< 2 Ihe E Mere 1 >

1 Solomọn nwa Devid mere onwe ya ka o guzosie ike nʼalaeze ya, nʼihi na Onyenwe anyị Chineke ya nọnyeere ya, meekwa ka ọ dị ukwuu hie nne.
Solomoni mwana wa Davide anakhazikika molimbika mu ufumu wake, pakuti Yehova Mulungu wake anali naye ndipo anamukweza kwambiri.
2 Mgbe ahụ, Solomọn gwara ndị Izrel niile okwu, ya bụ, ndịisi agha na-achị ọtụtụ puku ndị agha, na ndịisi agha na-achị ọtụtụ narị ndị agha, na ndị ikpe, na ndị ndu niile nọ nʼIzrel, na ndịisi ezinaụlọ niile.
Tsono Solomoni anayankhula kwa Aisraeli onse, olamulira a anthu 1,000, olamulira a anthu 100, oweruza ndiponso kwa atsogoleri onse a Israeli ndi atsogoleri amabanja.
3 Solomọn ya na ọgbakọ ahụ niile, gara nʼebe dị elu nke Gibiọn, nʼihi nʼebe ahụ ka ụlọ nzute Chineke dị, bụ nke Mosis onyeozi Onyenwe anyị wuru nʼọzara.
Solomoni pamodzi ndi gulu lonse la anthu anapita ku malo ofunika kwambiri pachipembedzo ku Gibiyoni. Tenti ya msonkhano ya Mulungu inali kumeneko, imene Mose mtumiki wa Yehova anayipanga mʼchipululu muja.
4 Ma Devid esitelarị na Kiriat Jearim buputa igbe ọgbụgba ndụ Chineke ahụ, bulaa ya nʼụlọ ikwu nke o wuru maka ya na Jerusalem.
Davide anabweretsa Bokosi la Mulungu kuchokera ku Kiriyati Yearimu, ndi kulikhazika kumalo kumene analikonzera popeza analimangira tenti mu Yerusalemu.
5 Ebe ịchụ aja bronz ahụ Bezalel nwa Uri, nwa Hua wuru dịkwa na Gibiọn, nʼihu ụlọ nzute Onyenwe anyị. Solomọn na ọgbakọ ahụ na-ajụta ya ase nʼebe bronz ahụ.
Koma guwa lansembe lamkuwa limene Bezaleli mwana wa Uri, mwana wa Huri analipanga linali ku Gibiyoni kutsogolo kwa tenti ya Yehova. Kotero kuti Solomoni ndi gulu lonse anakapembedza kumeneko.
6 Solomọn jere nʼebe ịchụ aja ahụ e ji bronz kpụọ, nke dị nʼihu Onyenwe anyị, nʼime ụlọ nzute, jiri anụ ụlọ ọnụọgụgụ ha dị otu puku chụọ aja nsure ọkụ nʼelu ya.
Solomoni anapita pamene panali guwa lansembe lamkuwa pamaso pa Yehova mu tenti ya msonkhano ndipo anapereka nsembe zopsereza 1,000.
7 Nʼabalị ụbọchị ahụ na Gibiọn, Onyenwe anyị mere ka Solomọn hụ ya anya, sị ya, “Rịọọ ihe ọbụla ị chọrọ ka m nye gị.”
Usiku umenewo Mulungu anaonekera kwa Solomoni ndipo anati kwa iye, “Pempha chilichonse chimene ukufuna ndipo ndidzakupatsa.”
8 Ma Solomọn zara Chineke, sị, “I gosila nna m bụ Devid obi ebere dị ukwuu. Ugbu a, i meekwala m eze nʼọnọdụ ya
Solomoni anayankha Mulungu kuti, “Inu munaonetsa kukoma mtima kwakukulu kwa Davide abambo anga ndipo mwayika ine kukhala mfumu mʼmalo mwake.
9 Ugbu a, Onyenwe anyị bụ Chineke, ka nkwa gị nke i kwere nna m, bụ Devid, bụrụ ihe e mezuru, nʼihi na ị meela m eze ndị a bara ụba nʼọnụọgụgụ dịka aja nke ala.
Tsopano Inu Yehova Mulungu, lolani kuti lonjezo lanu kwa abambo anga Davide likwaniritsidwe, pakuti mwandiyika kukhala mfumu ya anthu anu amene ndi ochuluka ngati fumbi la pa dziko lapansi.
10 Biko, nye m amamihe na nghọta, nke m ga-eji edu ndị a napụ na-abata, nʼihi na onye pụrụ ịchịkọta ndị gị a dị ukwuu?”
Mundipatse nzeru ndi luntha zolamulira anthu awa, pakuti ndani amene angathe kulamulira anthu anu ochulukawa?”
11 Chineke zara Solomọn sị ya, “Ebe ọ bụ na ị rịọghị m ka m nye gị akụnụba, maọbụ ogologo ndụ; ebe ọ bụkwa na ị rịọghị m ka m mee ka ndị kpọrọ gị asị nwụsịa, maọbụ ka m mee ka i nwee nsọpụrụ karịa, kama mkpa na-akpa gị bụ ka m nye gị amamihe na nghọta ị ga-eji duzie ndị m, nke m mere gị eze ha.
Mulungu anati kwa Solomoni, “Popeza izi ndi zokhumba za mtima wako ndipo sunapemphe katundu, chuma kapena ulemu, kapena imfa ya adani ako, ndiponso poti sunapemphe moyo wautali koma nzeru ndi luntha kuti ulamulire anthu anga amene Ine ndakuyika kukhala mfumu yawo,
12 Ya mere, enyela gị amamihe na nghọta dịka ị rịọrọ. Aga m enyekwa gị akụnụba na nsọpụrụ dị ukwuu, nke eze ọbụla nke buru gị ụzọ na-enwebeghị. Ọ dịkwaghị onye nke ga-eso gị ga-enwe ụdị ya.”
Ine ndidzakupatsa nzeru ndi chidziwitso. Ndipo ndidzakupatsanso katundu, chuma ndi ulemu, zinthu zoti palibe mfumu imene inali nazo iwe usanakhalepo ndipo palibe wina amene adzakhale nazo iweyo ukadzafa.”
13 Mgbe ahụ, Solomọn sitere nʼebe dị elu nke Gibiọn, site nʼihu ụlọ nzute ahụ, lọghachi na Jerusalem. Ọ chịrị dịka eze nʼIzrel.
Kotero Solomoni anabwerera ku Yerusalemu kuchoka kumalo opembedzerako a ku Gibiyoni, ku tenti ya msonkhano ndipo analamulira Israeli.
14 Solomọn chịkọbara ọtụtụ ụgbọ agha na ịnyịnya dị iche iche. O nwere ụgbọ agha dị otu puku na narị anọ na ịnyịnya agha dị puku iri na abụọ nʼọnụọgụgụ, ndị o debere ụfọdụ nʼime ha nʼobodo ụgbọ agha ya ma ndị ọzọ dị na Jerusalem ebe ya onwe ya nọ.
Solomoni anasonkhanitsa magaleta ndi akavalo; anali ndi magaleta 1,400 ndi akavalo 12,000, amene anawayika mʼmizinda yosungira magaleta ndipo ena anali ndi iye mu Yerusalemu.
15 Eze mere ka ọlaọcha na ọlaedo baa ụba na Jerusalem, dịka nkume efu. O mekwara ka osisi sida dị ọtụtụ dịka osisi sikamọ nke dị nʼala ala ugwu dị iche iche
Mfumu inasandutsa siliva ndi golide kukhala ngati miyala wamba mu Yerusalemu. Inasandutsanso mkungudza kukhala wochuluka ngati mitengo ya mkuyu ya ku zigwa.
16 A na-esite nʼIjipt nakwa ala Kue atụbatara Solomọn ịnyịnya. Ndị ahịa eze na-azụta ha site na Kue nʼọnụ ahịa a na-ere ha nʼoge ahụ.
Solomoni amagula akavalo ku Igupto ndi Kuwe pakuti anthu amalonda a mfumu amakawagula ku Kuwe.
17 Ha sitere nʼIjipt tụbata otu ụgbọ agha nʼọnụ ahịa narị shekel ọlaọcha isii; jirikwa otu narị shekel na iri shekel ise zụta otu ịnyịnya. Ha zipụkwara ha nye ndị eze niile nke ndị Het na ndị Aram.
Anthu ankagula galeta ku Igupto pa mtengo wa masekeli asiliva 600 ndipo kavalo pa mtengo wa ndalama zasiliva 150. Iwo ankazigulitsanso kwa mafumu onse a Ahiti ndi a Aramu.

< 2 Ihe E Mere 1 >