< 2 Ndị Eze 9 >
1 Emesịa, Ịlaisha onye amụma, kpọrọ otu onye nʼime ụmụ ndị amụma sị ya, “Jikere, fanye ọnụ uwe mwụda gị nʼeriri ikere nʼukwu gị, werekwa karama mmanụ oliv a nʼaka gị, bịa ka ị gaa Ramọt Gilead.
A KAHEA aku la o Elisai ke kaula i kekahi o na haumana a ka poe kaula, i aku la ia ia, E kaei oe i kou puhaka, a lawe i keia hue aila ma kou lima, a e hele aku i Ramota-Gileada.
2 I jeruo ebe ahụ, jee hụ Jehu nwa Jehoshafat, nwa Nimshi anya. Mee ka o bilie site nʼetiti ndị ha na ya nọ. Mekwaa ka gị na ya naanị baa nʼime ụlọ.
A hiki oe ilaila, e imi aku oe ilaila ia Iehu, ko keiki a Iehosapata, ke keiki a Nimesi, a komo aku oe, a hooku ia ia mai waena mai o kona poe hoahanau, a hookomo ia ia i ke keena maloko.
3 Were karama mmanụ wụkwasị ya nʼisi gwa ya okwu sị, ‘Otu a ka Onyenwe anyị kwuru, eteela m gị mmanụ ịbụ eze Izrel.’ I mesịa, meghe ụzọ ọsịịsọ, sitekwa nʼebe ahụ gbapụ ọsọ.”
Alaila e lawe oe i ka hue aila, a e ninini maluna o kona poo, a e i aku, Ke olelo mai nei o Iehova peneia, Ua poni aku au ia oe i alii maluna o ka Iseraela. Alaila e wehe ae oe i ka puka, a holo aku, mai kali oe.
4 Nwokorobịa onye amụma ahụ gara Ramọt Gilead.
A hele aku la ke kanaka ui i Ramota-Gileada, he kaula hoi ua kanaka ui la.
5 Mgbe o jeruru, ọ hụrụ ebe ọchịagha ahụ nọdụrụ nʼala nʼetiti ndịisi agha ibe ya. O kwuru sị, “Enwere m ozi m ga-ezi gị, ọchịagha.” Jehu jụrụ, “Ọ bụ onye nʼime anyị ka ị chọrọ izi ozi?” Ọ zara, “Ọ bụ gị ọchịagha.”
A hiki aku ia, aia hoi, e noho ana na luna o ke kaua; i aku la ia, Ho wahi olelo ka'u ia oe, e ka luna. I mai la o Iehu, Ia wai o makou a pau? I aku la ia, Ia oe, e ka luna.
6 Jehu biliri baa nʼime ụlọ. Nwokorobịa onye amụma ahụ wụkwasịrị ya mmanụ nʼisi, sị ya, “Otu a ka Onyenwe anyị, Chineke Izrel sịrị, ‘Eteela m gị mmanụ ịbụ eze ndị nke Onyenwe anyị, bụ Izrel.
Ku ae la ia a komo iloko o ka hale; a ninini iho la ia i ka aila maluna o kona poo. a i aku la ia ia, Ke olelo mai nei o Iehova ke Akua o ka Iseraela, Ua poni aku au ia oe i alii maluna o na kanaka o Iehova, maluna o ka Iseraela.
7 Ị ga-ekpochapụ ezinaụlọ Ehab, nna gị ukwu, aga m esi otu a bọtara onwe m ọbọ, nʼihi ọbara ndị ohu m, bụ ndị amụma na ọbara ndị ozi Onyenwe anyị niile Jezebel wufuru.
A e pepehi aku oe i ko ka hale o Ahaba kou haku, i hoopai aku ai au i ko koko o ka'u poe kauwa, o na kaula, a me ke koko o na kauwa a pau a Iehova ma ka lima o Iezebela.
8 Ezinaụlọ Ehab ga-abụ ihe lara nʼiyi. Nʼala Izrel, m ga-esite nʼezinaụlọ Ehab bipụ ndị ikom niile, maọbụ ohu maọbụ onye nwe onwe ya.
A e pau auanei ko ka hale a pau o Ahaba; a oki aku au i na kane a pau no Ahaba, a o ka mea i paa, a me ka mea i paa ole iloko o ka Iseraela.
9 M ga-ala ụlọ Ehab nʼiyi, ka m si laa ezinaụlọ Jeroboam nwa Nebat nʼiyi, na dịka m si lakwaa ezinaụlọ Baasha, nwa Ahija nʼiyi.
A e hana like aku au i ko ka hale o Ahaba me ko ka hale o Ieroboama ke keiki a Nebata, a me ko ka hale o Baasa, ke keiki a Ahiia.
10 Nkịta ga-erikwa anụ Jezebel nwunye Ehab na Jezril. Ọ dịkwaghị onye ga-eli ya.’” Mgbe o kwuchara okwu ndị a, onye amụma ahụ meghere ụzọ gbapụ ọsọ.
A e ai na ilio ia Iezebela ma ka aina i Iezereela, aohe mea nana ia e kanu. A wehe ae la ia i ka puka, a holo aku la.
11 Jehu jekwuuru ndịisi agha ibe ya. Otu onye nʼime ha jụrụ ya sị, “Gịnị ka onye ara ahụ chọrọ bịa? Udo ọ dịkwa?” Jehu zara, “Unu maara onye ọ bụ, marakwa ụdị okwu ga-esi ya nʼọnụ pụta.”
Alaila puka iwaho o Iehu i na kauwa a kona haku, a ninau mai kekahi ia ia, He pono anei? No ke aha la i hele mai ai keia hehena i ou la? I aku la ia ia lakou, Ua ike oukou i ke kanaka, a me kana olelo.
12 Ha sịrị, “Ihe i kwuru abụghị eziokwu, gwa anyị ihe o kwuru.” Jehu sịrị, “Ihe ndị a ka ọ gwara m, ‘Otu a ka a Onyenwe anyị kwuru, Eteela m gị mmanụ ịbụ eze Izrel.’”
I aku la lakou ia ia, He wahahee; e hai mai oe ia makou ano. I mai la ia, Me neia, me neia kana i olelo mai ai ia'u, i mai la, Ke i mai nei o Iehova peneia, Ua poni aku au ia oe i alii maluna o ka Iseraela.
13 Ngwangwa ha chịịrị uwe mgbokwasị ha niile doo ha nʼusoro nʼala ebe ahụ ka Jehu zọkwasị ha ụkwụ. Ha fụrụ opi ike tie mkpu sị, “Jehu bụ eze!”
Alaila wikiwiki lakou, a lawe ae la kela kanaka keia kanaka i kona aahu, a waiho malalo iho ona maluna o ke alapii, a puhi i na pu, i aku la, E alii ana o Iehu.
14 Otu a ka Jehu nwa Jehoshafat, nwa Nimshi, si gbaa izu megide Joram. (Nʼoge a, Joram na ndị Izrel niile na-eche Ramọt Gilead nche, nʼihi Hazael eze Aram.)
A kipi iho la o Iehu ke keiki a Iehosapata, ke keiki a Nimesi, ia Iorama. (A o Iorama e kiai ana ia ma Ramota-Gileada, oia, a me ka Iseraela a pau, no Hazaela ke alii o Suria.
15 Ma Joram bụ eze, laghachitere na Jezril ebe ọ nọ ka ahụ dị ya mma maka ahụ ndị Aram merụrụ ya mgbe ya na Hazael, eze Aram lụrụ agha. Ya mere, Jehu sịrị, “Ọ bụrụ na nke a bụ uche unu, ime m eze unu, unu ekwela ka onye ọbụla si nʼobodo a gbapụ, gaa Jezril kọọ akụkọ a.”
A ua hoi aku o Iorama ke alii ma Iezereela e hoolaia i kona eha a ko Suria i hana eha ai ia ia, i kona manawa i kaua aku ai ia Hazaela ke alii o Suria.) A i aku la o Iehu, Ina oukou e manao, mai puka aku e pakele kekahi mai ke kulanakauhale aku e hele ia e hai aku ma Iezereela.
16 Mgbe ahụ, Jehu wụkwasịrị nʼelu ụgbọ agha ya gbaga Jezril, nʼihi na Joram nọ nʼebe ahụ na-ezu ike. Ma Ahazaya, bụ eze Juda gakwara ileta ya.
A holo aku la o Iehu ma ka halekaa, a hele aku la i Iezereela; no ka mea, e waiho ana o Iorama malaila. A ua iho mai o Ahazia, ke alii o ka Iuda, e ike ia Iorama.
17 Mgbe onye nche nọ nʼụlọ elu Jezril hụrụ Jehu na ndị agha ya ka ha na-abịa, o tiri mkpu sị, “Lee, o nwere ndị agha na-abịa.” Joram eze Izrel nyere iwu sị, “Zipụ otu onye na-agba ịnyịnya ka ọ gaa zute ha jụọ ha sị, ‘Udo ọ dịkwa?’”
A e ku ana ke kanaka kiai maluna o ka hale kiai ma Iezereela, a ike aku la ia i ka poe nui o Iehu i kona hele ana mai, i aku la ia, Ke ike nei au i ka poe nui. I mai la o Iorama, e lawe oe i ka hooholelio, a e hoouna aku e halawai me lakou, a e ninau aku ia, He aloha anei?
18 Onye ọgbaịnyịnya ahụ nọkwasịrị nʼelu ya gbapụ izute Jehu, sị, “Otu a ka eze sịrị, ‘Udo ọ dịkwa?’” Jehu zara, “Gịnị ka gị na udo nwekọrọ? Tụgharịa gaa soro m nʼazụ.” Onye nche ahụ ziri ozi sị, “Onyeozi ahụ ezutela ha, kama ọ naghị alọta.”
A holo aku la kekahi maluna o ka lio e halawai me ia, a i aku la, Ke olelo mai nei ke alii peneia, He aloha anei? I aku la o Iehu, Heaha kau i ke aloha? e huli ae oe mahope o'u. A hai aku la ke kanaka kiai, i aku la, Hele aku la ke elele io lakou la, aole i hoi hou mai.
19 Eze zipụrụ onye ọgbaịnyịnya nke abụọ. Mgbe ọ bịakwutere ha ọ sịrị, “Otu a ka eze sịrị, ‘Udo ọ dịkwa?’” Jehu zara, “Gịnị ka gị na udo nwekọrọ? Chigharịa soro m nʼazụ.”
A hoouna hou aku la ia i ka lua maluna o ka lio a hiki aku la ia io lakou la, i aku la, Ke olelo mai nei ke alii peneia, He aloha anei? I aku la o Iehu, Heaha kau i ke aloha? E huli ae oe mahope o'u.
20 Onye ahụ nọ na-eche nche sịrị, “Ọ garuola ha nso, ma ọ dịghị alọghachitekwa azụ. Ma ọgbụgba ịnyịnya dịka ọ bụ Jehu nwa Nimshi, nʼihi na ọ na-agba ịnyịnya ya dịka onye na-ayị ara.”
A hai aku la ke kiai, i aku la, Ua hele aku ia io lakou la, aole i hoi hou mai; a o ka holo ana, ua like me ka holo ana o Iehu ke keiki a Nimesi, no ka mea, ke holo la ia e like me ka hehena huhu.
21 Joram nyere iwu sị, “Kwadooro m ụgbọ agha m.” Mgbe a kwadooro ya, Joram eze Izrel, na Ahazaya, eze Juda, pụtara nọkwasị nʼụgbọ agha, onye ọbụla na nke ya, pụọ ịga izute Jehu. Ha zutere ya nʼoke ala ubi Nebọt, onye Jezril.
I aku o Iorama, E hoomakaukau; a hoomakaukauia iho la kona halekaa. A hele aku la o Iorama ke alii o ka Iseraela, a o Ahazia ke alii o ka Iuda, o kela keia ma kona halekaa iho, a hele aku e halawai me Iehu, a loaa ia lakou ia ma ka aina o Nabota no Iezereela.
22 Mgbe Joram hụrụ Jehu, ọ jụrụ, “Ị bịara nʼudo? Udo ọ dịkwa, Jehu?” Jehu zara, “Olee otu udo ga-esi dịrị, ebe ọ bụ na ihe ọjọọ niile nke ikpere arụsị na mgbaasị nke Jezebel nne gị, jupụtara nʼebe niile.”
A i ka manawa i ike ai o Iorama ia Iehu, i aku la ia, He aloha anei, e Iehu? Ninau mai la ia, Heaha ke aloha i ka manawa i nui loa ai na hoomanakii o Iezebela kou makuwahine, a me ka anaana ana?
23 Joram chigharịrị ụgbọ agha ya bido ịgba ọsọ. Mgbe ọ na-agba ọsọ, o tiri mkpu kpọkuo Ahazaya sị ya, “Ahazaya, Aghụghọ dị, ọgbaaghara dị!”
A huli ae la o Iorama, a holo aku la, a i aku la ia Ahazia, He kipi, e Ahazia.
24 Jehu jiri ike ya niile dọtịa ụta o ji nʼaka ya gba ya Joram. Ọ gbatara Joram àkụ ahụ nʼazụ. Àkụ ahụ sikwa ya nʼobi pụta. Nke a mere ka Joram daa nʼime ụgbọala ya nwụọ.
A lawe o Iehu i ke kikoo ma kona lima, a pana aku la ia Iorama mawaena o kona mau lima, a puka aku la ka pua ma kona puuwai, a haule iho la ia maloko o kona halekaa.
25 Mgbe ahụ, Jehu sịrị Bidka, bụ onyeisi agha ya, “Bulie ya, tụba ya nʼubi Nebọt onye Jezril. Chetakwa na mụ na gị nọkwasịrị nʼelu ịnyịnya, anyị abụọ, na-eso nna ya Ehab, mgbe Onyenwe anyị kwuru okwu amụma a megide ya.
Alaila i aku la oia ia Bidekara i kona luna, E kaikai, a hoolei aku ia ia iloko o ka aina kihapai o Nabota no Iezereela; no ka mea, e hoomanao oe i ka wa a kaua elua i holo pu ai, mamuli o Ahaba kona makuakane, ua kau mai o Iehova i keia mea kaumaha maluna iho ona.
26 ‘Nʼezie, ahụrụ m ọbara Nebọt na ọbara ụmụ ya ndị ikom ụnyaahụ, otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara, nʼihi ya, aghaghị m ime ka ị kwụghachi ụgwọ ọbara ha nʼala ubi a.’ Ugbu a, bulie ya tụba ya nʼala ubi a dị ka okwu Onyenwe anyị si dị.”
Ua ike io no au inehinei i ke koko o Nabota, a me ke koko o kana mau keiki, wahi a Iehova; a e hoopai aka au ia oe ma keia aina, wahi a Iehova. Ano hoi, e lawe, a e hoolei aku ia ia iloko o ua aina la, e like me ka olelo a Iehova.
27 Mgbe Ahazaya eze Juda, hụrụ ihe mere, ọ gbaara ọsọ na-agbago nʼụzọ Bet Hagan. Ma Jehu chụsoro ya, na-eti mkpu sị, “Gbukwuonụ ya.” Ha merụrụ ya ahụ ka ọ nọ nʼụgbọ agha ya, nʼụzọ ịga Gua, nso Ibleam, ọ gbara ọsọ ga Megido ebe ọ nọ nwụọ.
A ike aku la o Ahazia ke alii o ka Iuda, alaila holo aku la ia ma ke ala o ka hale ma ke kihapai. A hahai aku la o Iehu mahope ona, a i aku la ia, E pepehi aku ia ia hoi ma ka halekaa i ka pii ana ma Gura, e kokoke ana i Ibeleama. A holo aku la ia i Megido, a make iho la ilaila.
28 Ndị ohu ya ji ụgbọ agha bịa buru ozu ya bubata ya na Jerusalem, lie ya nʼebe e liri nna nna ya ha, nʼobodo Devid.
A lawe aku la kana poe kauwa ia ia maloko o ka halekaa i Ierusalema, a kanu iho la ia ia iloko o ka halelua me kona poe kupuna ma ke kulanakauhale o Davida.
29 Nʼafọ iri na otu nke ọchịchị Joram nwa Ehab, ka Ahazaya malitere ịbụ eze Juda.
I ka umikumamakahi o ka makahiki o Iorama ke keiki a Ahaba, hoomaka iho la o Ahazia e noho alii maluna o ka Iuda.
30 Mgbe Jezebel nụrụ na Jehu abịaruola Jezril, ọ banyere nʼụlọ ya, tee uri nʼanya abụọ, dozie agịrị isi ya, pụta bịa nọdụ ala nʼakụkụ oghereikuku, site nʼebe ahụ na-elepụ anya nʼezi.
A hiki aku la o Iehu i Iezereela, lohe ae la o Iezebela; a pena iho la ia i kona maka, a hooponopono i kona poo, a nana mai la ma ka pukamakani.
31 Mgbe Jehu batara nʼọnụ ụzọ e si abata ụlọeze, Jezebel kpọkuru ya sị, “Ị bịara nʼudo, gị Zimri, gị onye gburu nna gị ukwu.”
A komo aku la o Iehu ma ka pukapa, ninau mai la keia, I maluhia anei o Zimeri, nana i pepehi kona haku?
32 Jehu leliri anya elu lee anya na oghereikuku tie mkpu sị, “Onye dịnyeere m?” Onozi abụọ maọbụ atọ na-eje ozi nʼụlọeze lepụtara anya lee ya anya.
A nana aku la ia iluna ma ka pukamakani, i aku la, Owai ka mea ma o'u nei? Owai? A nana mai la ia ia elua a ekolu paha mau luna hale.
33 Jehu nyere ha iwu sị ha, “Tụdanụ ya nʼala.” Ya mere, ha si nʼelu ebe ahụ tụda ya nʼala. Mgbe ọ daruru ala, ọbara ya fesasịrị nʼahụ mgbidi ụlọ na nʼahụ ịnyịnya ndị ji ụkwụ ha zọjaa ya.
I aku la ia, E hoolei mai ia ia ilalo. A hoolei iho la lakou ia ia ilalo, a helelei iho kekahi o kona koko ma ka papohaku, a maluna o na lio: a hehiia iho la ia malalo o na wawae.
34 Jehu banyere nọ nʼime ụlọeze rie ihe, ṅụkwaa ihe ọṅụṅụ. Emesịa, o nyere iwu sị, “Leenụ nwanyị a a bụrụ ọnụ; burunu ya gaa lie ya, nʼihi na ọ bụ ada eze.”
A komo aku la ia maloko, a ai iho la ia, a inu hoi, a i aku la, E hele, e nana aku ano i keia mea i hoinoia, a e kanu aku ia ia, no ka mea, he kaikamahine ia a kekahi alii.
35 Mgbe ha pụtara ili ya, ọ bụ naanị okpokoro isi ya na ọkpụkpụ ụkwụ ya abụọ, na aka ya abụọ ka ha hụrụ. Ha ahụkwaghị anụ ahụ ya.
A hele aku la lakou e kanu ia ia, aole i loaa ia lakou kekahi mea ona, o ka puniu wale no, a me na wawae, a me na poho lima.
36 Ha laghachiri gwa Jehu ihe ha hụrụ. Ọ zara sị ha, “Nke a bụ okwu Onyenwe anyị, nke o kwuru site nʼọnụ ohu ya Ịlaịja onye Tishbe sị: ‘Nʼala ubi dị na Jezril ka nkịta ga-anọ rie anụ ahụ Jezebel.
No ia mea, hoi mai lakou, hai aku ia ia. I mai la ia, O keia ka olelo a Iehova ana i olelo mai ai, ma kana kauwa, ma Elia no Tiseba, i ka i ana'e, Ma ka aina i Iezereela e ai iho ai na ilio i ka io o Iezebela.
37 Ozu Jezebel ga-adị ka unyi nʼala ubi dị na Jezril, ruo na mmadụ enweghị ike ikwupụta sị, Nke a bụ Jezebel.’”
A e like auanei ke kupapau o Iezebela me ka lepo maluna o ke kula o ka aina i Iezereela; nolaila, aole lakou e olelo ae, O Iezebela keia.