< 2 Ndị Eze 3 >
1 Jehoram nwa Ehab, malitere ịbụ eze ndị Izrel na Sameria nʼafọ nke iri na asatọ nke ọchịchị Jehoshafat na Juda. Afọ iri na abụọ ka ọ chịrị dịka eze.
Joramu, mwanakomana waAhabhu akava mambo weIsraeri muSamaria mugore regumi namasere raJehoshafati mambo weJudha, uye akatonga kwamakore gumi namaviri.
2 O mere ihe ọjọọ nʼanya Onyenwe anyị, ma ọ bụghị dịka nna ya na nne ya mere. O wezugara nkume ahụ e doro nsọ nye Baal nke nna ya kpụrụ.
Akaita zvakaipa pamberi paJehovha, asi haana kuita sezvakaita baba vake namai vake. Akabvisa dombo rinoera raBhaari rakanga raitwa nababa vake.
3 Otu ọ dị, ọ nọgidere na mmehie Jeroboam nwa Nebat, onye mere ka Izrel baa nʼime mmehie ife arụsị. Joram esiteghị na ha wezuga onwe ya.
Kunyange zvakadaro, akanamatira kuzvivi zvaJerobhoamu mwanakomana waNebhati, zvaakaita kuti Israeri iite, iye haana kubva kwazviri.
4 Eze ndị Moab, bụ Misha, na ndị ya, bụ ndị na-azụ atụrụ. Nʼafọ niile, ọ na-atụrụ eze Izrel otu narị puku ajị ebule, na otu narị puku atụrụ.
Zvino Mesha mambo weMoabhu aipfuwa makwai, uye aifanira kupa mambo weIsraeri makwayana anokwana zviuru zana namakushe amakondobwe anokwana zviuru zana.
5 Ma mgbe Ehab eze Izrel nwụrụ, eze Moab nupuru isi megide eze Izrel, jụkwa ịnọ nʼokpuru ya ọzọ.
Asi mushure mokufa kwaAhabhu, mambo weMoabhu akamukira mambo weIsraeri.
6 Ya mere, eze Joram sitere na Sameria pụọ ga kpọkọta ndị Izrel niile.
Saka panguva iyoyo, Mambo Jehoramu akabva kuSamaria akaunganidza vaIsraeri vose.
7 O zigara Jehoshafat eze Juda ozi sị ya, “Eze Moab enupula isi megide m. Ị ga-abịa soro m ịga buso ndị Moab agha?” Ọ zaghachiri, “Aga m eso gị gaa. Mụ na gị bụ otu, ndị m bụ ndị gị, ịnyịnya m bụkwa ịnyịnya gị.”
Akatumirawo shoko kuna Jehoshafati mambo weJudha achiti, “Mambo weMoabhu andimukira. Ungada kuenda neni kundorwa neMoabhu here?” Iye akapindura akati, “Ndichaenda newe. Ini ndakangoita sewe, navanhu vangu sevakowo, mabhiza angu samabhiza ako.”
8 “Ma olee ụzọ anyị ga-esi gaa ibu agha ahụ?” Joram zara, “Anyị ga-esi ụzọ ọzara Edọm.”
Akamubvunza akati, “Tichandovavamba nenzira ipi?” Iye akapindura akati, “NomuRenje reEdhomu.”
9 Ya mere, eze Izrel na eze Juda, na eze Edọm, na ndị agha ha niile, zukọtara site ụzọ ọzara Edọm ịga ibuso Moab agha. Ha gara ije abalị asaa nʼọzara. Ma mmiri ọṅụṅụ ha nwere gwụsịrị. Ọ dịkwaghị mmiri dịrị anụ ụlọ ha, na ndị agha ha.
Saka mambo weIsraeri akaenda namambo weJudha pamwe chete namambo weEdhomu. Mushure mokufamba vachipoterera kwamazuva manomwe, varwi vakapererwa nemvura yavo, neyezvipfuwo zvavaiva nazvo.
10 Mgbe ahụ, eze Izrel tiri mkpu sị, “Gịnị ka anyị ga-eme? Ọ ga-abụ na Onyenwe anyị kpọpụtara anyị bụ eze atọ ndị a, nʼebe a, inyefe anyị nʼaka ndị Moab, ka ha merie anyị?”
Mambo weIsraeri akati, “Haiwa! Heya Jehovha atidaidza isu madzimambo matatu pamwe chete kungozotipa hake kuvaMoabhu?”
11 Ma Jehoshafat, eze Juda, jụrụ ajụjụ sị, “Ọ bụ na o nweghị onye amụma Onyenwe anyị nọ nʼebe a, onye anyị ga-esi nʼaka ya jụta Onyenwe anyị ase, site na ya?” Otu onyeisi agha ndị Izrel sị ha, “Ịlaisha, nwa Shafat, onye jeere Ịlaịja ozi, nọ nʼebe a.”
Asi Jehoshafati akamubvunza akati, “Hapana muprofita waJehovha here pano, kuti tibvunze Jehovha nokwaari?” Muranda wamambo weIsraeri akati, “Pana Erisha mwanakomana waShafati. Aisimbosuridzira mvura pamaoko aEria.”
12 Jehoshafat zara sị, “Okwu Onyenwe anyị dị nʼọnụ ya.” Ya mere, eze Izrel na Jehoshafat, na eze Edọm, gakwuru ya.
Jehoshafati akati, “Shoko raJehovha riri paari.” Saka mambo weIsraeri naJehoshafati namambo weEdhomu vakaburuka vakaenda kwaari.
13 Ịlaisha zara eze Izrel sị, “Gịnị ka mụ na gị nwekọrọ? Jekwuru ndị amụma nne gị na nna gị, jụta ha ase.” Eze Izrel zara sị ya, “Mba, nʼihi na ọ bụ Onyenwe anyị kpọpụtara anyị bụ eze atọ nʼebe a, ka o were anyị nyefee nʼaka ndị Moab.”
Erisha akati kuna mambo weIsraeri, “Chiiko chandingaita nemi? Endai kuvaprofita vababa venyu navaprofita vamai venyu.” Mambo weIsraeri akapindura akati, “Kwete, nokuti ndiJehovha akatidaidza isu madzimambo matatu tose kuti azotipa kuvaMoabhu.”
14 Ịlaisha sịrị, “Ebe Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile na-adị ndụ, bụ onye m na-efe, a si na ọ bụghị nsọpụrụ m nwere nʼebe Jehoshafat eze Juda nọ, agaraghị m atụpụrụ gị ọnụ maọbụ lee gị anya nʼihu.
Erisha akati, “Zvirokwazvo naJehovha Wamasimba Ose mupenyu, wandinoshumira, dai ndanga ndisingaremekedzi Jehoshafati mambo weJudha vari pano, handaimbokutarisai kana kukuonai.
15 Ma ugbu a, kpọtaranụ m onye na-akpọ ụbọ.” Mgbe ọkpọ ụbọ ahụ malitere ịkpọ ụbọ ya, aka Onyenwe anyị bịakwasịrị Ịlaisha.
Asi zvino uyai nomuridzi worudimbwa kwandiri.” Muridzi worudimbwa paakanga achiridza, ruoko rwaJehovha rwakauya pamusoro paErisha,
16 Ọ sịrị, “Ihe a ka Onyenwe anyị kwuru, aga m eme ka ndagwurugwu a jupụta nʼolulu mmiri.
akati, “Zvanzi naJehovha: Itai kuti mupata uyu uzare namakoronga.
17 Nʼihi na otu a ka Onyenwe anyị kwuru, Unu agaghị ahụ ifufe maọbụ mmiri ozuzo, ma ndagwurugwu a ga-ejupụta na mmiri, unu onwe unu ga-aṅụ, na ehi unu, na anụmanụ ndị ọzọ unu ga-aṅụkwa mmiri.
Nokuti zvanzi naJehovha: Hamusi kuzoona mhepo kana mvura, kunyange zvakadaro, mupata uyu uchazadzwa nemvura, uye imi, nemombe dzenyu nedzimwe mhuka dzenyu muchanwamo.
18 Ma nke a bụ ihe dị nta nʼebe Onyenwe anyị nọ, nʼihi na ọ ga-enyefekwa ndị Moab nʼaka unu.
Chinhu ichi chakareruka pamberi paJehovha; achaisawo Moabhu kwamuri.
19 Unu ga-etigbu obodo ọbụla e wusiri ike, na obodo ukwu niile. Unu ga-egbudakwa ezi osisi ha na-amị mkpụrụ, kpọchie isi mmiri ha niile, werekwa nkume mebikwaa ezi ala ubi ha niile.”
Muchaparadza guta rimwe nerimwe rakakomberedzwa norusvingo uye namaguta ose makuru. Muchatemera pasi muti mumwe nomumwe wakanaka, mugotsindira matsime ose, uye muchakanganisa namabwe munda mumwe nomumwe wakanaka.”
20 O ruo, nʼụtụtụ, nʼoge e ji achụ aja nsure ọkụ ụtụtụ, lee na mmiri sitere ụzọ Edọm sọọrọ bịa nʼebe ahụ ha gwuru olulu na ndagwurugwu ala ahụ sọjuo ala ahụ niile.
Chifumi chamangwana, nenguva dzinenge dzokupa chibayiro, tarirai, mvura yakayerera ichibva kwakadziva kuEdhomu! Uye nyika yakazara nemvura.
21 Mgbe ndị Moab nụrụ na ndị eze ahụ na-abịa imegide ha, ha kpọkọtara ndị ikom ọbụla nwere ike ịlụ agha, ma okenye ma okorobịa, pụta bịa guzo nʼoke ala ha.
Zvino vaMoabhu vose vakanga vanzwa kuti madzimambo akanga auya kuzorwa navo; saka murume mumwe nomumwe, mudiki nomukuru, aigona kutakura zvombo akadaidzwa uye vakandogariswa kumuganhu.
22 Mgbe chi bọrọ nʼisi ụtụtụ, anyanwụ wara mụkwasị mmiri ahụ. Site nʼebe ha nọ, ndị Moab lepụrụ anya hụ mmiri ahụ ka ọ na-acha ọbara ọbara.
Vakati vachimuka mangwanani vakaona zuva richipenya pamusoro pemvura. KuvaMoabhu vaiva kuno rumwe rutivi, mvura yakanga yakatsvuka seropa.
23 Mgbe ahụ, ha sịrịtara onwe ha, “Leenụ ọbara! Ọ ga-abụ na ndị agha eze atọ ndị a etigbuola onwe ha. Pụtanụ, unu ndị Moab, ka anyị gaa kwakọrọ ihe nkwata na-agha!”
Vakati, “Iropa iro! Madzimambo ayo anenge arwa akaurayana. Zvino imi vaMoabhu endai munopamba!”
24 Mgbe ha gbaara ọsọ bịaruo nʼụlọ agha ndị Izrel, ndị agha Izrel biliri malite itigbu ha. Ya mere, ndị agha Moab sitere nʼihu ha gbalaga. Ma ndị agha Izrel banyere nʼime obodo ndị Moab, gbuo ihe niile ha hụrụ nʼụzọ.
Asi vaMoabhu vakati vasvika kumusasa weIsraeri, vaIsraeri vakavarwisa kusvikira vatiza. Ipapo vaIsraeri vakapinda munyika vakauraya vaMoabhu.
25 Ha tidara obodo ndị Moab niile, tinye nkume nʼala ubi ọma ndị Moab niile. Ha kpọchiri isi mmiri niile, gbudasịakwa ezi osisi niile na-amị mkpụrụ nʼala ahụ. Nʼikpeazụ, ọ bụ naanị otu obodo ndị Moab fọdụrụ, isi obodo a na-akpọ Kia Hareset. Ndị ji ụdọ na-ama nkume gbara obodo a gburugburu, bido ibuso ya agha.
Vakaparadza maguta, uye murume mumwe nomumwe akapotsera mabwe pamunda woga woga wakanaka kusvikira wafukidzwa namabwe. Vakatsindira matsime ose uye vakatema muti wose wakanga wakanaka. Kirihareseti chete ndiro rakasiyiwa riine mabwe aro, asi varume vaiva nezvimviriri vakarikomba vakarirwisawo.
26 Mgbe eze Moab hụrụ na agha ahụ anaghị agaziri ya nke ọma, ọ chịịrị narị ndị agha asaa, ndị ji mma agha ebu agha, gbalịa isi nʼetiti ndị agha Izrel tikapụta, na ncherita ihu ebe eze Edọm nọ, ma ha enweghị ike.
Mambo weMoabhu akati aona kuti akundwa, akatora varume mazana manomwe vaiva neminondo kuti varwise vaende kuna Mambo weEdhomu, asi vakakundikana.
27 Ya mere, o weere ọkpara ya, onye gaara abụ eze nʼọnọdụ ya, gbuo ya, dịka aja nʼelu mgbidi gbara obodo ahụ gburugburu nye chi Moab. Iwe dị ukwuu dị nʼụbọchị ahụ megide Izrel. Ha kwụsịrị ibu agha, laghachi nʼobodo nke aka ha.
Ipapo akatora dangwe rake, aifanira kumutevera paushe, akamupa sechibayiro parusvingo rweguta. Vakatsamwira vaIsraeri zvikuru; uye ivo vakabva kwaari vakadzokera kunyika yavo.