< 2 Samuel 12 >

1 Ya mere, Onyenwe anyị zigara Netan ka o jekwuru Devid. Mgbe Netan bịakwutere Devid, ọ kọọrọ ya akụkọ a, “E nwere ndị ikom abụọ bi nʼotu obodo, otu bụ ọgaranya ma nke ọzọ bụ ogbenye.
Yahvé envoya Nathan auprès de David. Il vint le trouver et lui dit: « Il y avait dans une ville deux hommes, l'un riche et l'autre pauvre.
2 Onye ọgaranya a nwere ọtụtụ igwe atụrụ na igwe ehi.
Le riche avait beaucoup de troupeaux,
3 Ma nwoke ogbenye ahụ enweghị ihe ọbụla karịa otu nwa nne atụrụ nta nke ọ zụtara. Ọ zụlitere ya, o tolite nʼetiti ya na ụmụ ya. Ọ na-eri nri site na ihe oriri ya, na-aṅụ mmiri site nʼiko mmiri ya, nʼobi ya ka ọ na-edinakwa. Ọ nọ ọnọdụ dịka nwa nwanyị nye ya.
mais le pauvre n'avait rien, sauf une petite brebis qu'il avait achetée et élevée. Elle grandissait avec lui et avec ses enfants. Elle mangeait de sa nourriture, buvait dans sa coupe, se couchait dans son sein et était pour lui comme une fille.
4 “Otu ụbọchị, onye ọbịa bịara nʼụlọ onye ọgaranya ahụ. Ma kama ọgaranya ahụ ga-ewere otu atụrụ maọbụ ehi nke ya siere onye ọbịa ya nri, ọ gara were nne atụrụ ogbenye ahụ, gbuo ya, jiri ya siere ọbịa ya nri.”
Un voyageur vint chez le riche, et il ne voulut pas prendre de son propre troupeau et de son propre bétail pour le préparer pour le voyageur qui était venu chez lui, mais il prit l'agneau du pauvre et le prépara pour l'homme qui était venu chez lui. »
5 Devid were oke iwe megide nwoke ahụ, ọ sịrị Netan, “Ana m aṅụ iyi nʼaha Onyenwe anyị dị ndụ na onye mere ihe dị otu a aghaghị ịnwụ!
La colère de David s'enflamma contre cet homme, et il dit à Nathan: « L'Éternel est vivant, l'homme qui a fait cela mérite la mort!
6 Ọ ga-ejikwa nwa atụrụ okpukpu anọ kwụghachi ogbenye ahụ ụgwọ otu atụrụ ahụ o weere, nʼihi na onye ọgaranya ahụ egosighị na o nwere obi ebere ọbụla.”
Il doit rendre l'agneau au quadruple, parce qu'il a fait cette chose et parce qu'il n'a pas eu de pitié! ».
7 Mgbe ahụ, Netan sịrị Devid, “Ọ bụ gị bụ nwoke ahụ! Otu a ka Onyenwe anyị, Chineke Izrel sịrị, ‘Mụ onwe m tere gị mmanụ ịbụ eze Izrel, mụ onwe m napụtakwara gị site nʼaka Sọl.
Nathan dit à David: « Tu es l'homme de la situation! Voici ce que dit Yahvé, le Dieu d'Israël: « Je t'ai oint comme roi d'Israël et je t'ai délivré de la main de Saül.
8 Enyere m gị ụlọ nna gị ukwu, nyefekwa ndị inyom nna gị ukwu nʼaka gị, na alaeze Izrel na Juda, ka ha bụrụ nke gị. Ma ọ bụrụ na nke a ezughị, agaara m atụkwasịrị gị ihe ndị a niile okpukpu okpukpu.
Je t'ai donné la maison de ton maître et les femmes de ton maître dans ton sein, et je t'ai donné la maison d'Israël et de Juda; et si cela eût été trop peu, je t'en aurais ajouté beaucoup d'autres.
9 Gịnị mere i ji lelịa okwu Onyenwe anyị anya, mee ihe a jọgburu onwe ya? Nʼihi na i jirila mma agha gbuo Ụraya onye Het, zurukwa nwunye ya nʼohi. Ọ bụkwa mma agha ndị Amọn ka i ji gbuo ya.
Pourquoi avez-vous méprisé la parole de l'Éternel, pour faire ce qui est mal à ses yeux? Vous avez frappé par l'épée Urie, le Hittite, vous avez pris sa femme pour en faire votre épouse, et vous l'avez tué par l'épée des fils d'Ammon.
10 Ya mere, nʼihi ihe a i mere, mma agha agaghị esi nʼezinaụlọ gị pụọ, nʼihi na i ledara m anya kpọrọ nwunye Ụraya onye Het ka ọ bụrụ nwunye gị.’
Maintenant, l'épée ne s'éloignera jamais de ta maison, parce que tu m'as méprisé et que tu as pris pour femme la femme d'Urie, le Héthien ».
11 “Ihe a ka Onyenwe anyị kwuru, ‘Aga m eme ka ihe ọjọọ si nʼezinaụlọ gị bilie megide gị. Nʼihu gị ka m ga-eduru ndị nwunye gị dunye otu onye dị gị nnọọ nso, ya na ha ga-edinakọ nʼehihie ọcha, nʼihu ndị Izrel niile.
« Voici ce que dit Yahvé: 'Voici, je vais susciter le mal contre toi à partir de ta propre maison; je prendrai tes femmes sous tes yeux et les donnerai à ton prochain, et il couchera avec tes femmes sous les yeux de ce soleil.
12 I mere mmehie gị na nzuzo, ma aga m eme nke a na mbara, nʼihu Izrel niile.’”
Car vous avez fait cela secrètement, mais moi, je ferai cela devant tout Israël et devant le soleil.'"
13 Mgbe ahụ, Devid sịrị Netan, “Emehiela m megide Onyenwe anyị.” Netan zara sị ya, “Onyenwe anyị nʼonwe ya agbagharakwala gị mmehie gị, ị gaghị anwụ.
David dit à Nathan: « J'ai péché contre Yahvé. » Nathan dit à David: « Yahvé a aussi effacé ton péché. Tu ne mourras pas.
14 Ma nʼihi na i meela ka ndị iro Onyenwe anyị nwe ohere ikwulu na ilelị ya anya, nwa nwoke ahụ amụụrụ gị ga-anwụ.”
Mais, parce que tu as donné aux ennemis de Yahvé l'occasion de blasphémer, l'enfant qui te naîtra mourra. »
15 Mgbe Netan lara, Onyenwe anyị mere ka nwantakịrị ahụ nwunye Ụraya mụụrụ Devid daa ọrịa.
Puis Nathan s'en alla dans sa maison. Yahvé frappa l'enfant que la femme d'Urie avait enfanté à David, et celui-ci fut très malade.
16 Devid rịọrọ Chineke arịrịọ banyere nwantakịrị ahụ. O buru ọnụ, dinaa nʼala efu abalị ahụ niile nʼihu Onyenwe anyị.
David supplia donc Dieu de lui accorder cet enfant; il jeûna, entra et passa la nuit à terre.
17 Emesịa, ndị okenye ụlọ ya rịọrọ Devid ka o bilie rie nri, ma ọ jụrụ iri ihe ọbụla.
Les anciens de sa maison se levèrent à côté de lui, pour le relever de terre; mais il ne voulut pas, et il ne mangea pas de pain avec eux.
18 Nʼụbọchị nke asaa, nwantakịrị ahụ nwụrụ. Mgbe ahụ, ndị na-ejere Devid ozi tụrụ egwu otu ha ga-esi gwa ya na nwantakịrị ahụ anwụọla. Nʼihi na ha kwuru nʼime onwe ha sị, “Mgbe nwantakịrị ahụ ka dị ndụ, anyị gwara ya okwu ma o geghị anyị ntị. Anyị ga-esi aṅaa gwa ya na nwantakịrị ahụ anwụọla? O nwere ike imerụ onwe ya ahụ.”
Le septième jour, l'enfant mourut. Les serviteurs de David eurent peur de lui annoncer que l'enfant était mort, car ils disaient: « Voici, lorsque l'enfant était encore vivant, nous lui avons parlé et il n'a pas écouté notre voix. Comment se fera-t-il donc du mal si nous lui disons que l'enfant est mort? ».
19 Mgbe Devid hụrụ na ha na-ekwurịta okwu nʼetiti onwe ha na nzuzo; ọ matara na nwa ahụ anwụọla. Ọ jụrụ ha sị, “Nwata ahụ ọ nwụọla?” Ha zara sị ya, “E, ọ nwụọla!”
Mais lorsque David vit que ses serviteurs chuchotaient ensemble, il comprit que l'enfant était mort; et David dit à ses serviteurs: « L'enfant est-il mort? » Ils ont dit: « Il est mort. »
20 Mgbe ahụ, Devid sitere nʼala ebe o dina, bilie, saa ahụ, gbanwee uwe ya, baa nʼụlọ Onyenwe anyị, kpọọrọ ya isiala. Ọ lọghachiri nʼụlọ ya nye iwu ka e wetara ya ihe oriri. O rikwara nri.
Alors David se leva de terre, se lava, s'oignit et changea de vêtements, puis il entra dans la maison de Yahvé et se prosterna. Puis il rentra dans sa maison; et quand il demanda, on mit du pain devant lui et il mangea.
21 O juru ndị na-ejere ya ozi anya, nʼihi ya ha jụrụ ya ajụjụ si, “Gịnị mere i ji eme omume dị otu a? Mgbe nwantakịrị ahụ nọ ndụ, i buru ọnụ, kwaakwa akwa, ma ugbu a, nwa ahụ anwụọla, ị kwụsịla iru ụjụ. Ugbu a, ị biliela na-erikwa nri.”
Alors ses serviteurs lui dirent: « Qu'est-ce que tu as fait? Tu as jeûné et pleuré l'enfant pendant qu'il était vivant, mais quand l'enfant est mort, tu t'es levé et tu as mangé du pain. »
22 Devid zara ha sị, “Eburu m ọnụ, kwaakwa akwa mgbe nwa ahụ nọ ndụ, nʼihi na ekwuru m sị, ‘ma eleghị anya, Onyenwe anyị ga-enwe ọmịiko nʼebe m nọ mee ka nwa ahụ dị ndụ.’
Il dit: « Lorsque l'enfant vivait encore, j'ai jeûné et pleuré, car je disais: « Qui sait si Yahvé ne me fera pas grâce, afin que l'enfant vive? »
23 Ma ugbu a ọ nwụrụ, gịnịkwa ka m nwere dịka uru ibu ọnụ ọzọ? M pụrụ ime ka ọ dị ndụ ọzọ? Aga m alakwuru ya, ma ọ gaghị alaghachikwutekwa m.”
Mais maintenant, il est mort. Pourquoi devrais-je jeûner? Puis-je le ramener à la vie? J'irai vers lui, mais il ne reviendra pas vers moi. »
24 Devid kasiri Batsheba nwunye ya obi, emesịa, mgbe ya na ya dinakọrọ, ọ tụụrụ ime ọzọ mụọ nwa nwoke onye ha kpọrọ aha ya Solomọn. Ma Onyenwe anyị hụrụ nwantakịrị ahụ nʼanya.
David consola sa femme Bethsabée, alla vers elle, et coucha avec elle. Elle enfanta un fils, et il lui donna le nom de Salomon. L'Éternel l'aima.
25 O zigara ozi site nʼaka Netan, onye amụma, ka a gụọ ya Jedidaya nʼihi Onyenwe anyị.
Il envoya par la main de Nathan le prophète, qui lui donna le nom de Jedidia, à cause de l'Éternel.
26 Nʼoge a, Joab busoro Raba obodo ndị Amọn agha dọta isi obodo eze ha nʼagha.
Joab fit la guerre à Rabba, des enfants d'Ammon, et prit la ville royale.
27 Joab zigara Devid ozi sị ya, “Ebuola m agha megide Raba dọta isi mmiri ọṅụṅụ ya nʼagha.
Joab envoya des messagers à David, et dit: « J'ai combattu contre Rabba. Oui, j'ai pris la ville des eaux.
28 Ugbu a chịkọtaa ndị agha fọdụrụ bịa lụpụchaa agha a, ka ị dọta obodo a nʼagha. Ọ bụrụ na i meghị otu a, aga m adọta obodo a nʼagha, a ga-akpọkwasịkwa ya aha m.”
Maintenant, rassemble le reste du peuple, campe contre la ville et prends-la, de peur que je ne prenne la ville et qu'on l'appelle de mon nom. »
29 Nʼihi nke a, Devid duuru ndị agha Izrel jeruo Raba, buso ya agha, meriekwa ya.
David rassembla tout le peuple, alla à Rabba, l'attaqua et la prit.
30 Devid kpupuru okpueze nke dị nʼisi eze ha, e kpunye ya nʼisi nke ya onwe ya. Ịdị arọ nke okpueze ahụ ruru kilogram ọlaedo iri atọ na anọ, nke e ji nkume ndị dị oke ọnụahịa chọọ mma. Devid sitekwara nʼobodo ahụ kwakọrọ ọtụtụ ihe nkwata nʼagha.
Il enleva de sa tête la couronne de leur roi, dont le poids était d'un talent d'or, et dans laquelle il y avait des pierres précieuses, et il la mit sur la tête de David. Il fit sortir de la ville une grande quantité de butin.
31 Ọ kpọpụtara ndị nọ nʼebe ahụ, manye ha nʼịrụ ọrụ nke e ji mma nkwọ e ji awa osisi, na igwe e ji egwu ala na anyụike nʼarụ. O mere ka ha rụọ ọrụ nʼebe a na-akpụ blọk brik. Devid mekwara otu ihe a nʼobodo niile nke ụmụ Amọn. Emesịa, ya na ndị agha ya niile laghachiri na Jerusalem.
Il fit sortir les gens qui s'y trouvaient et les fit travailler sous des scies, sous des pioches de fer, sous des haches de fer, et les fit passer au four à briques; il fit ainsi dans toutes les villes des enfants d'Ammon. Puis David et tout le peuple retournèrent à Jérusalem.

< 2 Samuel 12 >