< 2 Ndị Kọrint 9 >
1 Ọ dịghị mkpa idere unu akwụkwọ banyere ozi nke ndị nsọ.
Kuhusiana na huduma kwa ajili ya waumini, ni bora zaidi kwangu kuwaandikia.
2 Amaara m na unu jikeere inyere ha aka, dịka m nyara isi nye ndị Masidonia banyere unu. Nʼihi na agwara m ha na unu ndị bi na Akaịa ejikerelarị inyere ha aka kemgbe afọ gara aga. Ọ bụkwa ịnụ ọkụ nʼobi unu kwaliri obi ha, ime ihe ha mere.
Ninajua kuhusu shauku yenu, ambayo nilijivunia kwa watu wa Makedonia. Niliwaambia kwamba Akaya imekuwa tayari tangu mwaka uliopita. Hamu yenu imewatia moyo wengi wao kutenda.
3 Ugbu a, ana m ezitere unu ụmụnna anyị ndị a ka e mee ka ịnya isi nke m nyara banyere unu ghara ịbụ okwu efu. Ma dịka m gwara ha na unu ejikerela, achọrọ m ka unu jikere nye ha ihe unu chọrọ inye.
Sasa, nimewatuma ndugu ili kwamba majivuno yetu kuhusu ninyi yasiwe ya bure, na ili kwamba mngekuwa tayari, kama nilivyosema mngekuwa.
4 Nʼihi na ọ bụrụ na ndị Masidonia esoro m bịa hụ na unu ejikeghị ejike, ebe anyị na-anya isi na unu ejikerela, ọ ga-abụrụ m ihe ihere, bụkwara unu ihe ihere, ebe anyị nwere ntụkwasị obi na unu ga-anọ na njikere.
Vinginevyo, kama mtu yeyote wa Makedonia akija pamoja nami na kuwakuta hamjawa tayari, tungeona haya — sisemi chochote kuhusu ninyi—kwa kuwa jasiri sana katika ninyi.
5 Ọ bụ nke a mere m ji hụ na ọ dị mkpa ịrịọ ụmụnna anyị ka ha buru ụzọ bịa, tupu m bịa. Ka unu nwee ike ịkwado onyinye ahụ unu kwere na nkwa inye, jide ya na njikere ruo mgbe m bịara. Ka unu si otu a gosi ndị mụ na ha ga-eso na unu na-enye nʼihi na unu chọrọ inye, ọ bụkwaghị nʼihi na a gwara unu ka unu nye.
Hivyo niliona ilikuwa muhimu kuwasihi ndugu kuja kwenu na kufanya mipango mapema kwa ajili ya zawadi mlizoahidi. Hii ni hivyo ili kwamba ziwe tayari kama baraka, na si kama kitu kilichoamriwa.
6 Isi okwu bụ nke a, Onye ọbụla na-akụ mkpụrụ ntakịrị, ga-aghọtakwa nke nta, ma onye ahụ na-akụ mkpụrụ buru ibu ga-aghọtakwa mkpụrụ hiri nne.
Wazo ni hili: mtu apandaye haba pia atavuna haba, na yeyote apandaye kwa lengo la baraka pia atavuna baraka.
7 Ka onye ọbụla nye dịka o buru ụzọ kpebie nʼime obi ya inye. Ka ọ ghara inye nʼihi na mmadụ kwagidere ya, maọbụ inye nʼihi na ndị ọzọ na-enye, nʼihi na Chineke hụrụ ndị ji obi ụtọ nye onyinye ha nʼanya.
Basi na kila mmoja atoe kama alivyopanga moyoni mwake. Basi naye asitoe kwa huzuni au kwa kulazimishwa. Kwa kuwa Mungu humpenda yule atoaye kwa furaha.
8 Chineke nwere ike inye unu karịa ihe na-akpa unu, ka unu na-enwezukwa ihe unu chọrọ mgbe niile nʼoge niile. Mgbe ahụ, unu ga-enwezukwa ihe niile unu ji arụ ọrụ ọma.
Na Mungu anaweza kuizidishia kila baraka kwa ajili yenu, ili kwamba, kila wakati, katika mambo yote, muweze kupata yote mnayohitaji. Hii itakuwa ili kwamba mueze kuzidisha kila tendo jema.
9 Dịka e dere ya, “Ọ gbasara onyinye ya ebe niile nye ndị ogbenye; ezi omume ya na-adịgidekwa ruo mgbe ebighị ebi.” (aiōn )
Ni kama ilivyoandikwa: “Ametapanya utajiri wake na kuutoa kwa maskini. Haki yake yadumu milele.” (aiōn )
10 Ma onye ahụ na-enye onye ọrụ ubi mkpụrụ nke ọ na-agha nʼubi ya, na-enyekwa mmadụ nri ọ ga-eri, ọ ga-enyekwa unu ihe niile dị unu mkpa, meekwa ka ụlọakụ unu jupụta na mkpụrụ. Ọ ga-emekwa ka mkpụrụ ezi omume unu baa ụba.
Naye atoaye mbegu kwa mpanzi na mkate kwa ajili ya chakula, pia atatoa na kuzidisha mbegu yenu kwa ajili ya kupanda. Yeye ataongeza mavuno ya haki yenu.
11 Ọ ga-emekwa ka unu bụrụ ndị ọgaranya nʼụzọ niile, ka unu nwee ihe ga-ezuru unu na nke unu ga-enye ndị ọzọ mgbe niile. Site nʼaka anyị, afọ ofufu unu ga-enye Chineke ekele nʼihi inyeaka unu nyere ha.
Mtatajirishwa kwa kila namna ili kwamba muweze kuwa wakarimu. Hii italeta shukrani kwa Mungu kupitia sisi.
12 Nʼihi na ije ozi nke ife ofufe a abụghị naanị nke igboro ndị nsọ mkpa ha, kama ọ bụkwa nke na-eme ka ekele ọtụtụ ndị mmadụ na-enye Chineke babiga ụba oke.
Kwa kufanya huduma hii sio tu inagusa mahitaji ya waumini. Pia huzidisha katika matendo mengi ya shukrani kwa Mungu.
13 Nʼihi ije ozi a, nke unu sitere na ya gosi onwe unu dịka ndị kwesiri, ndị ọzọ ga-eto Chineke nʼihi irube isi unu nke dakọtara na nkwupụta unu banyere oziọma nke Kraịst, ya na onyinye afọ ofufu nke unu na-eme ka ha na ndị ọzọ niile soro unu nwekọ.
Kwa sababu ya kupimwa kwenu na kuthibitishwa kwa huduma hii, pia mtamtukuza Mungu kwa utii kwa ukiri wenu wa injili ya Kristo. Pia mtamtukuza Mungu kwa ukarimu wa karama yenu kwao na kwa kila mmoja.
14 Nke a ga-eme nʼekpere ha maka unu, ha ga-eji obi ha niile rịọọ arịrịọ, nʼihi ịdị ukwu nke amara Chineke dị nʼime unu.
Wanawatamani, na wanaomba kwa ajili yenu. Wanafanya hivi kwa sababu ya neema kubwa ya Mungu iliyo juu yenu.
15 Ekele dịrị Chineke nʼihi onyinye ya dị ukwuu nke ọnụ na-apụghị ịkọ.
Shukrani ziwe kwa Mungu kwa karama yake isiyoelezeka!