< 2 Ndị Eze 9 >

1 Emesịa, Ịlaisha onye amụma, kpọrọ otu onye nʼime ụmụ ndị amụma sị ya, “Jikere, fanye ọnụ uwe mwụda gị nʼeriri ikere nʼukwu gị, werekwa karama mmanụ oliv a nʼaka gị, bịa ka ị gaa Ramọt Gilead.
And Elisha the prophet called one of the sons of the prophets, and said to him, Gird up thy loins, and take this vial of oil in thy hand, and go to Ramoth-Gilead.
2 I jeruo ebe ahụ, jee hụ Jehu nwa Jehoshafat, nwa Nimshi anya. Mee ka o bilie site nʼetiti ndị ha na ya nọ. Mekwaa ka gị na ya naanị baa nʼime ụlọ.
And when thou art come thither, look out there Jehu the son of Jehoshaphat, son of Nimshi, and go in, and make him rise up from among his brethren, and bring him to an inner chamber;
3 Were karama mmanụ wụkwasị ya nʼisi gwa ya okwu sị, ‘Otu a ka Onyenwe anyị kwuru, eteela m gị mmanụ ịbụ eze Izrel.’ I mesịa, meghe ụzọ ọsịịsọ, sitekwa nʼebe ahụ gbapụ ọsọ.”
then take the vial of oil, and pour it on his head and say, Thus saith Jehovah: I have anointed thee king over Israel; and open the door, and flee, and tarry not.
4 Nwokorobịa onye amụma ahụ gara Ramọt Gilead.
And the young man, the young prophet, went to Ramoth-Gilead.
5 Mgbe o jeruru, ọ hụrụ ebe ọchịagha ahụ nọdụrụ nʼala nʼetiti ndịisi agha ibe ya. O kwuru sị, “Enwere m ozi m ga-ezi gị, ọchịagha.” Jehu jụrụ, “Ọ bụ onye nʼime anyị ka ị chọrọ izi ozi?” Ọ zara, “Ọ bụ gị ọchịagha.”
And when he came, behold, the captains of the host were sitting. And he said, I have an errand to thee, captain. And Jehu said, To which of all of us? And he said, To thee, captain.
6 Jehu biliri baa nʼime ụlọ. Nwokorobịa onye amụma ahụ wụkwasịrị ya mmanụ nʼisi, sị ya, “Otu a ka Onyenwe anyị, Chineke Izrel sịrị, ‘Eteela m gị mmanụ ịbụ eze ndị nke Onyenwe anyị, bụ Izrel.
And he rose up and went into the house; and he poured the oil on his head, and said to him, Thus saith Jehovah the God of Israel: I have anointed thee king over the people of Jehovah, over Israel.
7 Ị ga-ekpochapụ ezinaụlọ Ehab, nna gị ukwu, aga m esi otu a bọtara onwe m ọbọ, nʼihi ọbara ndị ohu m, bụ ndị amụma na ọbara ndị ozi Onyenwe anyị niile Jezebel wufuru.
And thou shalt smite the house of Ahab thy master; and I will avenge the blood of my servants the prophets, and the blood of all the servants of Jehovah at the hand of Jezebel.
8 Ezinaụlọ Ehab ga-abụ ihe lara nʼiyi. Nʼala Izrel, m ga-esite nʼezinaụlọ Ehab bipụ ndị ikom niile, maọbụ ohu maọbụ onye nwe onwe ya.
And the whole house of Ahab shall perish, and I will cut off from Ahab every male, and him that is shut up and left in Israel.
9 M ga-ala ụlọ Ehab nʼiyi, ka m si laa ezinaụlọ Jeroboam nwa Nebat nʼiyi, na dịka m si lakwaa ezinaụlọ Baasha, nwa Ahija nʼiyi.
And I will make the house of Ahab as the house of Jeroboam the son of Nebat, and as the house of Baasha the son of Ahijah.
10 Nkịta ga-erikwa anụ Jezebel nwunye Ehab na Jezril. Ọ dịkwaghị onye ga-eli ya.’” Mgbe o kwuchara okwu ndị a, onye amụma ahụ meghere ụzọ gbapụ ọsọ.
And the dogs shall eat Jezebel in the plot of Jizreel, and none shall bury her. And he opened the door and fled.
11 Jehu jekwuuru ndịisi agha ibe ya. Otu onye nʼime ha jụrụ ya sị, “Gịnị ka onye ara ahụ chọrọ bịa? Udo ọ dịkwa?” Jehu zara, “Unu maara onye ọ bụ, marakwa ụdị okwu ga-esi ya nʼọnụ pụta.”
And Jehu came forth to the servants of his lord. And one said to him, Is all well? why came this madman to thee? And he said to them, Ye know the man, and his mind.
12 Ha sịrị, “Ihe i kwuru abụghị eziokwu, gwa anyị ihe o kwuru.” Jehu sịrị, “Ihe ndị a ka ọ gwara m, ‘Otu a ka a Onyenwe anyị kwuru, Eteela m gị mmanụ ịbụ eze Izrel.’”
And they said, It is false! tell us now. And he said, Thus and thus spoke he to me saying, Thus saith Jehovah: I have anointed thee king over Israel.
13 Ngwangwa ha chịịrị uwe mgbokwasị ha niile doo ha nʼusoro nʼala ebe ahụ ka Jehu zọkwasị ha ụkwụ. Ha fụrụ opi ike tie mkpu sị, “Jehu bụ eze!”
Then they hasted and took every man his garment, and put it under him on the very stairs, and blew with trumpets, and said, Jehu is king!
14 Otu a ka Jehu nwa Jehoshafat, nwa Nimshi, si gbaa izu megide Joram. (Nʼoge a, Joram na ndị Izrel niile na-eche Ramọt Gilead nche, nʼihi Hazael eze Aram.)
And Jehu the son of Jehoshaphat, son of Nimshi, conspired against Joram. (Now Joram kept Ramoth-Gilead, he and all Israel, because of Hazael king of Syria;
15 Ma Joram bụ eze, laghachitere na Jezril ebe ọ nọ ka ahụ dị ya mma maka ahụ ndị Aram merụrụ ya mgbe ya na Hazael, eze Aram lụrụ agha. Ya mere, Jehu sịrị, “Ọ bụrụ na nke a bụ uche unu, ime m eze unu, unu ekwela ka onye ọbụla si nʼobodo a gbapụ, gaa Jezril kọọ akụkọ a.”
and king Joram had returned to be healed in Jizreel of the wounds that the Syrians had given him, when he fought against Hazael king of Syria.) And Jehu said, If it be your will, let not a fugitive escape out of the city to go to tell [it] in Jizreel.
16 Mgbe ahụ, Jehu wụkwasịrị nʼelu ụgbọ agha ya gbaga Jezril, nʼihi na Joram nọ nʼebe ahụ na-ezu ike. Ma Ahazaya, bụ eze Juda gakwara ileta ya.
And Jehu rode in a chariot and went to Jizreel; for Joram lay there. And Ahaziah king of Judah had come down to see Joram.
17 Mgbe onye nche nọ nʼụlọ elu Jezril hụrụ Jehu na ndị agha ya ka ha na-abịa, o tiri mkpu sị, “Lee, o nwere ndị agha na-abịa.” Joram eze Izrel nyere iwu sị, “Zipụ otu onye na-agba ịnyịnya ka ọ gaa zute ha jụọ ha sị, ‘Udo ọ dịkwa?’”
And the watchman stood on the tower in Jizreel, and saw Jehu's company as he came, and said, I see a company. And Joram said, Take a horseman, and send to meet them, and let him say, Is it peace?
18 Onye ọgbaịnyịnya ahụ nọkwasịrị nʼelu ya gbapụ izute Jehu, sị, “Otu a ka eze sịrị, ‘Udo ọ dịkwa?’” Jehu zara, “Gịnị ka gị na udo nwekọrọ? Tụgharịa gaa soro m nʼazụ.” Onye nche ahụ ziri ozi sị, “Onyeozi ahụ ezutela ha, kama ọ naghị alọta.”
So there went one on horseback to meet him; and he said, Thus saith the king: Is it peace? And Jehu said, What hast thou to do with peace? turn thee behind me. And the watchman told saying, The messenger came to them, and he does not return.
19 Eze zipụrụ onye ọgbaịnyịnya nke abụọ. Mgbe ọ bịakwutere ha ọ sịrị, “Otu a ka eze sịrị, ‘Udo ọ dịkwa?’” Jehu zara, “Gịnị ka gị na udo nwekọrọ? Chigharịa soro m nʼazụ.”
And he sent out a second on horseback; and he came to them and said, Thus saith the king: Is it peace? And Jehu said, What hast thou to do with peace? turn thee behind me.
20 Onye ahụ nọ na-eche nche sịrị, “Ọ garuola ha nso, ma ọ dịghị alọghachitekwa azụ. Ma ọgbụgba ịnyịnya dịka ọ bụ Jehu nwa Nimshi, nʼihi na ọ na-agba ịnyịnya ya dịka onye na-ayị ara.”
And the watchman told saying, He came to them, and does not return. And the driving is like the driving of Jehu the son of Nimshi; for he drives furiously.
21 Joram nyere iwu sị, “Kwadooro m ụgbọ agha m.” Mgbe a kwadooro ya, Joram eze Izrel, na Ahazaya, eze Juda, pụtara nọkwasị nʼụgbọ agha, onye ọbụla na nke ya, pụọ ịga izute Jehu. Ha zutere ya nʼoke ala ubi Nebọt, onye Jezril.
Then Joram said, Make ready! And they made ready his chariot. And Joram king of Israel and Ahaziah king of Judah went out, each in his chariot; and they went out to meet Jehu, and met him in the plot of Naboth the Jizreelite.
22 Mgbe Joram hụrụ Jehu, ọ jụrụ, “Ị bịara nʼudo? Udo ọ dịkwa, Jehu?” Jehu zara, “Olee otu udo ga-esi dịrị, ebe ọ bụ na ihe ọjọọ niile nke ikpere arụsị na mgbaasị nke Jezebel nne gị, jupụtara nʼebe niile.”
And it came to pass when Joram saw Jehu, that he said, Is it peace, Jehu? And he said, What peace, so long as the fornications of thy mother Jezebel and her sorceries are so many?
23 Joram chigharịrị ụgbọ agha ya bido ịgba ọsọ. Mgbe ọ na-agba ọsọ, o tiri mkpu kpọkuo Ahazaya sị ya, “Ahazaya, Aghụghọ dị, ọgbaaghara dị!”
Then Joram turned his hand, and fled, and said to Ahaziah, Treachery, Ahaziah!
24 Jehu jiri ike ya niile dọtịa ụta o ji nʼaka ya gba ya Joram. Ọ gbatara Joram àkụ ahụ nʼazụ. Àkụ ahụ sikwa ya nʼobi pụta. Nke a mere ka Joram daa nʼime ụgbọala ya nwụọ.
And Jehu took his bow in his hand, and smote Jehoram between his arms, and the arrow went out through his heart; and he sank down in his chariot.
25 Mgbe ahụ, Jehu sịrị Bidka, bụ onyeisi agha ya, “Bulie ya, tụba ya nʼubi Nebọt onye Jezril. Chetakwa na mụ na gị nọkwasịrị nʼelu ịnyịnya, anyị abụọ, na-eso nna ya Ehab, mgbe Onyenwe anyị kwuru okwu amụma a megide ya.
And he said to Bidkar his captain, Take him up [and] cast him in the plot of the field of Naboth the Jizreelite. For remember how, when I and thou rode together after Ahab his father, that Jehovah laid this burden upon him:
26 ‘Nʼezie, ahụrụ m ọbara Nebọt na ọbara ụmụ ya ndị ikom ụnyaahụ, otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara, nʼihi ya, aghaghị m ime ka ị kwụghachi ụgwọ ọbara ha nʼala ubi a.’ Ugbu a, bulie ya tụba ya nʼala ubi a dị ka okwu Onyenwe anyị si dị.”
Certainly I have seen yesterday the blood of Naboth, and the blood of his sons, saith Jehovah; and I will requite thee in this plot, saith Jehovah. And now, take [and] cast him into the plot, according to the word of Jehovah.
27 Mgbe Ahazaya eze Juda, hụrụ ihe mere, ọ gbaara ọsọ na-agbago nʼụzọ Bet Hagan. Ma Jehu chụsoro ya, na-eti mkpu sị, “Gbukwuonụ ya.” Ha merụrụ ya ahụ ka ọ nọ nʼụgbọ agha ya, nʼụzọ ịga Gua, nso Ibleam, ọ gbara ọsọ ga Megido ebe ọ nọ nwụọ.
When Ahaziah king of Judah saw [that], he fled by the way of the garden-house. And Jehu followed after him, and said, Smite him also in his chariot. It was on the ascent of Gur, which is by Jibleam. And he fled to Megiddo, and died there.
28 Ndị ohu ya ji ụgbọ agha bịa buru ozu ya bubata ya na Jerusalem, lie ya nʼebe e liri nna nna ya ha, nʼobodo Devid.
And his servants carried him in a chariot to Jerusalem, and buried him in his sepulchre with his fathers in the city of David.
29 Nʼafọ iri na otu nke ọchịchị Joram nwa Ehab, ka Ahazaya malitere ịbụ eze Juda.
(And in the eleventh year of Joram the son of Ahab had Ahaziah begun to reign over Judah.)
30 Mgbe Jezebel nụrụ na Jehu abịaruola Jezril, ọ banyere nʼụlọ ya, tee uri nʼanya abụọ, dozie agịrị isi ya, pụta bịa nọdụ ala nʼakụkụ oghereikuku, site nʼebe ahụ na-elepụ anya nʼezi.
And Jehu came to Jizreel; and Jezebel heard of it, and she put paint to her eyes, and decked her head, and looked out at the window.
31 Mgbe Jehu batara nʼọnụ ụzọ e si abata ụlọeze, Jezebel kpọkuru ya sị, “Ị bịara nʼudo, gị Zimri, gị onye gburu nna gị ukwu.”
And when Jehu came in at the gate, she said, Is it peace, Zimri, murderer of his master?
32 Jehu leliri anya elu lee anya na oghereikuku tie mkpu sị, “Onye dịnyeere m?” Onozi abụọ maọbụ atọ na-eje ozi nʼụlọeze lepụtara anya lee ya anya.
And he lifted up his face to the window, and said, Who is on my side? who? And two or three chamberlains looked out to him.
33 Jehu nyere ha iwu sị ha, “Tụdanụ ya nʼala.” Ya mere, ha si nʼelu ebe ahụ tụda ya nʼala. Mgbe ọ daruru ala, ọbara ya fesasịrị nʼahụ mgbidi ụlọ na nʼahụ ịnyịnya ndị ji ụkwụ ha zọjaa ya.
And he said, Throw her down! And they threw her down; and some of her blood was sprinkled on the wall, and on the horses; and he trampled on her.
34 Jehu banyere nọ nʼime ụlọeze rie ihe, ṅụkwaa ihe ọṅụṅụ. Emesịa, o nyere iwu sị, “Leenụ nwanyị a a bụrụ ọnụ; burunu ya gaa lie ya, nʼihi na ọ bụ ada eze.”
And he came in, and ate and drank; and he said, Go, look, I pray you, after this cursed [woman], and bury her; for she is a king's daughter.
35 Mgbe ha pụtara ili ya, ọ bụ naanị okpokoro isi ya na ọkpụkpụ ụkwụ ya abụọ, na aka ya abụọ ka ha hụrụ. Ha ahụkwaghị anụ ahụ ya.
And they went to bury her; but they found no more of her than the skull, and the feet, and the palms of the hands.
36 Ha laghachiri gwa Jehu ihe ha hụrụ. Ọ zara sị ha, “Nke a bụ okwu Onyenwe anyị, nke o kwuru site nʼọnụ ohu ya Ịlaịja onye Tishbe sị: ‘Nʼala ubi dị na Jezril ka nkịta ga-anọ rie anụ ahụ Jezebel.
And they came back and told him. And he said, This is the word of Jehovah, which he spoke through his servant Elijah the Tishbite saying, In the plot of Jizreel shall dogs eat the flesh of Jezebel;
37 Ozu Jezebel ga-adị ka unyi nʼala ubi dị na Jezril, ruo na mmadụ enweghị ike ikwupụta sị, Nke a bụ Jezebel.’”
and the carcase of Jezebel shall be as dung upon the open field in the plot of Jizreel, so that they shall not say, This is Jezebel.

< 2 Ndị Eze 9 >