< 2 Ndị Eze 2 >

1 O ruo mgbe Onyenwe anyị chọrọ ị kpọrọ Ịlaịja laa nʼeluigwe site nʼoke ifufe, Ịlaịja na Ịlaisha nọ nʼụzọ sitere Gilgal.
Hivyo ilipokuja kuhusu, wakati Yahwe alipokuwa akienda kumchukua Eliya kwenda mbinguni kwa uvumi, ambapo Eliya aliondoka pamoja na Elisha kutoka Gigali.
2 Ịlaịja sịrị Ịlaisha, “Nọdụ nʼebe a, nʼihi na Onyenwe anyị ziri m ozi ka m gaa Betel.” Ma Ịlaisha zara sị ya, “Dịka Onyenwe anyị na-adị ndụ, na dịka gị onwe gị nọkwa na-adị ndụ, agaghị m ahapụ gị.” Ya mere, ha abụọ sooro gaa Betel.
Eliya akamwambia Elisha, '“kaa hapa, tafadhali, kwa sababu Yahwe alinituma kwa Betheli.'” Elisha akajibu, “Kama Yahwe aishivyo, na kama uishivyo, sintokuacha.'” Hivyo wakashuka chini kulekea Betheli.
3 Nʼebe ahụ, ụmụ okorobịa ndị amụma nọ na Betel pụtara zute ha abụọ. Ndị amụma ahụ bịakwutere Ịlaisha sị ya, “Ị maara na Onyenwe anyị ga-esi nʼebe ị nọ wepụ onyenwe gị Ịlaịja taa?” Ịlaisha sịrị, “Mụ onwe m maara, ma unu nọrọ nwayọọ.”
Wana wa manabii ambao walikuwa Betheli walikuja kwa Elisha na kumwambia, je unajua kwamba Yahwe atamwondoa bwana wako kuanzia leo?”' Elisha akajibu, “Ndiyo, nalijua hilo, ila msizungumze kuhusu hilo.”'
4 Mgbe ahụ, Ịlaịja sịrị ya, “Ịlaisha, nọdụ nʼebe a, nʼihi na Onyenwe anyị ziri m ozi ka m gaa Jeriko.” Ma ọ zara, “Dịka Onyenwe anyị na-adị ndụ, na dịka gị onwe gị nọkwa na-adị ndụ, agaghị m ahapụ gị.” Ya mere ha abụọ sokwaara ruo Jeriko.
Eliya akamwambia, “Elisha, subiri hapa, tafadhali, kwa kuwa Yahwe amenituma niende Yeriko.” Kisha Elisha akajibu, '“Kama Yahwe aishivyo, na kama uishivyo, sintokuacha.” Hivyo wakaenda Yeriko.
5 Ndị otu ndị amụma nọ na Jeriko bịakwutere Ịlaisha nso jụọ ya, “Ị maara na Onyenwe anyị ga-ewepụ onyenwe gị taa?” Ọ zara, “E, amaara m, ya mere nọọnụ nwayọọ.”
Kisha wana wa manabii ambao walikuwa Yeriko wakaja kwa Elisha na kumwambia, “'Je unajua kwamba Yahwe atamwondoa bwana wako kutoka kwako leo?” Elisha akajibu, “Ndiyo, nalijua hilo, lakini msilizungumzie hilo.”
6 Mgbe ahụ, Ịlaịja sịrị ya, “Nọdụ nʼebe a, nʼihi na Onyenwe anyị ziri m ka m jee Jọdan.” Ma ọ zara, “Dịka Onyenwe anyị na-adị ndụ, na dịka gị onwe gị nọkwa na-adị ndụ, agaghị m ahapụ gị.” Ya mere, ha abụọ sooro na-eje.
Kisha Eliya akamwambia, '“kaa hapa, tafadhali, kwa kuwa Yahwe amenituma kwenda Yeriko.” Elisha akajibu, “Kama Yahwe ishivyo, na kama uishivyo, sintokuacha.” Hivyo wawili wakaenda mbele.
7 Iri ndị amụma ise sitere nʼetiti ndị amụma sooro ha guzoro nʼebe dị anya na ncherita ihu ebe Ịlaịja na Ịlaisha kwụsịrị nʼakụkụ Jọdan.
Baadaye watu hamsini wa watoto wa wale manabii wakasimama kuwakabili kwa mbali kidogo wale wawili wakasimama karibu na Yordani.
8 Mgbe ahụ, Ịlaịja chịịrị uwe mwụda ya, pịakọtaa ya, tie ya nʼelu osimiri ahụ. Mmiri ahụ kewara ụzọ abụọ, ala akọrọ pụtakwara. Nʼebe ahụ ka Ịlaịja na Ịlaisha si gafee nʼofe ọzọ nke osimiri ahụ.
Eliya akachukua vazi lake, akaliviringisha, na kuyapiga maji kwa kutumia lile vazi. Ule mto ukagawanyika katika sehemu mbili hivyo basi wawili hao wakatembea hadi nchi kavu.
9 Mgbe ha abụọ gafesịrị, Ịlaịja jụrụ Ịlaisha ajụjụ sị ya, “Gịnị ka ị chọrọ ka m meere gị tupu e site nʼebe ị nọ wepụ m?” Ịlaisha rịọrọ sị ya, “Biko, mee ka m nweta ụdị mmụọ i nwere okpukpu abụọ.”
Ilitokea, walipokwisha kuvuka, kwamba Eliya akamwambia Elisha, “Niambie unachotaka nifanye kwako kabla sijaondolewa kutoka kwako.” Elisha akajibu, “Naomba sehemu kubwa ya roho yako ije kwangu.
10 Ịlaịja zara sị ya, “Ihe ị rịọrọ bụ ihe sịrị ike omume. Ọ bụrụ na ị hụ m mgbe a na-ewepụ m site nʼebe ị nọ, ị ga-enweta ihe ị rịọrọ. Ma ọ bụrụ na ị hụghị m, ị gaghị enweta ihe ị rịọrọ.”
Eliya akajibu, “Umeomba jambo gumu. Hata hivyo, kama ukiniona wakati nitakapoondolewa kutoka kwako, hii itatokea kwako, lakini kama sivyo, haitatokea.”
11 Mgbe ha na-aga nʼihu nʼije ha na-akparịta ụka, na mberede, ụgbọ ọkụ nke ịnyịnya ọkụ na-adọkpụ pụtara ihe kewaa ha abụọ. Mgbe ahụ kwa oke ifufe buuru Ịlaịja rigoro nʼeluigwe.
Ikawa walipokuwa bado wakienda mbele na kuzungumza, gari la kukokotwa na farasi lenye moto na farasi wa moto ikatokea, ambapo iliwatenga wale watu wawili kutoka kila mmoja, na Eliya akaenda juu kwa uvumi wa upepo kwenda mbinguni.
12 Ịlaisha hụrụ ya, lelie anya elu tie mkpu akwa sị, “Nna m! Nna m! Usuu ụgbọ agha na usuu ndị na-agba ịnyịnya Izrel!” Ọ hụkwaghị Ịlaịja anya ọzọ. O jidere uwe o yi nʼahụ dọwaa ya ibe abụọ.
Elisha akaiona akalia kwa sauti, “Baba yangu, baba yangu, gari la kukokotwa na farasi la Israeli na waendesha farasi!'” Hakumwona Eliya tena, na akashikilia nguo zake mwenyewe na kugawanya kwenye vipande viwili.
13 Emesịa, ọ chịlịri uwe mwụda Ịlaịja nke dapụrụ mgbe e weliri ya elu, laghachi bịa guzo nʼakụkụ osimiri Jọdan.
Akachukua vazi la Eliya lililokuwa limemwangukia, na kurudi kusimama kwenye ukingo wa Yordani.
14 O tiri akwa ahụ nʼelu mmiri ahụ jụọ sị, “Olee ebe Onyenwe anyị, Chineke Ịlaịja nọ?” Mgbe o tiri mmiri ahụ ihe, o kewakwara otu ụzọ nʼaka nri nke ọzọ nʼaka ekpe, Ịlaisha gafere nʼofe nke ọzọ.
Akayapiga maji pamoja na lile vazi la Eliya alilokuwa ameliangusha na kusema, “Yahwe yuko wapi, Mungu wa Eliya?'” Wakati alipoyapiga yale maji, yaligawanyika katika pande mbili na Elisha akavuka.
15 Mgbe ndị amụma ahụ si Jeriko nʼele anya, hụrụ ihe mere, ha sịrị, “Mmụọ Ịlaịja adakwasịla Ịlaisha.” Ha gara zute ya, kpọọ isiala nʼihu ya.
Wakati hao wana wa manabii ambao walitoka Yeriko walipomuona akikatiza kwao, wakasema, “roho ya Eliya imepumzika kwa Elisha!” Hivyo wakaja kuonana naye, na wakasujudu aridhini mbele yake.
16 Ha sịrị ya “Lee, anyị bụ ndị ohu gị nwere iri ndị ikom ise ahụ siri ike. Kwere ka ha ga chọgharịa nna gị ukwu. Ma eleghị anya mmụọ Onyenwe anyị eburula ya tụdakwa ya nʼotu ugwu, maọbụ nʼotu ndagwurugwu.” Ịlaisha zaghachiri, “Unu ezigala ha.”
Wakamwambia, “Ona sasa, miongoni mwa watumishi wako kuna watu hamsini hodari. Tunakuomba Waache waende, na kumtafuta bwana wako, endapo huyo Roho wa Yahwe alipomchukua juu na kumtupa juu ya mlima mmoja au kwenye bonde moja.” Elisha akajibu, “Hapana, msiwatume.”
17 Ma mgbe ha nọgidere rịọsie ya arịrịọ ike, ruo mgbe o nwekwaghị ike igbochi ha. Ọ gwara ha sị, “Ọ dị mma, ziganụ mmadụ ka ha gaa chọọ ya.” Ha zigara iri ndị ikom ise, ndị gara chọgharịa Ịlaịja ụbọchị atọ, ma ha achọtaghị ya.
Lakini walimsihi Elisha hadi akaona aibu, akasema, “Watume.”Ndipo wakawatuma watu hamsini, na wakatafuta kwa mda wa siku tatu, lakini hawakumpata.
18 Ịlaisha nọ na Jeriko mgbe ndị a lọghachiri bịa kọọrọ ya otu ha si gaa. Mgbe ahụ, ọ gwara ha sị, “Ọ bụ na m agwaghị unu sị unu ejela?”
Wakarudi kwa Elisha, wakati alipokuwa bado yuko Yeriko, na akasema, “Je sikusema, 'msiende'?”
19 Ndị obodo ahụ sịrị Ịlaisha, “Lee, onyenwe anyị, obodo anyị dị nʼebe dị mma, dịka gị onwe gị na-ahụ, ma mmiri dị nʼime ya jọrọ njọ, ala ya adịghị amịpụta mkpụrụ dịka o kwesiri.”
Watu wa mjini wakamwambia Elisha, “Ona, tunakuomba, hali ya mjini hapa ni pazuri, kama bwana wangu awezavyo kuona, lakini maji ni mabaya na hiyo nchi haiwezi kuzaa matunda.”
20 Ịlaisha zara sị ha, “Ọ dị mma, gaanụ tinye nnu nʼime efere ọhụrụ wetara m ya.” Ha gara weta efere ọhụrụ nke nnu juru nʼime ya.
Elisha akajibu, “Nileteeni bakuli jipya na muweke chumvi ndani ya hilo bakuli,” hivyo wakamletea.
21 Ịlaisha buuru nnu ahụ gaa nʼebe mmiri ahụ si asọpụta, wụnye nnu ahụ nʼime ya. Mgbe ọ na-eme nke a, o kwuru okwu sị, “Ihe ndị a ka Onyenwe anyị kwuru, ‘Agwọọla m mmiri a. Ọnwụ maọbụ amịghị mkpụrụ nke ala agaghị adịkwa.’”
Elisha akaenda hadi kwenye chemichemi za maji na kutupia chumvi ndani; halafu akasema, “Yahwe asema hivi, 'Nimeyaponya haya maji. Kuanzia mda huu, hakutakuwa na kifo au nchi isiyozaa matunda.
22 Site nʼụbọchị ahụ gaa nʼihu, mmiri ahụ dịịrị ọcha ruo taa, dịka Ịlaisha kwuru.
“Hivyo hayo maji yakaponya hata leo, kwa lile neno ambalo Elisha aliongea.
23 Emesịa, Ịlaisha sitere na Jeriko pụọ ịlaghachi Betel. Mgbe ọ na-aga nʼụzọ, ụfọdụ ụmụ okorobịa nta sitere nʼime obodo pụta, bidoro jiri ya na-eme ihe ọchị, sị ya, “Onyeisi nkwọcha, site nʼebe a pụọ! Onyeisi nkwọcha, site nʼebe a pụọ!”
Ndipo Elisha akapanda kutoka pale mpaka Betheli. Naye alipokuwa akienda hadi kwenye barabara, wakatokea vijana nje ya mji na kumtania, wakamwambia, “Panda juu, wewe mwenye kipara! Panda juu, wewe mwenye kipara!”
24 Ịlaisha tụgharịrị lee ha anya, bụọ ha ọnụ nʼaha Onyenwe anyị. Otu mgbe ahụ, nne anụ ọhịa abụọ, a na-akpọ bịa, sitere nʼọhịa pụta, dọgbuo iri ụmụ okorobịa anọ na abụọ nʼime ha.
Elisha alipotazama nyuma yake na kuwaona; alimwambia Yahwe awalaani. Ndipo dubu wa kike wawili wakatokea kichakani na kuwajeruhi vijana arobaini na mbili.
25 Emesịa, Ịlaisha sitere nʼebe ahụ pụọ jeruo nʼugwu Kamel. Emesịakwa, o sitere nʼebe ahụ laghachi na Sameria.
Ndipo Elisha alipoondoka pale na kuelekea Mlima Karmeli, na kutoka huko alirudi samaria.

< 2 Ndị Eze 2 >