< 2 Ndị Kọrint 13 >

1 Nke a ga-eme ya ugboro atọ m na-abịa ileta unu. Ọ bụ site nʼama mmadụ abụọ maọbụ atọ gbara ka a ga-eme ka okwu niile guzoro.
This is the third time I am coming to you. “At the mouth of two or three witnesses shall every word be established.”
2 Mgbe m bịara leta unu nke ugboro abụọ, abaara m ndị niile dara iwu nʼoge gara aga na mmadụ ndị ọzọ mba, dọọkwa ha aka na ntị, ihu na ihu. Ugbu a m na-anọghị ya, ana m adọkwa ha aka na ntị ọzọ, ọ bụrụ na m bịa ọzọ hụ na ndị mehiere na mbụ echegharịghị, aga m emesi ha ike.
As I already said while with you the second time, I now repeat in writing while absent, to those who sinned before and to all the rest: If I come again I will not spare,
3 Ebe unu chọrọ ka e gosi na Kraịst na-ekwu okwu nʼime m, ọ dịghị egosi adịghị ike mgbe ọ na-emeso unu omume, kama ọ na-eme ka ike ya pụta ìhè nʼebe unu nọ.
since you want proof that Christ is speaking through me—He who is not weak toward you but powerful among you
4 Ọ bụ ezie na a kpọgidere ya na-adịghị ike, ma ugbu a, ọ na-adị ndụ site nʼike dị ukwuu nke Chineke. Anyị bụkwa ndị na-adịghị ike nʼime ya, ma ozi anyị na-ejere unu na mmekọrịta anyị na unu, anyị ga-eso ya dị ndụ site nʼike nke Chineke.
(although He was crucified in weakness, He lives by the power of God). Now we also are weak in Him, but we will live with Him by the power of God toward you.
5 Ya mere, ka onye ọbụla nʼime unu nyochaa onwe ya, tulekwa omume ya, mara ma ọ ka kwudosiri ike nʼokwukwe ya. Ọ bụ na unu aghọtaghị na Jisọs Kraịst nọ nʼime unu? Ma ọ bụghị na unu enyochaala onwe unu hụ na unu emeghị nke ọma.
Examine yourselves as to whether you are in the faith; test yourselves. Do you yourselves really not know that Jesus Christ is in you?—unless indeed you are disqualified.
6 Enwere m olileanya na unu niile ga-achọpụta na anyị adaghị ule ahụ.
Well I trust that you will know that we are not disqualified.
7 Ma anyị na-arịọ Chineke ka unu ghara ime ihe ọjọọ ọbụla. Anyị anaghị eme nke a iji gosi na anyị kwesiri ekwesi, kama ka unu nwee ike mee ihe dị mma, nʼagbanyeghị na ọ ga-adị ka a ga-asị na anyị emeghị nke ọma nʼọrụ anyị.
Now I pray to God that you do no evil; not that we may appear approved, but that you may do what is right (even though we may appear to have failed).
8 Nʼihi na anyị apụghị ime ihe ọbụla megide eziokwu, kama anyị na-eme ihe niile nʼihi eziokwu.
For we cannot do anything against the Truth, but only for the Truth.
9 Anyị na-aṅụrị ọṅụ mgbe anyị na-adịghị ike ma hụ na unu dị ike. Ihe anyị na-arịọ Chineke bụ ka unu tozuo oke.
Now we are glad when we are weak and you are strong. And we also pray for this, your perfecting.
10 Ana m edere unu akwụkwọ a ugbu a, nʼihi na-achọghị m ịbara unu mba na inye unu ntaramahụhụ mgbe m bịara. Achọkwaghị m iji ikike ahụ Onyenwe anyị nyere m nye unu ntaramahụhụ, kama achọrọ m iji ya wulie unu elu dịka ụlọ.
This is why I write these things while absent, so that when present I may not have to deal harshly, according to the authority that the Lord gave me, for building up and not for tearing down.
11 Nʼikpeazụ ụmụnna m, na-aṅụrịnụ ọṅụ. Gbalịanụ nʼimezi ndụ unu ka o zuo oke, na-agbarịta onwe ume, werenụ otu obi na-eme ihe, na-ebikwanụ nʼudo. Chineke nke udo na ịhụnanya ga-anọnyekwara unu.
Finally, brothers, rejoice; restore each other; encourage one another; be of one mind; live in peace; and the God of the love and the peace will be with you.
12 Werenụ isurita ọnụ dị nsọ kelerịta onwe unu.
Greet one another with a holy kiss.
13 Ndị nsọ niile na-ekelekwa unu.
All the saints greet you.
14 Ka amara Onyenwe anyị Jisọs Kraịst na ịhụnanya Chineke, na mmekọ nke Mmụọ Nsọ dịnyere unu niile.
The grace of our Lord Jesus Christ, and the love of God, and the fellowship of the Holy Spirit be with you all. Amen.

< 2 Ndị Kọrint 13 >