< 2 Ihe E Mere 35 >
1 Josaya mere Mmemme Ngabiga Onyenwe anyị na Jerusalem nʼụbọchị iri na anọ nke ọnwa mbụ nʼafọ. Ha gburu atụrụ Mmemme Ngabiga nʼụbọchị ahụ
Moreouer Iosiah kept a Passeouer vnto the Lord in Ierusalem, and they slewe the Passeouer in the fourtenth day of the first moneth.
2 O debekwara ndị nchụaja nʼime ụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị, gbaa ha ume ka ha bidokwa ịrụ ọrụ ha.
And he appointed the Priestes to their charges, and incouraged them to the seruice of the house of the Lord,
3 Ọ sịrị ndị Livayị, bụ ndị e doro nsọ nye Onyenwe anyị, ndị na-emekwa ka ndị Izrel ghọta ihe, “Dọnyenụ igbe nsọ ahụ nʼụlọnsọ ukwu ahụ Solomọn, nwa Devid, bụ eze Izrel wuru. Unu ekwesịkwaghị ị na-ebugharị ya nʼubu unu ọzọ. Ugbu a jeerenụ Onyenwe anyị Chineke unu, na ndị ya Izrel ozi.
And he sayd vnto the Leuites that taught all Israel and were sanctified vnto the Lord, Put the holy Arke in the house which Salomon the sonne of Dauid King of Israel did build: it shalbe no more a burden vpon your shoulders: serue now the Lord your God and his people Israel,
4 Kwadoonụ onwe unu nʼusoro ezinaụlọ unu nʼotu nʼotu, dịka ntụziaka ihe Devid, eze Izrel dere nʼakwụkwọ si dị, ya na nke Solomọn nwa ya si dịkwa.
And prepare your selues by the houses of your fathers according to your courses, as Dauid the King of Israel hath written, and according to the writing of Salomon his sonne,
5 “Werenụ ọnọdụ nʼebe nsọ unu na otu ndị Livayị, maka nkewa nke ezinaụlọ nna nna unu ha si dị, bụ ikwu ndị Izrel, ndị na-abụghị ndị nchụaja.
And stande in the Sanctuarie according to the deuision of the families of your brethren the children of the people, and after the deuision of the familie of the Leuites:
6 Gbuonụ atụrụ ngabiga ndị ahụ, doonụ onwe unu nsọ, doziekwaranụ ụmụnna unu ndị Izrel aja ha, ime dịka ihe Onyenwe anyị nyere Mosis nʼiwu si dị.”
So kill the Passeouer and sanctifie your selues, and prepare your brethren that they may doe according to the worde of the Lord by the hand of Moses.
7 Josaya nyere ndị niile nọ nʼebe ahụ onyinye igwe ewu na atụrụ ọnụọgụgụ ya dị iri puku atọ, nke ha ga-eji chụọ aja Mmemme Ngabiga. O nyekwara ha puku oke ehi atọ site nʼakụ eze.
Iosiah also gaue to the people sheepe, lambs and kiddes, all for the Passeouer, euen to all that were present, to the nomber of thirtie thousand, and three thousande bullocks: these were of the Kings substance.
8 Ndịisi ya nyekwara ndị nchụaja na ndị Livayị onyinye afọ ofufu. Otu a kwa, Hilkaya na Zekaraya, na Jehiel, ndị na-elekọta ụlọnsọ Chineke nyere ndị nchụaja puku ewu na atụrụ abụọ na narị isii, nyekwa ha narị oke ehi atọ, maka iji chụọ aja Ngabiga.
And his princes offred willingly vnto the people, to the Priests and to the Leuites: Hilkiah, and Zechariah, and Iehiel, rulers of the house of God, gaue vnto the Priests for the Passeouer, euen two thousand and sixe hundreth sheepe, and three hundreth bullockes.
9 Ndị bụ ndị ndu nʼebo Livayị aha ha bụ Konanaya, na Shemaya, na Netanel, na nwanne ya Hashabaya, na Jeiel, na Jozabad, nyere ndị Livayị puku ewu na atụrụ ise, na narị oke ehi ise maka iji ha chụọ aja Ngabiga.
Conaniah also and Shemaiah and Nethaneel his brethren, and Hashabiah and Ieiel, and Iozabad, chiefe of the Leuites gaue vnto the Leuites for the Passeouer, fiue thousand sheepe, and fiue hundreth bullockes.
10 Mgbe e dozichara usoro ije ozi ahụ niile, ndị nchụaja weere ọnọdụ ha, ha na ndị Livayị nʼoke ọrụ ha nʼusoro dịka eze nyere nʼiwu.
Thus the seruice was prepared, and the Priests stoode in their places, also the Leuites in their orders, according to the Kings commandement:
11 Mgbe ahụ ndị Livayị gburu atụrụ ngabiga ahụ niile, were ọbara ha nye ndị nchụaja. Ha fesara ya nʼebe ịchụ aja mgbe ndị Livayị nọ na-agba anụ ndị ahụ akpụkpọ.
And they slewe the Passeouer, and the Priests sprinkled the blood with their handes, and the Leuites flayed them.
12 Ha kenyere ezinaụlọ ọbụla anụ ndị ahụ niile ka ha jiri nke ha ketara chụọ aja nsure ọkụ nye Onyenwe anyị nʼusoro dịka e dere nʼime akwụkwọ Mosis. Otu a ka ha mekwara banyere ehi ndị ahụ.
And they tooke away from the burnt offering to giue it according to the deuisions of the families of the children of the people, to offer vnto the Lord, as it is written in the booke of Moses, and so of the bullockes.
13 Otu a kwa, dịka e dere ya nʼiwu Mosis, ha hụrụ anụ aja ngabiga ahụ nʼọkụ, sie aja ndị dị nsọ nʼite, buputa ha ngwangwa kee ha ndị mmadụ niile.
And they rosted the Passeouer with fire, according to ye custome, but the sanctified things they sod in pots, pannes, and cauldrons, and distributed them quickely to all the people.
14 Emesịa, ha kwadooro onwe ha ihe, ma kwadokwara ndị nchụaja, nʼihi na ndị nchụaja, bụ ụmụ Erọn, nọọrị na-achụ aja nsure ọkụ na abụba anụ ruo abalị. Ya mere, ndị Livayị ji kwadoro onwe ha ma kwadokwara ndị nchụaja, bụ ụmụ Erọn ihe.
Afterwarde also they prepared for them selues and for the Priestes: for the Priestes the sonnes of Aaron were occupied in offering of burnt offrings, and the fat vntill night: therefore the Leuites prepared for them selues, and for the Priests the sonnes of Aaron.
15 Ndị ikwu Asaf ndị a, bụ ndị na-abụ abụ, nọkwa nʼọnọdụ ha nʼusoro dịka ihe Devid, na Asaf, na Heman, na Jedutun onye amụma eze nyere nʼiwu. Ndị na-eche nche nʼọnụ ụzọ ama ahapụghị ọnọdụ ha, nʼihi na ndị Livayị ibe ha doziri ihe debere ha.
And the singers the sonnes of Asaph stoode in their standing according to the commandement of Dauid, and Asaph, and Heman, and Ieduthun the Kings Seer: and the porters at euery gate, who might not depart from their seruice: therefore their brethren the Leuites prepared for them.
16 Ya mere, e doziri ofufe niile nke Onyenwe anyị nʼotu ụbọchị ahụ, maka ime Mmemme Ngabiga na ịchụ aja nsure ọkụ niile nʼebe ịchụ aja Onyenwe anyị, dịka eze Josaya nyere nʼiwu.
So all the seruice of the Lord was prepared the same day, to keepe the Passeouer, and to offer burnt offerings vpon the altar of the Lord, according to the commandement of King Iosiah.
17 Ndị Izrel bụ ndị nọ nʼebe ahụ mere Mmemme Ngabiga nʼoge ahụ, meekwa mmemme achịcha ekoghị eko ụbọchị asaa.
And the children of Israel that were present, kept the Passeouer the same time, and the feast of the vnleauened bread seuen dayes.
18 E mebeghị Mmemme Ngabiga nʼụdị a nʼIzrel, site nʼụbọchị Samuel onye amụma, o nwebekwaghị eze Izrel ọbụla nke merela mmemme a dịka Josaya mere, ya na ndị nchụaja, ndị Livayị na ndị Juda niile na ndị Izrel niile bụ ndị nọ nʼebe ahụ tinyere ndị Jerusalem.
And there was no Passeouer kept like that, in Israel, from the dayes of Samuel the Prophet: neyther did all the Kings of Israel keepe such a Passeouer as Iosiah kept, and the Priestes and the Leuites, and all Iudah, and Israel that were present, and the inhabitants of Ierusalem.
19 Ọ bụ nʼafọ nke iri na asatọ nke ọchịchị Josaya, ka e mere Mmemme Ngabiga a.
This Passeouer was kept in the eighteenth yeere of the reigne of Iosiah.
20 Emesịa, mgbe Josaya hazisịrị ihe nʼụlọnsọ ahụ, Neko eze Ijipt gbagoro ịga buo agha na Kakemish, nke dị nʼakụkụ osimiri Yufretis. Mgbe ahụ, Josaya pụkwara izute ya nʼagha.
After all this, when Iosiah had prepared the Temple, Necho King of Egypt came vp to fight against Carchemish by Perath, and Iosiah went out against him.
21 Ma Neko zipụrụ ndị ozi bịara zie Josaya ozi, sị ya, “Olee esemokwu dị ugbu a nʼetiti mụ na gị, gị eze Juda? Ọ bụghị ibuso gị agha ka m bịara, kama ọ bụ naanị ụlọ mụ na ha nọ nʼagha. Chineke sịrị m ka m mee ngwa; ya mere, egbochikwala Chineke onye nọnyeere m, ka ọ ghara iji iwe bibie gị.”
But he sent messengers to him, saying, What haue I to doe with thee, thou King of Iudah? I come not against thee this day, but against the house of mine enemie, and God commanded me to make haste: leaue of to come against God, which is with me, least he destroy thee.
22 Ma Josaya esiteghị nʼebe ọ nọ chigharịa, kama o nwogharịrị onwe ya, ka a ghara ịmata onye ọ bụ, maka ịga buso ya agha. O geghịkwa ntị na okwu ahụ eze Neko kwuru nke si nʼaka Chineke bịa, kama ọ pụrụ ibuso ya agha nʼala Megido.
But Iosiah would not turne his face from him, but changed his apparel to fight with him, and hearkened not vnto the wordes of Necho, which were of the mouth of God, but came to fight in the valley of Megiddo.
23 Ma mgbe ndị nʼagba ụta gbatara eze, bụ Josaya ụta, eze gwara ndị ozi ya sị, “Bupunụ m, nʼihi na emerụọla m ahụ nʼebe ọ dị ukwuu.”
And the shooters shot at king Iosiah: then the King saide to his seruants, Cary me away, for I am very sicke.
24 Ya mere, ha sitere nʼụgbọ agha ya bulie ya bubanye ya nʼime ụgbọ agha ọzọ, bulata ya na Jerusalem, ebe ọ nọ nwụọ. E liri ya nʼili nna nna ya ha, ndị Juda na Jerusalem niile ruuru ya uju.
So his seruants tooke him out of that charet, and put him in the seconde charet which he had, and when they had brought him to Ierusalem, he dyed, and was buryed in the sepulchres of his fathers: and all Iudah and Ierusalem mourned for Iosiah.
25 Jeremaya bụụrụ Josaya abụ akwa, ruo taa ndị ikom na ndị inyom na-abụ abụ a iji na-echeta Josaya. Nke a ghọrọ omenaala nʼIzrel, e dekwara ya nʼakwụkwọ abụ akwa dị iche iche.
And Ieremiah lamented Iosiah, and al singing men and singing women mourned for Iosiah in their lamentations to this day, and made the same for an ordinance vnto Israel: and beholde, they be written in the lamentations.
26 Ihe ndị ọzọ niile Josaya mere, na ọrụ ebere niile ọ rụrụ nʼusoro ihe e dere nʼiwu Onyenwe anyị,
Concerning the rest of the actes of Iosiah and his goodnesse, doing as it was written in the Lawe of the Lord,
27 na akụkọ ndụ ya site na mmalite ruo nʼọgwụgwụ, ka e depụtara nʼakwụkwọ akụkọ ndị eze Izrel na Juda.
And his deedes, first and last, behold, they are written in the booke of the Kings of Israel and Iudah.