< 2 Ndị Kọrint 3 >

1 Anyị na-ebido ito onwe anyị ọzọ? Ọ dị a mkpa anyị inye unu, maọbụ ịnata nʼaka unu akwụkwọ nkọwa iji too onwe anyị dịka ụfọdụ mmadụ ndị ọzọ si eme?
Yi go bua yi guan nni ke kua ya yema nni ki yinba moan lo n ba die yi yuuli? yigo pia mi buama yeni ya tili nba wani yi baa kuni maama n cua yi kani?
2 Unu onwe unu bụ akwụkwọ ozi anyị nke e dere nʼobi anyị nke mmadụ niile maara ma gụọkwa.
yinba, yinba n tie ti ya tili yaali n dianni ti pali nni. Ke cabi bi niba kuli n cooji li ki go ya bani li.
3 Unu na-egosikwa na unu bụ akwụkwọ ozi si nʼebe Kraịst nọ, mpụta ihe nke ozi anyị jere. Ọ bụghị ihe e ji inki dee na mbadamba nkume, kama ọ bụ mmụọ Chineke na-adị ndụ ka e ji dee ya na mbadamba obi mmadụ.
Ke ŋan wani ki a tie kilisit tili, yaali n ñani ti kani, yaali ki dia nni yeni tidianni ñi moanma ka ama yeni o tienu fuama yua, ki laa tie a tanpaba po ka, ama bi niba ya palanni.
4 Nke a bụ ntụkwasị obi anyị nwere site na Kraịst nʼebe Chineke nọ.
Lani n teni ki ti pia li papaali o tienu nni ke duginni kilisiti po.
5 Ọ dịkwaghị mgbe anyị ji chee nʼime onwe anyị, na anyị nwere ike ime ihe ọbụla bara uru site nʼike aka anyị, kama ihe ọbụla anyị nwere, ihe ọbụla anyị rụpụtara, sitere nʼaka Chineke.
ba ki ti tie ya danba n pia o paalu ki ba guudi ya banla n ñan tiya kani, ti bama kuli na o tienu kani.
6 Onye mere ka anyị zuo oke ịbụ ndị ozi ya nke ọgbụgba ndụ ọhụrụ, nke edeghị nʼakwụkwọ iwu kama nʼime Mmụọ. Ihe e dere nʼakwụkwọ iwu na-eweta ọnwụ, ma Mmụọ na-enye ha ndụ.
mani pagiti ki ti tie ya tuosoanba n tunni o ŋantaadi paano ya ni nni, ki laa tie ti banma ka, ama yeni otienu fuoma yua, kilima mi banma biandi o nilo, ama o fuoma yua coubi li miali.
7 Ma ọ bụrụ nʼije ozi ahụ nke na-eweta ọnwụ bụ nke e gbunyere nʼelu nkume ji ebube dị ukwuu bịa, nke mere na ụmụ Izrel apụghị ilegide Mosis anya nʼihu mgbe o si nʼelu ugwu Saịnaị rịdata nʼihi ebube nke ihu ya, bụ ebube nke na-agabiga agabiga,
Moanla li ya tie ya tuoli n den tunni yeni ya. Tili n den diani a tanpaba po ki yegi yeni mi kuma den cuanni ti kpiagidi yali ki Isalele yaaba kan fidi ki diidi mousa nunga, kilima o tienu kpiagidi den gbie o nunga ya kpiagidi n den pia mi pendima.
8 ọ bụ nʼije ozi nke Mmụọ nsọ agaghị adị ebube karịa?
o tienu fuoma yua n tunni ya tunni ya tuoli kan ba ya kpiagidi n cie yen nni?
9 Ọ bụrụ na-enwere ebube nʼime ije ozi nke amamikpe, ije ozi nke ezi omume ga-adị ebube karịa ya.
Ya tuoli ki bi ba fidi ki bu cuoŋa ya cuani ti kpiagidi, ya tuoli n gi ki pia buudi ya kpiagidi ba yabi!
10 Nʼezie, ihe jupụtara nʼebube mgbe ochie enwekwaghị ebube ọbụla ugbu a, nʼihi na ebube nke ọgbụgba ndụ ọhụrụ ekpuchiela ya.
yen lan kuli, ya kpiagidi n den tieni yema po ki tie kpiagidi, kilima laa kpiagidi pendi.
11 Ọ bụrụ na ihe na-agafe agafe nwere ebube dị otu a, ihe ga-anọgide mgbe niile ga-enwe ebube karịa ya.
Mi n maadi yaala n pia n pendi ma ya dgidi yeni ti kpiagidi yaala gi ki pia pendima maan ka ye ali yali yogu n tu yogu!
12 Ya mere, ebe ọ bụ na anyị nwere olileanya dị otu a, anyị enweghị egwu ọbụla.
Ti pia la papali, ki ti yali tiba,
13 Anyị agaghị adị ka Mosis onye weere akwa kpuchie ihu ya, nʼihi na ọ chọghị ka ụmụ Izrel hụ ebube ahụ na-agbanwe agbanwe.
laa tie musa, n den yi ta licabili ki pini o nunga, ki Isalele yaaba buolu kan fidi ki yaadi tuogo yeni binunga yeni wan gbie yeniya kpiagidi n ba pendi.
14 Kama e mechiri obi ha ruo taa. Nʼihi na mgbe ọbụla ha gụrụ akwụkwọ ọgbụgba ndụ ochie ahụ, akwa mkpuchi ahụ na-anọgidekwa apụghị apụ nʼobi ha, nʼihi na ọ bụ naanị site nʼime Kraịst ka ọ ga-eji pụọ.
Ama bi yantiali ye ti juandi nni, hali din nne juandi baa ye bi ya cogi atikpela la bi po, kilima kilisiti nni bebe kiliba na.
15 Ee, tutu ruo taa, mgbe ọbụla ha na-agụ akwụkwọ iwu ahụ Mosis dere, ihe mkpuchi na-adịgide nʼobi ha.
ama, ba dinne, biya cogi mousa, li yantiali n piigi bi palaa.
16 Ma mgbe onye ọbụla tụgharịrị nʼebe Onyenwe anyị nọ, a na-ewepụ akwa mkpuchi ahụ.
Ama, ya danno n ta o yuli ki puni o tiyondano, laa (cabili) yantiali ba ña.
17 Nʼihi na Onyenwe anyị bụ Mmụọ, ma ebe ọbụla kwa Mmụọ Onyenwe anyị nọ, nʼebe ahụ ka mmadụ pụrụ inwere onwe ya.
Tiyondano tie fuoŋama n ye nanni, li dano tie yua yali o ba.
18 Anyị niile bụ ndị e wepụrụla akwa mkpuchi site nʼihu, na-egosi ebube nke Onyenwe anyị. A na-agbanwe anyị ịbanye nʼoyiyi ya site nʼebube ruo nʼebube, nke si nʼaka Onyenwe anyị, onye bụ Mmụọ.
Ti kuli, ya nunga la ki bandi o tienu kpiagidi, ki libidi toangu pui ti tua nani wani ki ba ya kpiagidi n ñani o ya kani nani tiyondano, wani yua n tie fuoŋama.

< 2 Ndị Kọrint 3 >