< 2 Ihe E Mere 8 >
1 Nʼọgwụgwụ iri afọ abụọ, mgbe Solomọn ji wuo ụlọnsọ Onyenwe anyị na ụlọeze nke ya onwe ya,
Un pēc divdesmit gadiem, kad Salamans bija uztaisījis Tā Kunga namu un savu namu,
2 Solomọn wugharịrị obodo ndị ahụ Hiram nyere ya, mee ka ndị Izrel biri nʼime ha.
Tad Salamans izbūvēja tās pilsētas, ko Hirams Salamanam bija devis, un lika Israēla bērniem tur dzīvot.
3 Solomọn gara Hamat-Zoba, merie ha.
Pēc tam Salamans cēlās uz HamatCovu un to pārvarēja.
4 O wuru obodo Tadmọ nke dị nʼọzara na ọtụtụ obodo nchịkọba ihe na Hamat.
Viņš arī uztaisīja Tadmoru tuksnesī un visas labības pilsētas, ko viņš Hamatā būvēja.
5 O wugharịkwara obodo Bet-Horon nke dị nʼelu elu, wuokwa Ndịda Bet-Horon ka ọ ghọọ obodo e wusiri ike nke nwere mgbidi, ibo ọnụ ụzọ ama na mkpọrọ e ji kpọchie ha.
Viņš arī uztaisīja kalna- un Lejas-BetOronu, stipras pilsētas ar mūriem, vārtiem un aizšaujamiem,
6 O wukwara obodo Baalat na obodo niile nke ebe ịchịkọba ihe, na obodo niile ebe idebe ụgbọ agha na ịnyịnya ya niile. O wuru ihe ọbụla gụrụ obi ya agụụ iwu na Jerusalem, Lebanọn na nʼoke ala ahụ niile ọ na-achị.
Un Baēlatu un visas labības pilsētas, kas Salamanam piederēja, un visas ratu un jātnieku pilsētas un visas Salamana prieka pilis, ko tam bija prieks taisīt Jeruzālemē un uz Lībanus un visās zemēs viņa valstībā.
7 Ndị niile fọdụrụ ndụ nʼetiti ndị Het, ndị Amọrait, ndị Periz, ndị Hiv na Jebus (ndị a abụghị ndị Izrel),
Visus atlikušos ļaudis no Hetiešiem un Amoriešiem un Fereziešiem un Hiviešiem un Jebusiešiem, kas nebija no Israēla,
8 ndị ụmụ ụmụ ha fọdụrụ nʼala ahụ, ndị ahụ ndị Izrel na-ebibighị, ndị a ka Solomọn mere ndị ọrụ mmanye na ndị ohu, nke a bụkwa ọnọdụ ha ruo taa.
Šo bērnus, kas pēc tiem tai zemē bija atlikuši, ko Israēla bērni nebija izdeldējuši, tos Salamans spieda pie klausības līdz šai dienai.
9 Ma Solomọn emeghị ka onye Izrel ọbụla bụrụ ohu, maka ọrụ ya, kama ha bụ ndị ikom agha, ndịisi ndị ọchịagha ya, ndịisi ụgbọ agha na ndị na-agba ịnyịnya agha ya.
Bet no Israēla bērniem Salamans neņēma kalpus pie sava darba, bet tie bija karavīri un virsnieki pār viņa bruņiniekiem un viņa ratu un jātnieku virsnieki.
10 Ha bụkwa ndịisi ozi nke eze Solomọn, narị ndị ikom abụọ na iri ise bụ ndịisi na-elekọta ndị mmadụ.
Un virsuzraugu ķēniņam Salamanam bija divsimt un piecdesmit, kas pār tiem ļaudīm valdīja.
11 Solomọn kpọpụtara ada Fero site nʼobodo Devid, gaa nʼụlọeze nke o wuuru ya, nʼihi na ọ sịrị, “Nwunye m agaghị ebi nʼụlọeze Devid, bụ eze Izrel, nʼihi na ebe ọbụla igbe ọgbụgba ndụ Onyenwe anyị banyere abụrụla ebe dị nsọ.”
Un Salamans veda Faraona meitu no Dāvida pils tai namā, ko viņš tai bija taisījis. Jo viņš sacīja: manai sievai nebūs Israēla ķēniņa Dāvida namā dzīvot, tāpēc ka tā vieta ir svēta, kur Tā Kunga šķirsts nācis.
12 Emesịa, Solomọn chụrụ aja nsure ọkụ nye Onyenwe anyị, nʼelu ebe ịchụ aja Onyenwe anyị, nke o wuru nʼihu mpụta ọnụ ụlọ ụlọnsọ ukwu ahụ,
Tad Salamans upurēja Tam Kungam dedzināmos upurus uz Tā Kunga altāra, ko viņš priekšnama priekšā bija uztaisījis,
13 ọbụladị dịka iwu metụtara aja e kwesiri ịchụ kwa ụbọchị si dị, bụ nke Mosis nyere nʼiwu. Aja ndị a bụ maka Ụbọchị Izuike, Ọnwa Ọhụrụ na ụdị mmemme atọ a na-eme nʼafọ, ndị bụ mmemme achịcha ekoghị eko, mmemme izu ụka asaa na mmemme ụlọ Ikwu.
Ikkatrā dienā savu tiesu upurēdams, itin kā Mozus bija pavēlējis, svētdienās un jaunos mēnešos un svētkos, trīs reiz gadskārtā, neraudzētās maizes svētkos un nedēļu svētkos un lieveņu svētkos.
14 O sitere nʼusoro ije ozi nke Devid, họpụtara otu ndị nchụaja ọrụ dị iche iche ha na-arụ ụbọchị niile. O nyekwara ndị Livayị ọrụ idu nʼotuto a na-enye Chineke na inyere ndị nchụaja aka ime ihe ụbọchị ọbụla nʼụbọchị ya. Kenyekwa ndị na-eche ọnụ ụzọ ụlọnsọ ahụ niile nche oke ọrụ ha nʼotu nʼotu, nʼihi na nke a bụ ihe Devid, onye nke Chineke nyere nʼiwu.
Un viņš iestādīja pēc sava tēva Dāvida likuma priesteru kārtas, kā tiem bija kalpot, un Levitus, kopt savu kopjamo, slavēt un kalpot priesteru priekšā, kas katrai dienai piekrita, arī vārtu sargus pēc savas kārtas pie ikkatriem vārtiem, jo tā bija Dāvida, Tā Dieva vīra, pavēle.
15 Ha ewezugaghị onwe ha nʼiso iwu niile eze nyere ndị nchụaja maọbụ ndị Livayị banyere ihe ọbụla na ihe gbasakwara ụlọakụ niile.
Un no ķēniņa pavēles par priesteriem un Levitiem viņi neatkāpās ne kādā lietā, arī ne pie tām mantām.
16 A rụzuru ọrụ niile Solomọn zubere ịrụ, site nʼụbọchị a tọrọ ntọala ụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị tutu ruo mgbe ewuchara ya. Ya mere, e wuchara ụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị.
Tā Salamans pabeidza visu savu darbu, no tās dienas, kad Tā Kunga namam lika pamatu, līdz kamēr to pabeidza un Tā Kunga nams pavisam bija gatavs.
17 Mgbe ahụ, Solomọn gara Eziọn Geba na Elat nke dị nʼọnụ osimiri, nʼala Edọm.
Tad Salamans gāja uz EceonĢeberu un uz Elotu jūrmalā, Edoma zemē.
18 Hiram zigaara ya ọtụtụ ụgbọ mmiri nke ndị ikom ya na-anya ụgbọ mmiri na-edu, bụ ndị maara ihe banyere ime njem nʼosimiri nke ọma. Ndị a, ha na ndị ikom Solomọn nyaara ụgbọ gaa Ọfịa site nʼebe ahụ bulatara eze Solomọn, ọlaedo ịdị arọ ya ruru puku kilogram iri na ise na narị atọ.
Un Hirams tam sūtīja caur saviem kalpiem lielas laivas, un kalpus, kas jūru pārzināja, un tie gāja ar Salamana kalpiem uz Ofiru un atveda no turienes četrsimt un piecdesmit talentus zelta un to nesa ķēniņam Salamanam.