< 2 Ndị Kọrint 5 >

1 Nʼihi na anyị ma nke ọma na mgbe e mebiri ụlọ ikwu nke anyị bi nʼime ya, bụ ụlọ nke ụwa a, anyị nwere ụlọ nke sitere na Chineke, ụlọ nke ejighị aka wuo, ga-adị ebighị ebi nʼeluigwe. (aiōnios g166)
Now we know that if the earthly tent we live in is destroyed, we have a building from God, an eternal house in heaven, not made by human hands. (aiōnios g166)
2 Ugbu a anyị nọ na-asụ ude, na-enwe agụụ inweta ebe obibi anyị dị nʼeluigwe.
For in this tent we groan, longing to be further clothed with our heavenly dwelling,
3 Ka ọ ga-abụ anyị yiri ya, ka anyị hapụ ịdị ka ndị gba ọtọ.
because when we are clothed, we will not be found naked.
4 Mgbe ahụ niile anyị nọ nʼime ụlọ ikwu a, anyị na-anọgide nʼịsụ ude nke ibu arọ. Ọ bụghị nʼihi na anyị chọrọ ịnwụ anwụ bụrụ ndị na-enweghị anụ ahụ, kama ọ bụ nʼihi na anyị chọrọ ka e yikwasị anyị anụ ahụ nke eluigwe ahụ, ka anụ ahụ a pụrụ ịnwụ anwụ yikwasị ndụ ebighị ebi.
For while we are in this tent, we groan and are burdened, not because we want to be unclothed, but further clothed, so that what is mortal may be swallowed up by life.
5 Chineke onye ya onwe ya, bụ onye kwadobere anyị maka mgbanwo nke a, nyekwara anyị Mmụọ Nsọ ka ọ bụrụ onye ga-ahụ na anyị ga-enwetazu nkwa ahụ niile.
Now he who has prepared us for this very thing is God, who has also given us the Spirit as a guarantee.
6 Nʼihi nke a, anyị nwere obi ike mgbe niile, nʼihi na anyị maara na mgbe anyị na-aga nʼihu na-adị ndụ nʼanụ ahụ a, anyị na Onyenwe anyị anọghị.
Therefore we have courage at all times, and we know that while we are at home in the body we are away from the Lord.
7 Nʼihi ọ bụ okwukwe ka anyị ji adị ndụ ọ bụghị ihe anya hụrụ.
For we walk by faith, not by sight.
8 Obi siri anyị ike. Ọ gaara amasị anyị ịhapụ ụlọ nke a anyị bi na ya, bụ ahụ anyị ma lakwuru Onyenwe anyị nʼebe obibi ya.
Yes, we have courage and would rather be away from the body and at home with the Lord.
9 Ya mere, ma anyị nọ nʼụlọ a maọbụ nʼọzọ, ihe anyị chọrọ bụ ka anyị mee ihe ga-atọ ya ụtọ.
Therefore, whether we are at home or away, we aspire to be pleasing to him.
10 Nʼihi na anyị niile ga-eguzo nʼihu oche ikpe Kraịst, mgbe ahụ onye ọbụla nʼime anyị, nʼotu nʼotu, ga-anata ụgwọ ọrụ dịka ihe ọ rụrụ na-anụ ahụ ya mgbe ọ nọ nʼime ụwa si dị, maọbụ ezi ihe maọbụ ihe ọjọọ.
For we must all appear before the judgment seat of Christ, so that each of us may receive his due for what he has done in the body, whether good or evil.
11 Ọ bụ nʼihi na anyị maara nnọọ ihe ịtụ egwu Onyenwe anyị pụtara, ka anyị ji na-arụsị ọrụ ike ka ndị mmadụ mata Chineke makwaara ụdị mmadụ anyị bụ. Enwekwara m olileanya na nke a pụtara ihe nye akọnuche unu.
Therefore, because we know what it is to fear the Lord, we persuade others. What we are is known to God, and I hope that it is known in your consciences as well.
12 Anyị adịghị agbalị ịgwa unu na anyị dị mma, kama anyị chọrọ inye unu ihe unu ga-eji nyaa isi mgbe unu na-ekwu ihe banyere anyị, ka unu nwee ike ịmata ihe unu ga-azaghachi ndị ahụ na-anya isi banyere ihe ha ji anya ha hụ, kama ihe dị mmadụ nʼobi.
For we are not commending ourselves to you again, but we are giving you an opportunity to boast about us, so that you may be able to answer those who boast about outward appearances and not about matters of the heart.
13 Ọ bụrụ na anyị amaghị onwe anyị, ọ bụ nʼihi Chineke, ọ bụrụ na anyị nwere uche zuruoke, ọ bụ nʼihi unu.
If we are out of our mind, it is for God; if we are in our right mind, it is for you.
14 Ọ bụ ịhụnanya Kraịst na-akwagide anyị, nʼihi na anyị kwere na otu onye nwụrụ maka mmadụ niile, nke pụtara na mmadụ niile anwụọla.
For the love of Christ compels us, because we have concluded that if one died for all, then all have died.
15 Ọ nwụrụ nʼihi mmadụ niile, ka ndị dị ndụ gharakwa ịdịrị onwe ha ndụ ọzọ, kama maka onye ahụ nwụrụ nʼihi ha ma sikwa nʼọnwụ kulie.
And he died for all so that those who live may no longer live for themselves, but for him who died for them and was raised.
16 Bido ugbu a gawa, anyị adịghị elekwa onye ọbụla anya dịka mmadụ nkịtị. Nʼihi na anyị sitere nʼụzọ dị otu a lee Kraịst anya, chee na ọ bụ mmadụ efu. Ma ugbu a, anyị amakwaghị ya nʼụzọ dị otu a.
So from now on we regard no one according to the flesh. Even if we have known Christ according to the flesh, we no longer know him in that way.
17 Ya mere, ọ bụrụ na onye ọbụla amalite ịdị ndụ nʼime Kraịst, ọ ghọọla onye e kere ọhụrụ, ihe ochie agaala, nke ọhụrụ anọchie.
Therefore, if anyone is in Christ, he is a new creation. Old things have passed away; behold, all things have become new.
18 Ma ọ bụ Chineke bụ onye na-eme ihe ndị a. Ọ bụ ya onwe ya sitere nʼaka Kraịst mee ka anyị na ya dịrị nʼudo. Ma ugbu a, o nyela anyị ọrụ ije ozi, ịkpọ ndị ọzọ ka ha bịa ka ya na ha dịrịkwa nʼudo.
And all these things are from God, who reconciled us to himself through Jesus Christ and gave us the ministry of reconciliation,
19 Ihe nke a pụtara bụ na Chineke sitere na Kraịst na-eme ka ya na ụwa dị na mma. Ọ dịghị agụkọrọ ụmụ mmadụ mmehie niile, kama o tinyela nʼaka anyị ozi banyere ụzọ o si eme ka ya na ụmụ mmadụ dịkwa na mma ọzọ.
namely, that God was reconciling the world to himself in Christ, not counting people's trespasses against them. And he has committed to us the message of reconciliation.
20 Ya mere, anyị bụ ndị na-anọchi anya Kraịst ijere ya ozi nʼụwa. Chineke ji anyị na-agwa unu okwu. Anyị na-arịọ unu dịka ọ bụ Kraịst nʼonwe ya na-arịọ unu. Biko, bịanụ ka unu na Chineke dịrị nʼudo.
Therefore, we are ambassadors for Christ, as though God were making an appeal through us. We plead on Christ's behalf: “Be reconciled to God.”
21 Nʼihi na o mere ka onye ahụ na-amaghị mmehie bụrụ mmehie nʼọnọdụ anyị, ka esi otu a mee ka anyị nwee oke nʼime ezi omume Chineke site na ya.
For God made him who did not know sin to be a sin offering for us, so that in him we might become the righteousness of God.

< 2 Ndị Kọrint 5 >