< 2 Ndị Eze 8 >

1 Ịlaisha gwara nwanyị ahụ o mere ka nwa ya si nʼọnwụ bilie okwu sị ya, “Bilie, gị na ezinaụlọ gị, gaa nʼobodo ọzọ ebe unu ga-anọ dịka ọbịa nʼihi na Onyenwe anyị ekwuola na oke ụnwụ ga-adakwasị ala Izrel afọ asaa.”
Basi, Elisha alikuwa amemwambia yule mwanamke ambaye alimfufulia mtoto wake. Akamwambia, “Inuka na uenede pamoja na nyumba yako, na uishi popote uwezapo katika nchi nyingine, kwa sababu Yahwe ameiita njaa ambayo itakuja katika hii nchi kwa miaka saba.”
2 Nwanyị ahụ mere dịka onye nke Chineke gwara ya, o biliri, ya na ezinaụlọ ya gaa biri nʼala ndị Filistia afọ asaa.
Basi yule mwanamke akainuka na akatii lile neno la mtumishi wa Mungu. Akaenda na nyumba yake na kuishi kwenye nchi ya Wafilisti miaka saba.
3 Mgbe ụnwụ ahụ gwụsịrị nʼafọ nke asaa, o si nʼala ndị Filistia lọta nʼIzrel. Mgbe ọ lọtara, o jekwuuru eze ka o nyere ya aka inwetaghachi ụlọ ya na ala ya.
Ikafika kama mwishoni mwa miaka saba yule mwanamke akarudi kutoka kwenye ile nchi ya Wafilisti, na kwenda kwa mfalme kumuomba nyumba yake na kwa ajili ya nchi yake.
4 Mgbe nwanyị ahụ bịakwutere eze, eze nọ na-agwa Gehazi bụ onye na-ejere onye nke Chineke ozi okwu sị ya, “Biko, kọọrọ m akụkọ ihe ukwu niile Ịlaisha mere.”
Basi mfalme alikuwa anaongea na Gehazi yule mtumishi wa Mungu, akisema, “Tafadhali niambie yale mambo makubwa ambayo Elisha ameyafanya.”
5 Mgbe Gehazi na-akọrọ eze otu Ịlaisha si mee ka nwantakịrị nwụrụ anwụ dị ndụ ọzọ, nwanyị ahụ, onye bụ nne nwantakịrị ahụ, batara nʼime ụlọeze. Mgbe ahụ, Gehazi kwuru sị, “Onyenwe m eze, onye a bụ nwanyị ahụ, leekwa nwa ya nwoke, onye Ịlaisha mere ka ọ dị ndụ ọzọ.”
Basi alipokuwa akimwambia yule mfalme jinsi gani Elisha alivyomfufua yule mtoto aliyekufa, huyo mwanamke ambaye mtoto wake aliyekuwa amefufuliwa akaja kumuomba yule mfalme kwa ajili ya nyumba yake na nchi yake. Gehazi akasema, “Bwana wangu, mfalme, huyu ndiye yule mwanamke, na huyu ndiye mtoto wake, ambaye Elisha amemfufua.”
6 Eze jụrụ nwanyị ahụ ajụjụ sị ya, “Ọ bụ eziokwu?” Nwanyị ahụ kọọrọ eze akụkọ ihe niile mere. Mgbe ahụ, eze dunyere ya otu onyeisi nʼime ndị ozi ya ka o nyere ya aka inwetaghachi ihe ya niile, ya na ụgwọ ruru ya nʼihi mkpụrụ ubi ya niile ha ghọrọ mgbe ahụ o bi nʼala ndị Filistia.
Wakati yule mfalme alipomuuliza yule mwanamke kuhusu mtoto wake, alimwelezea yule mfalme. Ndipo mfalme akamwagizia ofisa makini, akisema, “Mrudishie vyote vilivyokuwa vyake na mavuno yake yote ya kwenye mashamba tangu siku alipoondoka hadi sasa.”
7 Mgbe ihe ndị a gasịrị Ịlaisha gara Damaskọs, isi obodo ndị Siria. Nʼoge a, Ben-Hadad eze Aram, na-arịa ọrịa. “A gara gwa eze na onye nke Chineke abịala nʼebe ahụ.”
Elisha akaja Damaskasi ambako Ben Hadadi yule mfalme wa Shamu alikuwa anaumwa. Yule mfalme aliambiwa, “Yule mtu wa Mungu amekuja hapa.”
8 Mgbe eze nụrụ ya, ọ kpọrọ Hazael sị ya, “Were onyinye ịnata ihuọma nʼaka gị wegara onye nke Chineke, site nʼaka ya jụta Onyenwe anyị ase. Jụọ ya, ‘M ga-esi nʼọrịa a bilie?’”
Mfalme akamwambia Hazaeli, “Chukua zawadi kwenye mkono wako na uende ukakutane na mtu wa Mungu, na ukazungumze na Yahwe kupitia yeye, ukisema, “Je nitapona huu ugonjwa wangu?”
9 Hazael weere iri ịnyịnya kamel anọ buru ezi ihe niile si nʼala Damaskọs, wetara Ịlaisha onyinye ndị a sị ya, “Nwa gị Ben-Hadad, eze Aram, zitere ka m jụọ gị sị, ‘M ga-esi nʼọrịa a bilie?’”
Basi Hazaeli akaenda kuonana naye na kuchukua zawadi zake za kila kitu kizuri cha Damskasi, akabeba ngamia arobaini. Hivyo Hazaeli akaja na kusimama mbele ya Elisha na kusema, “Mtoto wako Ben Hadadi mfalme wa Shamu amenituma kwako, kusema, “Je nitapona huu ugonjwa?”
10 Ịlaisha zara sị ya, “Laa, gaa gwa ya sị ya, ‘Ị ga-esi nʼọrịa bilie.’ Ma Onyenwe anyị egosila m na, nʼezie, ọ ga-anwụ.”
Elisha akamwambia, “Nenda, kwa Ben Hadadi, 'Utapona hakika,' lakini Yahwe amenionyesha kwamba atakufa hahkika.”
11 Mgbe Ịlaisha nọ na-ekwu okwu a, o legidere Hazael anya nʼihu tutu ruo mgbe ihere mere ya. Mgbe ahụ, onye nke Chineke kwara akwa.
Basi Elisha akamtumbulia macho Hazaeli hadi alipojisikia aibu, na yule mtu wa Mungu akalia machozi.
12 Mgbe ahụ, Hazael jụrụ Ịlaisha ajụjụ sị, “Ọ bụ gịnị mere onyenwe m ji akwa akwa?” Ịlaisha zara sị ya, “Nʼihi na amaara m ihe ọjọọ ị ga-eme ụmụ Izrel nʼoge dị nʼihu. Ị ga-akpọ obodo niile ha e wusiri ike ọkụ, jiri mma agha gbuo ụmụ okorobịa ha. Ị ga-atụpịa ụmụntakịrị na-aṅụ ara, bọwakwaa afọ ndị inyom dị ime.”
Hazaeli akauliza, kwa nini unalia, bwana wangu?” Akajibu, “Kwa sababu najua uovu ambao utakaoufanya kwa watu wa Israeli. Utazichoma moto ngome zao kwa moto, na utawaua vijana wao kwa upanga, kuwaseta vipande vipande watoto wao wachanga, na kuwapasua mimba zao wanawake wenye mimba.”
13 Hazael sịrị, “Olee otu ọrụ gị, bụ nkịta efu, ga-esi nwee ike imezu ihe ukwuu a?” Ịlaisha zara, “Onyenwe anyị egosila m na ị ga-abụ eze Aram.”
Hazaeli akajibu, Ni nani mtumwa wako, ambaye atafanya jambo hili kubwa? Yeye ni mbwa tu.” Elisha akajibu, “Yahwe amenionyesha kwamba utakuwa mfalme juu ya Shamu.”
14 Mgbe Hazael, si nʼebe Ịlaisha nọ laa, ọ bịakwutere nna ya ukwu. Mgbe Ben-Hadad jụrụ ya sị, “Gịnị ka Ịlaisha gwara gị?” Hazael zara sị, “Ọ gwara m na ị ga-esi nʼọrịa bilie.”
Ndipo Hazaeli akamwacha Elisha na kuja kwa bwana wake, ambaye alimwambia, “Je Elisha alikwambiaje?” Akajibu, “Ameniambia kwamba utapona bila shaka.”
15 Ma nʼechi ya, Hazael chịịrị akwa na-egbo oyi, banye ya na mmiri jiri ya baa nʼebe eze dina, gbasaa ya nʼihu eze, tutu ruo mgbe ọ nwụrụ. Emesịa, Hazael ghọrọ eze nʼọnọdụ ya.
Basi siku ya pili yake Hazaeli akachukua blangeti na kulichovya kwenye maji, na kulitandaza kwenye uso wa Ben Hadadi hivyo akafa. Basi Hazaeli akawa mfalme katika sehemu sehemu yake.
16 Nʼafọ nke ise nke ọchịchị Joram nwa Ehab eze Izrel, mgbe Jehoshafat bụ eze Juda, ka Jehoram nwa Jehoshafat malitere ọchịchị ya dịka eze Juda.
Katika mwaka wa kumi na tano wa Yoramu mwana wa Ahabu, mfalme wa Israeli, Yehoramu akaanza kutawala. Alikuwa mwana wa Yehoshafati mfalme wa Yuda. Alianza wakati Yehoshafati alikuwa mfalme wa Yuda.
17 Ọ dị iri afọ atọ na abụọ mgbe ọ malitere ịbụ eze, ọ chịrị afọ asatọ na Jerusalem.
Yoramu alikuwa na umri wa miaka thelathini na mbili alipoanza kutawala, na alitawala kwa mda wa miaka minane katika Yerusalemu.
18 O soro ụzọ ndị eze Izrel dịka ụlọ Ehab mere, nʼihi na ọ lụrụ ada Ehab. O mere ihe dị njọ nʼanya Onyenwe anyị.
Yoramu akatembea kwenye njia ya huyo mfalme wa Israeli, kama walivyokuwa wakifanya kwenye nyumba ya Ahabu; kwa kuwa alikuwa na binti wa Ahabu kama mke wake, na alifanya uovu usoni kwa Yahwe.
19 Ma nʼagbanyeghị nke a, nʼihi ohu ya bụ Devid Onyenwe anyị achọghị ibibi Juda. Nʼihi na o kwere nkwa ime ka oriọna dịịrị Devid na ụmụ ụmụ ruo mgbe ebighị ebi.
Walakini, kwa sababu ya mtumishi wake Daudi, Yahwe hakutaka kuiharibu Yuda, tangu alipomwambia kwamba atampatia wazao.
20 Nʼoge Jehoram bụ eze, ka Edọm si nʼokpuru Juda nupu isi, họpụtara onwe ha eze.
Katika siku za Yoramu, Edomu akaasi kutoka chini ya mkono wa Yuda, na wakamfanya mfalme juu yao wenyewe.
21 Ya mere, Jehoram duuru ụgbọ agha ya niile gaa nʼobodo Zaịa. O biliri nʼabalị tigbuo ndị Edọm ahụ gbara ya na ndị ọchịagha ụgbọ agha ya gburugburu; ma ndị agha ya gbaghachiri azụ, laa nʼụlọ ha.
Basi Yehoramu akaenda na maamri jeshi na magari ya farasi yote. Ilitokea kwamba akaamka usiku na kushambulia na kuwazunguka Waedomu, waliokuwa wamemzunguka na wale maamri jeshi wa magari ya farasi. Ndipo wanajeshi wa Yehoramu wakakimbilia wajumbani kwao.
22 Ya mere, Edọm ka na-enupu isi megide Juda, ruo taa. Obodo Libna nupukwara isi nʼotu oge ahụ.
Hivyo Edomu aliasi dhidi ya utawala wa Yuda katika siku hizi. Libna pia aliasi katika kipindi hicho hicho.
23 Akụkọ ihe niile Jehoram mere, e deghị ha nʼakwụkwọ akụkọ ihe ndị eze Juda mere nʼụbọchị ndụ ha?
Kwa mambo mengine yamhusuyo Yehoramu, yote aliyoyafanya, je hayakuandikwa kwenye kitabu cha matukio ya mfalme wa Yuda?
24 Joram sooro ndị nna nna ya ha dina nʼọnwụ, e lie ya nʼebe e liri nna ya ha nʼobodo Devid. Ahazaya nwa ya ghọrọ eze nʼọnọdụ ya.
Yehoramu akafa na kuzikwa pamoja na baba zake, na akalala pamoja na baba zake katika mji wa Daudi. Ndipo Ahazi mtoto wake akawa mfalme katika sehemu yake.
25 Nʼafọ nke iri na abụọ nke ọchịchị Joram nwa Ehab, bụ eze Izrel, ka Ahazaya nwa Jehoram, bụ eze Juda malitere ịchị.
Katika mwaka wa kumi na mbili wa Yohoramu mwana wa Ahabu, mfalme wa Israeli, Ahazi mwana wa Yehoramu, mfalme wa Yuda, alianza kutawala.
26 Ahazaya gbara iri afọ abụọ na abụọ mgbe ọ malitere ịbụ eze, ọ chịrị otu afọ na Jerusalem. Aha nne ya bụ Atalaya, nwa nwa Omri, eze Izrel
Ahazi alikuwa ana umri wa miaka ishirini na mbili wakati alipoanza kutawala; alitawala kwa mda wa mwaka mmoja katika Yerusalemu. Mama yake alikuwa anaitwa Athalia; alikuwa mtoto wa Omri, mfalme wa Israeli.
27 O soro ụzọ niile nke ndị ezinaụlọ Ehab, mee ihe dị njọ nʼanya Onyenwe anyị dịka ezinaụlọ Ehab mere, nʼihi na ọ lụrụ nwanyị si nʼezinaụlọ Ehab.
Ahazia alitembelea katika nyumba ya Ahabu; alifanya yale yaliyo maovu katika uso wa Yahwe, kama nyumba ya Ahabu ilivyokuwa ikifanya, kwa kuwa Ahazia alikuwa mkwe kwenye nyumba ya Aabu.
28 Ahazaya sooro Joram nwa Ehab, gaa ibuso Hazael eze Aram agha na Ramọt Gilead. Ndị Aram merụrụ Joram ahụ.
Ahazia akaenda pamoja na Yoramu mwana wa Ahabu, kupigana dhidi ya Hazaeli, mfalme wa Shamu, katika Ramath Geleadi. Washami wakamjeruhi Yoramu.
29 Ya mere, eze Joram lọghachitere na Jezril, ka a gwọọ ya mmerụ ahụ ndị Aram merụrụ ya na Ramọt, nʼagha nke ya na Hazael eze Aram lụrụ. Mgbe ahụ, Ahazaya nwa Jehoram eze Juda, gara Jezril ileta Joram nwa Ehab, nʼihi na e merụrụ ya ahụ.
Mfalme Yoramu akarudi ili auguzwe huko Yezreeli kwenye yale majeraha ambayo Washami walimpatia huko Rama. Wakati alipopigana dhidi ya Hazaeli mfalme wa Shamu. Hivyo Ahazi mwana wa Yehoramu, mfalme Yuda, akashuka kwa Yezreeli kumuona Yoramu mwana wa Ahabu, kwa sababu Yoramu alikuwa amejeruhiwa.

< 2 Ndị Eze 8 >