriri ma ha amaghị ihe ọbụla.
Con Assalonne erano partiti da Gerusalemme duecento uomini, i quali, invitati, partirono con semplicità, senza saper nulla.
12 Mgbe Absalọm nọkwa na-achụ aja ahụ, o ziri ozi ka a kpọọ Ahitofel onye Gailo, otu nʼime ndị na-adụ Devid ọdụ, ka o si Gailo bịa nke bụ obodo ya. Nke a mere ka nkwekọrịta nzuzo ọjọọ ahụ na-esi ike karịa, ndị dịnyere Absalọm na-amụbanyekwa.
Assalonne convocò Achitòfel il Ghilonita, consigliere di Davide, perché venisse dalla sua città di Ghilo ad assistere mentre offriva i sacrifici. La congiura divenne potente e il popolo andava crescendo di numero intorno ad Assalonne.
13 Ọ dịghị anya, onyeozi bịaruru Jerusalem gwa Devid na ndị Izrel niile kwagidere Absalọm.
Arrivò un informatore da Davide e disse: «Il cuore degli Israeliti si è volto verso Assalonne».
14 Mgbe ahụ, Devid gwara ndị ọrụ ya niile ndị ya na ha nọ na Jerusalem, sị, “Bilienụ! Anyị aghaghị ịgbapụ, ma ọ bụghị otu a, ọ dịghị onye nʼime anyị ga-agbanarị Absalọm. Anyị ga-ahapụ ugbu a, ma ọ bụghị ya, ọ ga-eme ngwa gafee anyị wetara anyị mbibi, werekwa mma agha gbuchapụ ndị niile nọ nʼobodo a.”
Allora Davide disse a tutti i suoi ministri che erano con lui a Gerusalemme: «Alzatevi, fuggiamo; altrimenti nessuno di noi scamperà dalle mani di Assalonne. Partite in fretta perché non si affretti lui a raggiungerci e faccia cadere su di noi la sventura e colpisca la città a fil di spada».
15 Ndị na-ejere ya ozi zara sị ya, “Anyị dịnyere gị! Anyị jikekwara ime ihe ọbụla onyenwe anyị eze kwuru.”
I ministri del re gli dissero: «Tutto secondo ciò che sceglierà il re mio signore; ecco, noi siamo i tuoi ministri».
16 Ya mere, eze na ndị ụlọ ya niile si na Jerusalem pụọ. Ọ dịghị onye ọ hapụrụ karịakwa ndị iko ya nwanyị iri nʼihi ilekọta obieze ahụ.
Il re dunque uscì a piedi con tutta la famiglia; lasciò dieci concubine a custodire la reggia.
17 Eze biliri pụọ, ya na ndị niile so ya, ha kwụsịrị nʼoke ala nke obodo ahụ.
Il re uscì dunque a piedi con tutto il popolo e si fermarono all'ultima casa.
18 Ndị niile na-ejere ya ozi, gafere nʼakụkụ ya, ha na ndị Keret na Pelet, na narị ndị ikom isii ndị Git, bụ ndị so ya site na Gat, gafekwara nọrọ nʼihu eze.
Tutti i ministri del re camminavano al suo fianco e tutti i Cretei e tutti i Peletei e Ittài con tutti quelli di Gat, seicento uomini venuti da Gat al suo seguito, sfilavano davanti al re.
19 Mgbe ahụ, Devid tụgharịrị kpọọ Itai, onye Git, ọchịagha narị ndị agha isii ahụ sị ya, “Gịnị mere i ji eso m? Laghachi azụ soro eze Absalọm, nʼihi na ị bụ ọbịa nʼIzrel, onye gbatara ọsọ ndụ.
Allora il re disse a Ittài di Gat: «Perché vuoi venire anche tu con noi? Torna indietro e resta con il re, perché sei un forestiero e per di più un esule dalla tua patria.
20 Ọ dịbeghị anya kemgbe ị bịara. M ga-esi aṅaa kwere ka i soro m na-awagharị, ebe ọ bụ na m amaghị ebe m na-aga. Chịrị ndị agha gị laghachi. Ka obiọma na ikwesi ntụkwasị obi dịnyere unu.”
Appena ieri sei arrivato e oggi ti farei errare con noi, mentre io stesso vado dove capiterà di andare? Torna indietro e riconduci con te i tuoi fratelli; siano con te la grazia e la fedeltà al Signore!».
21 Ma Itai zara eze sị, “Dịka Onyenwe anyị na-adị ndụ, onyenwe m na-adịkwa ndụ, ebe ọbụla onyenwe m bụ eze ga-anọ, ma ọ pụtara ndụ maọbụ ọnwụ, nʼebe ahụ ka odibo gị ga-anọkwa.”
Ma Ittài rispose al re: «Per la vita del Signore e la tua, o re mio signore, in qualunque luogo sarà il re mio signore, per morire o per vivere, là sarà anche il tuo servo».
22 Devid sịrị Itai, “Gaa nʼihu, gabiga.” Ya mere Itai, onye Git gabigara ya na ndị ikom ya niile, na ezinaụlọ niile ndị so ya.
Allora Davide disse a Ittài: «Và, prosegui pure!». Ittài, quello di Gat, proseguì con tutti gli uomini e con tutte le donne e i bambini che erano con lui.
23 Obodo niile tiri mkpu akwa mgbe ndị ahụ niile na-agabiga. Eze gafere ọdọ mmiri Kidrọn, ya na ndị mmadụ niile chere ihu nʼụzọ ọzara.
Tutti quelli del paese piangevano ad alta voce, mentre tutto il popolo passava. Il re stava in piedi nella valle del Cedron e tutto il popolo passava davanti a lui prendendo la via del deserto.
24 Zadọk bịakwara, ya na ndị Livayị niile, ndị bu igbe ọgbụgba ndụ Chineke. Ha dọbara igbe ọgbụgba ndụ Chineke nʼala. Abịata chụgidere aja tutu ruo mgbe mmadụ niile sitere nʼobodo ahụ gabigasịrị.
Ecco venire anche Zadòk con tutti i leviti, i quali portavano l'arca dell'alleanza di Dio. Essi deposero l'arca di Dio presso Ebiatàr, finché tutto il popolo non finì di uscire dalla città.
25 Mgbe ahụ, eze sịrị Zadọk, “Bughachi igbe Chineke a nʼime obodo. Ọ bụrụ na m ahụta amara nʼanya Onyenwe anyị, ọ ga-akpọghachi m mee ka m hụ ya, na ebe obibi ya anya ọzọ.
Il re disse a Zadòk: «Riporta in città l'arca di Dio! Se io trovo grazia agli occhi del Signore, egli mi farà tornare e me la farà rivedere insieme con la sua Dimora.
26 Ma ọ bụrụ na ọ sị, ‘Ihe banyere gị adịghị atọkwa m ụtọ,’ lee m, ya mee m otu o si dị ya mma nʼanya.”
Ma se dice: Non ti gradisco, eccomi: faccia di me quello che sarà bene davanti a lui».
27 Mgbe ahụ, eze gwara Zadọk bụ onye nchụaja sị, “Ọkwa ị bụ onye ọhụ ụzọ? Laghachi nʼobodo nʼudo, kpọrọ Ahimaaz nwa gị nwoke, na Jonatan nwa Abịata. Gị na Abịata kpọrọ ụmụ unu ndị ikom abụọ ndị a laghachi nʼobodo.
Il re aggiunse al sacerdote Zadòk: «Vedi? Torna in pace in città con tuo figlio Achimaaz e Giònata figlio di Ebiatàr.
28 Aga m akwụsị chere nʼebe e si akwọfe osimiri Jọdan, ruo mgbe ozi ga-esi nʼebe ị nọ bịa.”
Badate: io aspetterò presso i guadi del deserto, finché mi sia portata qualche notizia da parte vostra».
29 Mgbe ahụ, Zadọk na Abịata bughachiri igbe Chineke na Jerusalem. Ha nọdụkwara nʼebe ahụ.
Così Zadòk ed Ebiatàr riportarono a Gerusalemme l'arca di Dio e là dimorarono.
30 Ma Devid na ndị so ya chere ihu irigo Ugwu Oliv. Mgbe ọ na-aga, Devid nọ na-akwa akwa. O yikwaghị ihe ọbụla nʼụkwụ ya, ma o ji ihe kpuchie isi ya. Ndị niile so ya kpuchikwara isi ha na-akwakwa akwa ka ha na-arịgo.
Davide saliva l'erta degli Ulivi; saliva piangendo e camminava con il capo coperto e a piedi scalzi; tutta la gente che era con lui aveva il capo coperto e, salendo, piangeva.
31 Mgbe a gwara Devid na Ahitofel onye na-adụ ya ọdụ dịnyere Absalọm, Devid kpere ekpere sị, “O Onyenwe anyị, biko, tụgharịa ndụmọdụ Ahitofel ka ọ bụrụ ndụmọdụ nzuzu.”
Fu intanto portata a Davide la notizia: «Achitòfel è con Assalonne tra i congiurati». Davide disse: «Rendi vani i consigli di Achitòfel, Signore!».
32 Mgbe Devid bịaruru nʼelu Ugwu Oliv, ebe ndị mmadụ na-anọ na-efe Chineke ofufe, Hushaị, onye Akai nọ nʼebe ahụ na-eche izute ya. Uwe ya dọwakwara adọwa, aja dịkwa ya nʼisi.
Quando Davide fu giunto in vetta al monte, al luogo dove ci si prostra a Dio, ecco farglisi incontro Cusài, l'Archita, con la tunica stracciata e il capo coperto di polvere.
33 Ma Devid sịrị ya, “Ọ bụrụ na i soro m, ị ga-abụ ibu arọ nye m.
Davide gli disse: «Se tu procedi con me, mi sarai di peso;
34 Ma ọ bụrụ na ị laghachi nʼobodo, sị Absalọm, ‘Aga m abụ ohu gị, eze. Abụ m ohu nna gị nʼoge gara aga, ugbu a aga m abụ ohu gị.’ Nʼụzọ dị otu a ị ga-enyere m aka mebie ndụmọdụ Ahitofel.
ma se torni in città e dici ad Assalonne: Io sarò tuo servo, o re; come sono stato servo di tuo padre prima, così sarò ora tuo servo, tu dissiperai in mio favore i consigli di Achitòfel.
35 Ọ bụ na Zadọk na Abịata ndị nchụaja agaghị eso gị nọdụ nʼebe ahụ? Gwa ha ihe ọbụla ị ga-anụta nʼụlọeze.
E non avrai forse là con te i sacerdoti Zadòk ed Ebiatàr? Quanto sentirai dire della reggia, lo riferirai ai sacerdoti Zadòk ed Ebiatàr.
36 Ụmụ ha ndị ikom, Ahimaaz nwa Zadọk na Jonatan nwa Abịata so ha nọdụ nʼebe ahụ. Zitere m ha ka ha gwa m ihe ọbụla ị nụtara.”
Ecco, essi hanno con loro i due figli, Achimaaz, figlio di Zadòk e Giònata, figlio di Ebiatàr; per mezzo di loro mi farete sapere quanto avrete sentito».
37 Ya mere Hushaị, enyi Devid, bịarutere Jerusalem mgbe Absalọm na-abata obodo ahụ.
Cusài, amico di Davide, arrivò in città quando Assalonne entrava in Gerusalemme.

< 2 Samuel 15 >