< 2 Samuel 11 >
1 Nʼoge ọkọchị, mgbe ndị eze na-apụ ibu agha, Devid zipụrụ Joab ọchịagha ya, na ndị agha Izrel. Ha bibiri ndị Amọn, nọchibidokwa Raba. Ma Devid nọdụrụ na Jerusalem.
Ikawa wakati wa majira ya kipupwe, wakati ambapo kwa kawaida wafalme huenda vitani, Daudi akamtuma Yoabu, mtumishi wake, na jeshi lote la Israeli. Wakaliaribu jeshi la Amoni na kuuhusuru Raba. Lakini Daudi akakaa Yerusalemu.
2 Nʼotu uhuruchi, Devid sitere nʼihe ndina ya bilie, gagharịa nʼelu ụlọeze ya. Ọ sitere nʼelu ụlọ ahụ hụ otu nwanyị na-asa ahụ. Nwanyị ahụ mara mma nke ukwu nʼile anya.
Hivyo ikawa siku moja wakati wa jioni Daudi akaamka kutoka kitandani na akatembea katika dari la kasri. Akiwa pale akamwona mwanamke aliyekuwa akioga, mwanamke yule alikuwa mzuri sana kwa mwonekano.
3 Devid ziri ozi ka a jụta onye nwanyị ahụ bụ, ma a gwara ya na ọ bụ Batsheba, nwa Eliam, nwunye Ụraya onye Het.
Hivyo Daudi akatuma na kuuliza watu waliomfahamu yule mwanamke. Mtu mmoja akasema, “Je huyu siye Bathsheba, binti Eliamu, naye si mke wa Uria mhiti?
4 Devid ziri ka a gaa kpọta ya. Mgbe ọ bịara, ya na Devid dinara. (Ka ọ ghụchasịrị onwe ya site nʼadịghị ọcha ya nke ọnwa ahụ.) Ọ laghachiri nʼụlọ ya.
Daudi akatuma wajumbe nao wakamchukua; akaja kwake, na akalala naye(kwani ndo alikuwa amejitakasa kutoka siku zake). Kisha akarudi nyumbani kwake.
5 Nwanyị a mechara dị ime, bịa ziga ozi ka agwa Devid. Ọ sịrị, “Adị m ime.”
Mwanamke akawa mjamzito, naye akatuma na kumwambia Daudi; akasema, “mimi ni mjamzito.”
6 Mgbe Devid nụrụ ya, o zigaara Joab ozi sị ya, “Zitere m Ụraya, onye Het.”
Kisha Daudi akatuma watu kwa Yoabu kusema, “Umtume kwangu Uria mhiti.” Hivyo Yoabu akamtuma Uria kwa Daudi.
7 Mgbe Ụraya bịakwutere ya, Devid jụrụ ya otu Joab mere, na otu ndị agha Izrel dị na otu agha si aga.
Uria alipofika, Daudi akamuuliza hali ya Yoabu. Jinsi jeshi lilivyokuwa likiendelea, na jinsi vita vilivyokuwa vinaendelea.
8 Devid sịrị Ụraya, “Laa nʼụlọ gị gaa saa ụkwụ gị.” Ụraya si nʼụlọeze pụọ. E zipụkwara onyinye nke ndị na-ejere eze ozi ji sochie ya azụ.
Daudi akamwambia Uria, “Shuka nyumbani kwako, unawe miguu yako. “Hivyo Uria akaondoka katika kasri la mfalme, mfalme akamtumia zawadi kwa Uria.
9 Ma Ụraya agaghị nʼụlọ ya. Kama o so ndị na-ejere eze ozi dinaa nʼọnụ ụzọ e si abata ụlọeze.
Lakini Uria akalala pamoja na watumishi wa bwana wake katika lango la kasri, wala hakushuka nyumbani kwake.
10 Mgbe a gwara Devid na Ụraya alaghị nʼụlọ ya, Devid kpọrọ Ụraya, jụọ ya ajụjụ sị, “Ọ bụghị ije dị anya ka i si lọta? Gịnị mere ị larughị nʼụlọ gị?”
Daudi alipoambiwa, “Uria hakushuka nyumbani kwake,” akamwambia Uria, Je haukutoka safarini? Kwa nini haukushuka nyumbani kwako?”
11 Ụraya zara Devid, “Lee, igbe ọgbụgba ndụ Onyenwe anyị, na Izrel na Juda niile nọ nʼụlọ ikwu. Nna m ukwu Joab na ndị agha nna m ukwu nọ nʼọhịa. M ga-esi aṅaa laa nʼụlọ m, iri na ịṅụ ihe ọṅụṅụ na isoro nwunye m dinaa? Ana m aṅụ iyi na agaghị m eme ihe dị otu a.”
Uria akamjibu Daudi, “Sanduku, na Israeli na Yuda wamo kwenye mahema, na Yoabu na watumishi wa bwana wangu wamepiga hema uwandani. Jinsi gani basi mimi naweza kwenda nyumbani kwangu kula kunywa na kulala na mke wangu? kwa hakika kama uishivyo, sitafanya hivyo.
12 Devid gwara ya sị, “Ọ dị mma, nọdụ nʼebe a taa, echi ị ga-alaghachikwa nʼọgbọ agha.” Ụraya kwenyere nọdụ na Jerusalem ụbọchị ahụ, nakwa ụbọchị na-eso ya.
Hivyo Daudi akamwambia Uria, “Ukae leo pia, kesho nitakuacha uende.” Kwa hiyo uria akakaa Yerusalemu siku hiyo na iliyofuata.
13 Emesịa, Devid kpọrọ ya oriri, meekwa ya ka ọ ṅụbiga mmanya oke, ma nke a emeghị ka ọ laa nʼụlọ ya nʼabalị ahụ, kama ọ bụkwa nʼọnụ ụzọ e si abata ụlọeze ka o dinara nʼetiti ndị na-ejere eze ozi.
Daudi alipomwita, alikula na kunywa pamoja naye, Daudi akamfanya alewe. Wakati wa jioni Uria akaenda kulala kitandani pake pamoja na watumish wa bwana wake; hakushuka nyumbani kwake.
14 Nʼụtụtụ echi ya, Devid degaara Joab akwụkwọ, zighachịkwa ya site nʼaka Ụraya.
Hivyo asubuhi Daudi akamwandikia Yoabu barua, naye akaituma kwa mkono wa Uria.
15 Ihe ọ dere nʼakwụkwọ ahụ bụ nke a, “Tinye Ụraya nʼihu agha ebe ọgụ siri ike. Mgbe ndị iro na-apụkwute unu, laanụ azụ, ma hapụnụ Ụraya nʼihu ọgụ ka ndị iro gbuo ya.”
Ndani ya barua Daudi aliandika hivi, “Mweke Uria mbele ya vita vikali sana, na kisha, mmwache, ili apigwe na afe.
16 Ya mere, mgbe Joab gbara obodo ahụ gburugburu, o tinyere Ụraya nʼebe ọ maara na ndị dị ike nʼetiti ndị iro ha nọ.
Hivyo Yoabu alipoona mji ukizingirwa, alimweka Uria katika sehemu aliyojua askari adui wenye nguvu wangekuwa wakipigana.
17 Ndị ikom obodo ahụ pụtara buso Joab agha. Ụfọdụ ndị agha Devid nwụrụ. Ụraya onye Het, so na ndị egburu.
Wakati watu wa mji walipotoka na kupigana dhidi ya jeshi la Yoabu, baadhi ya askari wa Daudi wakaanguka, na Uria Mhiti pia akauwawa.
18 Mgbe ahụ, Joab zigara ozi gwa Devid otu agha si na-aga,
Wakati Yoabu alipotuma neno kwa mfalme kuhusu hali ya vita,
19 Ọ gwara onyeozi ahụ sị, “Mgbe ị gwachara eze akụkọ ihe gbasara otu agha si gaa
alimwagiza mjumbe, kusema, “Utakapomaliza kumwambia mfalme kuhusu hali ya vita,
20 iwe nwere ike iwe eze nke ukwu, na o nwere ike jụọ gị sị, ‘Gịnị mere unu ji gaa mgbidi obodo ahụ nso ịlụ agha? Ọ bụ na unu amaghị na a ga-esi nʼelu mgbidi ahụ gbaa àkụ?
yawezekana mfalme akakasirika, naye akakwambia, 'Kwa nini mlipigana na mji kwa karibu hivyo, hamkujua kwamba wangeweza kushambulia kutokea ukutani?
21 Onye gburu Abimelek nwa Jeru-Beshet? Ọ bụghị na mgbidi obodo ka nwanyị nọ tụdaa aka nkume dagburu ya na Tebez? Gịnị mere unu ji jeruo mgbidi ahụ nso?’ Ọ bụrụ na ọ jụọ gị ihe dị otu a, gwa ya, ‘Ohu gị bụ Ụraya, onye Het anwụọkwala.’”
Ni nani aliyemwua Abimeleki mwana wa Yerubeshethi? Siye mwanamke aliyerusha jiwe la kusagia juu yake kutoka ukutani, hata akafa huko Thebesi? Kwanini basi mliukaribia ukuta jinsi hiyo? Nawe umjibu, 'Uria mtumishi wako amekufa pia.”
22 Onyeozi ahụ biliri ije, mgbe o rutere, ọ gwara Devid ihe niile Joab ziri ya ka o zie.
Hivyo mjumbe akaondoka na kwenda kwa Daudi akamwambia kila jambo ambalo Yoabu alimtuma kusema.
23 Onyeozi ahụ sịrị Devid, “Ndị ikom ahụ ji ike karịrị anyị, ha pụtara ị buso anyị agha na mbara ma anyị chụghachiri ha azụ. Chụruo ha nʼọnụ ụzọ ama obodo ahụ.
Na mjumbe akamwambia Daudi, “Mwanzoni adui walikuwa na nguvu kuliko sisi; walitukabili uwandani, lakini tukawarudisha nyuma kwenye maingilio ya lango.
24 Mgbe ahụ, ndị ọgba ụta sitere nʼelu mgbidi malite ịgba ndị ohu gị àkụ, ụfọdụ nʼime ndị ikom eze nwụrụ. Ohu gị Ụraya, onye Het, sokwa na ndị nwụrụ.”
Na wapiga mishale wao wakawarushia watumishi wako kutoka ukutani, na baadhi ya watumishi wa mfalme wameuawa, na mtumishi wako Uria mhiti pia ameuawa.”
25 Devid sịrị onyeozi ahụ, “Otu a ka ị ga-agwa Joab, ‘Ka ihe a ghara iwute gị nʼobi, nʼihi na mma agha na-egbu otu onye dịka o si egbu onye ọzọ. Lụsie ọgụ ike, lụgbukwaa obodo ahụ.’ Jiri okwu ndị a gbaa ya ume.”
Kisha Daudi akamwambia mjumbe, “Mwambie hivi Yoabu, 'Usiruhusu jamba hili likuhuzunishe, kwa maana upanga huangamiza huyu kama uangamizavyo na mwingine. Vifanye vita vyako kuwa vyenye nguvu zaidi dhidi ya mji, na uuteke.' Mtie moyo Yoabu.”
26 Mgbe nwunye Ụraya nụrụ na di ya anwụọla, o ruru ụjụ nʼihi ya.
Hivyo mke Uria aliposikia kwamba mme wake amekufa, akaomboleza sana kwa ajili yake.
27 Mgbe oge iru ụjụ ya gabigara, Devid ziri ka a kpọta ya nʼụlọeze. Ọ ghọkwara nwunye ya. Mụọra ya nwa nwoke. Ma ihe Devid mere jọrọ njọ nʼanya Onyenwe anyị.
Huzuni yake ilipoisha, Daudi akatuma na kumchukua kwake katika kasri lake, naye akawa mkewe na akamzalia mwana. Lakini alichokifanya Daudi hakikumpendeza Yahwe.