< 2 Samuel 13 >

1 Absalọm nwa Devid nwere otu nwanne nwanyị mara mma, aha ya bụ Tama. Ma Amnọn, otu nʼime ụmụ ndị ikom Devid, hụrụ nwaagbọghọ a nʼanya.
And it came to pass after this, that Absalom the son of David had a fair sister, whose name was Tamar; and Amnon the son of David loved her.
2 Ma ịhụnanya a Amnọn hụrụ Tama nwanne ya nwanyị mere ya ka ọ daa ọrịa, nʼihi na ọ bụ ihe rara Amnọn ahụ ịchọpụta ụzọ ya na Tama ga-esi nwee mmekọ, ebe ọ bụ na Tama bụ nwaagbọghọ na-amaghị nwoke.
And Amnon was so distressed that he fell sick because of his sister Tamar; for she was a virgin; and it seemed hard to Amnon to do any thing unto her.
3 Ma Amnọn nwere otu enyi dị aghụghọ, onye aha ya bụ Jonadab, nwa Shimea, nwanne Devid.
But Amnon had a friend, whose name was Jonadab, the son of Shimeah David's brother; and Jonadab was a very subtle man.
4 Otu ụbọchị, Jonadab bịakwutere Amnọn jụọ ya sị, “Gịnị mere, gị bụ nwa eze ji na-ata ahụ ụtụtụ niile? Ọ bụ na ị gaghị akọrọ m?” Amnọn gwara ya sị, “Ahụrụ m Tama nʼanya, bụ nwanne Absalọm, nwanne m nwoke.”
And he said unto him: 'Why, O son of the king, art thou thus becoming leaner from day to day? wilt thou not tell me?' And Amnon said unto him: 'I love Tamar, my brother Absalom's sister.'
5 Jonadab gwara ya sị, “Ọ dị mma. Lee ihe ị ga-eme. Gaa dinaa ala, dịka a ga-asị na ahụ adịghị gị. Mgbe nna gị bịara ileta gị, gwa ya okwu sị ya, ‘Achọrọ m ka nwanne m nwanyị bụ Tama bịa nye m ihe oriri. Achọrọ m ka ọ nọdụ nʼihu m sie nri ahụ, mgbe m na-ele ya anya, ka o jirikwa aka ya nye m nri ahụ.’”
And Jonadab said unto him: 'Lay thee down on thy bed, and feign thyself sick; and when thy father cometh to see thee, say unto him: Let my sister Tamar come, I pray thee, and give me bread to eat, and dress the food in my sight, that I may see it, and eat it at her hand.'
6 Amnọn mere otu a. Mgbe eze bịara ileta ya, Amnọn rịọrọ ya sị, “Biko, ka Tama bịa ebe a gheere m achịcha ole na ole ebe m ga-ahụ ya anya. Ka o jirikwa aka ya dozie ya nʼihu m ka m rie ya.”
So Amnon lay down, and feigned himself sick; and when the king was come to see him, Amnon said unto the king: 'Let my sister Tamar come, I pray thee, and make me a couple of cakes in my sight, that I may eat at her hand.'
7 Devid kwenyere, zie Tama ka ọ gaa nʼụlọ Amnọn gaa siere ya nri.
Then David sent home to Tamar, saying: 'Go now to thy brother Amnon's house, and dress him food.'
8 Tama gara nʼụlọ Amnọn, banyekwa nʼime ụlọ ebe o dinaa, ka Amnọn na-ele ya anya mgbe ọ na-agwọgharị ụtụ ọka. Emesịa, Tama gheere ya achịcha mara mma.
So Tamar went to her brother Amnon's house; and he was lying down. And she took dough, and kneaded it, and made cakes in his sight, and did bake the cakes.
9 Mgbe o cheziri achịcha ahụ nʼihu Amnọn, Amnọn jụrụ iri ya. Ihe o mere mgbe ahụ bụ inye ndị na-ejere ya ozi nọ nʼebe ahụ iwu sị ha niile pụọ ngwangwa. Ha niile pụkwara.
And she took the pan, and poured them out before him; but he refused to eat. And Amnon said: 'Have out all men from me.' And they went out every man from him.
10 Mgbe ahụ, Amnọn gwara Tama okwu sị, “Ugbu a, wetara m nri ahụ nʼime ụlọ ndina m, bịa jiri aka gị nye m ya.” Tama bugaara ya achịcha ahụ nʼime ụlọ ebe ihe ndina ya dị.
And Amnon said unto Tamar: 'Bring the food into the chamber, that I may eat of thy hand.' And Tamar took the cakes which she had made, and brought them into the chamber to Amnon her brother.
11 Ma mgbe Tama guzo nʼihu ya, Amnọn jidere ya nʼike sị ya, “Bịa, soro m dinaa, nwanne m nwanyị.”
And when she had brought them near unto him to eat, he took hold of her, and said unto her: 'Come lie with me, my sister.'
12 Tama zara sị ya, “Mba! Nwanne m nwoke. Emerụla m. Ihe dị otu a ekwesighị ime nʼala Izrel. Emela ihe ọjọọ dị otu a.
And she answered him: 'Nay, my brother, do not force me; for no such thing ought to be done in Israel; do not thou this wanton deed.
13 Olee ihe ga-abụ ọnọdụ m? Oleekwanụ ihe ga-abụ ọnọdụ gị? Olee ebe m ga-agbala izo onwe m nʼihi ihe ihere ga-adịrị m ma i mee ihe dị otu a? Ị ga-adị ka otu nʼime ndị nzuzu ọjọọ dị nʼIzrel. Biko, gwa eze, ọ ga-ekwe ka ị lụọ m.”
And I, whither shall I carry my shame? and as for thee, thou wilt be as one of the base men in Israel. Now therefore, I pray thee, speak unto the king; for he will not withhold me from thee.'
14 Ma Amnọn egeghị ntị. Ebe ọ bụ na ọ ka Tama ike, o jidere ya dinaa ya nʼike merụọ ya.
Howbeit he would not hearken unto her voice; but being stronger than she, he forced her, and lay with her.
15 Emesịa, Amnọn kpọrọ Tama asị. Nʼezie, ọ kpọrọ ya asị ugbu a karịa ịhụnanya ọ hụrụ ya na mbụ. Ọ gwara Tama okwu sị ya, “Bilie si nʼebe a pụọ ọsịịsọ!”
Then Amnon hated her with exceeding great hatred; for the hatred wherewith he hated her was greater than the love wherewith he had loved her. And Amnon said unto her: 'Arise, be gone.'
16 Ma Tama kwara akwa sị ya, “Mba! Ịjụ m otu a ka njọ karịa ihe ọjọọ i mere m.” Ma Amnọn egeghị ya ntị.
And she said unto him: 'Not so, because this great wrong in putting me forth is worse than the other that thou didst unto me.' But he would not hearken unto her.
17 Ọ kpọrọ nwokorobịa na-ejere ya ozi sị ya, “Chụpụ nwanyị a nʼezi, kpachiere m ụzọ nʼazụ.”
Then he called his servant that ministered unto him, and said: 'Put now this woman out from me, and bolt the door after her.' —
18 Onyeozi ya chụpụrụ ya nʼezi, kpachie ụzọ nʼazụ ya. Uwe mwụda nwere aka ogologo ka Tama yi, nʼihi na ọ bụ ụdị nke ụmụ ndị inyom eze na-amaghị nwoke na-eyi.
Now she had a garment of many colours upon her; for with such robes were the king's daughters that were virgins apparelled. — And his servant brought her out, and bolted the door after her.
19 Tama dọwara uwe mwụda ahụ o yi nʼahụ, werekwa ntụ kpokwasị onwe ya nʼisi, buru aka ya nʼisi na-eti mkpu akwa dịka ọ na-ala.
And Tamar put ashes on her head, and rent her garment of many colours that was on her; and she laid her hand on her head, and went her way, crying aloud as she went.
20 Nwanne ya nwoke, Absalọm jụrụ ya sị, “Amnọn, nwanne gị nwoke, o dinakwuuru gị? Ma ugbu a, nwanne m, gba nkịtị, nwanne gị nwoke ka ọ bụ. Etinyela ihe a mere nʼobi.” Tama nọrọ dịka onye mmadụ niile jụrụ ajụ nʼụlọ nwanne ya nwoke, bụ Absalọm.
And Absalom her brother said unto her: 'Hath Amnon thy brother been with thee? but now hold thy peace, my sister: he is thy brother; take not this thing to heart.' So Tamar remained desolate in her brother Absalom's house.
21 Mgbe eze Devid nụrụ ihe ndị a niile, iwe were ya nke ukwuu.
But when king David heard of all these things, he was very wroth.
22 Absalọm agwaghị Amnọn okwu ọbụla, maọbụ nke dị mma, maọbụ okwu ọjọọ. Ma ọ kpọrọ Amnọn asị nke ukwuu nʼihi ọnọdụ iweda nʼala o wedara nwanne ya Tama, mee ya ihe ihere.
And Absalom spoke unto Amnon neither good nor bad; for Absalom hated Amnon, because he had forced his sister Tamar.
23 Mgbe afọ abụọ gasịrị, mgbe ndị na-akpụchara Absalọm ajị ụmụ atụrụ ya nọ na Baal-Hazọ, nʼoke ala Ifrem, ọ kpọkọtara ụmụ ndị ikom eze niile ka ha bịa nʼebe ahụ.
And it came to pass after two full years, that Absalom had sheep-shearers in Baal-hazor, which is beside Ephraim; and Absalom invited all the king's sons.
24 Absalọm jekwuuru eze sị ya, “Ndị na-akpụcha ajị ụmụ atụrụ ohu gị bịara. Eze na ndịisi ozi ya, ha ga-abịa sonyere m?”
And Absalom came to the king, and said: 'Behold now, thy servant hath sheep-shearers; let the king, I pray thee, and his servants go with thy servant.'
25 Ma eze zara sị ya, “Mba, nwa m, anyị niile agaghị abịa, anyị ga-abụ ibu dị arọ nye gị.” Nʼagbanyeghị na Absalọm rugidere ya ma o kweghị aga, kama ọ gọziri ya.
And the king said to Absalom: 'Nay, my son, let us not all go, lest we be burdensome unto thee.' And he pressed him; howbeit he would not go, but blessed him.
26 Mgbe ahụ, Absalọm rịọrọ nna ya sị, “Ọ dị mma, ọ bụrụ na ị gaghị abịa, ị ga-emekwa ka nwanna m nwoke Amnọn, na ụmụ eze ndị ọzọ bịa?” Eze jụrụ ya sị, “Nʼihi gịnị ka Amnọn ga-eji soro gị gaa?”
Then said Absalom: 'If not, I pray thee, let my brother Amnon go with us.' And the king said unto him: 'Why should he go with thee?'
27 Ma Absalọm rụgidere ya, ya mere o zipụrụ Amnọn na ụmụ eze ndị ọzọ ka ha soro ya gaa.
But Absalom pressed him, and he let Amnon and all the king's sons go with him.
28 Mgbe ahụ, Absalọm nyere ndị na-ejere ya ozi iwu banyere Amnọn sị, “Cherenụ ruo mgbe mmanya bidoro igbu ya, mgbe m sịkwara unu tigbuo ya, unu atụla egwu, tigbuonụ ya. Ọ bụ m na-ekwu ihe ga-eme nʼebe a. Nweenụ obi ike, meekwanụ ya.”
And Absalom commanded his servants, saying: 'Mark ye now, when Amnon's heart is merry with wine; and when I say unto you: Smite Amnon, then kill him, fear not; have not I commanded you? be courageous, and be valiant.'
29 Mgbe oge ruru, ndị ozi Absalọm tigburu Amnọn. Mgbe ahụ, ụmụ eze niile biliri makwasị nʼịnyịnya ha gbalaga.
And the servants of Absalom did unto Amnon as Absalom had commanded. Then all the king's sons arose, and every man got him up upon his mule, and fled.
30 Mgbe ha ka nọ nʼụzọ na-agbaga Jerusalem, ozi eruolarị Devid ntị sị, “Absalọm egbuchaala ụmụ eze niile, ọ dịkwaghị otu onye nʼime ha fọdụrụ ndụ!”
And it came to pass, while they were in the way, that the tidings came to David, saying: 'Absalom hath slain all the king's sons, and there is not one of them left.'
31 Eze biliri ọtọ, dọwaa uwe ya, daa nʼala, gbatịa onwe ya nʼihi obi ọjọọ. Ndị na-ejere ya ozi dọwakwara uwe ha nʼihi egwu na obi ọjọọ.
Then the king arose, and rent his garments, and lay on the earth; and all his servants stood by with their clothes rent.
32 Ma Jonadab, nwa Shimea, nwanne Devid, sịrị, “Onyenwe m, echekwala na e gburu ụmụ ndị ikom eze niile, kama ọ bụ naanị Amnọn! Nke a bụ ihe Absalọm jikere ime site mgbe Amnọn wakporo nwanne ya nwanyị bụ Tama, dina ya.
And Jonadab, the son of Shimeah David's brother, answered and said: 'Let not my lord suppose that they have killed all the young men the king's sons; for Amnon only is dead; for by the appointment of Absalom this hath been determined from the day that he forced his sister Tamar.
33 Ma ugbu a, ka onyenwe m bụ eze ghara itinye akụkọ banyere ọnwụ ụmụ ndị ikom eze niile, nʼobi ya. Ọ bụ naanị Amnọn nwụrụ.”
Now therefore let not my lord the king take the thing to his heart, to think that all the king's sons are dead; for Amnon only is dead.'
34 Ma Absalọm gbara ọsọ gbalaga. Ọ dịghị anya nwoke na-anọ nʼelu mgbidi Jerusalem na-eche nche, lepụrụ anya hụ ndị mmadụ ka ha si nʼụzọ dị nʼakụkụ ugwu nta na-abịa. Nwoke ahụ gara gwa eze sị ya, “Ahụrụ m ndị si nʼakụkụ Horonaim, nʼakụkụ ugwu na-abịa.”
But Absalom fled. And the young man that kept the watch lifted up his eyes, and looked, and, behold, there came much people in a roundabout way by the hill-side.
35 Jonadab gwara eze sị, “Lee, ọ bụ ụmụ ndị ikom eze na-alọta dịka m kwuru.”
And Jonadab said unto the king: 'Behold, the king's sons are come; as thy servant said, so it is.'
36 Mgbe ha lọbatara, ha bidoro ịkwa akwa nke ukwuu. Eze na ndị na-ejere ya ozi sokwa kwaa akwa.
And it came to pass, as soon as he had made an end of speaking, that, behold, the king's sons came, and lifted up their voice, and wept; and the king also and all his servants wept very sore.
37 Absalọm gbara ọsọ gbakwuru Talmai nwa Amihud, eze Geshua. Ma eze Devid ruru ụjụ nke ukwuu maka ọnwụ Amnọn.
But Absalom fled, and went to Talmai the son of Ammihud, king of Geshur. And David mourned for his son every day.
38 Mgbe Absalọm gbara ọsọ gbaga Geshua, ọ nọrọ nʼebe ahụ afọ atọ.
So Absalom fled, and went to Geshur, and was there three years.
39 Ọ gụrụ eze bụ Devid agụụ ịgakwuru Absalọm, nʼihi ọ kasịela obi maka ọnwụ Amnọn.
And the soul of king David failed with longing for Absalom; for he was comforted concerning Amnon, seeing he was dead.

< 2 Samuel 13 >