< 2 Ndị Eze 19 >

1 Mgbe eze Hezekaya, nụrụ nke a, ọ dọwara uwe ya, yikwasị akwa mkpe, baa nʼime ụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị.
Ikawa kuhusu kwamba wakati Mfalme Hezekia aliposikia taazrifa zao, akararua mavazi yake, akavaa nguo za magunia, na kwenda kwenye nyumba ya Yahwe.
2 O zipụrụ Eliakịm onye nlekọta ụlọeze, Shebna ode akwụkwọ eze na ndị okenye nʼetiti ndị nchụaja, bụ ndị yikwa akwa mkpe, ka ha jekwuru Aịzaya onye amụma, nwa Emọz.
Akamtuma Elkana, ambaye alikua msimamizi wa nyumba ya mfalme, na Shebna yule mwandishi, na wazee wa makuhani, wote walikuwa wamefunikwa na nguo za magunia, kwenda kwa Isaya mwana wa Amozi, yule nabii.
3 Ha sịrị ya, “Otu a ka Hezekaya sịrị, Ụbọchị taa bụ ụbọchị ahụhụ, na ịba mba na nke ihe ihere. Ụbọchị jọgburu onwe ya dịka ụbọchị nwanyị nọ nʼoke ihe mgbu nke ịmụ nwa ma ike adịkwaghị o ji amụpụta nwa ya.
Wakamwambia, “Hezekia wakisema, 'siku hii ni siku ya mateso, shutuma, na fedheha, kwa kuwa wakati umewadia watoto kuzaliwa, lakini hakuna nguvu ili wazaliwe.
4 Ma eleghị anya Onyenwe anyị Chineke gị, ga-anụ okwu ahụ niile nke Rabashaka bụ ọchịagha, onye nna ya ukwu bụ eze Asịrịa, zitere ịkwa Chineke dị ndụ emo. Eleghị anya Onyenwe anyị Chineke gị ga-abara ya mba nʼihi okwu ndị a niile o kwuru, bụ ndị ọ nụrụ. Ya mere, kpeere anyị ekpere, anyị bụ ndị fọdụrụ ndụ.”
Inaweza kuwa Yahwe Mungu wako atasikia maneno yote ya amiri jeshi mkuu, ambaye mfalme wa Ashuru bwana wake amemtuma kumkaidi Mungu aliye hai, naye atayakemea yale maneno ambayo Yahwe Mungu wako aliyasikia. Sasa inua maombi yako juu kwa ajili ya mabaki yaliyo bakia hapo.”'
5 Mgbe ndị ozi eze Hezekaya bịakwutere Aịzaya,
Hivyo watumishi wa mfalme Hezekia wakaja kwa Isaya,
6 ọ sịrị ha, “Otu a ka unu ga-asị nna unu ukwu, ‘Otu a ka Onyenwe anyị kwuru, Atụla egwu nʼihi okwu niile nke ị nụrụ, bụ nke ndị na-ejere eze Asịrịa ozi ji kwuluo m.
na Isaya akawaambia, “Mwambieni bwana wenu: 'Yahwe asema hivi, “Usiyaogope maneno ambayo uliyoyasikia, pamoja na kwamba watumishi wa mfalme wa Ashuru wamenitukana.
7 Gee ntị, mgbe ọ nụrụ akụkọ dị aṅaa, aga m eme ka ọ chọọ ịlaghachi nʼobodo nke aka ya. Nʼebe ahụ ka m ga-emekwa ka e jiri mma agha gbuo ya.’”
Tazama, nitaweka roho ndani yake, na yamkini atasikia taarifa na kurudi kwenye nchi yake mwenyewe. Nitamfanya aanguke kwa upanga katika nchi yake mwenyewe."”'
8 Mgbe ọchịagha ahụ nụrụ na eze Asịrịa e sitela nʼobodo Lakish pụa, ọ laghachiri hụ na eze Asịrịa na-ebuso obodo Libna agha.
Kisha amiri jeshi mkuu akarudi na kumkuta mfalme wa Ashuru akipigana dhidi ya Libna, kwa kuwa alisikia kwamba mfalme alikuwa ameenda kutoka Lakishi.
9 Nʼoge ahụ, Senakerib natara ozi na Tiahaka, eze Kush, na-apụta ịbịa ibuso ya agha. Ya mere, o zipụrụ ndị ozi ka ha ga zie Hezekaya ozi, sị,
Kisha Senakeribu akasikia kwamba Tirhaka mfalme wa Kushi na Misri alihamasisha kupigana dhidi yake, hivyo akatuma wajumbe tena kwa Hezekia pamoja na ujumbe:
10 “Gwanụ Hezekaya, eze Juda, Ekwela ka Chineke onye ị na-atụkwasị obi duhie gị, mgbe ọ na-asị, ‘Agaghị enyefe Jerusalem nʼaka eze Asịrịa.’
“Mwambieni Hezekia mfalme wa Yuda, 'Asikudanganye Mungu wako unayemwamini, kusema, “Yerusalemu haitawekwa kwenye mikono ya mikono ya mfalme wa Ashuru.”
11 Nʼezie a, ị nụla ihe ndị eze Asịrịa mere obodo niile ha busoro agha, otu ha si bibie ha kpamkpam. Ma a ga-anapụtakwa gị onwe gị?
Tazama, umesikia kwamba wafalme wa Ashuru wamemaliza nchi zote kwa kuziharibu kabisa. Kwa hiyo je utaokoka?
12 Chi niile nke mba niile ndị ahụ nna nna m ha lara nʼiyi, ha napụtara ha, bụ chi ndị Gozan, Haran, Rezef na nke ndị Eden, ndị nọ na Tel Asa?
Je wale miungu wa mataifa wamewaokoa, mataifa ambao baba zangu waliyaharibu: Gozani, Harani, Resefu, na watu wa Edeni katika Telasari?
13 Olee ebe eze ndị Hamat maọbụ eze Apad nọ? Olee ebe eze obodo Lair, Sefavaim, Hena na Iva nọkwa?”
Je yuko wapi mfalme wa Hamathi, mfalme Arpadi, mfalme wa miji ya Sefarvaimu, wa Hena, na Iva?”'
14 Mgbe Hezekaya natara akwụkwọ ozi a site nʼaka ndị ozi ahụ, gụọ ya, o weere ya gaa nʼime ụlọnsọ Onyenwe anyị, gbasaa ya nʼihu Onyenwe anyị.
Hezekia akapokea hii barua kutoka wale wajumbe na kuisoma. Kisha akapanda hata kwenye nyumba ya Yahwe na kuukunjua mbele yake.
15 Hezekaya kpere ekpere nye Onyenwe anyị, sị, “O, Onyenwe anyị, Chineke nke Izrel, onye ocheeze ya dị nʼetiti ndị cherubim, naanị gị bụ Chineke na-achị alaeze niile nke ụwa. Ọ bụkwa naanị gị kere eluigwe na ụwa.
Kisha Hezekia akaomba mbele ya Yahwe na kusema, “Yahwe wa majeshi, Mungu wa Israeli, uketiye juu ya makerubi, wewe ni Mungu wa pekee juu ya tawala zote za dunia. Uliyeziumba mbingu na nchi.
16 Tọọ ntị gị nʼala, o Onyenwe anyị ma nụrụ; meghee anya gị abụọ Onyenwe anyị, ka ịhụ; gee ntị nụkwa okwu ndị ahụ Senakerib zitere, nke o ji ekwulu Chineke dị ndụ.
Tega sikio lako, Yahwe, na usikie. Fungua macho yako, Yahwe, na tazama, na sikia maneno ya Senakeribu, ambayo ameyatuma kumdhihaki Mungu aliye hai.
17 “Nʼeziokwu, Onyenwe anyị, ndị eze Asịrịa alala mba niile a dị iche iche na ala ha nʼiyi, mee ka ha tọgbọrọ nʼefu.
Ni kweli, Yahwe, wafalme wa Ashuru ameyaharibu mataifa na nchi zao.
18 Ha atụnyekwala chi ha niile nʼime ọkụ, repịakwa ha, nʼihi na ọ bụghị chi ka ha bụ, kama ha bụ naanị ihe a kpụrụ akpụ, nke mmadụ ji osisi na nkume pịa.
Wameiweka miungu yao kwenye moto, kwa kuwa hawakuwa miungu lakini ilikuwa kazi ya mikono ya watu, ilikuwa miti na mawe. Hivyo Waashuru wamewaharibu.
19 Ugbu a, Onyenwe anyị Chineke anyị, biko, zọpụta anyị site nʼaka ya, ka alaeze niile nke ụwa mata na naanị gị Onyenwe anyị, naanị, bụ Chineke.”
Basi sasa, Yahwe Mungu wetu, tuokoe, nakusihi, kutoka kwenye nguvu zake, ili kwamba mamlaka zote za dunia zipate kujua yakwamba wewe, Yahwe, ndiye Mungu wa pekee.”
20 Mgbe ahụ Aịzaya nwa Emọz zigaara Hezekaya ozi sị, “Otu a ka Onyenwe anyị, Chineke Izrel sịrị, Anụla m ekpere i kpere banyere Senakerib, eze Asịrịa.
Kisha Isaya mwana wa Amozi akatuma ujumbe kwa Hezekia, akisema, “Yahwe, Mungu wa Israeli asema, 'Kwasababu umeomba kwangu kuhusiana na Senakeribu mfalme wa Ashuru, nimekusikia.
21 Nke a bụ okwu nke Onyenwe anyị kwuru megide ya: “‘Nwaagbọghọ na-amaghị nwoke, bụ Ada Zayọn na-elelị gị anya, ma jirikwa gị na-eme ihe ọchị. Nwaada Jerusalem na-efufekwa isi ya mgbe ị na-agbapụ ọsọ
Hili ndilo neno ambalo Yahwe ameliongea kuhusu yeye: “Bikira binti Sayuni amekudharau na kukucheka kwa dharau. Binti wa Yerusalemu akatikisa kichwa juu yako.
22 Onye ka ị kparịrị ma kwulukwaa? Ọ bụ onye ka i sitere na nganga gị welie olu okwu gị na anya gị elu megide? Ọ bụ megide Onye Nsọ nke Izrel?
Je ni nani uliyemchokoza na kumtukana? Dhidi ya nani umeinua sauti yako na kuinua macho yako katika majivuno? Juu ya Mtakatifu wa Israeli!
23 I sitere nʼaka ndị ozi gị kparịa Onyenwe anyị, kwuluo ya, ị sịkwara, “Eji m ọtụtụ ụgbọala m rigoruo ebe dị elu nke nʼelu ugwu niile, nʼebe kachasị elu nke ugwu Lebanọn. Egbudasịala m osisi sida ya niile toro ogologo, na osisi junipa ya niile kachasị mma. Ejeruola m na nsọtụ niile ya, bụ ebe kachasị maa mma nʼoke ọhịa ya niile.
Kupitia wajumbe wako wamemdharau Bwana, na kusema, 'Pamoja na wingi wa magari yangu ya farasi nimeenda juu ya vilele ya milima, hata juu ya kilele cha Lebanoni. Nitaikata mierezi mirefu na kuchagua miti ya mivinje huko. Nitaingia sehemu za makazi yake yaliyo mbali, msitu wake uzaao sana.
24 Egwuola m ọtụtụ olulu mmiri nʼala ndị mba ọzọ, ṅụkwa mmiri dị nʼebe ahụ. Ọ bụ ọbụ ụkwụ m ka m ji mee ka isi iyi niile dị nʼIjipt takpọọ.”
Nimechimba visima na kunywa maji mageni. Nimekausha mito yote ya Misri chini ya soli ya miguu yangu.'
25 “‘Ọ bụ na ị nụbeghị? Na mgbe ochie ka m kpebiri ya. Nʼụbọchị ndị ahụ gara aga ka m nọ pịa ọpịpịa ya; ugbu a, emeela m ka ọ bịa na mmezu, na ị meela ka obodo nke mgbidi gbara gburugburu, ghọọ mkpokọta nkume.
Je hukusikia jinsi nilivyoagiza tangu zamani, na kuyafanya tangu siku za zamani? Sasa ninalileta kupita. Uko hapa kupunguza miji isiyoingilika kwenye rundo la maangamizi.
26 Ndị bi nʼime ha, ndị a napụrụ ike ha nwere bụ ndị dara mba, ndị e tinyekwara nʼọnọdụ ihere. Ha dịka ahịhịa ndụ puru nʼala ubi na ome na-epupụta epupụta nakwa ahịhịa na-etopụta nʼelu ụlọ nke anwụ na-achakpọ tupu o tolite.
Makazi yao, ya nguvu kidogo, imevunjwa vunjwa na aibu. Wamekuwa mimea katika shamba, majani ya kijani, majani juu kwenye dari au kwenye shamba, lililochomwa kabla halijakua.
27 “‘Ma amaara m ebe ị nọ ọnọdụ marakwa ọpụpụ gị na mbata gị marakwa oke iwe gị megide m.
Lakini najua kuketi kwako chini, na kutoka kwako, kuingia kwako dhidi yangu.
28 Nʼihi ọnụma dị gị nʼobi megide m, nʼihi na mkparị gị eruola m ntị, aga m etinye nko m nʼimi gị werekwa mkpụmkpụ igwe m kpachie egbugbere ọnụ gị mee ka ị laghachi site nʼụzọ ahụ nke i siri bịa.’
Kwasababu kiburi chako kimeyafikia masikio yangu, Nitaweka kulabu yangu kwenye pua yako, na hatamu yangu kwenye mdomo wako; nitakurudisha nyuma kwa njia ile ile uliyoijia.”
29 “Ma nke a ga-abụ ihe ịrịbama, nye gị, Hezekaya: “Nʼafọ a unu ga-eri ihe na-epu nʼonwe ya, nʼafọ nke abụọ unu ga-eri ihe ubi si na nke ahụ pupụta. Ma nʼafọ nke atọ ghaanụ mkpụrụ ubi, weenụ ihe ubi; kụọ vaịnị nʼubi vaịnị, riekwanụ mkpụrụ ha.
Hii ndiyo itakuwa ishara kwako: Mwaka huu mtakula vitu viotavyo porini, na katika mwaka wa pili vile vikuavyo katika huo. Lakini katika mwaka wa tatu ni lazima mpande na kuvuna, kupanda mashamba ya mizabibu na kula matunda yake.
30 Ọzọkwa, ndị fọdụrụ nʼalaeze Juda ga-agba mgbọrọgwụ nʼokpuru ala, mịkwaa mkpụrụ nʼelu.
Mabaki ya nyumba ya Yuda ambayo yataokoka yatachukua tena mizizi na kuzaa matunda.
31 Nʼihi na ọ bụ site na Jerusalem ka ndị fọdụrụ ga-esi pụta; otu ndị fọdụrụ ndụ ga-esitekwa nʼugwu Zayọn pụta. “Ọ bụ site nʼịnụ ọkụ nʼobi nke Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile ga-emezu nke a.
Kwa kuwa mabaki yatatoka Yerusalemu, kutoka Mlima Sayuni wenye kuokoka utakuja. Wivu wa Yahwe wa majeshi utafanya hivyo.
32 “Ya mere, nke a bụ ihe Onyenwe anyị kwuru banyere eze Asịrịa, sị, “‘Ọ gaghị azọbata ụkwụ ya nʼime obodo a maọbụ gbaa ọ bụladị otu àkụ nʼebe a. Ọ gaghị eji ọta jegharịa nʼọnụ ụzọ ama ya, maọbụ wuo mgbidi nnọchibido megide ya.
Kwa hiyo Yahwe asema hivi kuhusu mfalme wa Ashuru: “Hatakuja kwenye huu mji wala kupiga mshale hapa. Wala hatakuja mbele yake na ngao au kujenga boma dhidi yake.
33 Ụzọ o si bịa ka ọ ga-esi laghachi; ọ gaghị abanye nʼobodo a. Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri ya.
Njia ile ile aliyoijia ndiyo njia atakayoondokea; hatoingia mji huu - hivi ndivyo asemavyo Yahwe.”
34 Aga m echebe obodo a, zọpụtakwa ya nʼihi aha m, na nʼihi Devid, bụ ohu m.’”
Kwa maana nitaulinda huu mji na kuuokoa, kwa ajili yangu mwenyewe na kwa ajili ya Daudi mtumishi wangu.”'
35 Nʼabalị ahụ, mmụọ ozi Onyenwe anyị pụrụ gaa tigbuo otu puku narị na puku iri asatọ na ise nʼụlọ ikwu ndị Asịrịa. Mgbe ndị mmadụ tetara nʼisi ụtụtụ, lee, ozu ka ha jupụtara ebe niile.
Ikawa kuhusu usiku huo ambao malaika wa Yahwe alitoka na kuvamia kambi ya Waashuru, akawaua maaskari 185, 000. Kisha watu wakaamka asubuhi na mapema, miili ya watu waliokuwa wamekufa ilikuwa imelala kila mahali.
36 Ya mere, Senakerib, eze Asịrịa biliri ije, laghachi nʼala ya. Ọ laghachiri biri nʼobodo Ninive.
Hivyo Senakeribu mfalme wa Ashuru akaondoka Israeli na kwenda nyumbani na kuishi katika Ninawi.
37 Otu ụbọchị, mgbe ọ nọ na-akpọ isiala nʼụlọ chi ya a na-akpọ Nisrọk, ụmụ ya ndị ikom aha ha bụ Adramelek na Shareza were mma agha gbuo ya. Ha gbapụrụ ọsọ gbaga nʼala Ararat. Isahadon, bụ nwa ya nwoke, ghọrọ eze nʼọnọdụ ya.
Baadaye, alipokuwa akiabudu kwenye nyumba ya Nisroki mungu wake, watoto wake Adramaleki na Shareza wakamuua kwa upanga. Kisha wakakimbilia kwenye nchi ya Ararati. Kisha Esarhodani mwanaye akawa mfalme katika mahali pake.

< 2 Ndị Eze 19 >