< 2 Ndị Eze 15 >
1 Nʼafọ nke iri abụọ na asaa nke ọchịchị Jeroboam nʼIzrel ka Azaraya nwa Amazaya bidoro ịchị dịka eze na Juda.
Azariah, son of Amaziah, became king of Judah in the twenty-seventh year of the reign of Jeroboam, king of Israel.
2 Ọ gbara afọ iri na isii mgbe ọ malitere ị bụ eze. Ọ chịkwara na Jerusalem iri afọ ise na abụọ. Aha nne ya bụ Jekolaya, onye Jerusalem.
He was sixteen years old when he became king, and he reigned in Jerusalem for fifty-two years. His mother's name was Jecoliah of Jerusalem.
3 O soro nzọ ụkwụ nna ya bụ Amazaya, mee ihe ziri ezi nʼanya Onyenwe anyị.
He did what was right in the Lord's sight, just as his father Amaziah had done.
4 Kama dịka eze ndị ọzọ, o wezugaghị ebe ịchụ aja dị nʼelu ugwu; ndị mmadụ gara nʼihu na-achụ aja nsure ọkụ na aja na-esi isi ụtọ nʼebe ahụ.
But the high places were not removed. The people still were sacrificing and presenting burnt offerings in those places.
5 Onyenwe anyị tiri eze ihe otiti ọrịa ekpenta ruo ụbọchị ọnwụ ya. O biri nʼụlọ ewupụrụ iche. Jotam nwa nwoke eze ghọrọ onye nlekọta ụlọeze na-achịkwa ndị ala ahụ.
The Lord touched the king and he had leprosy until the day he died. He lived in isolation in a separate house. His son Jotham was in charge of the palace and was the country's actual ruler.
6 Ma banyere ihe ndị ọzọ niile mere nʼoge ọchịchị Azaraya, na ihe niile o mere, ọ bụ na e deghị ha nʼakwụkwọ akụkọ ihe mere nʼoge ndị eze Juda?
The rest of what happened in Azariah's reign and all he did are recorded in the Book of Chronicles of the Kings of Judah.
7 Azaraya soro ndị nna nna ya dina nʼọnwụ, e lie ya nso nʼebe e liri ha, nʼime obodo Devid. Jotam nwa ya ghọrọ eze nʼọnọdụ ya.
Azariah died and was buried with his fore fathers in the City of David. His son Jotham succeeded him as king.
8 Nʼafọ nke iri atọ na asatọ nke ọchịchị eze Azaraya bụ eze Juda, ka Zekaraya, nwa Jeroboam ghọrọ eze Izrel na Sameria. Ọ chịrị ọnwa isii.
Zechariah, son of Jeroboam, became king of Israel in the thirty-eighth year of the reign of Azariah, king of Judah. He reigned in Samaria for six months.
9 Dịka ndị nna ya bu ya ụzọ si mee, Zekaraya mere ihe jọrọ njọ nʼanya Onyenwe anyị. O mekwara dịka Jeroboam nwa Nebat, onye dubara ndị Izrel na mmehie ịkpọ isiala nye chi ọzọ.
He did what was evil in the Lord's sight, as his forefathers had done. He did not end the sins that Jeroboam, son of Nebat, had made Israel commit.
10 Shalum nwa Jebesh, na ndị ọzọ, gbara izu ọjọọ megide ya, tigbuo ya nʼihu ndị Izrel niile. Ọ ghọkwara eze mgbe Zekaraya nwụrụ.
Then Shallum, son of Jabesh, plotted against Zechariah. He attacked him, murdering him in front of the people, and took over as king.
11 Akụkọ metụtara ihe ndị ọzọ mere mgbe Zekaraya bụ eze, e deghị ha nʼakwụkwọ akụkọ ihe ndị eze Izrel mere nʼụbọchị ndụ ha.
The rest of the events of Zechariah's reign are recorded in the Book of Chronicles of the Kings of Israel.
12 Ya mere, okwu ahụ Onyenwe anyị gwara Jehu mezuru, nke bụ: “Ụmụ ụmụ gị ga-anọkwasị nʼocheeze Izrel ruo nʼọgbọ nke anọ ha.”
In this way what the Lord told Jehu came true: “Your descendants will sit on the throne of Israel to the fourth generation.”
13 Shalum nwa Jebesh malitere ịbụ eze nʼafọ nke iri atọ na itoolu nke ọchịchị Uzaya eze Juda. Ọ chịrị otu ọnwa na Sameria.
Shallum, son of Jabesh, became king in the thirty-ninth year of the reign of King Uzziah of Judah. He reigned in Samaria for one month.
14 Menahem nwa Gadi sitere nʼobodo Tịaza bịaruo Sameria gbuo Shalum nwa Jebesh ghọọ eze nʼọnọdụ ya.
Then Menahem, son of Gadi, went from Tirzah to Samaria, attacked and murdered Shallum, son of Jabesh, and took over as king.
15 Akụkọ ndị ọzọ gbasara Shalum na izu ọjọọ ya, e deghị ha nʼakwụkwọ ihe mere nʼoge ndị eze Izrel na-achị.
The rest of the events of Shallum's reign and the rebellion he plotted are recorded in the Book of Chronicles of the Kings of Israel.
16 Nʼoge ahụ, Menahem sitere na Tịaza buso obodo Tipsa agha, na onye ọbụla bi nʼobodo ahụ na gburugburu ya nʼihi na ha ekweghị emeghe ọnụ ụzọ ama ha. O tigburu Tifsa kwakọrọ ihe niile, bọwakwaa afọ ndị inyom niile dị ime.
At that time Menahem, starting from Tirzah, attacked Tiphsah and the region nearby, because they would not surrender the town to him. So he destroyed Tiphsah and ripped open all the pregnant women.
17 Nʼafọ iri atọ na itoolu nke Azaraya, eze Juda, Menahem nwa Gadi ghọrọ eze ọhụrụ ndị Izrel. Ọ chịrị afọ iri dịka eze na Sameria.
Menahem, son of Gadi, became king of Israel in the thirty-ninth year of the reign of King Azariah of Judah. He reigned in Samaria for ten years.
18 O mere ihe jọrọ njọ nʼanya Onyenwe anyị. Nʼoge ọchịchị ya, o sighị na mmehie Jeroboam nwa Nebat wezuga onwe ya, bụ nke o mere ka Izrel mehie.
Throughout his reign he did what was evil in the Lord's sight. He did not end the sins that Jeroboam, son of Nebat, had made Israel commit.
19 Mgbe ahụ, Pul eze Asịrịa busoro ala ahụ agha. Menahem nyere ya otu puku talenti ọlaọcha, ime ka Pul kwagide ọchịchị ya, na ime ka aka ya siekwa ike nʼalaeze Izrel.
Pul, king of Assyria, invaded the country. Menahem paid Pul a thousand talents of silver to support Menahem in consolidating his power over the kingdom.
20 Menahem si nʼaka ndị Izrel nweta ego a. Onye ọgaranya ọbụla tụrụ iri shekel ọlaọcha ise nke e nyere eze Asịrịa. Mgbe eze Asịrịa natachara ọlaọcha ndị a, o si nʼala ahụ pụọ, ọ nọgidekwaghị nʼala ahụ.
Menahem demanded payment from all the wealthy men of Israel, fifty shekels of silver each, to give to the king of Assyria. So the king of Assyria retreated and did not stay in the country.
21 Akụkọ banyere Menahem na ihe niile o mere, e deghị ha nʼakwụkwọ akụkọ ihe ndị eze Izrel mere nʼụbọchị ndụ ha?
The rest of what happened in Menahem's reign and all he did are recorded in the Book of Chronicles of the Kings of Israel.
22 Menahem sooro ndị nna nna ya ha dina nʼọnwụ, Pekahaya nwa ya ghọrọ eze nʼọnọdụ ya.
Menahem died, and his son Pekahiah succeeded him as king.
23 Nʼafọ nke iri ise, nke ọchịchị eze Azaraya na Juda, ka Pekahaya nwa Menahem bidoro ịchị dịka eze nʼIzrel. Afọ abụọ ka ọ chịrị nʼime Sameria.
Pekahiah, son of Menahem, became king of Israel in Samaria in the fiftieth year of the reign of King Azariah of Judah, and he reigned for two years.
24 Ma Pekahaya mere ihe ọjọọ nʼanya Onyenwe anyị. O sighị na mmehie niile nke Jeroboam nwa Nebat wezuga onwe ya, bụ nke o jiri mee ka Izrel mehie.
He did what was evil in the Lord's sight. He did not end the sins that Jeroboam, son of Nebat, had made Israel commit.
25 Ma Peka nwa Remalaya, otu nʼime ndịisi agha eze na iri ndị ikom ise ọzọ si Gilead gbara izu megide ya, gbuo ya nʼụlọeze dị nʼime Sameria. Ha gbukwara Agob na Arie nʼoge a ha gburu Pekahaya. Emesịa, Peka ghọrọ eze nʼọnọdụ ya.
Pekah, son of Remaliah, one of his officers plotted against him together with Argob, Arieh, and fifty men from Gilead. Pekah attacked and killed Pekahiah in the fortress of the king's palace in Samaria, and took over as king.
26 Akụkọ banyere Pekahaya na ihe niile o mere ka e dere nʼakwụkwọ akụkọ ihe ndị eze Izrel mere nʼụbọchị ndụ ha.
The rest of what happened in Pekahiah's reign and all he did are recorded in the Book of Chronicles of the Kings of Israel.
27 Nʼafọ nke iri ise na abụọ nke ọchịchị Azaraya eze Juda ka Peka nwa Remalaya ghọrọ eze Izrel nʼobodo Sameria. Ọ chịrị dịka eze iri afọ abụọ.
Pekah, son of Remaliah, became king of Israel in the fifty-second year of the reign of King Azariah of Judah. He reigned in Samaria for twenty years.
28 O mere ihe jọrọ njọ nʼanya Onyenwe anyị. O fere chi ọzọ ofufe, o sighị na mmehie Jeroboam nwa Nebat wezuga onwe ya, bụ mmehie nke o dubara ndị Izrel nʼime ya.
He did what was evil in the Lord's sight. He did not end the sins that Jeroboam, son of Nebat, had made Israel commit.
29 Nʼoge Peka bụ eze Izrel, ka Tiglat-Pilesa, eze Asịrịa bịara were Ijon, Ebel-Bet-Maaka, Janoa, Kedesh, Hazọ, Gilead, Galili na ala ndị Naftalị niile. Ọ chụpụrụ ndị mmadụ niile mee ka ha gaa biri nʼAsịrịa.
During the reign of Pekah, king of Israel, Tiglath-pileser, king of Assyria, invaded and captured Ijon, Abel-beth-maacah, Janoah, Kedesh, Hazor, Gilead, Galilee, and all the land of Naphtali, and he took the people to Assyria as prisoners.
30 Nʼoge ahụ, Hoshea nwa Elaa gbara izu ọjọọ megide Peka nwa Remalaya gbuo ya, bụrụ eze nʼọnọdụ ya. Ọ malitere ịbụ eze nʼafọ nke iri abụọ nke ọchịchị eze Jotam nwa Uzaya.
Then Hoshea, son of Elah, plotted against Pekah, son of Remaliah. In the twentieth year of the reign of Jotham, son of Uzziah, Hoshea attacked Pekah, killed him, and took over as king.
31 Akụkọ banyere Peka na ihe niile o mere, e deghị ha nʼakwụkwọ akụkọ ihe ndị eze Izrel niile mere nʼụbọchị ndụ ha?
The rest of what happened in Pekah's reign and all he did are recorded in the Book of Chronicles of the Kings of Israel.
32 Nʼafọ nke abụọ nke ọchịchị Peka nwa Remalaya eze Izrel ka Jotam nwa Ụzaya eze Juda malitere ọchịchị ya.
Jotham, son of Uzziah, became king of Judah in the second year of the reign of Pekah son of Remaliah, king of Israel.
33 Ọ gbara iri afọ abụọ na ise mgbe ọ ghọrọ eze. Ọ chịrị afọ iri na isii na Jerusalem. Aha nne ya bụ Jerusha, nwa Zadọk.
He was twenty-five when he became king, and he reigned in Jerusalem for sixteen years. His mother's name was Jerusha, daughter of Zadok.
34 O mere ihe ziri ezi nʼanya Onyenwe anyị dịka nna ya Ụzaya mere.
He did what was right in the Lord's sight, just as his father Uzziah had done.
35 Kama, o wezugaghị ebe ịchụ aja dị nʼelu ugwu, ndị mmadụ gara nʼihu na-achụ aja nsure ọkụ dị iche iche na aja na-esi isi ụtọ nʼebe ahụ. Jotam wugharịrị Ọnụ Ụzọ ama nke dị Elu nke ụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị.
But the high places were not removed. The people still were sacrificing and presenting burnt offerings in those places. He rebuilt the upper gate of the Lord's Temple.
36 Ma banyere ihe ndị ọzọ niile nke oge ọchịchị Jotam na ihe o mere, ọ bụ na e deghị ha nʼakwụkwọ akụkọ ihe mere nʼoge ndị eze Juda?
The rest of the events of Jotham's reign are recorded in the Book of Chronicles of the Kings of Judah.
37 (Nʼụbọchị ndị ahụ, Onyenwe anyị malitere izite Rezin eze ndị Aram na Peka nwa Remalaya, imegide ndị Juda.)
During that time the Lord started sending Rezin, king of Aram, and Pekah, son of Remaliah, to attack Judah.
38 Jotam sooro ndị nna nna ya ha dina nʼọnwụ, e lie ya nʼebe e liri ha, nʼobodo Devid, bụ obodo nna ya. Ehaz nwa ya nwoke ghọrọ eze nʼọnọdụ ya.
Jotham died and was buried with his forefathers in the City of David, his ancestor. His son Ahaz succeeded him as king.