< 2 Ndị Kọrint 10 >

1 Ma mụ onwe m bụ Pọl, ji ịdị nwayọọ na obi umeala nke Kraịst na-arịọ unu. Mụ, onye na-adị umeala mgbe mụ na unu nọ nʼihu nʼihu, ma na-enwe mkwuwa okwu nʼebe unu nọ mgbe m na-anọghị nʼetiti unu.
Anye Paulo, omwene enibhalembelesha kwo bhufula bwa Kristo. Anye ni mufula omwanya nili imbele yemwe, Nawe ninaobwiikanyibwa kwemwe omwanya nikabha kula nemwe.
2 Arịọ m unu, ka m ghara inwe obi ike mgbe m bịarutere dịka o kwesiri nʼebe ụfọdụ ndị nọ, site na iguzogide ndị ahụ na-eche na anyị na-eme ihe dị ka ndị ụwa si eme ya.
Enibhasabwa emwe ati, nikabhao amwi, nitakwenda okubha mubha nokwikomesha kwanye omwene. Nawe eniganilisha okubha namanaga omwanya nikabhabhuma bhaliya abhoabheganilisha ati echikala kulwo kulubha omubhili.
3 Ọ bụ ezie na anyị na-ebi dịka mmadụ, ma anyị adịghị ebu agha dịka usoro anụ ahụ si dị.
Kulwo kubha echilibhata kulwo kulubha omubhili, chitakulwana chinyamubhili.
4 Nʼihi na ngwa agha anyị ji ebu agha, abụghị ngwa agha nke mmadụ nkịtị nke ụwa, kama ha nwere ike nke mmụọ ịla ebe niile e wusiri ike nʼiyi.
Kwo kubha ebhigwato ebyo echikolela okulwanila bhitali bye chinyamubhili. Nawe ni bya manage ga Nyamuanga gokunyamula obwikingo.
5 Anyị na-ala ịrụ ụka niile na okwu ụgha niile nʼiyi, nke na-egbochiri ụmụ mmadụ ụzọ e si amata Chineke, na-eme ka echiche niile hulata isi nʼokpuru Kraịst.
Ona, echinyamula bhuli chinu echobhutulo bwa ingulu bwo bhumenyi bwa Nyamuanga.
6 Anyị nọ na njikere ịta erubeghị isi niile ahụhụ, mgbe irube isi gị zuruoke.
Nechilikula bhuli ganilisho mu bhugaya bwo kumungwa Kristo. Ne chibhona intambala bhuli bhikolwa elyo litali na bwolobha, no bwolobha bwemwe bhulibha bwa kumila.
7 Unu na-ele anya nʼihe ndị dị unu nʼihu. Ọ bụrụ na ọ bụ ihe doro anya nye onye ọbụla na ha bụ nke Kraịst, ha matakwa na onwe ha, na otu ahụ ha bụ nke Kraịst na anyị onwe anyị bụkwa nke ya.
Lola chiliya chilibwelu imbele yemwe. Alabha wonawona unu keiikanyaga ati omwene ni wa Kristo, negalishe omwene ati lwa kutyo omwene ni wa Kristo, neswe one nikwo kutyo chili bha Kristo.
8 Ugbu a, ọ bụrụ na m anya isi banyere ikike ahụ Onyenwe anyị nyere m nʼebe unu nọ, ike ahụ o nyere m iji wulie unu elu, ọ bụghị iji wedaa unu ala, ihere agaghị eme m nʼihi nke a.
Kwo kubha nolwo ndeyungwa kutoto obhutolo bweswe, bhunu Lata bhugenyi asosishe kulweswe okubhombaka emwe natali okubhanyamula, nitakulola nswalo.
9 Achọghị ka ọ dịka m a ga-asị na m sitere nʼakwụkwọ ozi m na-emenye unu egwu.
Nitakwenda linu libhonekane ati enibhobhaisha emwe na jinyalubha jani.
10 Nʼihi na ha na-asị, “Akwụkwọ ozi ya dị arọ dịkwa ike, ma na mmadụ, ma nʼọdịdị ya na mmadụ adịghị ike, okwu ọnụ ya bụkwa ihe na-abaghị uru.”
Kwo kubha abhanu abhaika ati, “Jinyalubha jae jikomee na jina amanaga, Nawe chinyamubhili omwene mulenga. No bwaika bwae bhuteile okubhutegelesha.”
11 Ma ana m eme ka ndị dị otu a ghọta na ihe anyị na-ekwu site nʼakwụkwọ ozi mgbe anyị na-anọghị nʼetiti unu, ka anyị ga-eme ma anyị nọrọ nʼetiti unu.
Abhanu bha insonga inu bhamenye ati chinu echaika kwo bhwangu omwanya gunu chili kula, nilwakutyo chilakola chilyao.
12 Anyị enweghị anya ike ihazi ọnọdụ maọbụ were onwe anyị tụnyere ndị ụfọdụ na ndị ahụ nʼeto onwe ha. Ma mgbe ha na-eji onwe ha na-atụ onwe ha, werekwa onwe ha na-atụnyere onwe ha, ha adịghị ezipụta nghọta.
Chitakuja kula muno lwo kwikuya eswe abhene okwisusanisha nabhanu abhekuya abhene. Nawe bhakelenga abhene na bhuli umwi webhwe, bhatana bhwenge.
13 Ma anyị onwe anyị, adịghị anya isi banyere ihe ọbụla anyị na-enweghị ike ime. Kama anyị ga-anya isi nʼoke ọrụ ahụ Chineke kenyere anyị, ka anyị rụrụte ọ bụladị ruo nʼebe unu nọ.
Eswe, nolo kutyo, chitakwikuya okulabha mumbibhi. Nawe, echikola kutyola munda ya jimbibhi jinu Nyamuanga achilengee eswe, jimbibhi jinu ejikinga obhulela lwo bhwemwe kutyo bhuli.
14 Nʼihi na anyị adịghị ekwu okwu karịrị ọnụ anyị mgbe anyị na-etinye anya nʼihe gbasara unu, nʼihi na ọ bụ anyị buru ụzọ bịakwute unu, ikwusara unu oziọma gbasara Kraịst.
Kulwokubha chiteyongesishe eswe abhene chejile obhakingako emwe. Chabhee bho kwamba okukinga obhulela bhwemwe ingulu ya Kristo.
15 Ọ bụghị na anyị na-ekwu na ọ bụ anyị rụrụ ọrụ niile, ya na ọrụ nke ndị ọzọ rụrụ nʼetiti unu, kama olileanya anyị bụ na okwukwe unu ga na-eto eto mgbe niile, ka ọrụ ya nʼetiti unu bụrụ nke ga-eto eto.
Chichali kwikuya mundengo ye milimu ja bhandi. Nawe, echiikanya lwakutyo elikilisha lyemwe kutyo elikula olubhala lweswe lwe milimu lwa kutyo eliyongesha muno, naichali mumbibhi jakisi.
16 Nke a ga-eme ka anyị nwee ike zisaa oziọma ahụ na mba ndị ọzọ ndị dị nʼofe ala unu, ghara iji ọrụ arụrụ nʼebe ndị ọzọ na-arụ ọrụ na-etu ọnụ.
Echiikanya kulinu, koleleki chibhone okulasha emisango jombwana mumikowa okukila emwe. Chichali kwikuya ingulu ye milimu jinu ejikolwa mumbala ejindi.
17 Ma, “Onye ọbụla na-anya isi, ya nyaa nʼime Onyenwe anyị.”
“Nawe wona wona unu kekuya, ekuye mu Latabhugenyi.”
18 Nʼihi na ọ bụghị onye ji aka ya bulie onwe ya elu ka a na-anabata, kama ọ bụ onye Onyenwe anyị jiri aka ya bulie.
Kulwokubha atali unu kekuya omwenela nawe unu kakuibhwa. Nawe, niunu Latabhugenyi kakuya.

< 2 Ndị Kọrint 10 >