< 2 Ndị Eze 19 >
1 Mgbe eze Hezekaya, nụrụ nke a, ọ dọwara uwe ya, yikwasị akwa mkpe, baa nʼime ụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị.
On hearing this report, King Hezekiah tore his clothes, put on sackcloth, and entered the house of the LORD.
2 O zipụrụ Eliakịm onye nlekọta ụlọeze, Shebna ode akwụkwọ eze na ndị okenye nʼetiti ndị nchụaja, bụ ndị yikwa akwa mkpe, ka ha jekwuru Aịzaya onye amụma, nwa Emọz.
And he sent Eliakim the palace administrator, Shebna the scribe, and the leading priests, all wearing sackcloth, to the prophet Isaiah son of Amoz
3 Ha sịrị ya, “Otu a ka Hezekaya sịrị, Ụbọchị taa bụ ụbọchị ahụhụ, na ịba mba na nke ihe ihere. Ụbọchị jọgburu onwe ya dịka ụbọchị nwanyị nọ nʼoke ihe mgbu nke ịmụ nwa ma ike adịkwaghị o ji amụpụta nwa ya.
to tell him, “This is what Hezekiah says: Today is a day of distress, rebuke, and disgrace; for children have come to the point of birth, but there is no strength to deliver them.
4 Ma eleghị anya Onyenwe anyị Chineke gị, ga-anụ okwu ahụ niile nke Rabashaka bụ ọchịagha, onye nna ya ukwu bụ eze Asịrịa, zitere ịkwa Chineke dị ndụ emo. Eleghị anya Onyenwe anyị Chineke gị ga-abara ya mba nʼihi okwu ndị a niile o kwuru, bụ ndị ọ nụrụ. Ya mere, kpeere anyị ekpere, anyị bụ ndị fọdụrụ ndụ.”
Perhaps the LORD your God will hear all the words of the Rabshakeh, whom his master the king of Assyria has sent to defy the living God, and He will rebuke him for the words that the LORD your God has heard. Therefore lift up a prayer for the remnant that still survives.”
5 Mgbe ndị ozi eze Hezekaya bịakwutere Aịzaya,
So the servants of King Hezekiah went to Isaiah,
6 ọ sịrị ha, “Otu a ka unu ga-asị nna unu ukwu, ‘Otu a ka Onyenwe anyị kwuru, Atụla egwu nʼihi okwu niile nke ị nụrụ, bụ nke ndị na-ejere eze Asịrịa ozi ji kwuluo m.
who replied, “Tell your master that this is what the LORD says: ‘Do not be afraid of the words you have heard, with which the servants of the king of Assyria have blasphemed Me.
7 Gee ntị, mgbe ọ nụrụ akụkọ dị aṅaa, aga m eme ka ọ chọọ ịlaghachi nʼobodo nke aka ya. Nʼebe ahụ ka m ga-emekwa ka e jiri mma agha gbuo ya.’”
Behold, I will put a spirit in him so that he will hear a rumor and return to his own land, where I will cause him to fall by the sword.’”
8 Mgbe ọchịagha ahụ nụrụ na eze Asịrịa e sitela nʼobodo Lakish pụa, ọ laghachiri hụ na eze Asịrịa na-ebuso obodo Libna agha.
When the Rabshakeh heard that the king of Assyria had left Lachish, he withdrew and found the king fighting against Libnah.
9 Nʼoge ahụ, Senakerib natara ozi na Tiahaka, eze Kush, na-apụta ịbịa ibuso ya agha. Ya mere, o zipụrụ ndị ozi ka ha ga zie Hezekaya ozi, sị,
Now Sennacherib had been warned about Tirhakah king of Cush: “Look, he has set out to fight against you.” So Sennacherib again sent messengers to Hezekiah, saying,
10 “Gwanụ Hezekaya, eze Juda, Ekwela ka Chineke onye ị na-atụkwasị obi duhie gị, mgbe ọ na-asị, ‘Agaghị enyefe Jerusalem nʼaka eze Asịrịa.’
“Give this message to Hezekiah king of Judah: ‘Do not let your God, in whom you trust, deceive you by saying that Jerusalem will not be delivered into the hand of the king of Assyria.
11 Nʼezie a, ị nụla ihe ndị eze Asịrịa mere obodo niile ha busoro agha, otu ha si bibie ha kpamkpam. Ma a ga-anapụtakwa gị onwe gị?
Surely you have heard what the kings of Assyria have done to all the other countries, devoting them to destruction. Will you then be spared?
12 Chi niile nke mba niile ndị ahụ nna nna m ha lara nʼiyi, ha napụtara ha, bụ chi ndị Gozan, Haran, Rezef na nke ndị Eden, ndị nọ na Tel Asa?
Did the gods of the nations destroyed by my fathers rescue those nations—the gods of Gozan, Haran, and Rezeph, and of the people of Eden in Telassar?
13 Olee ebe eze ndị Hamat maọbụ eze Apad nọ? Olee ebe eze obodo Lair, Sefavaim, Hena na Iva nọkwa?”
Where are the kings of Hamath, Arpad, Sepharvaim, Hena, and Ivvah?’”
14 Mgbe Hezekaya natara akwụkwọ ozi a site nʼaka ndị ozi ahụ, gụọ ya, o weere ya gaa nʼime ụlọnsọ Onyenwe anyị, gbasaa ya nʼihu Onyenwe anyị.
So Hezekiah received the letter from the messengers, read it, and went up to the house of the LORD and spread it out before the LORD.
15 Hezekaya kpere ekpere nye Onyenwe anyị, sị, “O, Onyenwe anyị, Chineke nke Izrel, onye ocheeze ya dị nʼetiti ndị cherubim, naanị gị bụ Chineke na-achị alaeze niile nke ụwa. Ọ bụkwa naanị gị kere eluigwe na ụwa.
And Hezekiah prayed before the LORD: “O LORD, God of Israel, enthroned between the cherubim, You alone are God over all the kingdoms of the earth. You made the heavens and the earth.
16 Tọọ ntị gị nʼala, o Onyenwe anyị ma nụrụ; meghee anya gị abụọ Onyenwe anyị, ka ịhụ; gee ntị nụkwa okwu ndị ahụ Senakerib zitere, nke o ji ekwulu Chineke dị ndụ.
Incline Your ear, O LORD, and hear; open Your eyes, O LORD, and see. Listen to the words that Sennacherib has sent to defy the living God.
17 “Nʼeziokwu, Onyenwe anyị, ndị eze Asịrịa alala mba niile a dị iche iche na ala ha nʼiyi, mee ka ha tọgbọrọ nʼefu.
Truly, O LORD, the kings of Assyria have laid waste these nations and their lands.
18 Ha atụnyekwala chi ha niile nʼime ọkụ, repịakwa ha, nʼihi na ọ bụghị chi ka ha bụ, kama ha bụ naanị ihe a kpụrụ akpụ, nke mmadụ ji osisi na nkume pịa.
They have cast their gods into the fire and destroyed them, for they were not gods, but only wood and stone—the work of human hands.
19 Ugbu a, Onyenwe anyị Chineke anyị, biko, zọpụta anyị site nʼaka ya, ka alaeze niile nke ụwa mata na naanị gị Onyenwe anyị, naanị, bụ Chineke.”
And now, O LORD our God, please save us from his hand, so that all the kingdoms of the earth may know that You alone, O LORD, are God.”
20 Mgbe ahụ Aịzaya nwa Emọz zigaara Hezekaya ozi sị, “Otu a ka Onyenwe anyị, Chineke Izrel sịrị, Anụla m ekpere i kpere banyere Senakerib, eze Asịrịa.
Then Isaiah son of Amoz sent a message to Hezekiah: “This is what the LORD, the God of Israel, says: I have heard your prayer concerning Sennacherib king of Assyria.
21 Nke a bụ okwu nke Onyenwe anyị kwuru megide ya: “‘Nwaagbọghọ na-amaghị nwoke, bụ Ada Zayọn na-elelị gị anya, ma jirikwa gị na-eme ihe ọchị. Nwaada Jerusalem na-efufekwa isi ya mgbe ị na-agbapụ ọsọ
This is the word that the LORD has spoken against him: ‘The Virgin Daughter of Zion despises you and mocks you; the Daughter of Jerusalem shakes her head behind you.
22 Onye ka ị kparịrị ma kwulukwaa? Ọ bụ onye ka i sitere na nganga gị welie olu okwu gị na anya gị elu megide? Ọ bụ megide Onye Nsọ nke Izrel?
Whom have you taunted and blasphemed? Against whom have you raised your voice and lifted your eyes in pride? Against the Holy One of Israel!
23 I sitere nʼaka ndị ozi gị kparịa Onyenwe anyị, kwuluo ya, ị sịkwara, “Eji m ọtụtụ ụgbọala m rigoruo ebe dị elu nke nʼelu ugwu niile, nʼebe kachasị elu nke ugwu Lebanọn. Egbudasịala m osisi sida ya niile toro ogologo, na osisi junipa ya niile kachasị mma. Ejeruola m na nsọtụ niile ya, bụ ebe kachasị maa mma nʼoke ọhịa ya niile.
Through your servants you have taunted the Lord, and you have said: “With my many chariots I have ascended to the heights of the mountains, to the remote peaks of Lebanon. I have cut down its tallest cedars, the finest of its cypresses. I have reached its farthest outposts, the densest of its forests.
24 Egwuola m ọtụtụ olulu mmiri nʼala ndị mba ọzọ, ṅụkwa mmiri dị nʼebe ahụ. Ọ bụ ọbụ ụkwụ m ka m ji mee ka isi iyi niile dị nʼIjipt takpọọ.”
I have dug wells and drunk foreign waters. With the soles of my feet I have dried up all the streams of Egypt.”
25 “‘Ọ bụ na ị nụbeghị? Na mgbe ochie ka m kpebiri ya. Nʼụbọchị ndị ahụ gara aga ka m nọ pịa ọpịpịa ya; ugbu a, emeela m ka ọ bịa na mmezu, na ị meela ka obodo nke mgbidi gbara gburugburu, ghọọ mkpokọta nkume.
Have you not heard? Long ago I ordained it; in days of old I planned it. Now I have brought it to pass, that you should crush fortified cities into piles of rubble.
26 Ndị bi nʼime ha, ndị a napụrụ ike ha nwere bụ ndị dara mba, ndị e tinyekwara nʼọnọdụ ihere. Ha dịka ahịhịa ndụ puru nʼala ubi na ome na-epupụta epupụta nakwa ahịhịa na-etopụta nʼelu ụlọ nke anwụ na-achakpọ tupu o tolite.
Therefore their inhabitants, devoid of power, are dismayed and ashamed. They are like plants in the field, tender green shoots, grass on the rooftops, scorched before it is grown.
27 “‘Ma amaara m ebe ị nọ ọnọdụ marakwa ọpụpụ gị na mbata gị marakwa oke iwe gị megide m.
But I know your sitting down, your going out and coming in, and your raging against Me.
28 Nʼihi ọnụma dị gị nʼobi megide m, nʼihi na mkparị gị eruola m ntị, aga m etinye nko m nʼimi gị werekwa mkpụmkpụ igwe m kpachie egbugbere ọnụ gị mee ka ị laghachi site nʼụzọ ahụ nke i siri bịa.’
Because your rage and arrogance against Me have reached My ears, I will put My hook in your nose and My bit in your mouth; I will send you back the way you came.’
29 “Ma nke a ga-abụ ihe ịrịbama, nye gị, Hezekaya: “Nʼafọ a unu ga-eri ihe na-epu nʼonwe ya, nʼafọ nke abụọ unu ga-eri ihe ubi si na nke ahụ pupụta. Ma nʼafọ nke atọ ghaanụ mkpụrụ ubi, weenụ ihe ubi; kụọ vaịnị nʼubi vaịnị, riekwanụ mkpụrụ ha.
And this will be a sign to you, O Hezekiah: This year you will eat what grows on its own, and in the second year what springs from the same. But in the third year you will sow and reap; you will plant vineyards and eat their fruit.
30 Ọzọkwa, ndị fọdụrụ nʼalaeze Juda ga-agba mgbọrọgwụ nʼokpuru ala, mịkwaa mkpụrụ nʼelu.
And the surviving remnant of the house of Judah will again take root below and bear fruit above.
31 Nʼihi na ọ bụ site na Jerusalem ka ndị fọdụrụ ga-esi pụta; otu ndị fọdụrụ ndụ ga-esitekwa nʼugwu Zayọn pụta. “Ọ bụ site nʼịnụ ọkụ nʼobi nke Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile ga-emezu nke a.
For a remnant will go forth from Jerusalem, and survivors from Mount Zion. The zeal of the LORD of Hosts will accomplish this.
32 “Ya mere, nke a bụ ihe Onyenwe anyị kwuru banyere eze Asịrịa, sị, “‘Ọ gaghị azọbata ụkwụ ya nʼime obodo a maọbụ gbaa ọ bụladị otu àkụ nʼebe a. Ọ gaghị eji ọta jegharịa nʼọnụ ụzọ ama ya, maọbụ wuo mgbidi nnọchibido megide ya.
So this is what the LORD says about the king of Assyria: ‘He will not enter this city or shoot an arrow into it. He will not come before it with a shield or build up a siege ramp against it.
33 Ụzọ o si bịa ka ọ ga-esi laghachi; ọ gaghị abanye nʼobodo a. Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri ya.
He will go back the way he came, and he will not enter this city,’
34 Aga m echebe obodo a, zọpụtakwa ya nʼihi aha m, na nʼihi Devid, bụ ohu m.’”
‘I will defend this city and save it for My own sake and for the sake of My servant David.’”
35 Nʼabalị ahụ, mmụọ ozi Onyenwe anyị pụrụ gaa tigbuo otu puku narị na puku iri asatọ na ise nʼụlọ ikwu ndị Asịrịa. Mgbe ndị mmadụ tetara nʼisi ụtụtụ, lee, ozu ka ha jupụtara ebe niile.
And that very night the angel of the LORD went out and struck down 185,000 men in the camp of the Assyrians. When the people got up the next morning, there were all the dead bodies!
36 Ya mere, Senakerib, eze Asịrịa biliri ije, laghachi nʼala ya. Ọ laghachiri biri nʼobodo Ninive.
So Sennacherib king of Assyria broke camp and withdrew. He returned to Nineveh and stayed there.
37 Otu ụbọchị, mgbe ọ nọ na-akpọ isiala nʼụlọ chi ya a na-akpọ Nisrọk, ụmụ ya ndị ikom aha ha bụ Adramelek na Shareza were mma agha gbuo ya. Ha gbapụrụ ọsọ gbaga nʼala Ararat. Isahadon, bụ nwa ya nwoke, ghọrọ eze nʼọnọdụ ya.
One day, while he was worshiping in the temple of his god Nisroch, his sons Adrammelech and Sharezer put him to the sword and escaped to the land of Ararat. And his son Esar-haddon reigned in his place.