< 2 Ndị Eze 14 >
1 Nʼafọ nke abụọ nke ịbụ eze Jehoash nwa Jehoahaz nʼIzrel, ka Amazaya nwa Joash eze Juda malitere ọchịchị ya.
Amaziah, son of Joash, became king of Judah in the second year of the reign of Jehoash, son of Jehoahaz, king of Israel.
2 Amazaya gbara iri afọ abụọ na ise mgbe ọ malitere ịbụ eze. Ọ bụ eze na Jerusalem iri afọ abụọ na itoolu. Aha nne ya bụ Jehoadin, onye Jerusalem.
He was twenty-five when he became king, and he reigned in Jerusalem for twenty-nine years. His mother's name was Jehoaddan of Jerusalem.
3 O mere ihe ziri ezi nʼanya Onyenwe anyị, ma o meghị dịka nna nna ya bụ Devid mere. Nʼihe niile, ọ gbasoro nzọ ụkwụ nna ya Joash.
He did what was right in the Lord's sight, but not in the same way as his forefather David had. He did everything just as his father Joash had done.
4 Ọ wezugaghị ebe ịchụ aja niile dị nʼugwu. Ndị Juda gara nʼihu na-achụ aja na-esurekwa ihe nsure ọkụ na-esi isi ụtọ nʼelu ugwu ahụ niile.
But the high places were not removed. The people still were sacrificing and presenting burn offerings in those places.
5 Mgbe alaeze ahụ siri ike nʼọchịchị ya, o gburu ndị ozi ahụ gburu eze, bụ nna ya.
Once he was secure on the throne he executed the officials who had murdered his father the king.
6 Ma o meghị ka ụmụ ndị ogbu mmadụ ahụ nwụọ, nʼusoro ihe e dere nʼakwụkwọ iwu Mosis, ebe Onyenwe anyị nyere iwu sị: “Agaghị eme ka ndị mụrụ ụmụ nwụọ nʼihi ihe ụmụ ha metara, maọbụ mee ka ụmụ nwụọ nʼihi ihe ndị mụrụ ha metara, onye ọbụla ga-anwụ nʼihi mmehie nke aka ya.”
But he did not execute the murderers' children, following the Lord's command in the law of Moses that “Fathers must not be put to death for their children's sins, and children must not be put to death for their father's sins. Everyone is to die for their own sin.”
7 Amazaya bụ onye gburu puku ndị agha Edọm iri na Ndagwurugwu Nnu, dọtakwa obodo Sela nʼagha, gụgharịa ya Jekteel, nke bụ aha a na-akpọ ya ruo ụbọchị taa.
Amaziah killed ten thousand Edomites in the Valley of Salt. He attacked and captured Sela and renamed it Joktheel, which is what it is called to this very day.
8 Mgbe ahụ, Amazaya zigara ndị ozi ka ha jekwuru Jehoash nwa Jehoahaz nwa Jehu, eze Izrel, zie ya ozi ịma aka, sị, “Bịa, ka dimkpa na ibe ya zute ihu na ihu nʼagha.”
Amaziah sent messengers to the king of Israel, Jehoash, son of Jehoahaz, son of Jehu, telling him, “Let's fight, face to face!”
9 Ma Jehoash eze Izrel zighachiri ozi nye Amazaya eze Juda sị ya, “Uke dị na Lebanọn zigaara osisi sida nke dị na Lebanọn ozi, sị ya, ‘Nye nwa m nwoke nwa gị nwanyị ka ọ bụrụ nwunye ya.’ Mgbe ahụ, anụ ọhịa nke dị na Lebanọn gafetere ebe ahụ, zọpịa uke ahụ.
Jehoash, king of Israel, replied to Amaziah, king of Judah: “In Lebanon a thistle sent a message to a cedar, saying, ‘Give your daughter as a wife to my son.’ But a wild animal of Lebanon came by and trampled down the thistle.
10 I meriela Edọm, nʼezie. Ugbu a, mpako abatala. Ṅụrịa ọṅụ nʼihi mmeri nke i nwetara, ma nọdụ nʼụlọ gị. Nʼihi gịnị ka ị ga-eji kpaliere onwe gị nsogbu, si otu a wetara onwe gị na Juda ọdịda?”
You may indeed have defeated Edom. Now you've become arrogant. Stay home and enjoy your victory! Why provoke trouble that will bring you down, and Judah with you?”
11 Ma otu ọ dị, Amazaya egeghị ntị. Ya mere, Jehoash bụ eze Izrel buliri agha, ya na Amazaya eze Juda zutere ihu na ihu nʼagha na Bet-Shemesh, dị nʼala Juda.
But Amaziah refused to listen, so Jehoash, king of Israel, came to attack him. He and Amaziah, king of Judah, met face to face at Beth Shemesh in Judah.
12 Ndị Izrel meriri ndị Juda, mee ka ha gbalaga, nwoke ọbụla nʼụlọ ya.
The army of Judah was defeated by Israel, and ran away home.
13 Jehoash bụ eze Izrel nwudere Amazaya bụ eze Juda, nwa Joash, nwa Ahazaya na Bet-Shemesh. Mgbe ahụ, Jehoash gara Jerusalem kwada mgbidi Jerusalem, site nʼỌnụ ụzọ ama Ifrem ruo nʼọnụ ụzọ ama Nkuku, nke ogologo ya ruru narị nzọ ụkwụ isii.
Jehoash, king of Israel, captured Amaziah, king of Judah, the son of Joash, son of Ahaziah, at Beth Shemesh. Then Jehoash attacked Jerusalem and knocked down the city wall from the Ephraim Gate to the Corner Gate, about four hundred cubits in length.
14 Ọ chịkọrọ ọlaedo na ọlaọcha niile na ngwongwo niile ahụtara nʼụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị, na nke dị nʼụlọakụ nke ụlọeze. Ọ dọtara ọtụtụ ndị mmadụ nʼagha, kpọrọ laghachi na Sameria.
He removed all the gold and silver, and all the items found in the Lord's Temple and in the treasuries of the royal palace, and also some hostages. Then he went back to Samaria.
15 Ihe banyere akụkọ ndị ọzọ gbasara ọchịchị Jehoash, na ihe o mere, na ihe ọ rụpụtara, tinyere agha ọ lụrụ megide Amazaya eze Juda, ọ bụ na-edeghị ha nʼakwụkwọ akụkọ ihe ndị eze Izrel mere nʼoge ha?
The rest of what happened in Jehoash's reign, all he did, and his great achievements and his war with Amaziah, king of Judah, are recorded in the Book of Chronicles of the Kings of Israel.
16 Jehoash sooro nna nna ya ha dinaa nʼọnwụ, e lie ya na Sameria, ebe e liri eze ndị Izrel ndị ọzọ. Jeroboam nwa ya ghọrọ eze nʼọnọdụ ya.
Jehoash died and was buried in Samaria with the kings of Israel. His son Jeroboam succeeded him as king.
17 Amazaya nwa Joash, eze Juda nọrọ ndụ afọ iri na ise, mgbe Jehoash nwa Jehoahaz, eze Izrel nwụsịrị.
Amaziah, son of Joash, king of Judah, lived for fifteen more years after the death of Joash, son of Jehoahaz, king of Israel.
18 Ma banyere ihe ndị ọzọ niile mere nʼoge ọchịchị Amazaya, ọ bụ na e deghị ha nʼakwụkwọ akụkọ ihe mere nʼoge ndị eze Juda?
The rest of the events that happened in Amaziah's reign are recorded in the Book of Chronicles of the Kings of Judah.
19 Ha gbara izuzu imegide ya nʼime Jerusalem, ọ gbapụrụ gbalaga Lakish. Ma ha zipụrụ ndị ikom chụụrụ ya gaa Lakish, gbuo ya nʼebe ahụ.
A conspiracy against Amaziah took place in Jerusalem, and he ran away to Lachish. But men were sent after him and they murdered him there.
20 Ha bulatara ozu ya nʼelu ịnyịnya, e lie ya na Jerusalem nʼebe e liri ndị nna nna ya ha, nʼobodo Devid.
They brought him back on horses and buried him in Jerusalem with his forefathers in the City of David.
21 Mgbe ahụ, ndị Juda niile duuru Azaraya onye aha ya bụkwa Uzaya, onye gbara afọ iri na isii, mee ya eze nʼọnọdụ nna ya Amazaya.
Then all the people of Judah made Amaziah's son Azariah king to replace his father. Azariah was sixteen years old.
22 Ọ bụ ya wugharịrị obodo Elat, nyeghachi ya Juda, mgbe Amazaya eze sooro ndị nna nna ya ha dina nʼọnwụ.
Azariah recaptured Elath for Judah and rebuilt it after his father's death.
23 Nʼafọ nke iri na ise nke Amazaya nwa Joash, eze Juda, Jeroboam nwa Jehoash eze Izrel ghọrọ eze na Sameria. Ọ chịrị iri afọ anọ na otu dịka eze.
Jeroboam, son of Jehoash, became king of Israel in the fifteenth year of the reign of Amaziah, son of Joash, king of Judah. He reigned in Samaria for forty-one years.
24 Ma o mere ihe ọjọọ nʼanya Onyenwe anyị nʼihi na o wezugaghị onwe ya site na mmehie Jeroboam nwa Nebat, onye ahụ dubara ndị Izrel na mmehie.
He did what was evil in the Lord's sight and did not end all the sins that Jeroboam, son of Nebat, had made Israel commit.
25 Ọ bụ ya weghachitara oke ala Izrel site na Lebo Hamat ruo nʼosimiri Araba, dịka okwu Onyenwe anyị, Chineke nke Izrel si dị, nke o kwuru site nʼọnụ Jona nwa Amitai, onye amụma si Gat Hefa.
He restored the border of Israel to where it had been, from Lebo-hamath as far as the Sea of the Arabah, as the Lord, the God of Israel, had said through his servant Jonah, son of Amittai, the prophet, who came from Gath-hepher.
26 Onyenwe anyị hụrụ ọnọdụ ọjọọ nke ndị Izrel nọ nʼime ya; onye ọbụla nʼime ha, ohu na onye nwe onwe ya, nọ nʼoke ahụhụ. Ọ dịkwaghị onye inyeaka ọbụla ha nwere.
The Lord had seen how badly the Israelites were suffering, both slave and free. No one was there to help Israel.
27 Ma ọ bụghị uche Onyenwe anyị ịla Izrel nʼiyi kpamkpam nʼokpuru eluigwe, nʼihi ya ka o mere ka Jeroboam nwa Jehoash napụta ha site nʼaka ndị iro ha.
However, since the Lord had said that he would not wipe out Israel, he saved them through Jeroboam, son of Jehoash.
28 Akụkọ niile gbasara ihe niile Jeroboam mere, na ike ya niile, na agha niile o buru, na otu o si nwetaghachiri ndị Izrel obodo Damaskọs na Hamat, bụ obodo ndị Juda, ọ bụ na e deghị ha nʼakwụkwọ akụkọ ihe ndị eze Izrel mere nʼụbọchị ndụ ha?
The rest of what happened in Jeroboam's reign, all he did, his great achievements and the battles he fought, and how he recovered for Israel both Damascus and Hamath, are recorded in the Book of Chronicles of the Kings of Israel.
29 Jeroboam sooro ndị nna nna ya ha dina nʼọnwụ, e lie ya nʼebe e liri ndị eze Izrel nwụrụ anwụ. Ma Zekaraya nwa ya ghọrọ eze Izrel nʼọnọdụ ya.
Jeroboam died and was buried with the kings of Israel. His son Zechariah succeeded him as king.