< 2 Ihe E Mere 4 >

1 Solomọn wukwara ebe ịchụ aja bronz. Ogologo ya ruru iri mita na ọkara. Obosara ya rukwara iri mita na ọkara; ma ịdị elu ya dị mita ise na ụma atọ.
Ya yi bagaden tagulla mai tsawo kamu ashirin, fāɗinsa kamu ashirin, tsayinsa kuma kamu goma.
2 O mekwara Oke osimiri nke ọla awụrụ awụ, nke dị gburugburu nʼụdịdị. Ọtụtụ ya bụ ihe ruru mita abụọ na ụma atọ nʼogologo, dịkwa mita ise na ụma atọ, site nʼotu ọnụ ruo nʼọnụ nke ọzọ. Ọ bụ eriri e ji atụ ihe nke ruru ihe dịka mita iri na anọ ka e ji tụọ ya gburugburu.
Ya yi ƙaton kwano mai suna Teku na zubin ƙarfe, mai siffar da’ira, awonsa kamu goma ne daga da’ira zuwa da’ira tsayinsa kuma kamu biyar. Ya ɗauki magwaji mai tsawo kamu talatin ya auna shi kewaye.
3 Nʼokpuru ọnụ ya, oyiyi ụmụ oke ehi gbara ya gburugburu, iri dị na mita anọ na ọkara ọbụla. Ehi ndị ahụ dị nʼahịrị abụọ. A wụkọtara ha na Oke osimiri ahụ otu mgbe.
Ƙasa da da’ira kuwa, akwai siffofin bijimai kewaye da ita, goma ga kowane kamu guda. An yi zubin bijiman a jeri biyu a gefe guda na kwatarniya.
4 E mekwara ka Oke osimiri ahụ guzo nʼelu ehi iri na abụọ. Atọ na-eche ihu nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ; atọ na-eche ihu nʼọdịda anyanwụ; atọ na-eche ihu nʼakụkụ ndịda, atọ na-eche ihu nʼakụkụ ugwu. Oke osimiri ahụ dịkwasịrị ha nʼelu, ebe azụ ha niile dị nʼime nʼetiti.
Tekun ya tsaya a kan bijimai goma sha biyu, uku na fuskantar arewa, uku na fuskantar yamma, uku na fuskantar kudu, uku kuma na fuskantar gabas. Tekun ya zauna a kansu, kuma ƙarfafun bayansu suna wajen tsakiya.
5 Ịdị arọ ya ha ka otu ọtụtụ ntu-aka dimkpa. E mere ọnụ ya ka ọ dị ka ọnụ iko mmiri, dịkwa ka okoko lili na-awapụta awapụta. Ọ na-erite puku galọọnụ iri na asatọ.
Kaurin ya kai tafin hannu, kuma da’iransa ya yi kama da’irar kwaf, kama furen da ya tohu. Ya riƙe randuna dubu uku.
6 A kpụkwara efere ukwu iri nke e ji asacha ihe e wetara maka ịchụ aja nsure ọkụ. Ise nʼime ha dị nʼakụkụ ndịda olulu mmiri ahụ, ise nʼakụkụ ugwu. Ndị nchụaja na-esite naanị na olulu mmiri ahụ ekuru mmiri ha ji asacha ihe.
Sa’an nan ya yi daruna goma don wanki ya sa biyar a gefen kudu, biyar kuma a gefen arewa. A cikinsu kayan da za a yi amfani don ɗauraye hadayun ƙonawa, amma firistoci suna amfani da ƙaton kwano mai suna Teku don wanki.
7 Ọ kpụrụ ihe ịdọba oriọna ọlaedo iri nʼusoro dịka Chineke nyere ya nʼiwu. O debere ha nʼime ụlọnsọ ukwu ahụ, ise nʼakụkụ ndịda ụlọ ahụ, ise nʼakụkụ nke ugwu.
Ya yi wurin ajiye fitila goma na zinariya bisa ga tsari dominsu ya kuma sa su a haikali, biyar a gefen kudu, biyar kuma a gefen arewa.
8 O mekwara tebul iri dọnye nʼụlọnsọ ukwu ahụ, ise nʼakụkụ ndịda, ise nʼakụkụ ugwu. Ọ kpụkwara otu narị efere ọlaedo maka ịkwọsa mmiri.
Ya yi tebur goma ya kuma sa su cikin haikalin, biyar a gefen kudu, biyar kuma a gefen arewa. Ya kuma yi kwanonin yayyafawa guda ɗari.
9 Ọ mere ogige ndị nchụaja, mekwa otu ogige ukwuu, na ibo ọnụ ụzọ maka itinye nʼogige ahụ. O jiri bronz machie ibo ọnụ ụzọ ndị ahụ.
Ya yi fili na firistoci da kuma babban fili da ƙofofi domin filin, ya shafe ƙofofin da tagulla.
10 Oke osimiri ahụ ka ọ dọbara nʼakụkụ ndịda, na ncherita ihu ọwụwa anyanwụ nke ụlọnsọ ahụ.
Ya sa ƙaton kwano mai suna Teku a gefen kudu, a kusurwa kudu maso gabas.
11 Huram kpụkwara ite dị iche iche, shọvel niile, na efere ịkwọsa mmiri niile. Nʼikpeazụ, ọ rụchara ọrụ dị nʼụlọnsọ Chineke, nke eze Solomọn tinyere ya nʼaka ịrụ.
Ya kuma yi tukwane da manyan cokula da kwanonin yayyafawa. Ta haka Huram ya gama aikin da ya yi wa Sarki Solomon a cikin haikalin Allah.
12 Ogidi abụọ ahụ; ihe ọkpụkpụ abụọ dịka efere dị nʼelu ogidi abụọ ahụ; Ihe ọkpụkpụ yiri ụdọ a tụrụ atụ nke e ji chọọ ihe ọkpụkpụ abụọ ahụ dịka efere mma;
Ginshiƙai biyu; kwanoni biyu masu siffar kwartaniya a bisa ginshiƙai; jeri biyu na tuƙaƙƙen adon kwanonin yayyafawa masu siffar kwartaniya a bisa ginshiƙai;
13 narị anọ nke mkpụrụ pomegranet a kpụrụ akpụ maka ahịrị ihe abụọ ahụ a kpụrụ akpụ, ya bụ, ahịrị pomegranet abụọ nʼihi otu ihe ọkpụkpụ, iji chọọ ihe ọkpụkpụ ahụ yiri efere dị nʼisi elu ogidi ahụ mma;
rumman ɗari huɗu don jeri biyu na tuƙaƙƙe (layi biyu na rumman don kowane tuƙaƙƙe, mai adon kwano mai siffar kwartaniya a bisan ginshiƙai);
14 ihe ndọkwasị na efere ịsa mmiri ha,
dakalai da darunansu;
15 na Oke osimiri ahụ na ehi iri na abụọ ahụ dị ya nʼokpuru,
ya yi kwanon da ya kira Teku, da bijimai goma sha biyu a ƙarƙashinsa;
16 na ite niile, shọvel niile, ihe ịgụrụ anụ niile na ihe ngwongwo ndị ọzọ ya na ha so. Ihe niile nke Huram-Abi mere eze Solomọn nʼihi ụlọnsọ Onyenwe anyị, bụ bronz e hichaziri nke ọma.
tukwane, manyan cokula, cokula masu yatsu don nama da dukan kayayyakin da suka shafi wannan. Dukan kayayyakin da Huram-Abi ya yi domin Sarki Solomon saboda haikalin Ubangiji an yi su da gogaggen tagulla ne.
17 Ọ bụ nʼala ụrọ, nʼobosara ala Jọdan, nʼetiti Sukọt na Zaretan, ka eze mere ka a nọrọ kpụọ ihe ndị a.
Sarki ya sa aka yi zubinsu a katakon yin tubali a filin Urdun tsakanin Sukkot da Zereda.
18 Ihe ndị a niile nke Solomọn mere dị ukwuu nke ukwu; nke bụ na-enweghị ike ịgụkọta ihe ịdị arọ nke bronz ahụ bụ.
Dukan waɗannan abubuwa da Solomon ya yi suna da tsada ƙwarai har suka kai nauyin tagullar da ya fi misali.
19 Solomọn mekwara ngwongwo niile dị nʼime ụlọnsọ Chineke, ya bụ, ebe ịchụ aja e ji ọlaedo kpụọ, na tebul niile nke a dọkwasịrị achịcha nke iche nʼIhu Onyenwe anyị,
Solomon ya kuma yi dukan kayayyakin da suke a cikin haikalin Allah. Bagaden zinariya; teburin da ake ajiye burodin Kasancewa;
20 ihe ịdọkwasị oriọna niile nke ọlaedo a nụchara anụcha, ha na oriọna ha niile, ka ọ na-enwu nʼihu ime ime ebe nsọ, dịka e nyere nʼiwu,
wurin ajiye fitila na zinariya zalla tare da fitilunsu, don ƙonawa a gaban wuri mai tsarki na ciki kamar yadda aka tsara;
21 ihe ịchọ mma oyiyi okoko osisi, na oriọna niile na ihe ịgụta ihe niile. E ji ọlaedo a nụchara anụcha kpụọ ha niile.
aikin zānen furannin zinariya da fitilu da abin ɗiban wuta (an yi su da zinariya zalla);
22 Ọ kpụkwara ihe ịkpakepụ ọkụ niile nke ọlaedo a nụchara anụcha, na efere ịkwọsa mmiri niile, na ngaji niile, na ihe ịgụ ọkụ niile, na ibo ọlaedo niile nke ụlọnsọ, ya bụ, ibo ọnụ ụzọ ime ime niile nke dịrị Ebe ahụ Kachasị Nsọ, na ibo ndị dị nʼọnụ ụlọ ezumezu.
arautaki; kwanonin yayyafawa, kwanoni da hantsuka; da kuma ƙofofin zinariya na haikali, ƙofofi na ciki zuwa Wuri Mafi Tsarki da kuma ƙofofin babban zaure.

< 2 Ihe E Mere 4 >