< 2 Ndị Eze 2 >

1 O ruo mgbe Onyenwe anyị chọrọ ị kpọrọ Ịlaịja laa nʼeluigwe site nʼoke ifufe, Ịlaịja na Ịlaisha nọ nʼụzọ sitere Gilgal.
And it came to pass when Jehovah would take up Elijah into the heavens by a whirlwind, that Elijah went with Elisha from Gilgal.
2 Ịlaịja sịrị Ịlaisha, “Nọdụ nʼebe a, nʼihi na Onyenwe anyị ziri m ozi ka m gaa Betel.” Ma Ịlaisha zara sị ya, “Dịka Onyenwe anyị na-adị ndụ, na dịka gị onwe gị nọkwa na-adị ndụ, agaghị m ahapụ gị.” Ya mere, ha abụọ sooro gaa Betel.
And Elijah said to Elisha, Abide here, I pray thee; for Jehovah has sent me to Bethel. And Elisha said, As Jehovah liveth, and as thy soul liveth, I will not leave thee! So they went down to Bethel.
3 Nʼebe ahụ, ụmụ okorobịa ndị amụma nọ na Betel pụtara zute ha abụọ. Ndị amụma ahụ bịakwutere Ịlaisha sị ya, “Ị maara na Onyenwe anyị ga-esi nʼebe ị nọ wepụ onyenwe gị Ịlaịja taa?” Ịlaisha sịrị, “Mụ onwe m maara, ma unu nọrọ nwayọọ.”
And the sons of the prophets that were at Bethel came forth to Elisha, and said to him, Dost thou know that Jehovah will take away thy master from over thy head to-day? And he said, I also know it: be silent!
4 Mgbe ahụ, Ịlaịja sịrị ya, “Ịlaisha, nọdụ nʼebe a, nʼihi na Onyenwe anyị ziri m ozi ka m gaa Jeriko.” Ma ọ zara, “Dịka Onyenwe anyị na-adị ndụ, na dịka gị onwe gị nọkwa na-adị ndụ, agaghị m ahapụ gị.” Ya mere ha abụọ sokwaara ruo Jeriko.
And Elijah said to him, Elisha, abide here, I pray thee; for Jehovah has sent me to Jericho. And he said, As Jehovah liveth, and as thy soul liveth, I will not leave thee! And they came to Jericho.
5 Ndị otu ndị amụma nọ na Jeriko bịakwutere Ịlaisha nso jụọ ya, “Ị maara na Onyenwe anyị ga-ewepụ onyenwe gị taa?” Ọ zara, “E, amaara m, ya mere nọọnụ nwayọọ.”
And the sons of the prophets that were at Jericho drew near to Elisha and said to him, Dost thou know that Jehovah will take away thy master from over thy head to-day? And he said, I also know it: be silent!
6 Mgbe ahụ, Ịlaịja sịrị ya, “Nọdụ nʼebe a, nʼihi na Onyenwe anyị ziri m ka m jee Jọdan.” Ma ọ zara, “Dịka Onyenwe anyị na-adị ndụ, na dịka gị onwe gị nọkwa na-adị ndụ, agaghị m ahapụ gị.” Ya mere, ha abụọ sooro na-eje.
And Elijah said to him, Abide here, I pray thee; for Jehovah has sent me to the Jordan. And he said, As Jehovah liveth, and as thy soul liveth, I will not leave thee! And they two went on.
7 Iri ndị amụma ise sitere nʼetiti ndị amụma sooro ha guzoro nʼebe dị anya na ncherita ihu ebe Ịlaịja na Ịlaisha kwụsịrị nʼakụkụ Jọdan.
And fifty men of the sons of the prophets went and stood opposite afar off; and they two stood by the Jordan.
8 Mgbe ahụ, Ịlaịja chịịrị uwe mwụda ya, pịakọtaa ya, tie ya nʼelu osimiri ahụ. Mmiri ahụ kewara ụzọ abụọ, ala akọrọ pụtakwara. Nʼebe ahụ ka Ịlaịja na Ịlaisha si gafee nʼofe ọzọ nke osimiri ahụ.
And Elijah took his mantle, and wrapped it together, and smote the waters, and they were divided hither and thither; and they two went over on dry ground.
9 Mgbe ha abụọ gafesịrị, Ịlaịja jụrụ Ịlaisha ajụjụ sị ya, “Gịnị ka ị chọrọ ka m meere gị tupu e site nʼebe ị nọ wepụ m?” Ịlaisha rịọrọ sị ya, “Biko, mee ka m nweta ụdị mmụọ i nwere okpukpu abụọ.”
And it came to pass when they had gone over, that Elijah said to Elisha, Ask what I shall do for thee, before I am taken away from thee. And Elisha said, I pray thee, let a double portion of thy spirit be upon me.
10 Ịlaịja zara sị ya, “Ihe ị rịọrọ bụ ihe sịrị ike omume. Ọ bụrụ na ị hụ m mgbe a na-ewepụ m site nʼebe ị nọ, ị ga-enweta ihe ị rịọrọ. Ma ọ bụrụ na ị hụghị m, ị gaghị enweta ihe ị rịọrọ.”
And he said, Thou hast asked a hard thing: if thou see me when I am taken from thee, it shall be so to thee; but if not, it shall not be [so].
11 Mgbe ha na-aga nʼihu nʼije ha na-akparịta ụka, na mberede, ụgbọ ọkụ nke ịnyịnya ọkụ na-adọkpụ pụtara ihe kewaa ha abụọ. Mgbe ahụ kwa oke ifufe buuru Ịlaịja rigoro nʼeluigwe.
And it came to pass as they went on, and talked, that behold, a chariot of fire and horses of fire; and they parted them both asunder; and Elijah went up by a whirlwind into the heavens.
12 Ịlaisha hụrụ ya, lelie anya elu tie mkpu akwa sị, “Nna m! Nna m! Usuu ụgbọ agha na usuu ndị na-agba ịnyịnya Izrel!” Ọ hụkwaghị Ịlaịja anya ọzọ. O jidere uwe o yi nʼahụ dọwaa ya ibe abụọ.
And Elisha saw [it], and he cried, My father, my father! the chariot of Israel and the horsemen thereof! And he saw him no more. Then he took hold of his own garments and rent them in two pieces.
13 Emesịa, ọ chịlịri uwe mwụda Ịlaịja nke dapụrụ mgbe e weliri ya elu, laghachi bịa guzo nʼakụkụ osimiri Jọdan.
And he took up the mantle of Elijah which fell from him, and went back and stood by the bank of the Jordan;
14 O tiri akwa ahụ nʼelu mmiri ahụ jụọ sị, “Olee ebe Onyenwe anyị, Chineke Ịlaịja nọ?” Mgbe o tiri mmiri ahụ ihe, o kewakwara otu ụzọ nʼaka nri nke ọzọ nʼaka ekpe, Ịlaisha gafere nʼofe nke ọzọ.
and he took the mantle of Elijah which had fallen from him, and smote the waters, and said, Where is Jehovah, the God of Elijah? He also smote the waters, and they parted hither and thither, and Elisha went over.
15 Mgbe ndị amụma ahụ si Jeriko nʼele anya, hụrụ ihe mere, ha sịrị, “Mmụọ Ịlaịja adakwasịla Ịlaisha.” Ha gara zute ya, kpọọ isiala nʼihu ya.
And the sons of the prophets who were at Jericho on the opposite side saw him, and they said, The spirit of Elijah rests on Elisha. And they came to meet him, and bowed themselves to the ground before him,
16 Ha sịrị ya “Lee, anyị bụ ndị ohu gị nwere iri ndị ikom ise ahụ siri ike. Kwere ka ha ga chọgharịa nna gị ukwu. Ma eleghị anya mmụọ Onyenwe anyị eburula ya tụdakwa ya nʼotu ugwu, maọbụ nʼotu ndagwurugwu.” Ịlaisha zaghachiri, “Unu ezigala ha.”
and said to him, Behold now, there are with thy servants fifty valiant men; let them go, we pray thee, and seek thy master, lest perhaps the Spirit of Jehovah have taken him up, and cast him upon some mountain, or into some ravine. And he said, Ye shall not send.
17 Ma mgbe ha nọgidere rịọsie ya arịrịọ ike, ruo mgbe o nwekwaghị ike igbochi ha. Ọ gwara ha sị, “Ọ dị mma, ziganụ mmadụ ka ha gaa chọọ ya.” Ha zigara iri ndị ikom ise, ndị gara chọgharịa Ịlaịja ụbọchị atọ, ma ha achọtaghị ya.
And they pressed him till he was ashamed, and he said, Send. They sent therefore fifty men, and they sought three days, but did not find him.
18 Ịlaisha nọ na Jeriko mgbe ndị a lọghachiri bịa kọọrọ ya otu ha si gaa. Mgbe ahụ, ọ gwara ha sị, “Ọ bụ na m agwaghị unu sị unu ejela?”
And they came again to him (now he was staying at Jericho); and he said to them, Did I not say to you, Go not?
19 Ndị obodo ahụ sịrị Ịlaisha, “Lee, onyenwe anyị, obodo anyị dị nʼebe dị mma, dịka gị onwe gị na-ahụ, ma mmiri dị nʼime ya jọrọ njọ, ala ya adịghị amịpụta mkpụrụ dịka o kwesiri.”
And the men of the city said to Elisha, Behold now, the situation of the city is good, as my lord sees; but the water is bad, and the land is barren.
20 Ịlaisha zara sị ha, “Ọ dị mma, gaanụ tinye nnu nʼime efere ọhụrụ wetara m ya.” Ha gara weta efere ọhụrụ nke nnu juru nʼime ya.
And he said, Bring me a new cruse, and put salt in it. And they brought it to him.
21 Ịlaisha buuru nnu ahụ gaa nʼebe mmiri ahụ si asọpụta, wụnye nnu ahụ nʼime ya. Mgbe ọ na-eme nke a, o kwuru okwu sị, “Ihe ndị a ka Onyenwe anyị kwuru, ‘Agwọọla m mmiri a. Ọnwụ maọbụ amịghị mkpụrụ nke ala agaghị adịkwa.’”
And he went forth to the source of the waters, and cast the salt in there, and said, Thus saith Jehovah: I have healed these waters: there shall not be from thence any more death or barrenness.
22 Site nʼụbọchị ahụ gaa nʼihu, mmiri ahụ dịịrị ọcha ruo taa, dịka Ịlaisha kwuru.
And the waters were healed to this day, according to the saying of Elisha which he spoke.
23 Emesịa, Ịlaisha sitere na Jeriko pụọ ịlaghachi Betel. Mgbe ọ na-aga nʼụzọ, ụfọdụ ụmụ okorobịa nta sitere nʼime obodo pụta, bidoro jiri ya na-eme ihe ọchị, sị ya, “Onyeisi nkwọcha, site nʼebe a pụọ! Onyeisi nkwọcha, site nʼebe a pụọ!”
And he went up from thence to Bethel, and as he went up by the way, there came forth little boys out of the city, and mocked him, and said to him, Go up, bald head; go up, bald head!
24 Ịlaisha tụgharịrị lee ha anya, bụọ ha ọnụ nʼaha Onyenwe anyị. Otu mgbe ahụ, nne anụ ọhịa abụọ, a na-akpọ bịa, sitere nʼọhịa pụta, dọgbuo iri ụmụ okorobịa anọ na abụọ nʼime ha.
And he turned back, and looked on them, and cursed them in the name of Jehovah. And there came forth two she-bears out of the wood, and tore forty-two children of them.
25 Emesịa, Ịlaisha sitere nʼebe ahụ pụọ jeruo nʼugwu Kamel. Emesịakwa, o sitere nʼebe ahụ laghachi na Sameria.
And he went from thence to mount Carmel, and from thence he returned to Samaria.

< 2 Ndị Eze 2 >