< 2 Ndị Kọrint 9 >

1 Ọ dịghị mkpa idere unu akwụkwọ banyere ozi nke ndị nsọ.
Nebo o pomoci, kteráž se sbírá na svaté, jest zbytečné psáti vám.
2 Amaara m na unu jikeere inyere ha aka, dịka m nyara isi nye ndị Masidonia banyere unu. Nʼihi na agwara m ha na unu ndị bi na Akaịa ejikerelarị inyere ha aka kemgbe afọ gara aga. Ọ bụkwa ịnụ ọkụ nʼobi unu kwaliri obi ha, ime ihe ha mere.
Vím zajisté o vaší hotovosti, pro kteroužto chlubím se vámi u Macedonských, kterak by Achaia hotova byla k tomu od předešlého léta. A ta z vás pošlá horlivost mnohými k témuž pohnula.
3 Ugbu a, ana m ezitere unu ụmụnna anyị ndị a ka e mee ka ịnya isi nke m nyara banyere unu ghara ịbụ okwu efu. Ma dịka m gwara ha na unu ejikerela, achọrọ m ka unu jikere nye ha ihe unu chọrọ inye.
I poslal jsem k vám tyto bratří, aby chlouba naše vámi nebyla marná v té stránce, ale abyste, (jakž jsem řekl, ) byli hotovi,
4 Nʼihi na ọ bụrụ na ndị Masidonia esoro m bịa hụ na unu ejikeghị ejike, ebe anyị na-anya isi na unu ejikerela, ọ ga-abụrụ m ihe ihere, bụkwara unu ihe ihere, ebe anyị nwere ntụkwasị obi na unu ga-anọ na njikere.
Abychom snad, přišli-li by se mnou Macedonští, a nalezli vás nehotové, nemusili se styděti, (ať nedím vy) za takovou chloubu.
5 Ọ bụ nke a mere m ji hụ na ọ dị mkpa ịrịọ ụmụnna anyị ka ha buru ụzọ bịa, tupu m bịa. Ka unu nwee ike ịkwado onyinye ahụ unu kwere na nkwa inye, jide ya na njikere ruo mgbe m bịara. Ka unu si otu a gosi ndị mụ na ha ga-eso na unu na-enye nʼihi na unu chọrọ inye, ọ bụkwaghị nʼihi na a gwara unu ka unu nye.
Protož vidělo mi se za potřebné těchto bratří napomenouti, aby předešli mne k vám, a připravili prve opověděnou sbírku vaši, aby byla hotová jako dobrovolná sbírka, a ne jako bezděčná.
6 Isi okwu bụ nke a, Onye ọbụla na-akụ mkpụrụ ntakịrị, ga-aghọtakwa nke nta, ma onye ahụ na-akụ mkpụrụ buru ibu ga-aghọtakwa mkpụrụ hiri nne.
Ale totoť pravím: Kdo skoupě rozsívá, skoupě i žíti bude; a kdož rozsívá ochotně, ochotně i žíti bude.
7 Ka onye ọbụla nye dịka o buru ụzọ kpebie nʼime obi ya inye. Ka ọ ghara inye nʼihi na mmadụ kwagidere ya, maọbụ inye nʼihi na ndị ọzọ na-enye, nʼihi na Chineke hụrụ ndị ji obi ụtọ nye onyinye ha nʼanya.
Jeden každý jakž uložil v srdci svém, tak učiň, ne s neochotnou myslí anebo z mušení. Neboť ochotného dárce miluje Bůh.
8 Chineke nwere ike inye unu karịa ihe na-akpa unu, ka unu na-enwezukwa ihe unu chọrọ mgbe niile nʼoge niile. Mgbe ahụ, unu ga-enwezukwa ihe niile unu ji arụ ọrụ ọma.
Mocenť jest pak Bůh všelikou milost rozhojniti v vás, abyste ve všem všudy všelikou dostatečnost majíce, hojní byli ke všelikému skutku dobrému,
9 Dịka e dere ya, “Ọ gbasara onyinye ya ebe niile nye ndị ogbenye; ezi omume ya na-adịgidekwa ruo mgbe ebighị ebi.” (aiōn g165)
Jakož psáno jest: Rozsypal a dal chudým, spravedlnost jeho zůstává na věky. (aiōn g165)
10 Ma onye ahụ na-enye onye ọrụ ubi mkpụrụ nke ọ na-agha nʼubi ya, na-enyekwa mmadụ nri ọ ga-eri, ọ ga-enyekwa unu ihe niile dị unu mkpa, meekwa ka ụlọakụ unu jupụta na mkpụrụ. Ọ ga-emekwa ka mkpụrụ ezi omume unu baa ụba.
Ten pak, kterýž dává símě rozsívajícímu, dejž i vám chléb k jedení, a rozmnožiž símě vaše, a přispořiž úrody spravedlnosti vaší,
11 Ọ ga-emekwa ka unu bụrụ ndị ọgaranya nʼụzọ niile, ka unu nwee ihe ga-ezuru unu na nke unu ga-enye ndị ọzọ mgbe niile. Site nʼaka anyị, afọ ofufu unu ga-enye Chineke ekele nʼihi inyeaka unu nyere ha.
Abyste všelijak zbohaceni byli ke všeliké sprostnosti, kterážto působí skrze nás, aby díky činěny byly Bohu.
12 Nʼihi na ije ozi nke ife ofufe a abụghị naanị nke igboro ndị nsọ mkpa ha, kama ọ bụkwa nke na-eme ka ekele ọtụtụ ndị mmadụ na-enye Chineke babiga ụba oke.
Nebo služba oběti této netoliko doplňuje nedostatky svatých, ale také rozhojňuje se v mnohé díků činění Bohu, příčinou schválení služby této,
13 Nʼihi ije ozi a, nke unu sitere na ya gosi onwe unu dịka ndị kwesiri, ndị ọzọ ga-eto Chineke nʼihi irube isi unu nke dakọtara na nkwupụta unu banyere oziọma nke Kraịst, ya na onyinye afọ ofufu nke unu na-eme ka ha na ndị ọzọ niile soro unu nwekọ.
Když chválí Boha z jednomyslné poddanosti vaší k evangelium Kristovu, a z upřímé pomoci jim i všechněm učiněné,
14 Nke a ga-eme nʼekpere ha maka unu, ha ga-eji obi ha niile rịọọ arịrịọ, nʼihi ịdị ukwu nke amara Chineke dị nʼime unu.
A modlí se za vás ti, kteříž vás převelice milují pro vyvýšenou milost Boží v vás.
15 Ekele dịrị Chineke nʼihi onyinye ya dị ukwuu nke ọnụ na-apụghị ịkọ.
Díka pak budiž Bohu z nevymluvného daru jeho.

< 2 Ndị Kọrint 9 >