< 2 Jọn 1 >

1 Ọ bụ okenye ahụ, Na-edegara nwanyị ahụ onye Chineke họpụtara, na ụmụ ya akwụkwọ a, bụ ndị m hụrụ nʼanya nʼime eziokwu. Ọ bụghị naanị m kama ndị niile maara eziokwu ahụ.
这封信来自长老,写给被选中的女士和她的儿女,都是我以真理所热爱的。不只是我,这封信也来自所有知道真理之人,
2 Nʼihi eziokwu ahụ nke dị nʼime anyị, nke ga-adịgidekwa nʼime anyị ruo mgbe ebighị ebi: (aiōn g165)
因为这真理就生活在我们中间,将于我们永远同在。 (aiōn g165)
3 Amara, na ebere, na udo nke sitere na Chineke Nna na Jisọs Kraịst, bụ Ọkpara Nna ahụ dịnyere anyị nʼeziokwu nʼịhụnanya.
愿在真理和爱中, 来自父上帝和其子耶稣基督的恩典、怜悯和平安,持续与我们同在。
4 Apụghị m ịkọ ụdị aṅụrị m nwere mgbe m hụrụ na ụfọdụ ụmụ gị na-ebi ndụ ịgbaso eziokwu dịka ihe Nna nyere anyị nʼiwu.
很高兴看到你的一些儿女,就像天父命令我们那样,追寻真理。
5 Ma ugbu a, ezi nwanyị, ọ bụghị iwu ọhụrụ ka m na-edere gị kama nke ahụ e nyere anyị site na mmalite. Ana m arịọ ka anyị hụrịta ibe anyị nʼanya.
亲爱的女士,现在我要告诉你:我们应该彼此相爱。这并非是一条新指令,而是我们应该从一开始就要遵守的。
6 Nke a bụ ịhụnanya ahụ: ka anyị na-ejegharị nʼirube isi nʼiwu ya niile. Dịka unu si nụ ya site na mmalite, unu ahapụkwala ijegharị nʼime ya.
我们应该遵循上帝的命令,这就是爱。这命令正如你们最初听到的,你们应该生活在爱中。
7 Nʼihi na ọtụtụ ndị nduhie apụọla baa nʼụwa, bụ ndị na-adịghị ekwenye na Jisọs Kraịst bịara nʼoyiyi mmadụ. Onye ọbụla dị otu a bụ onye nduhie bụrụkwa onye na-emegide Kraịst.
我告诉你们这些,是因为许多欺骗者已经离开,到外面的世界去了。他们不接受耶稣基督是以人的身份来的。任何像这样的人都是欺骗者和反基督者。
8 Lezienụ anya, ka unu ghara itufu ụgwọ ọrụ nke anyị dọgburu onwe anyị nʼọrụ maka ya, kama ka unu nata ụgwọ ọrụ unu nʼuju.
你们要小心,不要丢掉我们如此努力完成的工作,也不要丢掉你应该得到的一切。
9 Onye ọbụla na-adịghị anọgide nʼozizi Kraịst, nke na-esite na ya na ewezuga onwe ya, enweghị Chineke. Ma onye ọbụla na-anọgide nʼozizi ahụ nwere Nna na Ọkpara ya.
那些变得极端的人,不在继续遵守基督的教导,上帝不会与之同在。遵循基督的教导,上帝和上帝之子都会与他们同在。
10 Ọ bụrụ na onye ọbụla abịa izi unu ihe ọzọ dị iche site nʼozizi a, unu akpọbatala ya nʼụlọ unu, maọbụ nabatakwa ya.
如果有人来到你面前,没有展示基督教导的证据,不要接纳他们,也不要问候他;
11 Nʼihi na onye nabatara ya ga-eso onye dị otu a keta oke nʼajọ omume ya.
因为你鼓励他们,就是等于参与了邪恶的事情。
12 Ọ bụ ezie na enwere m ọtụtụ ihe m chọrọ idere unu, ma achọghị m iji akwụkwọ na inki dee ha. Kama, ana m ele anya ịbịa leta unu ka mụ na unu kwukọrịta okwu ihu nʼihu, ka e sikwa otu a mee ka ọṅụ anyị zuo oke.
我还有许多话想要说给你们听,但我不想用纸墨继续写下去,只是希望能造访你们,与你们当面谈谈,那样会让我们感到非常欢喜!
13 Ụmụ nwanne gị nwanyị, bụ onye a họpụtara, na-ekele unu.
你那被选中姐妹的儿女向你问候。

< 2 Jọn 1 >