< 2 Ndị Eze 3 >

1 Jehoram nwa Ehab, malitere ịbụ eze ndị Izrel na Sameria nʼafọ nke iri na asatọ nke ọchịchị Jehoshafat na Juda. Afọ iri na abụọ ka ọ chịrị dịka eze.
Y JORAM hijo de Achâb comenzó á reinar en Samaria sobre Israel el año dieciocho de Josaphat rey de Judá; y reinó doce años.
2 O mere ihe ọjọọ nʼanya Onyenwe anyị, ma ọ bụghị dịka nna ya na nne ya mere. O wezugara nkume ahụ e doro nsọ nye Baal nke nna ya kpụrụ.
E hizo lo malo en ojos de Jehová, aunque no como su padre y su madre; porque quitó las estatuas de Baal que su padre había hecho.
3 Otu ọ dị, ọ nọgidere na mmehie Jeroboam nwa Nebat, onye mere ka Izrel baa nʼime mmehie ife arụsị. Joram esiteghị na ha wezuga onwe ya.
Mas allegóse á los pecados de Jeroboam, hijo de Nabat, que hizo pecar á Israel; y no se apartó de ellos.
4 Eze ndị Moab, bụ Misha, na ndị ya, bụ ndị na-azụ atụrụ. Nʼafọ niile, ọ na-atụrụ eze Izrel otu narị puku ajị ebule, na otu narị puku atụrụ.
Entonces Mesa rey de Moab era propietario de ganados, y pagaba al rey de Israel cien mil corderos y cien mil carneros con sus vellones.
5 Ma mgbe Ehab eze Izrel nwụrụ, eze Moab nupuru isi megide eze Izrel, jụkwa ịnọ nʼokpuru ya ọzọ.
Mas muerto Achâb, el rey de Moab se rebeló contra el rey de Israel.
6 Ya mere, eze Joram sitere na Sameria pụọ ga kpọkọta ndị Izrel niile.
Y salió entonces de Samaria el rey Joram, é inspeccionó á todo Israel.
7 O zigara Jehoshafat eze Juda ozi sị ya, “Eze Moab enupula isi megide m. Ị ga-abịa soro m ịga buso ndị Moab agha?” Ọ zaghachiri, “Aga m eso gị gaa. Mụ na gị bụ otu, ndị m bụ ndị gị, ịnyịnya m bụkwa ịnyịnya gị.”
Y fué y envió á decir á Josaphat rey de Judá: El rey de Moab se ha rebelado contra mí: ¿irás tú conmigo á la guerra contra Moab? Y él respondió: Iré, [porque] como yo, así tú; como mi pueblo, así tu pueblo; como mis caballos, así también tus caballos.
8 “Ma olee ụzọ anyị ga-esi gaa ibu agha ahụ?” Joram zara, “Anyị ga-esi ụzọ ọzara Edọm.”
Y dijo: ¿Por qué camino iremos? Y él respondió: Por el camino del desierto de Idumea.
9 Ya mere, eze Izrel na eze Juda, na eze Edọm, na ndị agha ha niile, zukọtara site ụzọ ọzara Edọm ịga ibuso Moab agha. Ha gara ije abalị asaa nʼọzara. Ma mmiri ọṅụṅụ ha nwere gwụsịrị. Ọ dịkwaghị mmiri dịrị anụ ụlọ ha, na ndị agha ha.
Partieron pues el rey de Israel, y el rey de Judá, y el rey de Idumea; y como anduvieron rodeando por el desierto siete días de camino, faltóles el agua para el ejército, y para las bestias que los seguían.
10 Mgbe ahụ, eze Izrel tiri mkpu sị, “Gịnị ka anyị ga-eme? Ọ ga-abụ na Onyenwe anyị kpọpụtara anyị bụ eze atọ ndị a, nʼebe a, inyefe anyị nʼaka ndị Moab, ka ha merie anyị?”
Entonces el rey de Israel dijo: ¡Ah! que ha llamado Jehová estos tres reyes para entregarlos en manos de los Moabitas.
11 Ma Jehoshafat, eze Juda, jụrụ ajụjụ sị, “Ọ bụ na o nweghị onye amụma Onyenwe anyị nọ nʼebe a, onye anyị ga-esi nʼaka ya jụta Onyenwe anyị ase, site na ya?” Otu onyeisi agha ndị Izrel sị ha, “Ịlaisha, nwa Shafat, onye jeere Ịlaịja ozi, nọ nʼebe a.”
Mas Josaphat dijo: ¿No hay aquí profeta de Jehová, para que consultemos á Jehová por él? Y uno de los siervos del rey de Israel respondió y dijo: Aquí está Eliseo hijo de Saphat, que daba agua á manos á Elías.
12 Jehoshafat zara sị, “Okwu Onyenwe anyị dị nʼọnụ ya.” Ya mere, eze Izrel na Jehoshafat, na eze Edọm, gakwuru ya.
Y Josaphat dijo: Este tendrá palabra de Jehová. Y descendieron á él el rey de Israel, y Josaphat, y el rey de Idumea.
13 Ịlaisha zara eze Izrel sị, “Gịnị ka mụ na gị nwekọrọ? Jekwuru ndị amụma nne gị na nna gị, jụta ha ase.” Eze Izrel zara sị ya, “Mba, nʼihi na ọ bụ Onyenwe anyị kpọpụtara anyị bụ eze atọ nʼebe a, ka o were anyị nyefee nʼaka ndị Moab.”
Entonces Eliseo dijo al rey de Israel: ¿Qué tengo yo contigo? Ve á los profetas de tu padre, y á los profetas de tu madre. Y el rey de Israel le respondió: No: porque ha juntado Jehová estos tres reyes para entregarlos en manos de los Moabitas.
14 Ịlaisha sịrị, “Ebe Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile na-adị ndụ, bụ onye m na-efe, a si na ọ bụghị nsọpụrụ m nwere nʼebe Jehoshafat eze Juda nọ, agaraghị m atụpụrụ gị ọnụ maọbụ lee gị anya nʼihu.
Y Eliseo dijo: Vive Jehová de los ejércitos, en cuya presencia estoy, que si no tuviese respeto al rostro de Josaphat rey de Judá, no mirara á ti, ni te viera.
15 Ma ugbu a, kpọtaranụ m onye na-akpọ ụbọ.” Mgbe ọkpọ ụbọ ahụ malitere ịkpọ ụbọ ya, aka Onyenwe anyị bịakwasịrị Ịlaisha.
Mas ahora traedme un tañedor. Y mientras el tañedor tocaba, la mano de Jehová fué sobre Eliseo.
16 Ọ sịrị, “Ihe a ka Onyenwe anyị kwuru, aga m eme ka ndagwurugwu a jupụta nʼolulu mmiri.
Y dijo: Así ha dicho Jehová: Haced en este valle muchas acequias.
17 Nʼihi na otu a ka Onyenwe anyị kwuru, Unu agaghị ahụ ifufe maọbụ mmiri ozuzo, ma ndagwurugwu a ga-ejupụta na mmiri, unu onwe unu ga-aṅụ, na ehi unu, na anụmanụ ndị ọzọ unu ga-aṅụkwa mmiri.
Porque Jehová ha dicho así: No veréis viento, ni veréis lluvia, y este valle será lleno de agua, y beberéis vosotros, y vuestras bestias, y vuestros ganados.
18 Ma nke a bụ ihe dị nta nʼebe Onyenwe anyị nọ, nʼihi na ọ ga-enyefekwa ndị Moab nʼaka unu.
Y esto es cosa ligera en los ojos de Jehová; dará también á los Moabitas en vuestras manos.
19 Unu ga-etigbu obodo ọbụla e wusiri ike, na obodo ukwu niile. Unu ga-egbudakwa ezi osisi ha na-amị mkpụrụ, kpọchie isi mmiri ha niile, werekwa nkume mebikwaa ezi ala ubi ha niile.”
Y vosotros heriréis á toda ciudad fortalecida y á toda villa hermosa, y talaréis todo buen árbol, y cegaréis todas las fuentes de aguas, y destruiréis con piedras toda tierra fértil.
20 O ruo, nʼụtụtụ, nʼoge e ji achụ aja nsure ọkụ ụtụtụ, lee na mmiri sitere ụzọ Edọm sọọrọ bịa nʼebe ahụ ha gwuru olulu na ndagwurugwu ala ahụ sọjuo ala ahụ niile.
Y aconteció que por la mañana, cuando se ofrece el sacrificio, he aquí vinieron aguas por el camino de Idumea, y la tierra fué llena de aguas.
21 Mgbe ndị Moab nụrụ na ndị eze ahụ na-abịa imegide ha, ha kpọkọtara ndị ikom ọbụla nwere ike ịlụ agha, ma okenye ma okorobịa, pụta bịa guzo nʼoke ala ha.
Y todos los de Moab, como oyeron que los reyes subían á pelear contra ellos, juntáronse desde todos los que ceñían talabarte arriba, y pusiéronse en la frontera.
22 Mgbe chi bọrọ nʼisi ụtụtụ, anyanwụ wara mụkwasị mmiri ahụ. Site nʼebe ha nọ, ndị Moab lepụrụ anya hụ mmiri ahụ ka ọ na-acha ọbara ọbara.
Y como se levantaron por la mañana, y lució el sol sobre las aguas, vieron los de Moab desde lejos las aguas rojas como sangre;
23 Mgbe ahụ, ha sịrịtara onwe ha, “Leenụ ọbara! Ọ ga-abụ na ndị agha eze atọ ndị a etigbuola onwe ha. Pụtanụ, unu ndị Moab, ka anyị gaa kwakọrọ ihe nkwata na-agha!”
Y dijeron: ¡Sangre es esta de espada! Los reyes se han revuelto, y cada uno ha muerto á su compañero. Ahora pues, ¡Moab, á la presa!
24 Mgbe ha gbaara ọsọ bịaruo nʼụlọ agha ndị Izrel, ndị agha Izrel biliri malite itigbu ha. Ya mere, ndị agha Moab sitere nʼihu ha gbalaga. Ma ndị agha Izrel banyere nʼime obodo ndị Moab, gbuo ihe niile ha hụrụ nʼụzọ.
Mas cuando llegaron al campo de Israel, levantáronse los Israelitas é hirieron á los de Moab, los cuales huyeron delante de ellos: siguieron empero hiriendo todavía á los de Moab.
25 Ha tidara obodo ndị Moab niile, tinye nkume nʼala ubi ọma ndị Moab niile. Ha kpọchiri isi mmiri niile, gbudasịakwa ezi osisi niile na-amị mkpụrụ nʼala ahụ. Nʼikpeazụ, ọ bụ naanị otu obodo ndị Moab fọdụrụ, isi obodo a na-akpọ Kia Hareset. Ndị ji ụdọ na-ama nkume gbara obodo a gburugburu, bido ibuso ya agha.
Y asolaron las ciudades, y en todas las heredades fértiles echó cada uno su piedra, y las llenaron; cegaron también todas las fuentes de las aguas, y derribaron todos los buenos árboles; hasta que en Kir-hareseth solamente dejaron sus piedras; porque los honderos la cercaron, y la hirieron.
26 Mgbe eze Moab hụrụ na agha ahụ anaghị agaziri ya nke ọma, ọ chịịrị narị ndị agha asaa, ndị ji mma agha ebu agha, gbalịa isi nʼetiti ndị agha Izrel tikapụta, na ncherita ihu ebe eze Edọm nọ, ma ha enweghị ike.
Y cuando el rey de Moab vió que la batalla lo vencía, tomó consigo setecientos hombres que sacaban espada, para romper contra el rey de Idumea: mas no pudieron.
27 Ya mere, o weere ọkpara ya, onye gaara abụ eze nʼọnọdụ ya, gbuo ya, dịka aja nʼelu mgbidi gbara obodo ahụ gburugburu nye chi Moab. Iwe dị ukwuu dị nʼụbọchị ahụ megide Izrel. Ha kwụsịrị ibu agha, laghachi nʼobodo nke aka ha.
Entonces arrebató á su primogénito que había de reinar en su lugar, y sacrificóle en holocausto sobre el muro. Y hubo grande enojo en Israel; y retiráronse de él, y volviéronse á su tierra.

< 2 Ndị Eze 3 >