< 2 Ndị Eze 24 >

1 Nʼoge Jehoiakim na-achị, Nebukadneza eze Babilọn ji ike bata nʼala ya, mee ka Jehoiakim ghọọ ohu ya afọ atọ. Ma o mesịrị tụgharịa megide Nebukadneza, nupukwa isi nʼokpuru ya.
Pa nthawi ya ulamuliro wa Yehoyakimu, Nebukadinezara mfumu ya Babuloni anadzathira nkhondo dzikolo ndipo Yehoyakimu anakhala pansi pa ulamuliro wake zaka zitatu. Koma kenaka anasintha maganizo ake nawukira Nebukadinezara.
2 Onyenwe anyị zigara ndị na-apụnara mmadụ ihe site na Kaldịa, Aram, Moab na ndị Amọn, ka ha ga bibie Juda. Ọ bụ nʼusoro okwu Onyenwe anyị kpọsara site nʼọnụ ndị amụma ya.
Yehova anatumiza magulu a Ababuloni, Aaramu, Amowabu ndi Aamoni, kudzathira nkhondo Yuda. Iye anawatumiza kudzawononga Yuda molingana ndi mawu amene Yehova ananeneratu kudzera mwa aneneri ake.
3 Nʼezie, ihe ndị a bịakwasịrị Juda dịka Onyenwe anyị si nye ya nʼiwu, ka o si otu a kpochapụ ha site nʼihu ya nʼihi mmehie niile Manase mere, na dịka ihe niile o mere si dị,
Ndithu, izi zinachitikira Yuda monga momwe Yehova analamulira nʼcholinga choti awachotse pamaso pake chifukwa cha machimo a Manase ndi zonse zimene anachita,
4 tinyere ọbara ndị aka ha dị ọcha nke ọ wusiri. Nʼihi na o mere ka ọbara ndị aka ha dị ọcha jupụta na Jerusalem. Onyenwe anyị ekwekwaghị agbaghara ajọ omume dị otu a.
kuphatikizapo kukhetsa magazi a anthu osalakwa. Chifukwa iye anadzaza Yerusalemu ndi magazi a anthu osalakwa ndipo Yehova sanafune kumukhululukira.
5 Akụkọ ọzọ niile gbasara ọchịchị Jehoiakim na ihe niile o mere, e deghị ha nʼakwụkwọ akụkọ ihe e mere nʼụbọchị ndụ ndị eze Juda?
Ntchito zina za Yehoyakimu ndi zonse zimene anachita, kodi sizinalembedwe mʼbuku la mbiri ya mafumu a Yuda?
6 Jehoiakim sooro ndị nna nna ya ha dina nʼọnwụ. Jehoiakin nwa ya ghọrọ eze ọhụrụ nʼọnọdụ ya.
Yehoyakimu anamwalira ndipo anayikidwa mʼmanda pamodzi ndi makolo ake. Ndipo Yehoyakini mwana wake analowa ufumu mʼmalo mwake.
7 Ma eze Ijipt esiteghị nʼala ya pụta ọzọ, nʼihi na eze Babilọn nọchiri oke ala ya niile, site na mmiri iyi Ijipt ruo nʼoke Osimiri Yufretis.
Mfumu ya Igupto sinatulukenso mʼdziko lake chifukwa mfumu ya Babuloni inalanda mayiko onse kuchokera ku Mtsinje wa ku Igupto mpaka ku Mtsinje wa Yufurate.
8 Jehoiakin gbara afọ iri na asatọ mgbe ọ malitere ịbụ eze. Ọ chịrị naanị ọnwa atọ na Jerusalem. Aha nne ya bụ Nehushta, nwa Elnatan, onye Jerusalem.
Yehoyakini anakhala mfumu ali ndi zaka 18 ndipo analamulira mu Yerusalemu miyezi itatu. Amayi ake anali Nehusita mwana wa Elinatani wa ku Yerusalemu.
9 O mere ihe jọrọ njọ nʼanya Onyenwe anyị, dịka nna ya ha mere.
Iye anachita zoyipa pamaso pa Yehova monga anachitira abambo ake.
10 Nʼoge ọ bụ eze, ndịisi Nebukadneza, eze Babilọn bịara, gbaa Jerusalem gburugburu ma nọchibido obodo ahụ nʼagha.
Nthawi imeneyo ankhondo a Nebukadinezara mfumu ya Babuloni anabwera ku Yerusalemu nazinga mzindawo ndi misasa ya nkhondo
11 Nebukadneza, eze Babilọn nʼonwe ya, bịara nʼobodo ahụ mgbe ndị agha ya gbara ya gburugburu.
ndipo Nebukadinezara anafika ku mzindawo pamene ankhondo ake anawuzinga.
12 Jehoiakin, bụ eze Juda, na nne ya na ndị ọrụ ya niile na ndịisi niile na ndịisi ozi ya niile were onwe ha nyefee Nebukadneza nʼaka. Nʼafọ asatọ nke ọchịchị eze Babilọn ka ọ kpụụrụ Jehoiakin dịka onye mkpọrọ.
Yehoyakini mfumu ya Yuda pamodzi ndi amayi ake, atumiki ake, anthu ake olemekezeka ndiponso akuluakulu onse anadzipereka kwa mfumu ya ku Babuloni. Mfumu ya Babuloni inagwira Yoyakini ukapolo mʼchaka chachisanu ndi chitatu cha ufumu wake.
13 Ọ kwakọọrọ akụ niile dị nʼụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị, na ndị nke dị nʼụlọeze, o gbukakwara ihe ọlaedo niile Solomọn eze Izrel tinyere nʼụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị buru ha bulaa Babilọn, ihe a niile mere dịka Onyenwe anyị kwururịị.
Monga ananenera Yehova, Nebukadinezara anachotsa chuma chonse cha mʼNyumba ya Yehova ndiponso cha mʼnyumba ya mfumu ndipo anatenga ziwiya zonse zagolide za ku Nyumba ya Yehova zimene Solomoni mfumu ya Israeli anapanga.
14 O bupụkwara puku ndị ikom iri site na Jerusalem bulaa ha Babilọn dịka ndị a dọtara nʼagha. Ndị so nʼime ndị a bụ ndịisi niile na ndị agha niile. O bupụkwara ndị na-akwa ǹka niile na ndị ọkpụ ụzụ. Naanị ndị na-enweghị ike, na ndị ogbenye ka ọ hapụrụ nʼala ahụ.
Anatenga anthu onse a mu Yerusalemu kupita nawo ku ukapolo. Akuluakulu onse pamodzi ndi anthu ankhondo, anthu onse aluso ndi amisiri osula onse pamodzi analipo 10,000. Osauka okha ndiye anatsala mʼdzikomo.
15 Nebukadneza kpụụrụ Jehoiakin ka ọ ga biri na Babilọn. O sikwa na Jerusalem kpọrọ nne eze, na ndị nwunye eze, ndị ozi ya, na ndị niile a ma ama nʼala ahụ gaa Babilọn.
Nebukadinezara anatenga Yehoyakini ngati kapolo kupita naye ku Babuloni. Mu Yerusalemu anatenganso amayi a mfumu, akazi ake, akuluakulu ake ndiponso anthu olemekezeka mʼdzikomo.
16 Eze Babilọn bupụkwara ndị ikom niile dị ike ma tozukwaa ibu agha, ndị ọnụọgụgụ ha dị puku asaa, tinyere otu puku ndị ọrụ aka, na ndị ọrụ ǹka, bulaa ha Babilọn.
Mfumu ya Babuloni inatumizanso ku Babuloni anthu ankhondo 70,000, anthu amphamvu ndi okonzeka kupita ku nkhondo, anthu aluso ndi amisiri osula 1,000.
17 O mere nwanne nna Jehoiakin, bụ Matanaya, eze nʼọnọdụ ya. Ọ gụgharịrị ya aha, kpọọ ya Zedekaya.
Iye analonga ufumu Mataniya, malume wa Yoyakini mʼmalo mwake ndipo anasintha dzina lake kuti akhale Zedekiya.
18 Iri afọ abụọ na otu ka Zedekaya gbara mgbe ọ malitere ịbụ eze nʼime Jerusalem. Aha nne ya bụ Hamutal, nwa Jeremaya onye Libna. Ọ chịrị dịka eze na Jerusalem afọ iri na otu.
Zedekiya anakhala mfumu ali ndi zaka 21 ndipo analamulira mu Yerusalemu zaka 11. Amayi ake anali Hamutali mwana wa Yeremiya wa ku Libina.
19 Ma o mere ihe jọrọ njọ nʼanya Onyenwe anyị dịka Jehoiakim mere.
Iye anachita zoyipa pamaso pa Yehova monga anachitira Yehoyakimu.
20 Ọ bụ nʼihi iwe Onyenwe anyị ka ihe ndị a niile ji bịakwasị Jerusalem na Juda. Nʼikpeazụ, o sitere nʼihu ya chụpụ ha. Nʼoge a, Zedekaya nupuru isi nʼokpuru eze Babilọn.
Zonsezi zinachitikira Yerusalemu ndi Yuda chifukwa cha mkwiyo wa Mulungu ndipo pa mapeto pake anawachotsa pamaso pake. Ndipo Zedekiya anawukira mfumu ya Babuloni.

< 2 Ndị Eze 24 >