< 2 Samuel 10 >
1 Mgbe ihe ndị a gasịrị, eze ndị Amọn nwụrụ. Hanọn nwa ya ghọrọ eze nʼọnọdụ ya.
Some time later, the king of the Ammonites died and was succeeded by his son Hanun.
2 Mgbe ahụ, Devid chere sị, “Aga m egosi Hanọn nwa Nahash obi ebere dịka nna ya si gosi m obi ebere.” Ya mere, Devid zipụrụ ndị ozi ka ha gaa kasịe ya obi nʼihi ọnwụ nna ya. Mgbe ndị ikom Devid rutere nʼala ndị Amọn,
And David said, “I will show kindness to Hanun son of Nahash, just as his father showed kindness to me.” So David sent some of his servants to console Hanun concerning his father. But when they arrived in the land of the Ammonites,
3 ndịisi ala Amọn sịrị Hanọn bụ onyenwe ha, “Ị na-eche na Devid na-akwanyere nna gị ụgwụ site na izite ndị ozi ya ka ha bịa kasịe gị obi? Ọ bụ na Devid eziteghị ha ịbịakwute gị, naanị ka ha bịa mee nledo nʼobodo a, nyochapụta ya ma kwatuo ya?”
the princes of the Ammonites said to Hanun their lord, “Just because David has sent you comforters, do you really believe he is showing respect for your father? Has not David instead sent his servants to explore the city, spy it out, and overthrow it?”
4 Nʼihi nke a, Hanọn jidere ndị ozi Devid nʼike, kpụchapụ otu mpaghara afụọnụ nwoke ọbụla, bipụkwa uwe mwụda ha nʼetiti ike ha, zilaga ha.
So Hanun took David’s servants, shaved off half of each man’s beard, cut off their garments at the hips, and sent them away.
5 Mgbe a gwara Devid ihe mere, o zipụrụ ndị ozi ka ha gaa zute ndị ikom ahụ, nʼihi na e mere ha ihe ihere nʼebe ọ dị ukwuu. Eze sịrị, “Nọdụnụ na Jeriko ruo mgbe afụọnụ unu tolitere, mgbe ahụ unu ga-alọta.”
When this was reported to David, he sent messengers to meet the men, since they had been thoroughly humiliated. The king told them, “Stay in Jericho until your beards have grown back, and then return.”
6 Ma mgbe ndị Amọn chọpụtara na ha abụrụla ihe ịsọ oyi nʼebe Devid nọ, ha gara goo iri puku ndị agha abụọ ji ụkwụ eje site nʼAram, Bet-Rehob nakwa Zoba. Ha gokwara eze Maaka ya na puku ndị ikom, tinyekwara iri puku ndị ikom na puku abụọ ọzọ site nʼala Tob.
When the Ammonites realized that they had become a stench to David, they hired twenty thousand Aramean foot soldiers from Beth-rehob and Zoba, as well as a thousand men from the king of Maacah and twelve thousand men from Tob.
7 Mgbe Devid nụrụ nke a, o zipụrụ Joab na ndị agha ya niile bụ dike na dimkpa nʼagha.
On hearing this, David sent Joab and the entire army of mighty men.
8 Ndị Amọn pụtara doo onwe ha nʼusoro ibu agha, nʼọnụ ụzọ ama nke obodo ha. Ma ndị Aram, ndị si Zoba na Rehob, na ndị ikom Tob na Maaka, nọpụrụ onwe ha na mbara ala.
The Ammonites marched out and arrayed themselves for battle at the entrance of the city gate, while the Arameans of Zobah and Rehob and the men of Tob and Maacah were by themselves in the open country.
9 Mgbe Joab hụrụ na agha dị megide ya nʼihu na azụ, ọ họpụtara ụfọdụ ndị ọkachamara site nʼetiti ndị agha Izrel, doo ha nʼusoro izute ndị Aram.
When Joab saw the battle lines before him and behind him, he selected some of the best men of Israel and arrayed them against the Arameans.
10 O tinyere ndị ikom fọdụrụ nʼokpuru ọchịchị Abishai, nwanne ya, zipụkwa ha izute ndị Amọn nʼagha.
And he placed the rest of the forces under the command of his brother Abishai, who arrayed them against the Ammonites.
11 Joab sịrị, “Ọ bụrụ na ndị agha Aram akarịa m ike, pụta bịa nyere m aka; ma ọ bụrụkwanụ na ndị Amọn akarịa gị ike, aga m apụta bịa napụta gị.
“If the Arameans are too strong for me,” said Joab, “then you will come to my rescue. And if the Ammonites are too strong for you, then I will come to your rescue.
12 Nwee obi ike, ka anyị lụọ ọgụ a dịka ndị dị ike, nʼihi ndị anyị, na obodo niile nke Chineke anyị. Ka Onyenwe anyị meekwa ihe dị mma nʼanya ya.”
Be strong and let us fight bravely for our people and for the cities of our God. May the LORD do what is good in His sight.”
13 Mgbe ahụ, Joab na ndị agha so ya bịara nso ibuso ndị Aram agha, ha sitere nʼihu ha gbapụ ọsọ.
So Joab and his troops advanced to fight the Arameans, who fled before him.
14 Mgbe ndị Amọn hụrụ ka ndị Aram na-agbapụ ọsọ, ha onwe ha gbakwara ọsọ nʼihu Abishai, gbaba nʼime obodo. Ya mere, Joab sitere nʼịlụso ndị Amọn agha lọghachi, bịa na Jerusalem.
When the Ammonites saw that the Arameans had fled, they too fled before Abishai, and they entered the city. So Joab returned from fighting against the Ammonites and came to Jerusalem.
15 Mgbe ndị Aram hụrụ na ndị Izrel tigburu ha; ha lara, chịkọtaa onwe ha ọnụ.
When the Arameans saw that they had been defeated by Israel, they regrouped.
16 Hadadeza mere ka a kpọta ndị Aram site nʼofe ọzọ nke Osimiri Yufretis. Ha gara Hilam, ha na ọchịagha ndị agha Hadadeza, a na-akpọ Shobak, onye na-edu ha.
Hadadezer sent messengers to bring more Arameans from beyond the Euphrates, and they came to Helam with Shobach the commander of Hadadezer’s army leading them.
17 Mgbe a gwara Devid banyere nke a, ọ chịkọtara ndị Izrel niile, gafee Jọdan, jeruo Hilam. Ndị Aram doro usoro agha ha izute Devid, lụsokwaa ya agha.
When this was reported to David, he gathered all Israel, crossed the Jordan, and went to Helam. Then the Arameans arrayed themselves against David and fought against him.
18 Ma ha sitere nʼihu ndị Izrel gbaa ọsọ, Devid gburu narị ndị ikom asaa na-anya ụgbọ agha nke ịnyịnya na-adọkpụ. Gbukwaa iri puku ndị agha anọ na-eji ụkwụ eje. O tidara Shobak, bụ ọchịagha ndị agha ha, ọ nwụọ nʼebe ahụ.
But the Arameans fled before Israel, and David killed seven hundred charioteers and forty thousand foot soldiers. He also struck down Shobach the commander of their army, who died there.
19 Mgbe ndị eze niile nọ nʼokpuru ọchịchị Hadadeza hụrụ na Izrel etigbuola ha, ha mere ka ha na ndị Izrel dịrị nʼudo, bụrụkwa ndị nọ nʼokpuru ha. Ya mere, ndị Aram tụrụ egwu inyere ụmụ Amọn aka ọzọ.
When all the kings who were subject to Hadadezer saw that they had been defeated by Israel, they made peace with Israel and became subject to them. So the Arameans were afraid to help the Ammonites anymore.