< 2 Ndị Eze 14 >

1 Nʼafọ nke abụọ nke ịbụ eze Jehoash nwa Jehoahaz nʼIzrel, ka Amazaya nwa Joash eze Juda malitere ọchịchị ya.
Ní ọdún kejì tí Jehoaṣi ọmọ Joahasi ọba Israẹli, Amasiah ọmọ Joaṣi ọba Juda bẹ̀rẹ̀ sí ní jẹ ọba.
2 Amazaya gbara iri afọ abụọ na ise mgbe ọ malitere ịbụ eze. Ọ bụ eze na Jerusalem iri afọ abụọ na itoolu. Aha nne ya bụ Jehoadin, onye Jerusalem.
Ó jẹ́ ọmọ ọdún mẹ́ẹ̀ẹ́dọ́gbọ̀n nígbà tí ó di ọba, ó sì jẹ ọba ní Jerusalẹmu fún ọdún mọ́kàndínlọ́gbọ̀n. Orúkọ ìyá rẹ̀ a máa jẹ́ Jehoadani; ó wá láti Jerusalẹmu.
3 O mere ihe ziri ezi nʼanya Onyenwe anyị, ma o meghị dịka nna nna ya bụ Devid mere. Nʼihe niile, ọ gbasoro nzọ ụkwụ nna ya Joash.
Ó ṣe ohun tí ó tọ́ ní ojú Olúwa, ṣùgbọ́n kì í ṣe bí i Dafidi baba a rẹ̀ tí ṣe. Nínú ohun gbogbo, ó tẹ̀lé àpẹẹrẹ baba a rẹ̀ Joaṣi.
4 Ọ wezugaghị ebe ịchụ aja niile dị nʼugwu. Ndị Juda gara nʼihu na-achụ aja na-esurekwa ihe nsure ọkụ na-esi isi ụtọ nʼelu ugwu ahụ niile.
Àwọn ibi gíga bí ó ti wù kí ó rí, a kò sí i kúrò, àwọn ènìyàn sì tẹ̀síwájú láti rú ẹbọ àti sun tùràrí níbẹ̀.
5 Mgbe alaeze ahụ siri ike nʼọchịchị ya, o gburu ndị ozi ahụ gburu eze, bụ nna ya.
Lẹ́yìn tí ó ti fi ọwọ́ gbá ìjọba rẹ̀ mú gbọingbọin, ó pa àwọn oníṣẹ́ tí wọ́n ti pa baba a rẹ̀ ọba.
6 Ma o meghị ka ụmụ ndị ogbu mmadụ ahụ nwụọ, nʼusoro ihe e dere nʼakwụkwọ iwu Mosis, ebe Onyenwe anyị nyere iwu sị: “Agaghị eme ka ndị mụrụ ụmụ nwụọ nʼihi ihe ụmụ ha metara, maọbụ mee ka ụmụ nwụọ nʼihi ihe ndị mụrụ ha metara, onye ọbụla ga-anwụ nʼihi mmehie nke aka ya.”
Síbẹ̀ kò pa ọmọ àwọn apànìyàn náà. Ní ìbámu pẹ̀lú ohun tí a kọ sínú ìwé òfin Mose níbi tí Olúwa ti paláṣẹ pé, “A kì yóò pa baba nítorí àwọn ọmọ, tàbí àwọn ọmọ nítorí àwọn baba; olúkúlùkù ni kí ó kú fún ẹ̀ṣẹ̀ rẹ̀.”
7 Amazaya bụ onye gburu puku ndị agha Edọm iri na Ndagwurugwu Nnu, dọtakwa obodo Sela nʼagha, gụgharịa ya Jekteel, nke bụ aha a na-akpọ ya ruo ụbọchị taa.
Òun ni ẹni tí ó ṣẹ́gun ẹgbẹ̀rún mẹ́wàá ará Edomu ní àfonífojì iyọ̀, ó sì fi agbára mú Sela nínú ogun, tí ó ń pè é ní Jokteeli, orúkọ tí ó ní títí di òní.
8 Mgbe ahụ, Amazaya zigara ndị ozi ka ha jekwuru Jehoash nwa Jehoahaz nwa Jehu, eze Izrel, zie ya ozi ịma aka, sị, “Bịa, ka dimkpa na ibe ya zute ihu na ihu nʼagha.”
Nígbà náà, Amasiah rán àwọn ìránṣẹ́ sí Jehoaṣi ọmọ Jehoahasi ọmọ Jehu ọba Israẹli pẹ̀lú ìpèníjà: “Wá, jẹ́ kí á wo ara wa ní ojú.”
9 Ma Jehoash eze Izrel zighachiri ozi nye Amazaya eze Juda sị ya, “Uke dị na Lebanọn zigaara osisi sida nke dị na Lebanọn ozi, sị ya, ‘Nye nwa m nwoke nwa gị nwanyị ka ọ bụrụ nwunye ya.’ Mgbe ahụ, anụ ọhịa nke dị na Lebanọn gafetere ebe ahụ, zọpịa uke ahụ.
Ṣùgbọ́n Jehoaṣi ọba Israẹli fèsì sí Amasiah ọba Juda: “Òṣùṣú kan ní Lebanoni rán iṣẹ́ sí kedari ní Lebanoni, ‘Fi ọmọbìnrin rẹ fún ọmọkùnrin mi ní ìgbéyàwó.’ Nígbà náà ẹranko ẹlẹ́sẹ̀ mẹ́rin tinú igbó ní Lebanoni wá pẹ̀lú ó sì fi ẹsẹ̀ tẹ òṣùṣú náà mọ́lẹ̀.
10 I meriela Edọm, nʼezie. Ugbu a, mpako abatala. Ṅụrịa ọṅụ nʼihi mmeri nke i nwetara, ma nọdụ nʼụlọ gị. Nʼihi gịnị ka ị ga-eji kpaliere onwe gị nsogbu, si otu a wetara onwe gị na Juda ọdịda?”
Ìwọ ti ṣẹ́gun Edomu pẹ̀lú, ṣùgbọ́n, nísinsin yìí ìwọ ṣe ìgbéraga. Ògo nínú ìṣẹ́gun rẹ, ṣùgbọ́n dúró nílé! Kí ni ó dé tí o fi ń wá wàhálà tí o sì fa ìṣubú rẹ àti ti Juda pẹ̀lú?”
11 Ma otu ọ dị, Amazaya egeghị ntị. Ya mere, Jehoash bụ eze Izrel buliri agha, ya na Amazaya eze Juda zutere ihu na ihu nʼagha na Bet-Shemesh, dị nʼala Juda.
Bí ó ti wù kí ó rí Amasiah kò ní tẹ́tí, bẹ́ẹ̀ ni Jehoaṣi ọba Israẹli sì dojúkọ ọ́. Òun àti Amasiah ọba Juda kọjú sí ara wọn ní Beti-Ṣemeṣi ní Juda.
12 Ndị Izrel meriri ndị Juda, mee ka ha gbalaga, nwoke ọbụla nʼụlọ ya.
A kó ipa ọ̀nà Juda nípasẹ̀ Israẹli, gbogbo àwọn ọkùnrin sì sálọ sí ilé e rẹ̀.
13 Jehoash bụ eze Izrel nwudere Amazaya bụ eze Juda, nwa Joash, nwa Ahazaya na Bet-Shemesh. Mgbe ahụ, Jehoash gara Jerusalem kwada mgbidi Jerusalem, site nʼỌnụ ụzọ ama Ifrem ruo nʼọnụ ụzọ ama Nkuku, nke ogologo ya ruru narị nzọ ụkwụ isii.
Jehoaṣi ọba Israẹli fi agbára mú Amasiah ọba Juda, ọmọ Jehoaṣi, ọmọ Ahasiah ní Beti-Ṣemeṣi. Nígbà náà, Jehoaṣi lọ sí Jerusalẹmu, ó sì lọ wó odi Jerusalẹmu lulẹ̀ láti ìlẹ̀kùn Efraimu sí ibi igun ìlẹ̀kùn. Ìpín kan tí ó fẹ́rẹ̀ jẹ́ irinwó ìgbọ̀nwọ́.
14 Ọ chịkọrọ ọlaedo na ọlaọcha niile na ngwongwo niile ahụtara nʼụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị, na nke dị nʼụlọakụ nke ụlọeze. Ọ dọtara ọtụtụ ndị mmadụ nʼagha, kpọrọ laghachi na Sameria.
Ó mú gbogbo wúrà àti fàdákà àti gbogbo ohun tí ó rí nínú ilé tí a kọ́ fún Olúwa àti níbi ìfowópamọ́ sí nínú ààfin ọba. Ó mú àwọn ògo, ó sì dá wọn padà sí Samaria.
15 Ihe banyere akụkọ ndị ọzọ gbasara ọchịchị Jehoash, na ihe o mere, na ihe ọ rụpụtara, tinyere agha ọ lụrụ megide Amazaya eze Juda, ọ bụ na-edeghị ha nʼakwụkwọ akụkọ ihe ndị eze Izrel mere nʼoge ha?
Fún ti ìyókù iṣẹ́ nígbà ìjọba Jehoaṣi, gbogbo ohun tí ó ṣe pẹ̀lú àṣeyọrí rẹ̀, pẹ̀lú ogun rẹ̀ sí Amasiah ọba Juda, ṣé a kò kọ wọ́n sí inú ìwé ìtàn ayé àwọn ọba Israẹli?
16 Jehoash sooro nna nna ya ha dinaa nʼọnwụ, e lie ya na Sameria, ebe e liri eze ndị Izrel ndị ọzọ. Jeroboam nwa ya ghọrọ eze nʼọnọdụ ya.
Jehoaṣi sì sinmi pẹ̀lú àwọn baba rẹ̀, a sì sin ín sí Samaria pẹ̀lú àwọn ọba Israẹli. Jeroboamu ọmọ rẹ̀ sì rọ́pò rẹ̀ gẹ́gẹ́ bí ọba.
17 Amazaya nwa Joash, eze Juda nọrọ ndụ afọ iri na ise, mgbe Jehoash nwa Jehoahaz, eze Izrel nwụsịrị.
Amasiah ọmọ Joaṣi ọba Juda gbé fún ọdún mẹ́ẹ̀ẹ́dógún lẹ́yìn ikú Jehoaṣi ọmọ Jehoahasi ọba Israẹli.
18 Ma banyere ihe ndị ọzọ niile mere nʼoge ọchịchị Amazaya, ọ bụ na e deghị ha nʼakwụkwọ akụkọ ihe mere nʼoge ndị eze Juda?
Fún ti ìyókù iṣẹ́ rẹ̀ nígbà ìjọba Amasiah, ṣé a kò kọ wọ́n sínú ìwé ìtàn ayé àwọn ọba Juda?
19 Ha gbara izuzu imegide ya nʼime Jerusalem, ọ gbapụrụ gbalaga Lakish. Ma ha zipụrụ ndị ikom chụụrụ ya gaa Lakish, gbuo ya nʼebe ahụ.
Wọ́n dìtẹ̀ sí i ní Jerusalẹmu, ó sì sálọ sí Lakiṣi, ṣùgbọ́n wọ́n rán àwọn ọkùnrin tẹ̀lé e sí Lakiṣi, wọ́n sì pa á síbẹ̀.
20 Ha bulatara ozu ya nʼelu ịnyịnya, e lie ya na Jerusalem nʼebe e liri ndị nna nna ya ha, nʼobodo Devid.
Wọ́n gbé e padà pẹ̀lú ẹṣin, a sì sin ín sí Jerusalẹmu pẹ̀lú àwọn baba rẹ̀, ní ìlú ńlá ti Dafidi.
21 Mgbe ahụ, ndị Juda niile duuru Azaraya onye aha ya bụkwa Uzaya, onye gbara afọ iri na isii, mee ya eze nʼọnọdụ nna ya Amazaya.
Nígbà náà, gbogbo àwọn ènìyàn Juda mú Asariah tí ó jẹ́ ọmọ ọdún mẹ́rìndínlógún. Wọ́n sì ṣe é ní ọba ní ìrọ́pò baba rẹ̀ Amasiah.
22 Ọ bụ ya wugharịrị obodo Elat, nyeghachi ya Juda, mgbe Amazaya eze sooro ndị nna nna ya ha dina nʼọnwụ.
Òun ni ẹni tí ó tún Elati kọ́, ó sì dá a padà sí Juda lẹ́yìn tí Amasiah ti sinmi pẹ̀lú àwọn baba rẹ̀.
23 Nʼafọ nke iri na ise nke Amazaya nwa Joash, eze Juda, Jeroboam nwa Jehoash eze Izrel ghọrọ eze na Sameria. Ọ chịrị iri afọ anọ na otu dịka eze.
Ní ọdún kẹ́ẹ̀dógún tí Amasiah ọmọ Joaṣi ọba Juda, Jeroboamu ọmọ Jehoaṣi ọba Israẹli di ọba ní Samaria, ó sì jẹ ọba fún ọ̀kànlélógójì ọdún.
24 Ma o mere ihe ọjọọ nʼanya Onyenwe anyị nʼihi na o wezugaghị onwe ya site na mmehie Jeroboam nwa Nebat, onye ahụ dubara ndị Izrel na mmehie.
Ó ṣe búburú ní ojú Olúwa kò sì yípadà kúrò nínú ọ̀kankan nínú ẹ̀ṣẹ̀ Jeroboamu ọmọ Nebati. Èyí tí ó ti fa Israẹli láti dá.
25 Ọ bụ ya weghachitara oke ala Izrel site na Lebo Hamat ruo nʼosimiri Araba, dịka okwu Onyenwe anyị, Chineke nke Izrel si dị, nke o kwuru site nʼọnụ Jona nwa Amitai, onye amụma si Gat Hefa.
Òun ni ẹni tí ó ti dá àwọn ààlà Israẹli padà láti Lebo-Hamati sí òkú aginjù. Ní ìbámu pẹ̀lú ọ̀rọ̀ Olúwa Ọlọ́run Israẹli, tí ó sọ nípasẹ̀ ìránṣẹ́ Jona ọmọ Amittai, wòlíì láti Gati-Heferi.
26 Onyenwe anyị hụrụ ọnọdụ ọjọọ nke ndị Izrel nọ nʼime ya; onye ọbụla nʼime ha, ohu na onye nwe onwe ya, nọ nʼoke ahụhụ. Ọ dịkwaghị onye inyeaka ọbụla ha nwere.
Olúwa ti rí ìpọ́njú Israẹli pé, ó korò gidigidi, nítorí kò sí ẹrú tàbí òmìnira tàbí olùrànlọ́wọ́ kan fún Israẹli.
27 Ma ọ bụghị uche Onyenwe anyị ịla Izrel nʼiyi kpamkpam nʼokpuru eluigwe, nʼihi ya ka o mere ka Jeroboam nwa Jehoash napụta ha site nʼaka ndị iro ha.
Láti ìgbà tí Olúwa kò ti wí pé òhun yóò bu àbùkù lu orúkọ Israẹli láti abẹ́ ọ̀run. Ó gbà wọ́n là, lọ́wọ́ Jeroboamu ọmọ Jehoaṣi.
28 Akụkọ niile gbasara ihe niile Jeroboam mere, na ike ya niile, na agha niile o buru, na otu o si nwetaghachiri ndị Izrel obodo Damaskọs na Hamat, bụ obodo ndị Juda, ọ bụ na e deghị ha nʼakwụkwọ akụkọ ihe ndị eze Izrel mere nʼụbọchị ndụ ha?
Fún ti ìyókù iṣẹ́ ìjọba Jeroboamu, gbogbo ohun tí ó ṣe àti gbogbo àwọn agbára rẹ, bí ó ti jagun sí, àti bí ó ti gba Damasku àti Hamati, tí í ṣe ti Juda, padà fún Israẹli, a kò ha kọ wọ́n sínú ìwé ìtàn ayé àwọn ọba Israẹli?
29 Jeroboam sooro ndị nna nna ya ha dina nʼọnwụ, e lie ya nʼebe e liri ndị eze Izrel nwụrụ anwụ. Ma Zekaraya nwa ya ghọrọ eze Izrel nʼọnọdụ ya.
Jeroboamu sinmi pẹ̀lú àwọn baba rẹ̀, àwọn ọba Israẹli Sekariah ọmọ rẹ̀ sì rọ́pò rẹ̀ gẹ́gẹ́ bí ọba.

< 2 Ndị Eze 14 >