< 2 Ndị Kọrint 8 >

1 Anyị chọrọ ime ka unu mara, ụmụnna m, ihe banyere ihe nke amara Chineke rụrụ na nzukọ niile dị na Masidonia.
NOW we inform you, brethren, of the grace of God which hath been bestowed on the churches of Macedonia;
2 Nʼime ọnọdụ oke mkpagbu na ihe mwute, ha nwere ọṅụ dị nnọọ ukwuu ruo na ha gbasara aka ha nye ndị ọzọ ihe, wezugakwa na ọ bụ ezie na ha bụ ndị ogbenye ọnụ ntụ.
that in a great trial of affliction the abundance of their joy, and their deep poverty, hath more abounded to the riches of their liberality.
3 Ana m agba ama na ha nyere dịka ike ha, ha nyekwara ọ bụladị karịa otu a tụrụ anya. Onyinye ha si nʼobi ha pụta.
For unto their power, I bear them witness, and above their power, they were voluntarily ready to give:
4 Nʼezie, ha rịọsiri anyị arịrịọ ike ka anyị nara onyinye amara ha nyere nʼihi iso keta oke inyere ndị nsọ ndị ọzọ nọ na mkpa aka.
with much entreaty praying us that we would receive the gift, and undertake the communication of the contribution for the saints.
5 Nke ka nke, ha nyere karịa ihe anyị lere anya na ha ga-enye. Nʼihi na ha buru ụzọ were onwe ha nye Onyenwe anyị. Ha sitekwara nʼọchịchọ Chineke nyekwa anyị onwe ha.
And not merely as we hoped, but gave themselves first to the Lord, and to us according to the will of God.
6 Ya mere, anyị rịọrọ Taịtọs, onye malitere ọrụ ka ọ rụzuo ọrụ amara ahụ ruo nʼisi.
So that we exhorted Titus, that as he had been active before, so also he would perfect in you this grace also.
7 Ma ebe unu babigara ụba oke nʼihe niile unu nwere, nʼokwukwe, na okwu, nʼihe ọmụma, na ịnụ ọkụ nʼobi, na ịhụnanya unu hụrụ anyị, lezie unu anya hụ na unu babigakwara ụba oke nʼamara nke inye ihe a.
So as ye abound in every thing, in faith, and elocution, and knowledge, and in all diligence, and in your love to us, see that ye abound in this grace also.
8 Anaghị m enye unu iwu, kama site nʼizi unu otu o si na-anụ ndị ọzọ ọkụ nʼobi inyeaka, achọrọ m ịchọpụta ma ịhụnanya unu na ịnụ ọkụ nʼobi unu ọ ga-adakọtakwa.
I speak not by commandment, but because of the forwardness of others, and to prove the genuineness of your love.
9 Nʼihi na unu maara ụdị amara nke Onyenwe anyị Jisọs Kraịst nwere. Ọ bụ ezie na ọ bụ ọgaranya, ma ọ họọrọ ịbụ ogbenye nʼihi unu, ka unu onwe unu site nʼogbenye ya bụrụ ọgaranya.
For ye know the grace of our Lord Jesus Christ, that for your sake he became poor though he was rich, that ye by his poverty should be made rich.
10 Nke a bụ ndụmọdụ m na-enye unu nʼokwu a. Ọ baara unu uru ka unu rụzuo ọrụ unu malitere ịrụ nʼafọ gara aga. Unu bụ ndị mbụ buru ụzọ chepụta ịrụ ọrụ a, unu bụkwa ndị mbụ buru ụzọ malite ime ihe banyere ya.
And in this I give my opinion: for this is expedient for you, who have before begun not only to do, but also to be willing a year ago.
11 Ma ugbu a mezuonụ ihe unu chepụtara ime. Ka ịnụ ọkụ nʼobi unu nwere na mbụ ịrụ ọrụ a bụrụkwa ihe unu ga-eji mezuo ya dịka ihe unu nwere si dị.
Now then accomplish also the doing it, that as there was a readiness to will, so there may be also to perform out of that which ye have.
12 Nʼihi na ọ bụrụ na ịnụ ọkụ nʼobi dị ebe ahụ, a na-anara ya dịka ihe mmadụ nwere ike inye, ọ bụghị ihe ọ na-enweghị ike inye.
For if there is first a ready mind, a man is acceptable according to what he hath, and not according to what he hath not.
13 Nzube m abụghị ka unu nye nʼụzọ ihe ga-esi siere unu ike nʼihi na unu nyere. Kama ka e nwe nhatanha.
For I mean not that there should be ease for others and a burden on you;
14 Ugbu a, ọ bụ ihe dị mma ka unu nyere ndị ọzọ nọ na mkpa aka. Mgbe unu ga-anọkwa na mkpa, ha ga-enyere unu aka ma ha nwee hie nne. Nʼụzọ dị otu a, a ga-enwe nhatanha.
but that according to equality, your abundance on the present occasion should afford a supply for their deficiency, that their abundance also may supply your deficiency, that there may be equality.
15 Nke a bụkwa ihe akwụkwọ nsọ kwuru, “Onye ahụ chịkọtara hie nne enweghị karịa. Onye nke chịkọtara ihe dị nta enweghị ihe fọdụrụ ya inweta ihe ọ chọrọ.”
According as it is written, “He that gathered much had no more than others, and he who gathered little, had no less.”
16 Ekelere m Chineke onye tinyere nʼobi Taịtọs otu ịnụ ọkụ ahụ banyere unu ekele, dịka o si emetụ m nʼobi.
But thanks be to God, who put the same solicitude for you into the heart of Titus.
17 Ọ bụghị naanị na o kweere ime dịka anyị si rịọrọ ya, kama nʼihi ịhụnanya o nwere nʼebe unu nọ, o kpebiri nʼime obi ya ịbịakwute unu na inyere unu aka.
For he received in deed the exhortation, but being more diligent, of his own ready mind he went unto you.
18 Anyị na-ezitekwa ya na nwanna anyị onye ahụ nzukọ niile na-asọpụrụ nʼihi ọrụ ikwusa oziọma ahụ.
We have sent with him also a brother, whose praise in the gospel is spread through all the churches;
19 Ma ọ bụghị naanị nke a, kama nzukọ họpụtara ya iso anyị, na inyere anyị aka dịka anyị na-ebu onyinye a, bụ ije ozi anyị na-eje nʼihi iwetara Onyenwe anyị otuto, na izipụta njikere anyị inyere ibe anyị aka.
and not only so, but who was chosen by the churches as my fellow-traveller with this charity, ministered by us to the glory of the same Lord, and to shew your ready mind.
20 Anyị na-eze ka onye ọbụla ghara ịta anyị ụta nʼihe ọbụla, nʼihi ụzọ anyị si jee ozi gbasara onyinye mgbasapụ aka a.
Avoiding this, that no man should lay any blame to us in this abundance which is administered by us:
21 Ọ bụ ọchịchọ anyị ime ihe ọma, ọ bụghị naanị nʼihu Onyenwe anyị, kama nʼihu ndị mmadụ kwa.
providing what is fair, not only before the Lord, but also before men.
22 Ugbu a anyị na-ezitekwara unu nwanna anyị nwoke ọzọ ka o soro ha bịakwute unu, nwanna anyị a bụ onye anyị nwapụtara, onye ọ na-anụ ọkụ nʼobi inyeaka. Ugbu a, o nwekwara ntụkwasị obi dị ukwuu nʼebe unu nọ.
And we have sent with him our brother, whom we have often experienced in many things to be a man of diligence, but now much more diligent, through the great confidence which I have in you.
23 Ma banyere Taịtọs, ọ bụ onye otu m nʼọrụ a, bụrụkwa onye mụ na ya na-arụkọ ọrụ nʼetiti unu. Ma banyere ụmụnna anyị ndị ọzọ a, ha bụ ndị na-anọchite anya nzukọ, na ndị na-ewetara Kraịst otuto.
If any inquire concerning Titus, he is my companion and fellow-labourer to you; or our brethren be inquired of, they are the messengers of the churches, the glory of Christ.
24 Ya mere, gosinụ ha ihe ga-eme ka ha mata na unu hụrụ ha nʼanya. Meekwanụ ka ha mata ihe bụ ịnya isi anyị banyere unu, ka chọọchị niile hụkwa ya.
Therefore shew unto them, and in the presence of the churches, a proof of your love, and of our just boasting in you.

< 2 Ndị Kọrint 8 >