< 2 Ndị Eze 1 >

1 Moab nupuru isi megide Izrel mgbe Ehab nwụrụ.
Moabu aliasi dhidi ya Israeli baada ya kifo cha Ahabu.
2 Nʼoge a, Ahazaya sitere na mgbe ụlọ elu ya dị na Sameria daa, merụọ ahụ nke ukwuu. Nʼihi ọrịa a, o zigara ndị ozi, sị ha, “Gaa jụta ase nʼaka Baal-Zebub, bụ chi Ekrọn, ma m ga-adịrị site nʼihe mmerụ ahụ a.”
Baada hapo Ahazi akaanguka chini ya dirisha lenye waya zinazikinzana kwenye chumba chake juu katika Samaria, na alikuwa amejeruhiwa. Kwa hiyo alituma wajumbe na kuwaambia, “Nendeni, muulizeni Baal Zebubu, mungu wa Ekroni, kama nitapona hili jeraha.”
3 Ma mmụọ ozi Onyenwe anyị gwara Ịlaịja onye Tishbe okwu sị ya, “Gaa zute ndị ozi eze Sameria zipụrụ, jụọ ha sị, ‘Gịnị mere unu ji aga Ekrọn ịjụ ase? Ọ bụ na Chineke anọghị nʼIzrel mere unu ji aga ịjụ Baal-Zebub ase ịmata ma eze ọ ga-adị ndụ?’
Lakini malaika wa Yahwe wakamwambia Eliya Mtishbi, “Inuka, nenda ukaonane na wajumbe wa mfalme wa Samaria, na uwaulize, 'Je ni kwasababu hakuna Mungu katika israeli ambaye mnayekwenda kuuliza pamoja na Zebebu, mungu wa Ekroni?
4 Nʼihi nke a, otu a ka Onyenwe anyị kwuru, ‘Ị gaghị esite nʼelu ihe ndina ahụ bilie. Ị ghaghị ịnwụ!’” Ya mere Ịlaịja pụrụ gaa zie ndị ozi eze ozi ahụ.
Kwa hiyo Yahwe anasema, “Hutaweza kushuka chini kutoka kwenye kitanda ambacho ulichokipanda; badala yake, utakufa hakika."”” Baada ya hapo Eliya akaondoka.
5 Ndị ozi ahụ laghachiri azụ. Ma mgbe eze hụrụ ha, ọ jụrụ ha sị, “Gịnị mere unu ji lọghachi?”
wakati wale wajumbe waliporudi kwa Ahazia, akawaambia, “Kwa nini mmerudi?”
6 Ha zara ya, “Otu nwoke zutere anyị nʼụzọ sị anyị, ‘Laghachi ga zie eze ahụ zitere unu sị ya: “Ihe ndị a, ka Onyenwe anyị kwuru, Ọ bụ nʼihi na Chineke anọghị nʼIzrel ka i ji zipụ ndị mmadụ ka ha gaa jụta ase site nʼaka Baal-Zebub, chi ndị Ekrọn? Nʼihi nke a, ị gaghị esite nʼihe ndina gị bilie. Ya doo gị anya na ị ghaghị ịnwụ!”’”
Wakamwambia, “mtu amekuja kuonana na sisi ambaye ametuambia, 'Turudi kwa mfalme ambaye aliyewatuma, na mkamwambie, Yahwe amesema hivi: 'Je ni kwa sababu hakuna Mungu katika Israeli mpaka mmewatuma watu kwenda kumuuliza kwa Baal Zabubu, mungu wa Ekron? Kwa hiyo hutashuka kutoka kitanda ulichokipanda; badala yake, utakufa hakika."””
7 Eze jụrụ ha sị, “Onye bụ nwoke a zutere unu nʼụzọ gwa unu okwu ndị a? Olee ụdị mmadụ ọ bụ?”
Ahazi akawaambia wajumbe wake, “'Alikuwa mtu wa aina gani, yule ambaye alikuja kuonana na ninyi na akasema haya maneno kwenu?”
8 Ha zaghachiri ya, “Ọ bụ nwoke yi uwe e ji ajị anụ kpaa; o kere ihe okike akpụkpọ anụ nʼukwu ya.” Eze sịrị, “Ọ bụ Ịlaịja, onye amụma si Tishbe!”
Wakamjibu, “Alikuwa amevaa kanzu yenye manyaya na alikuwa na mkanda wa ngozi kiunanoni kwake.'” Hivyo mfalme akajibu, '“Yule alikuwa Eliya Mtishbi.”
9 Mgbe ahụ, eze zigara otu onyeisi agha ya, na iri ndị agha ise ka ha gaa jide Ịlaịja. Mgbe ndị agha ahụ bịarutere hụ Ịlaịja ka ọ nọ ala nʼelu ugwu, onyeisi agha ahụ kpọrọ Ịlaịja sị ya, “Onye nke Chineke, eze sị gị, ‘rituo!’”
Ndipo mfalme akatuma nahodha wa askari hamsini kwa Elya. Nahodha akaenda mpaka kwa Eliya ambapo alipokuwa amekaa juu ya mlima. Nahodha akamwambia Eliya, “Wewe, mtu wa Mungu, mfalme amesema, 'shuka chini.'”
10 Ịlaịja zara sị ha, “Ọ bụrụ na m bụ onye nke Chineke dịka i kwuru, ka ọkụ si nʼeluigwe daa rechapụ gị na iri ndị a agha ise so gị.” Otu mgbe ahụ, ọkụ sitere nʼeluigwe daa rechapụ iri ndị agha ise ahụ na onyeisi ha.
Eliya akajibu na kusema kwa nahodha, “Kama mimi ni mtu wa Mungu, moto na ushuke chini kutoka mbinguni na kukula wewe na watu wako hamsini.” Kisha moto ukashuka chini kutoka mbinguni na kumla yeye na watu wake hamsini.
11 Ọzọkwa, eze zigara otu onyeisi agha na iri ndị agha ise ọzọ ka ha gaa jide Ịlaịja. Mgbe ha bịarutere hụ Ịlaịja, onyeisi agha ahụ kpọkuru ya sị ya, “Onye nke Chineke, eze sị gị, ‘rituo, bịa ngwangwa!’”
Tena Mfalme Ahazi akamtuma nahodha mwingine pamoja na maaskari wengine hamsini. Huyu nahodha pia akasema kwa Eliya, “Wewe, mtu wa Mungu, mfalme anasema, teremka chini haraka.”'
12 Ịlaịja zara sị ya, “Ọ bụrụ na m bụ onye nke Chineke dịka i kwuru, ka ọkụ si nʼeluigwe daa rechapụ gị na iri ndị agha ise gị na ha so.” Ngwangwa, ọkụ Chineke si nʼeluigwe daa rechapụ ha.
Eliya akajibu na kuwaambia, “Kama mimi ni mtu wa Mungu, ngoja moto ushuke kutoka mbinguni na ukule wewe na watu wako hamsini.” Moto wa Mungu ukashuka chini tena kutoka mbinguni na kumla yeye na watu wake hamsini.
13 Ọzọkwa, eze zigara otu onyeisi agha na iri ndị agha ise ọzọ ka ha gaa jide Ịlaịja. Mgbe ndị agha a bịara hụ Ịlaịja, onyeisi agha ahụ rigoro nʼelu ugwu gbuo ikpere nʼala nʼihu Ịlaịja rịọọ ya amara sị ya, “Onye nke Chineke, biko, meere ohu gị na iri ndị agha ise mụ na ha so ebere.
Bado tena mfalme alituma kundi la tatu la wapiganaji hamsini. Huyu nahodha akaenda, akaanguka mbele ya miguu ya Eliya, na kumsihi na kumwambia, “Wewe, mtu wa Mungu, Nakuomba, acha uzima wangu na uzima wa hawa watumishi wako hamsini uwe na thamani machoni kwako.
14 Lee, ọkụ esitela nʼeluigwe rechapụ ndịisi agha abụọ ahụ buru ụzọ, ha na ndị agha ha. Ugbu a, biko, arịọ m gị, chebe ndụ anyị.”
Ndipo, moto ukashuka chini kutoka mbinguni na kuwala wale manahodha wawili wa kwanza pamoja na watu wao, bali sasa acha uzima wangu uwe na thamani machoni kwako.”
15 Mgbe ahụ, mmụọ ozi Onyenwe anyị gwara Ịlaịja okwu sị ya, “Atụla egwu! Soro ya gaa!” Ya mere, Ịlaịja sooro onyeisi agha ahụ gaa nʼihu eze.
Malaika wa Yahwe akamwambia Eliya, “'Nenda chini pamoja naye. Usimwogope.”' Hivyo Eliya akainuka na kwenda chini pamoja naye kwenda kwa mfalme.
16 Mgbe Ịlaịja ruru nʼihu eze, ọ gwara eze okwu sị ya, “Ihe ndị a ka Onyenwe anyị kwuru, ọ bụ nʼihi na Chineke anọghị nʼIzrel ka i ji zipụ ndị ozi ka ha gaa jụta ase site nʼaka Baal-Zebub, chi ndị Ekrọn? Ebe ọ bụ na i mere ihe dị otu a, ị gaghị esite nʼihe ndina gị bilie. Ị ga-anwụrịrị!”
Baadye Eliya akamwambia Ahazia, '“Hivi ndivyo Yahwe asemavyo, Umewatuma wajumbe kuzungumza pamoja na Baal-Zebubu, mungu wa Ekron. Je ni kwa sababu hakuna Mungu katika Israeli ambaye unayeweza kumuuliza habari? Kwa hiyo sasa, hutaweza kushuka chini kutoka kwenye kitanda ulichokipanda; utakufa hakika.'”
17 Ọ nwụrụ dịka okwu Onyenwe anyị nke Ịlaịja kwuru si dị. Nʼihi na Ahazaya enweghị nwa nwoke ọbụla, Jehoram nọchiri anya ya dịka eze, nʼafọ nke abụọ nke ịbụ eze Jehoram nwa Jehoshafat, bụ eze Juda.
Hivyo Mfalme Ahazia alikufa kulingana na neno la Yahwe ambalo Eliya alilisema. Yoramu alianza kutawala katika eneo lake, katika mwaka wa pili Yoramu mwana wa Yohoshafati mfalme wa Yuda, kwa sababu Ahazia hakuwa na mtoto.
18 Akụkọ banyere ịbụ eze nke Ahazaya, na ihe niile o mere, e deghị ha nʼakwụkwọ akụkọ ndị eze Izrel?
Kama mambo mengine yanayomuhusu Ahazia, je hayakuandikwa katika kitabu cha matukio ya wafalme wa Israeli?

< 2 Ndị Eze 1 >