< 2 Pita 1 >
1 Ọ bụ Saimọn Pita, odibo na onyeozi nke Jisọs Kraịst, Na-edegara ndị niile anyị na ha ketara otu ụdị okwukwe a dị oke ọnụahịa, nʼime ezi omume nke Chineke na Onye nzọpụta anyị Jisọs Kraịst akwụkwọ ozi a:
Simon Petro, Mtumwa na Mtume wa Yesu Kristo, Kwa wale walioipokea imani ile ile ya thamani kama tulivyoipokea sisi, imani iliyo ndani ya haki ya Mungu na mwokozi wetu Yesu Kristo.
2 Ka amara na udo bara unu ụba, site na mmazu nke Chineke na nke Jisọs Onyenwe anyị.
Neema iwe kwenu; amani iongezeke kupitia maarifa ya Mungu na Bwana wetu Yesu.
3 O sitela nʼike o ji bụrụ Chi nye anyị ihe niile dị anyị mkpa ibi ndụ na-asọpụrụ ya, site nʼọmụma nke anyị mara ya, bụ onye ahụ kpọrọ anyị site nʼebube ya na ịdị mma ya.
Kupitia maarifa ya Mungu tumepata mambo yake yote kwa ajili ya uchaji wamaisha, Toka kwa Mungu aliyetuita kwa ajili ya uzuri wa utukufu wake.
4 O sitela nʼihe ndị a nye anyị nkwa dị ukwuu na nke dị oke ọnụahịa, ka anyị site na ha keta oke nʼụdịdị nsọ ya, si otu a gbanarị ịrụ arụ dị nʼụwa, nke ọchịchọ ọjọọ na-ebute.
Kwa njia hii alitutumainishia ahadi kuu za thamani. Alifanya hili ili kutufanya warith wa asili ya Mungu, kwa kadiri tunavyoendelea kuuacha uovu wa dunia hii.
5 Nʼihi nke a, gbalịsienụ ike ịtụkwasị ịdị mma nʼelu okwukwe unu, ma na-atụkwasịkwanụ ihe ọmụma nʼelu ịdị mma,
Kwa sababu hii, fanyeni bidii kuongeza uzuri kwa njia ya imani yenu, kwa sababu ya uzuri, maarifa.
6 tụkwasịkwanụ imerụ ihe nʼoke nʼelu ihe ọmụma, tụkwasịkwanụ ntachiobi nʼelu imerụ ihe na oke, ma na-atụkwasịkwanụ ibi ndụ dị ka ndị Chineke nʼelu ntachiobi.
Kupitia maarifa, kiasi, na kupitia kiasi saburi, na kupitia saburi, utauwa.
7 Tụkwasịkwanụ obiọma nye ụmụnna nʼelu ibi ndụ dị ka ndị Chineke, ma na-atụkwasịkwanụ ịhụnanya nʼelu obiọma nye ụmụnna.
Kupitia utauwa upendo wa ndugu na kupitia upendo wa ndugu, upendo.
8 Ọ bụrụ na unu enwe ihe ndị a nʼụzọ ha jubigakwara oke nʼime unu, mgbe ahụ ha ga-eme ka unu ndị na-adịghị amị mkpụrụ, bụrụ ndị na-amị mkpụrụ, na ndị bara uru nʼihe unu maara banyere Onyenwe anyị Jisọs Kraịst.
Kama mambo haya yamo ndani yenu, yakiendelea kukua ndani yenu, basi ninyi hamtakuwa tasa au watu msiozaa matunda katika maarifa ya Bwana wetu Yesu Kristo.
9 Ma onye ọbụla na-atụkwasịghị ihe ndị a nʼokwukwe ya nọ nʼọchịchịrị. Ọ naghị ahụ ụzọ. Ọ bụkwa onye na-echefu na a sachapụla ya mmehie ya, ndị o mere nʼoge gara aga.
Lakini yeyote asiyekuwa na mambo haya, huyaona mambo ya karibu tu; yeye ni kipofu. amesahau utakaso wa dhambi zake za kale.
10 Nʼihi ya ụmụnna m, gbalịsienụ ike iguzosike nʼọkpụkpọ na nhọpụta unu. Nke a ga-eme ka unu hapụ ịsọ ngọngọ maọbụ daa.
Kwa hiyo, ndugu zangu, fanyeni juhudi ili kujihakikishia uteule na wito kwa ajili yenu. Kama mtayafanya haya, hamtajikwaa.
11 Nʼụzọ dị otu a, a ga-enye unu ohere dị ukwuu iji bata nʼalaeze ebighị ebi nke Onyenwe anyị na Onye nzọpụta anyị Jisọs Kraịst. (aiōnios )
Hivyo mtajipatia wingi wa lango la kuingilia katika ufalme wa milele wa Bwana wetu na mwokozi Yesu Kristo. (aiōnios )
12 Aga m na-aga nʼihu na-echetara unu ihe ndị a site nʼoge ruo nʼoge. Ọ bụ ezie na unu maara na ha na-eguzosikwa ike nʼeziokwu ahụ unu natara.
Kwa hiyo mimi nitakuwa tayari kuwakumbusha mambo haya kila mara, hata kama mnayafahamu, na sasa mmekuwa imara katika kweli.
13 Ana m agụ ya nʼihe ziri ezi ịkpọte mmụọ unu na uche unu site nʼichetara unu ihe ndị a ugbu a m dị ndụ nʼanụ ahụ a.
Nafikiria kuwa niko sahihi kuwaamsha na kuwakumbusha juu ya mambo haya, ningali nimo katika hema hii.
14 Nʼihi na Onyenwe anyị Jisọs Kraịst agwala m hoohaa, na m ga-eyipụ ya nʼoge na-adịghị anya.
Kwa maana najua kuwa si muda mrefu nitaiondoa hema yangu, kama Bwana Yesu Kristo alivyonionyesha.
15 Aga m agbalịsi ike ịhụ na mgbe m hapụchara ụwa nke a, unu ga na-echeta ihe ndị a mgbe niile.
Nitajitahidi kwa bidii kwa ajili yenu ili mkumbuke mambo haya baada ya mimi kuondoka.
16 Ihe niile anyị na-akọrọ unu abụghị akụkọ ifo mmadụ kọrọ site nʼamamihe ya. Nʼihi na anyị kọwaara unu ihe banyere ike Onyenwe anyị Jisọs Kraịst na ọbịbịa ọ ga-abịa ọzọ. Ọ bụ anya anyị abụọ ka anyị ji hụ ebube nke ịbụ eze ya.
Kwa kuwa sisi hatukufuata hadthi zilizoingizwa kwa ustadi pale tulipowaeleza juu ya nguvu na kujidhihirisha kwa Bwana wetu Yesu Kristo, bali sisi tulikuwa mashahidi wa utukufu wake.
17 Nʼihi na ọ natara nsọpụrụ na ebube site nʼaka Chineke bụ Nna mgbe olu ahụ si nʼebube ahụ dị ukwuu daa sị, “Onye a bụ Ọkpara m, onye m hụrụ nʼanya, onye ihe ya dị m ezi mma.”
Yeye alipokea Utukufu na heshima toka kwa Mungu baba pale sauti iliposikika toka katika utukufu mkuu ikisema, “Huyu ndiye mwanangu, mpendwa wangu ambaye nimependezwa naye.”
18 Anyị onwe anyị nụrụ olu ahụ si nʼeluigwe daa mgbe anyị so ya nọdụ nʼelu ugwu nsọ ahụ.
Tuliisikia sauti hii ikitokea mbinguni pale tulipokuwa naye kwenye ule mlima mtakatifu.
19 Anyị nwapụtara na okwu ndị amụma ahụ bụ ihe mezuru emezu. Unu onwe unu kwesikwara ilezi anya nʼokwu ndị ahụ, dịka a ga-asị na ha bụ ìhè na-enwu nʼebe ọchịchịrị gbara nke na-adị ruo mgbe chi bọrọ, mgbe e mere ka kpakpando ọtụtụ walie nʼobi unu.
Tunalo hili neno la unabii lililothibitika, ambalo kwalo mwafanya vyema kulitekeleza. Ni kama taa ing'aayo gizani mpaka kuchapo na nyota za mawio zionekanazo katika mioyo yenu.
20 Nke ka nke, ghọtanụ na okwu amụma ọbụla dị nʼakwụkwọ nsọ abụghị nke e dere dịka akọnuche mmadụ si dị.
Tambueni haya ya kwamba, hakuna unabii unaoandikwa kwa sababu ya kujifikirisha kwa nabii mwenyewe.
21 Nʼihi na o nweghị okwu amụma ọbụla nke e chepụtara dị ka ọchịchọ obi mmadụ si dị, kama mgbe ndị mmadụ kwuru okwu nʼaha Chineke, ọ bụ Mmụọ Nsọ duru ha.
Kwa kuwa hakuna unabii uliokuja kwa mapenzi ya mwanadamu, isipokuwa wanadamu waliwezeshwa na Roho Mtakatifu aliyeongea toka kwa Mungu.