< 2 Ndị Kọrint 8 >
1 Anyị chọrọ ime ka unu mara, ụmụnna m, ihe banyere ihe nke amara Chineke rụrụ na nzukọ niile dị na Masidonia.
Zvino tinokuzivisai, hama, nyasha dzaMwari dzakapiwa pamakereke eMakedhonia;
2 Nʼime ọnọdụ oke mkpagbu na ihe mwute, ha nwere ọṅụ dị nnọọ ukwuu ruo na ha gbasara aka ha nye ndị ọzọ ihe, wezugakwa na ọ bụ ezie na ha bụ ndị ogbenye ọnụ ntụ.
kuti pakuedzwa kukuru kwedambudziko, kuwanzwa kwemufaro wavo neurombo hwavo hwakadzama zvakawedzera pafuma yekupa kwavo.
3 Ana m agba ama na ha nyere dịka ike ha, ha nyekwara ọ bụladị karịa otu a tụrụ anya. Onyinye ha si nʼobi ha pụta.
Nokuti vakange vane chido pakukwanisa kwavo, ndinopupura, kunyange kupfuura kukwanisa kwavo,
4 Nʼezie, ha rịọsiri anyị arịrịọ ike ka anyị nara onyinye amara ha nyere nʼihi iso keta oke inyere ndị nsọ ndị ọzọ nọ na mkpa aka.
nechikumbiro chikuru vakatigombedzera, kuti tigamuchire chipo uye kugovana parubatsiro rwunova rwevatsvene;
5 Nke ka nke, ha nyere karịa ihe anyị lere anya na ha ga-enye. Nʼihi na ha buru ụzọ were onwe ha nye Onyenwe anyị. Ha sitekwara nʼọchịchọ Chineke nyekwa anyị onwe ha.
uye kwete sezvatakatarisira, asi vakatanga kuzvipa ivo kuna Ishe, nekwatiri nechido chaMwari.
6 Ya mere, anyị rịọrọ Taịtọs, onye malitere ọrụ ka ọ rụzuo ọrụ amara ahụ ruo nʼisi.
Zvekuti takakurudzira Tito, kuti sezvaakange ambotanga, saizvozvo apedzisewo kwamuri basa iri renyashawo.
7 Ma ebe unu babigara ụba oke nʼihe niile unu nwere, nʼokwukwe, na okwu, nʼihe ọmụma, na ịnụ ọkụ nʼobi, na ịhụnanya unu hụrụ anyị, lezie unu anya hụ na unu babigakwara ụba oke nʼamara nke inye ihe a.
Asi sezvamakawanza pazvese, parutendo, uye pashoko, uye paruzivo, uye pakushingaira kwese, uye parudo rwenyu kwatiri, tarirai kuti muwanzewo pabasa iri renyasha.
8 Anaghị m enye unu iwu, kama site nʼizi unu otu o si na-anụ ndị ọzọ ọkụ nʼobi inyeaka, achọrọ m ịchọpụta ma ịhụnanya unu na ịnụ ọkụ nʼobi unu ọ ga-adakọtakwa.
Handitauri semurairo, asi nekushingaira kwevamwe uye ndichiidza uchokwadi hwerudo rwenyu.
9 Nʼihi na unu maara ụdị amara nke Onyenwe anyị Jisọs Kraịst nwere. Ọ bụ ezie na ọ bụ ọgaranya, ma ọ họọrọ ịbụ ogbenye nʼihi unu, ka unu onwe unu site nʼogbenye ya bụrụ ọgaranya.
Nokuti munoziva nyasha dzaIshe wedu Jesu Kristu, kuti kunyange akange akafuma, nekuda kwenyu wakava murombo, kuti imwi kubudikidza neurombo hwake mufume.
10 Nke a bụ ndụmọdụ m na-enye unu nʼokwu a. Ọ baara unu uru ka unu rụzuo ọrụ unu malitere ịrụ nʼafọ gara aga. Unu bụ ndị mbụ buru ụzọ chepụta ịrụ ọrụ a, unu bụkwa ndị mbụ buru ụzọ malite ime ihe banyere ya.
Zvino pachinhu ichi ndinopa maonero; nokuti ichi chinokubatsirai, imwi makatotanga kubva gore rakapera, kwete kuita chete, asi nekuda.
11 Ma ugbu a mezuonụ ihe unu chepụtara ime. Ka ịnụ ọkụ nʼobi unu nwere na mbụ ịrụ ọrụ a bụrụkwa ihe unu ga-eji mezuo ya dịka ihe unu nwere si dị.
Asi ikozvinowo pedzisai kuita, kuti, sezvapane chishuwo chemoyo, saizvozvo kuripo kupedzisawo kubva pane zvamunazvo.
12 Nʼihi na ọ bụrụ na ịnụ ọkụ nʼobi dị ebe ahụ, a na-anara ya dịka ihe mmadụ nwere ike inye, ọ bụghị ihe ọ na-enweghị ike inye.
Nokuti kana chishuwo chemoyo chiripo, munhu anogamuchirika zvichienderana nezvaanazvo, kwete kuenderana nezvaasina.
13 Nzube m abụghị ka unu nye nʼụzọ ihe ga-esi siere unu ike nʼihi na unu nyere. Kama ka e nwe nhatanha.
Nokuti hakusi kuti vamwe vave nekurerusirwa, imwi muremerwe; asi kubva pakuenzana, panguva yaikozvino zvakawanda zvenyu zviwedzere pakushaiwa kwavo,
14 Ugbu a, ọ bụ ihe dị mma ka unu nyere ndị ọzọ nọ na mkpa aka. Mgbe unu ga-anọkwa na mkpa, ha ga-enyere unu aka ma ha nwee hie nne. Nʼụzọ dị otu a, a ga-enwe nhatanha.
kutiwo zvakawanda zvavo zviwedzere pakushaiwa kwenyu, kuti kuve nekuenzana,
15 Nke a bụkwa ihe akwụkwọ nsọ kwuru, “Onye ahụ chịkọtara hie nne enweghị karịa. Onye nke chịkọtara ihe dị nta enweghị ihe fọdụrụ ya inweta ihe ọ chọrọ.”
sezvazvakanyorwa zvichinzi: Wakaunganidza zvizhinji haana kuva nezvakasara; newakaunganidza zvishoma haana kushaiwa.
16 Ekelere m Chineke onye tinyere nʼobi Taịtọs otu ịnụ ọkụ ahụ banyere unu ekele, dịka o si emetụ m nʼobi.
Asi ngaavongwe Mwari wakaisa mumoyo maTito kushingaira kwakadaro kwamuri,
17 Ọ bụghị naanị na o kweere ime dịka anyị si rịọrọ ya, kama nʼihi ịhụnanya o nwere nʼebe unu nọ, o kpebiri nʼime obi ya ịbịakwute unu na inyere unu aka.
kuti zvirokwazvo wakagamuchira kurudziro, asi zvaakange achishingaira zvikuru, wakabva akaenda kwamuri nechido chake.
18 Anyị na-ezitekwa ya na nwanna anyị onye ahụ nzukọ niile na-asọpụrụ nʼihi ọrụ ikwusa oziọma ahụ.
Zvino takatuma pamwe naye hama, rumbidzo yake muevhangeri yakagura nemumakereke ese;
19 Ma ọ bụghị naanị nke a, kama nzukọ họpụtara ya iso anyị, na inyere anyị aka dịka anyị na-ebu onyinye a, bụ ije ozi anyị na-eje nʼihi iwetara Onyenwe anyị otuto, na izipụta njikere anyị inyere ibe anyị aka.
zvisati zviri izvozvo chete, asi wakasarudzwawo nemakereke kuti atiperekedze nenyasha idzi, dzakabatiswa nesu mukurumbidzwa kwaIshe uyu, nechishuwo chemoyo wenyu;
20 Anyị na-eze ka onye ọbụla ghara ịta anyị ụta nʼihe ọbụla, nʼihi ụzọ anyị si jee ozi gbasara onyinye mgbasapụ aka a.
tichidzivirira izvi, zvimwe umwe angatimhura pamusoro pezvipamhidzirwa izvi zvinobatiswa nesu;
21 Ọ bụ ọchịchọ anyị ime ihe ọma, ọ bụghị naanị nʼihu Onyenwe anyị, kama nʼihu ndị mmadụ kwa.
tichirangarira zvakanaka kwete pamberi paIshe chete asi pamberi pevanhuwo.
22 Ugbu a anyị na-ezitekwara unu nwanna anyị nwoke ọzọ ka o soro ha bịakwute unu, nwanna anyị a bụ onye anyị nwapụtara, onye ọ na-anụ ọkụ nʼobi inyeaka. Ugbu a, o nwekwara ntụkwasị obi dị ukwuu nʼebe unu nọ.
Uye takatuma navo hama yedu, yatakawana yakashingaira pazvizhinji kazhinji, asi zvino anonyanya kushingaira nekuda kwekukuvimbai kukuru.
23 Ma banyere Taịtọs, ọ bụ onye otu m nʼọrụ a, bụrụkwa onye mụ na ya na-arụkọ ọrụ nʼetiti unu. Ma banyere ụmụnna anyị ndị ọzọ a, ha bụ ndị na-anọchite anya nzukọ, na ndị na-ewetara Kraịst otuto.
Kana zviri zvaTito, umwe wangu nemushandi pamwe neni kwamuri; kana hama dzedu, nhume dzekereke, vari kukudzwa kwaKristu.
24 Ya mere, gosinụ ha ihe ga-eme ka ha mata na unu hụrụ ha nʼanya. Meekwanụ ka ha mata ihe bụ ịnya isi anyị banyere unu, ka chọọchị niile hụkwa ya.
Naizvozvo ratidzai kwavari uchapupu hwerudo rwenyu nehwekuzvikudza kwedu pamusoro penyu, nepamberi pemakereke.