< 2 Ndị Eze 11 >

1 Mgbe Atalaya nne Ahazaya hụrụ na nwa ya nwoke anwụọla, ọ gara nʼihu bido igbu ndị niile a mụrụ nʼụlọ eze.
Cuando Atalía, la madre de Ocozías, vio que su hijo había muerto, dio la orden de asesinar a todo el resto de la familia real.
2 Ma Jehosheba, bụ nwa nwanyị eze Jehoram, ma bụrụkwa nwanne nwanyị Ahazaya, kuuru Joash nwa Ahazaya, zopu ya site nʼetiti ụmụ ndị ikom eze, bụ ndị a chọrọ igbu egbu. O zoro ya na nwanyị na-elekọta ya anya nʼime ụlọ ndina, ka Atalaya hapụ ịhụ ya, nke a mere na-egbughị ya.
Pero Josaba, hija del rey Jehoram, hermana de Ocozías, tomó a Joás, hijo de Ocozías, apartándolo del resto de los hijos del rey que estaban siendo asesinados. Lo puso a él y a su nodriza en un dormitorio para ocultarlo de Atalía, y no fue asesinado.
3 Ya na nwanyị na-elekọta ya anya nọgidere na nzuzo nʼime ụlọnsọ Onyenwe anyị, afọ isii, oge ahụ niile Atalaya na-achị nʼala ahụ.
Joás permaneció escondido en el Templo del Señor durante seis años, mientras Atalía gobernaba el país.
4 Nʼafọ nke asaa, Jehoiada, ziri ozi kpọọ ndị ọchịagha na-achị narị ndị agha, ndị Karị na ndị nche oku, mee ka ha bịakwute ya nʼụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị. Ya na ha gbara ndụ, o mekwara ka ha ṅụọ iyi nʼụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị. Mgbe ahụ, o gosiri ha nwa eze.
En el séptimo año, Joyadá mandó llamar a los comandantes de centenares, a los cereteos, y los guardias, y los llevó al Templo del Señor. Hizo un acuerdo con ellos y les hizo prestar un juramento. Allí, en el Templo del Señor, les mostró al hijo del rey
5 O nyere ha iwu, sị, “Nke a bụ ihe unu ga-eme, unu bụ ndị nọ nʼotu atọ ga-abịa ọrụ nʼụbọchị izuike, nke otu ụzọ nʼime unu na-eche ụlọeze nche,
y les ordenó: “Esto es lo que vais a hacer: Un tercio de vosotros, que viene de servicio el sábado, vigilará el palacio real.
6 otu ụzọ nʼime ụzọ atọ ga-anọ nʼọnụ ụzọ Sua, ebe otu ụzọ ga-anọ nʼọnụ ụzọ ama, nʼazụ ndị na-eche nche nʼụlọnsọ ukwu Chineke.
Un tercio estará en la Puerta Sur, y otro tercio en la puerta detrás de los guardias. Se alternarán en la vigilancia del palacio.
7 Ma unu bụ otu abụọ ndị kwesiri ịga ezumike site nʼọrụ unu nʼụbọchị izuike, ga-eguzo na nche nʼụlọnsọ ukwu nʼihi eze.
Las dos divisiones que normalmente salen de servicio en el día de reposo vigilarán el Templo del Señor para el rey.
8 Doonụ onwe unu gburugburu eze, onye ọbụla nʼime unu jide ihe agha nʼaka ya. Onye ọbụla nke na-abịa nso ahịrị unu, ka e gbuo ya. Nọrọnụ eze nso ebe ọbụla ọ gara, mgbe ọ na-apụ nʼezi na mgbe ọ na-aba nʼime.”
Rodeen al rey con las armas desenfundadas, y cualquiera que se acerque a esta línea debe ser asesinado. Permanezcan cerca del rey dondequiera que vaya”.
9 Ndị ọchịagha ndị a na-achị narị ndị agha mere dịka Jehoiada, onye nchụaja nyere nʼiwu. Onye ọbụla kpọrọ ndị ikom ya, ma ndị na-emechi ọrụ, ma ndị na-abata ịrụ ọrụ nʼụbọchị izuike, bịakwute Jehoiada, bụ onye nchụaja.
Los comandantes de centenares siguieron todas las instrucciones que había dado el sacerdote Joyadá. Cada uno tomó a sus propios hombres, los que venían de servicio el sábado y los que salían de servicio, y se presentaron ante el sacerdote Joyadá.
10 O nyere ndị ọchịagha ahụ ùbe na ọta niile, ndị bụrịị nke eze Devid, ndị dị nʼụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị.
Entonces el sacerdote entregó a los comandantes de centenas las lanzas y los escudos que habían pertenecido al rey David y que estaban guardados en el Templo del Señor.
11 Onye ọbụla na ndị nche ahụ ji ngwa agha nʼaka ya, ha guzoro onwe ha, nọdụ eze gburugburu, na nso ebe ịchụ aja na ụlọnsọ ukwu, site nʼakụkụ ndịda ruo nʼakụkụ ugwu nke ụlọnsọ ukwu ahụ.
Los guardias se pusieron de pie con las armas desenfundadas rodeando al rey junto al altar, y en una línea alrededor del Templo, desde el lado sur hasta el lado norte del Templo.
12 Jehoiada kpọpụtara nwa eze, kpube ya okpueze nʼisi, o nyere ya otu akwụkwọ nke ihe ọgbụgba ndụ ahụ, chie ya eze. Ha tekwara ya mmanụ ịbụ eze. Ndị niile nọ nʼebe ahụ kụrụ aka, tie mkpu, sị, “Ka eze dịrị ndụ ruo mgbe ebighị ebi!”
Entonces Joyadá sacó al hijo del rey, le puso la corona y le entregó un ejemplar de la Ley de Dios. Lo proclamaron rey y lo ungieron. El pueblo aplaudió y gritó: “¡Viva el rey!”.
13 Mgbe Atalaya nụrụ mkpọtụ nke ndị nche na ndị mmadụ na-eme, ọ gakwuru ndị ahụ nọ nʼụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị.
Cuando Atalía oyó el ruido de los guardias y del pueblo, corrió hacia la multitud en el Templo del Señor.
14 O lepụrụ anya, ma lee eze, ka o guzo nʼakụkụ ogidi, dịka omenaala mmemme ịchị eze si dị. Ndịisi na ndị na-afụ opi nọ nʼakụkụ eze. Ndị niile nke ala ahụ nọkwa na-aṅụrị ọṅụ na-afụ opi. Atalaya dọwara uwe ya, sị, “Nnupu isi megide eze! Nke a bụ nnupu isi megide ọchịchị!”
Vio al rey de pie junto a su columna, como era costumbre. Los comandantes y los trompetistas estaban con el rey, y todos celebraban y tocaban las trompetas. Atalía se rasgó las vestiduras y gritó: “¡Traición! Traición!”
15 Jehoiada, bụ onye nchụaja nyere ndịisi ọchịagha na-achị narị ndị agha, bụ ndị na-elekọta usuu ndị agha, iwu sị ha, “Sitenụ nʼebe ahụ kpọpụta ya nʼetiti ahịrị unu, onye ọbụla nke gbasoro ya, werenụ mma agha gbuo onye ahụ.” Nʼihi na onye nchụaja sịrị, “Agaghị egbu ya nʼime ụlọnsọ Onyenwe anyị.”
Joyadá ordenó a los comandantes del ejército: “Llévenla ante los hombres que están frente al Templo y maten a cualquiera que la siga”. Antes, el sacerdote había dejado claro: “No deben matarla en el Templo del Señor”.
16 Ya mere, ha jidere ya, mgbe o rutere nʼụzọ ebe ịnyịnya si abata nʼogige ụlọeze, ebe ahụ ka ha nọ gbuo ya.
Entonces la agarraron, la llevaron hasta donde los caballos entran en el recinto del palacio y allí la mataron.
17 Jehoiada mere ka ọgbụgba ndụ dị nʼetiti Onyenwe anyị na eze, na ndị mmadụ, na ha ga-abụ ndị nke Onyenwe anyị. O mekwara ka ọgbụgba ndụ dịrị nʼetiti eze na ndị ahụ.
Entonces Joyadá hizo un acuerdo solemne entre el Señor, el rey y el pueblo de que serían el pueblo del Señor. También hizo un acuerdo entre el rey y el pueblo.
18 Ndị niile nke ala ahụ gara nʼụlọ nchụaja Baal kwatuo ya. Ha tidasịrị ebe nchụaja na arụsị niile dị nʼebe ahụ mee ka ọ darisịa, gbukwaa Matan onye nchụaja Baal nʼihu ebe ịchụ aja ahụ. Mgbe ahụ, Jehoiada onye nchụaja, debekwara ndị nche ka ha lekọta ụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị.
Todos fueron al Templo de Baal y derribaron sus altares y destrozaron los ídolos. Mataron a Matán, el sacerdote de Baal, frente al altar. Entonces el sacerdote Joyadá mandó poner guardias en el Templo del Señor.
19 Ọ kpọọrọ ndị ọchịagha na-achị narị ndị agha, ha na ndị Karị, na ndị nche, ha na ndị ala ahụ niile, ha niile dupụtara eze site nʼụlọnsọ Onyenwe anyị site nʼọnụ ụzọ ndị nche banye nʼụlọeze. Eze were ọnọdụ ya nʼelu ocheeze.
Junto con los comandantes, los nobles, los gobernantes del pueblo y todo el pueblo, condujo al rey en una procesión desde el Templo del Señor, entrando por la puerta superior al palacio real. Allí sentaron al rey en el trono real.
20 Ndị ala ahụ niile ṅụrịrị ọṅụ nke ukwuu, obodo ahụ dakwara jụụ, nʼihi na e ji mma agha gbuo Atalaya nʼụlọeze.
En todo el país la gente celebró, y Jerusalén estaba en paz, porque Atalía había sido muerta a espada en el palacio.
21 Joash gbara afọ asaa mgbe ọ malitere ịbụ eze.
Joás tenía siete años cuando se convirtió en rey.

< 2 Ndị Eze 11 >