< 2 Ndị Kọrint 1 >

1 Pọl, onyeozi nke Jisọs Kraịst dịka ọchịchọ nke Chineke si dị, na Timoti nwanne anyị nwoke, Na-edegara chọọchị Chineke nke dị na Kọrint, na ndị nsọ niile ndị nọ nʼala Akaịa akwụkwọ:
Mini polo, Jesu Kilisiti tondo kelima U tienu yanbuama po, leni ti kpiilo Timote, ti taani diani yinba Utienu nitanli yaaba n ye Kolinta, leni Utienu nigagidiŋanba yaaba n ye Akayi diema nni kuli.
2 Ka amara na udo nke sitere na Chineke Nna anyị, na Onyenwe anyị Jisọs Kraịst dịrị unu.
Utienu ti ba leni Jesu Kilisiti ŋanbili leni Oyanduanma n yaa ye leni yi.
3 Otuto dịrị Chineke na Nna nke Onyenwe anyị Jisọs Kraịst, bụ Nna nke obi ebere, nakwa Chineke nke nkasiobi niile.
Utienu n baa ti kpiagidi wani yua n tie Jesu Kilisiti ba, mi ninñingbadima ba leni i baagi kuli yaa ba.
4 Onye na-akasị anyị obi nʼime nsogbu anyị niile, ka anyị site nʼụzọ dị otu a nwee ike ịkasị ndị ọzọ niile nọ na nsogbu dị iche iche obi. Inyere ha aka dịka anyị onwe anyị si nata inyeaka site nʼaka Chineke.
Wani n baagiti falabuolu kuli n ni ke ti moko n tua baagi kaaba yaaba n ye fala tiamo nni leni tin ba yaa baagi Utienu kani.
5 Nʼihi na dịka anyị si eketa oke nʼime ọtụtụ ahụhụ nke Kraịst, otu a nkasiobi anyị na-ababiga ụba site na Kraịst.
Nani tin laadi yaa falaciamo kelima kilisiti po n yaba maama yeni, tin baadi yaa baagi Kilisiti kani moko yabi ki da yene.
6 Ma ọ bụrụ na anyị na-ahụ ahụhụ, ọ bụ nʼihi na nkasiobi unu, nakwa nzọpụta unu. Ọ bụrụkwa na a na-akasị anyị obi, ọ bụkwa nʼihi nkasiobi unu, nke na-arụpụta ike na ume iji ntachiobi die ụdị ahụhụ nke anyị onwe anyị na-edikwa.
Ti yaa laadi fala li tie kelima ti bua yin paagi yi ba mi tindima ya sanun ni, ti yaa baadi yi baagi li tie ke yi moko n ba i baagi, li tie yin baa li juunli li yaa tie ke yi moko laa tin laadi yaa fala.
7 Olileanya anyị nwere nʼebe unu nọ sịrị ike, ebe anyị maara na dịka unu si eketa oke nʼịta ahụhụ anyị, otu ahụkwa ka unu ga-esi keta oke na nkasiobi ahụ anyị na-anata.
Ti pala pa yi po boncianla kelima yi yaa tuo fala, i baagi moko baa tua yi biinu.
8 Anyị chọrọ ka unu mara ụmụnna m, ihe banyere nsogbu e sogburu anyị nʼEshịa. Nʼezie, nsogbu ahụ karịrị anyị ike, mee ka anyị hapụ inwekwa olileanya na anyị ga-emesi dịrị ndụ.
N kpiiba li tie ke tii bua wuoni li ba kuli leni tin laa yaa fala biado Asi diema nni. laa fala biado den kpiagi ki pendi ti fidu banlu hali ke ti den taama ke ti kaa pia miali.
9 Nʼezie, ọ dị nnọọ nʼoge ahụ, dịka a ga-asị na a mara anyị ikpe ọnwụ. Ma anyị maara na o si otu a mee ka anyị nwee ike ịmụta na o kwesighị ka anyị tụkwasị obi nʼike nke aka anyị, kama ka anyị nwee olileanya nʼime Chineke, onye pụrụ ime ka ndị nwụrụ anwụ si nʼọnwụ bilie.
Ti den nua cain nani bi tianba, ke ti kuumi yogunu pundi hali ke ti den bangi ke ti kan yaa dugi ti yucela po ka, ama ti baa yaa dugi Utienu po wan yua fiindi a tinkpila.
10 Ọ bụ Chineke bụ onye zọpụtara anyị site nʼime oke ọnwụ dị otu a. Anyị nwekwara ntụkwasị obi na ọ ga-aga nʼihu na-azọpụtakwa anyị,
Wani n den faabi ti, ki go baa faabi leni laa kuubuolu. ti tama ke O go baa faabi ti.
11 dịka unu ga-enyekwara anyị aka site nʼekpere unu, ka ọtụtụ nwere ike nye ekele nʼihi anyị maka onyinye amara anyị natara na nzaghachi ekpere ọtụtụ mmadụ ndị a na-ekpere anyị.
Yinba yi moko n yaa todi ti i jaandi nni, yaa niba kaa wa tuondi Utienu leni O ŋanbili ti po kelima niba boncianla den jandi ti po.
12 Ịnya isi anyị bụ nke a, na akọnuche anyị na-agbara anyị akaebe na anyị kpara agwa ọma nʼụwa, karịchasịa nʼebe unu nọ, nʼịdị nsọ na izi ezi nke si nʼaka Chineke. Nke a bụ site nʼamara o nyere anyị, ọ bụghị site nʼamamihe nke mmadụ.
Kelima tin pia yaa jigidi tie ke ti pala siedo doagidi ke ti ye ŋanduna nni leni yaa tagu n gagidi leni yaa yantugupiengu n ñani Utienu kani. yaala n cie mo n tie ke ti tagu den tie yene yi siiga. tii den pia laa tagiŋamu kelima o nisaalo yanfuoma po ka, ama li tie kelima Utienu ŋanbili po.
13 Nʼihi na ihe anyị na-edere unu abụghị ihe unu na agaghị agụta maọbụ ghọta. Enwere m nchekwube na unu ga-aghọta ya nke ọma.
Tii diani yi po bontoala kaa tie yin cogi yaala ki go ban yaala. n sugini yin bandi la ki pugini hali ki ban bandi cain.
14 Dịka unu ghọtarala anyị nwa nke nta ugbu a, unu ga-eji anyị anya isi nʼụbọchị nke Onyenwe anyị Jisọs.
Nani yin bandi waamu maama, ke ti yi jigidi nani yi moko n ba ti tua maama O Diedo Jesu cuama daali.
15 Ihe m na-ekwu were m anya, nke mere m ji chọọ ibu ụzọ bịa leta unu ka unu nwee uru abụọ.
Min den bandi cain ke li baa tie yene yi po, lan yaa po n den jagi ke n baa cua i kani lani n tie yin baa li ŋanbili ki pugini.
16 Ebu m ya nʼobi na m ga-akwụsị hụ unu mgbe m na-agafe ịga Masidonia. Ebukwa m ya nʼobi m na mgbe m si Masidonia na-alaghachi na m ga-akwụsịkwa ileta unu, ka unu nweekwa ike inyere anyị aka mgbe anyị bidoro ịlaghachi Judịa.
N bi bua ki tagini yi kani ki yuandi ki suagi Maseduana diema nni. n yaa gedi Maseduana ki guani yi kani, yin ciani nni min gedi Jude diemanni.
17 E nwere m obi abụọ mgbe m chọrọ ime nke a? Ana m ezube nzube m dịka mmadụ nkịtị, onye dị nkwadobe ikwu “E,” na “E e,” nʼotu oge ahụ?
Min den bua ki tieni maama yeni, naani li tie ke mii nuanli la bonmoanli bii? bi min jagi maama yeni tie nisaali yanjagili yo? ke n niini pia yantiana lie «nm» leni «aa» a.
18 Ma dịka Chineke si bụrụ onye kwesiri ntụkwasị obi, okwu anyị gwara unu abụghị “E,” na “E e.”
U tienu tie siedi ke tin den waani yi yaa maama yeni, naa den tie «nm» ki go tie «aa a».
19 Nʼihi na Ọkpara Chineke, Jisọs Kraịst, onye e sitere nʼọnụ Saịlas na Timoti na mụ onwe m kwusaa abụghị “E” na “E e,” kama nʼime ya ọ bụ naanị “E.”
Mini leni Silivin leni timote n den wangi yi yua yaa maama yeni lan tie Jesu Kilisiti Utienu bijua naa tie «nm» ki go tie «aa a». ama «nm» bebe n ye O kani.
20 Nʼime Kraịst ka anyị hụrụ “E” na nkwa niile nke Chineke kwere ụmụ mmadụ. Nke a mere anyị ji site na ya kwee “Amen” nʼinye Chineke otuto.
Kelima Utienu ŋoanianu kuli «nm» bebe n ye. wan yaa po yo ke ti gani «amina» O yeli kpiagidi po.
21 Ọ bụ Chineke nʼonwe ya mere ka anyị na unu guzosie ike nʼime Kraịst. O meela ka anyị bụrụ ndị e tere mmanụ.
Yua n teni ke tinba leni yinba se ke pa Kilisiti nni tie Utienu wani yua n go gandi ti.
22 Ọ kara anyị akara nʼihu, nyekwa anyị Mmụọ Nsọ ya ka o biri nʼobi anyị, dịka onye ga-ahụ na anyị ga-emezu nkwa ahụ niile.
O go den tieni ti po O maalima, yaa maalima n tie Utienu Fuomi yua ti pala nni.
23 Ana m akpọku Chineke dịka onye akaebe m, ọ bụ nʼihi ịnapụta unu mere m ji hapụ ịbịa Kọrint.
Utienu tie n siedo, ke mii pua faama li yaa tie moamoani won ta n miali; mii den guani ki gedi Kolinta, kelima mii den bua ki cuagi yi.
24 Ọ bụghị na anyị bụ ndị ọchịchị nke okwukwe unu, kama anyị so unu na-arụkọ ọrụ ka unu nwe ọṅụ nʼihi na ọ bụ site nʼokwukwe ka unu ga-esi kwụrụ chịm.
Laa tie ke tinba gobidi yi dandanli ka, ama li tie ki todi yi yin yaa pia li pamanli kelima yi se ke li pa li dandanli nni.

< 2 Ndị Kọrint 1 >