< 2 Ndị Kọrint 4 >
1 Ya mere, ebe anyị natara ije ozi a site nʼebere Chineke, ike adịghị agwụ anyị nʼobi.
Тому, маючи це служіння згідно з милістю, що нам явилася, ми не втрачаємо відваги.
2 Anyị ahapụla omume nzuzo niile na-eweta ihere. Anyị ahapụla ụzọ aghụghọ niile, maọbụ iji okwu Chineke na-atụ asị. Kama site nʼikwupụta eziokwu ahụ ka ndị mmadụ were ezi akọnuche ha mata ụdị mmadụ anyị bụ nʼihu Chineke.
Ми відреклися від прихованих та ганебних [учинків], не живемо в хитрощах і не перекручуємо Слова Божого. Навпаки, показуючи істину, ми представляємо себе перед Богом на суд кожного людського сумління.
3 Ma a sịkwa na oziọma nke anyị na-ekwusa dịka ihe e zoro ezo, ọ bụ ihe e zoro ezo nye ndị ahụ na-ala nʼiyi.
І якщо наша Добра Звістка закрита, то лише для тих, що гинуть, –
4 Nʼebe ha nọ, chi nke ụwa a ekpuchiela uche ndị na-ekweghị ekwe iji gbochie ha ịhụ ìhè nke oziọma ahụ na-ezipụta ebube Kraịst, onye dị nʼụdị Chineke nʼonwe ya. (aiōn )
для невіруючих, яким бог цього віку засліпив розум, щоб не засяяло [над ними] світло Доброї Звістки про славу Христа, Який є образом Бога. (aiōn )
5 Nʼihi na ọ bụghị anyị onwe anyị ka anyị na-ekwusa, kama anyị na-ekwusa na Kraịst Jisọs bụ Onyenwe anyị. Ma anyị onwe anyị bụ ụmụodibo unu nʼihi Jisọs.
Ми проповідуємо не себе, а Ісуса Христа [як] Господа, себе ж – як ваших рабів заради Ісуса.
6 Nʼihi na ọ bụ Chineke ahụ sịrị, ka ìhè si nʼọchịchịrị chawapụta; bụkwa onye mere ka ìhè ya nwuwa nʼime obi anyị. Nke a ka o mere iji wetara anyị ìhè amamihe nke ebube Chineke nʼihu Kraịst.
Адже Бог, Який сказав: «Нехай з темряви засяє світло», є Тим, Хто засяяв у наших серцях, щоби просвітити розуміння слави Бога в особі Ісуса Христа.
7 Anyị onwe anyị bụ ndị natara akụ nke dị oke ọnụahịa dị nʼime ite ụrọ, iji gosi na ike kacha elu si nʼaka Chineke, ọ bụghị nʼaka anyị.
Проте ми носимо цей скарб у глиняних горщиках, щоб надмірність сили була від Бога, а не від нас.
8 A na-akpagbu anyị nʼakụkụ niile, ma adịghị emeri anyị. Mgbe ụfọdụ, anyị nọ na mgbagwoju anya ma anyị adịghị ada mba.
Ми в усьому обтяжені, та не роздавлені; збиті з пантелику, але не впадаємо в розпач;
9 A na-esogbu anyị, ma adịghị ahapụ naanị anyị; mgbe ụfọdụ, a na-akụtu anyị nʼala ma adịghị ala anyị nʼiyi.
нас переслідують, та ми не покинуті; нас збивають із ніг, та ми не гинемо.
10 Ọtụtụ mgbe, anyị na-ebugharị nʼahụ anyị ọnwụ Jisọs, ka ndụ nke Jisọs nwekwa ike pụta ìhè nʼahụ anyị.
У своєму тілі ми завжди носимо смерть Ісуса, щоб життя Ісуса виявилося в наших тілах.
11 Mgbe ọbụla anyị dị ndụ, anyị nọ nʼọnwụ nʼihi Jisọs, ka ndụ Jisọs nwee ike pụta ìhè nʼahụ anyị pụrụ ịnwụ anwụ.
Адже ми, живі, постійно віддаємо себе на смерть заради Ісуса, щоб Його життя виявилося в наших смертних тілах.
12 Nke a pụtara na ọnwụ na-arụsị ọrụ ike nʼime anyị, ma na ndụ na-arụ ọrụ nʼime unu.
Тому в нас діє смерть, а у вас – життя.
13 Ebe ọ bụ na anyị nwere otu mmụọ nke okwukwe ahụ, dịka e si dee nʼakwụkwọ nsọ, “Ekweere m, ya mere m ji kwuo.” Anyị onwe anyị kwekwara, nʼihi nke a mere anyị ji na-ekwu,
Маючи один дух віри, згідно з тим, що написано: «Я вірив і тому говорив», ми віримо й тому говоримо,
14 ma anyị maara na onye mere ka Onyenwe anyị Jisọs si nʼọnwụ bilie, ga-emekwa ka anyị soro Jisọs si nʼọnwụ bilie, ma kpọbatakwa anyị na unu nʼihu ya.
оскільки знаємо, що Той, Хто воскресив Господа Христа, воскресить і нас разом з Ісусом та представить разом із вами.
15 Ihe ndị a niile bụ maka nʼihi unu, ka ọ ga-abụ amara na-abawanye irute ọtụtụ mmadụ aka, ka o nwee ike na-abawanye inye ekele maka otuto nke Chineke.
Адже все – для вас, щоб благодать, примножена багатьма, щедро принесла подяку на славу Божу.
16 Ọ bụ nke a mere ike adịghị agwụ anyị nʼobi. Ọ bụ ezie na anụ ahụ anyị na-anwụ anwụ, ma a na-agba mmụọ anyị ume kwa ụbọchị.
Тому ми не падаємо духом. І, навіть якщо наша зовнішня людина гине, наша внутрішня людина оновлюється день у день.
17 Nwantịntị ahụhụ nke anyị na-ata ugbu a, nke na-adị nwa oge, na-akwadoro anyị otuto ebighị ebi dị ukwuu. (aiōnios )
Адже наше тимчасове й легке страждання приносить нам більш вагоме багатство вічної слави. (aiōnios )
18 Nʼihi na anyị adịghị ele ihe anya nwere ike ịhụ, kama anyị na-ele anya nʼihe ahụ anya na-adịghị ahụ. Nʼihi na ihe ahụ anya na-ahụ na-adị naanị nwa oge, ma ihe ahụ anya na-adịghị ahụ na-adị ruo mgbe ebighị ebi. (aiōnios )
Ми дивимося не на видиме, а на невидиме, бо видиме минає, а невидиме вічне. (aiōnios )