< 2 Ihe E Mere 4 >

1 Solomọn wukwara ebe ịchụ aja bronz. Ogologo ya ruru iri mita na ọkara. Obosara ya rukwara iri mita na ọkara; ma ịdị elu ya dị mita ise na ụma atọ.
Moreover he made an altar of brass, twenty cubits the length thereof, and twenty cubits the breadth thereof, and ten cubits the height thereof.
2 O mekwara Oke osimiri nke ọla awụrụ awụ, nke dị gburugburu nʼụdịdị. Ọtụtụ ya bụ ihe ruru mita abụọ na ụma atọ nʼogologo, dịkwa mita ise na ụma atọ, site nʼotu ọnụ ruo nʼọnụ nke ọzọ. Ọ bụ eriri e ji atụ ihe nke ruru ihe dịka mita iri na anọ ka e ji tụọ ya gburugburu.
Also he made a molten sea of ten cubits from brim to brim, round in compass, and five cubits the height thereof; and a line of thirty cubits did compass it round about.
3 Nʼokpuru ọnụ ya, oyiyi ụmụ oke ehi gbara ya gburugburu, iri dị na mita anọ na ọkara ọbụla. Ehi ndị ahụ dị nʼahịrị abụọ. A wụkọtara ha na Oke osimiri ahụ otu mgbe.
And under it was the similitude of oxen, which did compass it round about: ten in a cubit, compassing the sea round about. Two rows of oxen were cast, when it was cast.
4 E mekwara ka Oke osimiri ahụ guzo nʼelu ehi iri na abụọ. Atọ na-eche ihu nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ; atọ na-eche ihu nʼọdịda anyanwụ; atọ na-eche ihu nʼakụkụ ndịda, atọ na-eche ihu nʼakụkụ ugwu. Oke osimiri ahụ dịkwasịrị ha nʼelu, ebe azụ ha niile dị nʼime nʼetiti.
It stood on twelve oxen, three looking toward the north, and three looking toward the west, and three looking toward the south, and three looking toward the east: and the sea was set above on them, and all their hinder parts were inward.
5 Ịdị arọ ya ha ka otu ọtụtụ ntu-aka dimkpa. E mere ọnụ ya ka ọ dị ka ọnụ iko mmiri, dịkwa ka okoko lili na-awapụta awapụta. Ọ na-erite puku galọọnụ iri na asatọ.
And the thickness of it was an handbreadth, and the brim of it like the work of the brim of a cup, with flowers of lilies; and it received and held three thousand baths.
6 A kpụkwara efere ukwu iri nke e ji asacha ihe e wetara maka ịchụ aja nsure ọkụ. Ise nʼime ha dị nʼakụkụ ndịda olulu mmiri ahụ, ise nʼakụkụ ugwu. Ndị nchụaja na-esite naanị na olulu mmiri ahụ ekuru mmiri ha ji asacha ihe.
He made also ten lavers, and put five on the right hand, and five on the left, to wash in them: such things as they offered for the burnt offering they washed in them; but the sea was for the priests to wash in.
7 Ọ kpụrụ ihe ịdọba oriọna ọlaedo iri nʼusoro dịka Chineke nyere ya nʼiwu. O debere ha nʼime ụlọnsọ ukwu ahụ, ise nʼakụkụ ndịda ụlọ ahụ, ise nʼakụkụ nke ugwu.
And he made ten candlesticks of gold according to their form, and set them in the temple, five on the right hand, and five on the left.
8 O mekwara tebul iri dọnye nʼụlọnsọ ukwu ahụ, ise nʼakụkụ ndịda, ise nʼakụkụ ugwu. Ọ kpụkwara otu narị efere ọlaedo maka ịkwọsa mmiri.
He made also ten tables, and placed them in the temple, five on the right side, and five on the left. And he made an hundred basins of gold.
9 Ọ mere ogige ndị nchụaja, mekwa otu ogige ukwuu, na ibo ọnụ ụzọ maka itinye nʼogige ahụ. O jiri bronz machie ibo ọnụ ụzọ ndị ahụ.
Furthermore he made the court of the priests, and the great court, and doors for the court, and overlaid the doors of them with brass.
10 Oke osimiri ahụ ka ọ dọbara nʼakụkụ ndịda, na ncherita ihu ọwụwa anyanwụ nke ụlọnsọ ahụ.
And he set the sea on the right side of the east end, over against the south.
11 Huram kpụkwara ite dị iche iche, shọvel niile, na efere ịkwọsa mmiri niile. Nʼikpeazụ, ọ rụchara ọrụ dị nʼụlọnsọ Chineke, nke eze Solomọn tinyere ya nʼaka ịrụ.
And Huram made the pots, and the shovels, and the basins. And Huram finished the work that he was to make for king Solomon for the house of God;
12 Ogidi abụọ ahụ; ihe ọkpụkpụ abụọ dịka efere dị nʼelu ogidi abụọ ahụ; Ihe ọkpụkpụ yiri ụdọ a tụrụ atụ nke e ji chọọ ihe ọkpụkpụ abụọ ahụ dịka efere mma;
To wit, the two pillars, and the pommels, and the capitals which were on the top of the two pillars, and the two wreaths to cover the two pommels of the capitals which were on the top of the pillars;
13 narị anọ nke mkpụrụ pomegranet a kpụrụ akpụ maka ahịrị ihe abụọ ahụ a kpụrụ akpụ, ya bụ, ahịrị pomegranet abụọ nʼihi otu ihe ọkpụkpụ, iji chọọ ihe ọkpụkpụ ahụ yiri efere dị nʼisi elu ogidi ahụ mma;
And four hundred pomegranates on the two wreaths; two rows of pomegranates on each wreath, to cover the two pommels of the capitals which were on the pillars.
14 ihe ndọkwasị na efere ịsa mmiri ha,
He made also bases, and lavers made he on the bases;
15 na Oke osimiri ahụ na ehi iri na abụọ ahụ dị ya nʼokpuru,
One sea, and twelve oxen under it.
16 na ite niile, shọvel niile, ihe ịgụrụ anụ niile na ihe ngwongwo ndị ọzọ ya na ha so. Ihe niile nke Huram-Abi mere eze Solomọn nʼihi ụlọnsọ Onyenwe anyị, bụ bronz e hichaziri nke ọma.
The pots also, and the shovels, and the meat hooks, and all their instruments, did Huram his father make to king Solomon for the house of the LORD of bright brass.
17 Ọ bụ nʼala ụrọ, nʼobosara ala Jọdan, nʼetiti Sukọt na Zaretan, ka eze mere ka a nọrọ kpụọ ihe ndị a.
In the plain of Jordan did the king cast them, in the clay ground between Succoth and Zeredathah.
18 Ihe ndị a niile nke Solomọn mere dị ukwuu nke ukwu; nke bụ na-enweghị ike ịgụkọta ihe ịdị arọ nke bronz ahụ bụ.
Thus Solomon made all these vessels in great abundance: for the weight of the brass could not be found out.
19 Solomọn mekwara ngwongwo niile dị nʼime ụlọnsọ Chineke, ya bụ, ebe ịchụ aja e ji ọlaedo kpụọ, na tebul niile nke a dọkwasịrị achịcha nke iche nʼIhu Onyenwe anyị,
And Solomon made all the vessels that were for the house of God, the golden altar also, and the tables where on the show bread was set;
20 ihe ịdọkwasị oriọna niile nke ọlaedo a nụchara anụcha, ha na oriọna ha niile, ka ọ na-enwu nʼihu ime ime ebe nsọ, dịka e nyere nʼiwu,
Moreover the candlesticks with their lamps, that they should burn after the manner before the oracle, of pure gold;
21 ihe ịchọ mma oyiyi okoko osisi, na oriọna niile na ihe ịgụta ihe niile. E ji ọlaedo a nụchara anụcha kpụọ ha niile.
And the flowers, and the lamps, and the tongs, made he of gold, and that perfect gold;
22 Ọ kpụkwara ihe ịkpakepụ ọkụ niile nke ọlaedo a nụchara anụcha, na efere ịkwọsa mmiri niile, na ngaji niile, na ihe ịgụ ọkụ niile, na ibo ọlaedo niile nke ụlọnsọ, ya bụ, ibo ọnụ ụzọ ime ime niile nke dịrị Ebe ahụ Kachasị Nsọ, na ibo ndị dị nʼọnụ ụlọ ezumezu.
And the snuffers, and the basins, and the spoons, and the censers, of pure gold: and the entry of the house, the inner doors thereof for the most holy place, and the doors of the house of the temple, were of gold.

< 2 Ihe E Mere 4 >